Otu Ụlọ nke N’usoro N’usoro
“N’soro n’soro” bụ ụzọ dị mfe, ụdị okike, ma dị ire maka Onyenwe anyị ikuziri anyị, dịka ụmụ Ya, ụkpụrụ niile dị mkpa.
Nime ndụ nke ọrụ m na nime ije ozi m nime Nzukọ-nsọ, E mela m nke a ọtụtọ ugboro—abụghị n’ihu ndị nwoke 15 nọ n’azụ m. A nam enwe mmetụta nke ekpre unu na nke ha.
Ụmụnne m nwoke na nwanyị, a bụ m nwa afọ nke Alaeze nke Tonga nime South Pacific kama azụrụ m nime North America. Ọrịa mkpochapụ ahụ egbochiwo ọtụtụ narị, ikekwe ọtụtụ puku nke ndị mgbasa oziọma si na obodo Tonga na eje ozi n’ụwa niile ịlọta na obodo ha hụrụ n’anya nihi na emechiri oké-ala ya. Ụfọdụ ndị okenye Tonga anọrọla na ije ozi mgbasa oziọma ha afọ atọ ma ndị nwanne nwanyị ihe karịrị afọ abụọ! Ha na eji okwukwe na ndidi na eche nke bụ ihe eji mara ndị anyị. Ugbua, ya amapụlagị obi ọbụrụ na ụfọdụ ha ndị na eje ozi nime ngalaba ukwu niile na stek niile unu ka dịzị ka m—n’eme okenye ma n’agba isi awọ. Anyị nwere obi ekele maka ndị mgbasa oziọma ebe ọbụla maka ije ozi ha raara onwe ha nye, ọbụna mgbe ọgafere ma ọbụ orughị oge atụrụanya nihi ọrịa mkpochapụ.
Otu Sọnde mgbe m bụ onye dikọn, A nọ m nime ebe a na-eri nri buru tray mmịrị enye oriri-nsọ mgbe otu nwanyị batara nime ụlọ ahụ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, A gakwurụ m ya ma bunye ya tray ahụ. O kwere n’isi, waa ọnụ-ọchị, ma were otu iko nke mmịrị. Ọ bịaghị ọsịsọ ịnata achịcha ahụ. Na oge n’adịghị anya nhụmihe nke a gachara, onye nkuzi ebe-obibi m, Ned Brimley, kuziri m na ọtụtụ akụkụ niile na ngọzi niile nke oziọma nke Jizọs Kraịst bụ ihe a na enye anyị n’usoro n’usoro.
Ka emechara na izu-ụka ahụ, Ned na onye nsiso ya bịara na ebe-obibi anyị ịkuzi ihe anaghị echefu echefu. Ned chetara anyị na enwere usoro Chineke jiri kee ụwa. Onyenwe anyị kpachara anya na ịkọwara Moses usoro O jiri kee ụwa. Nke mbụ, O bidoro site na ịkewa ihè na ọchịchịrị, mgbe ahụ mmịrị site na ala akọrọ. Ọ gbakwụnyere osisi na anụmanụ niile tupu ọ wepụtara ụwa ahụ okere ọhụrụ okike Ya nke kachasị: mmadụ, bido na Adam na Iv.
“Ya mere Chineke ekee mmadụ site n’ọyịyị nke onwe Ya, n’ime ọdịdị nke Chineke ka o kere ya; nwoke na nwanyị ka o kere ha. …
“ Ma Chineke wee hụ ihe niile ọbụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu” (Jenesis 1:27, 31).
Onyenwe anyị nwere obi-ụtọ. Ma O zuru ike na ụbọchị nke asaa.
N’usoro n’usoro ahụ e jiri kee ụwa na enye anyị nanị nlele ọbụghị nanị ihe nke kacha dịịrị Chineke mkpa kama kwa ihe maka ndị O jiri kee ụwa.
N’etiti nkuzi Ned Brimley nke na-akwalite mmụọ, o kwuru okwu nke a dị mfe: “ Vai, ụlọ nke Chineke bụ nke nwere usoro. Ọ tụrụanya na ị ga ebi ndụ gị na usoro. Na usoro kwesịrị ekwesi. Ọ chọrọ ka ije ozi mgbasa oziọma tupu ịlụọ nwanyị.” Ruo na oge nke a, ndị ndu Nzukọ-nsọ na akuzi ugbua na “Onyenweanyị tụrụanya na nwa nwoke ọbụla ji ahụ ga akwado ije ozi. … Ụmụ agbọghọ … ndị chọrọ ije ozi kwesịrị kwa ịkwado” (General Handbook: Ịrụ-ọrụ nime Nzukọ-nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ, 24.0, ChurchofJesusChrist.org). Nwanne nwoke Brimley gara nihu: “ Chineke chọrọ ka ịlụọ nwanyị tupu inwe ụmụ. Ma Ọ chọrọ ka ị na azụlite onyinye chi gị niile mgbe ọbụla dịka ị na amụ akwụkwọ.” Ọ bụrụ na gị họrọ ibi ndụ na adịghị na usoro, ị ga ebi ndụ ga aka esi ike ma dị ọgbaaghara karịa.
Nwanne nwoke Brimley kuzikwara anyị na site na ịchụ-aja aja mgbaghara mmehie Ya, Onye nzọpụta na enyere anyị aka iweghachite usoro nye ndụ anyị nke na-agba gharaghara ma ọbụ pụrụ na usoro site na nhọrọ anyị ma ọbụ nke ndị ọzọ adịghị mma.
Site na oge ahụ ga nihu, e nwela m oke mmasị na “n’usoro n’usoro.” A zụlitere m agwa nke ileanya maka usoro ụkpụrụ niile nime ndụ na nime oziọma ahụ.
Okenye David A. Bednar kuziri ụkpụrụ nke a: “ Dịka anyị na amụ ihe, mụta, ma bie ndụ oziọma nke Jizọs Kraịst, nsoro na abịa mgbe ọbụla. Tulee, na ịma-atụ, ihe niile anyị na amụta gbasara ihe mmụọ ndị kacha mkpa site na usoro nke isi ihe niile mere dịka eweghachitere oziọma nke Onye nzọpụta na uju ya nime ụbọchị ikpeazụ niile ndị a.”
Okenye Bednar depụtara Ọhụ Mbụ na mpụta mbụ nke Moronaị nye Josef Smit dịka ibido ịkuziri onye amụma nwa nwoke ahụ, nke okike na agwa nke Chineke, ndị sotere bụrụ ọrụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn na Elijah ga arụ na ịkpọkọta Israel na akụkụ abụọ nke akwa-mgbochi nime ọgbọ ikpeazụ a.
Okenye Bednar mechiri: “Usoro nkwalite mmụọ nke a kuziri gbasara ihe ndi mmụọ niile nke kachasị mkpa nye Chi” (“Obi niile nke Ụmụntakịrị Ga Atụgharị,” LiahonaNov. 2011, 24).
Otu nleba anya m mere bụ na “n’soro n’soro” bụ ụzọ dị mfe, ụdị okike, ma dị ire maka Onyenweanyị ikuziri anyị, dịka ụmụ Ya, ụkpụrụ niile dị mkpa.
Anyị a bịala na ụwa ịmuta ihe ma nwee nhụmihe anyị agaghịrị enweta. Otito anyị pụrụ iche nye onye ọbụla nime anyị otu na otu ma bụrụ akụkụ dị mkpa nke atụmatụ Nna nke Elu-igwe. Otito nke anụ arụ na nke mmụọ anyị na ebido na ọkwa ma were nwayọ na ebilite dịka anyị na enwe nhụmihe n’usoro.
Alma nyere okwu chukwu siri ike na okwukwe—were ntụnyere nke mkpụrụ osisi, nke ọbụrụ na elekọta ya nke ọma, ga epupụta site na sapling wee tojuo, osisi tojuru na amị mkpụrụ n’atọ ụtọ (lee Alma 32:28–43). Nkuzi ahụ bụ na okwukwe unu ga abayanye dịka ị na enye ohere maka ma na azụ mkpụrụ osisi ahụ—ma ọbụ mkpụrụ okwu nke Chineke—nime obi unu. Okwukwe unu ga abawanye dịka mkpụrụ okwu nke Chineke bidoro “ikolite nime obi unu niile” (amaokwu 28). Na ọ “na-ekolite, ma na-epupụta, ma malite ito” (amaokwu 30) bụ ihe eji anya ahụ ma nwee nkụzi nime ya. Ọ dị kwa n’usoro.
Onyenwe anyị na akuziri anyị otu na otu dịka ike mmụta anyị na otu anyị si amụta. Otito anyị dabere na ịdị na njikere anyị, ọchịchọ ịmata ihe, ọkwa nke okwukwe , na nghọta.
A kuzịrị Nifaị ihe Josef Smit ga amụta nime Kirtland, Ohio, ihe karịrị afọ 2,300 n’abịa abịa: “N’ihi na lee, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru: A ga m enye ụmụ nke mmadụ ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a na ntakịrị ebe ahụ; ma ngọzi na-adịrị ndị na-ańa ntị na ozizi m niile, ma na-ege ntị na ndụmọdụ m, n’ihi na ha ga amụta amamihe” (2 Nifaị 28:30).
Na anyị na-amụ “ahịrị n’elu ahịrị, ozizi n’elu ozizi, ntakịrị n’ebe a na ntakịrị ebe ahụ” bụ usoro ọzọ.
Tulee nkwupụta niile ndịa ndị nke anyị nụrụla ọtụtụ oge nke ndụ anyị: “Ihe mbụ niile ga-ebu ụzọ” ma ọbụ “Nye ha mmiriara tupu anụ.” Kedụ maka “Anyị kwesịrị ịga ije tupu anyị agbaa ọsọ” ? Okwu niile ndịa n’otu n’otu kọwara ihe dị n’usoro.
Ọrụ ebube niile n’arụ ọrụ dịka n’usoro n’usoro. Ọrụ ebube niile n’eme mgbe anyị bu ụzọ nwee okwukwe. Okwukwe n’ebu ọrụ ebube ụzọ.
Ndị ntorobịa ka a na echi echichi nye ọkwa ọrụ niile nke Ọkwa nchụ-aja Erọn n’usoro, dịka afọ onye a na echi echichi gbara: dikọn, onye-nkuzi, na mgbe ahụ onye nchụ-aja.
Emume-nsọ nịịle dị mkpa maka nzọpụta na mbuli-elu bụ dị n’usoro nke okike. A na eme anyị baptizim tupu anyị anata onyinye nke Mmụọ Nsọ. Emume nsọ niile nke tempụl dị kwa n’usoro. N’ezie, dịka enyi m Ned Brimley jiri amamihe kuziere m, oriri-nsọ ahụ dị n’usoro—ọ na ebido na achicha, mmiri esoro.
“Ma mgbe ha na-eri ihe, Jizọs weere achịcha, ma gọzie ya, ma nyawa ya, ma nye kwa ya ndị na-eso ụzọ ya, ma sị, Nara, rie; nke a bụ arụ m.
“Ma o were kwa iko ahụ, ma nye ekele, ma nye ha ya, n’asị, Ṅụọ nụ ha niile;
“N’ihi na nke a bụ ọbara m nke agba ọhụrụ,nke akwafuru maka ọtụtụ n’ihi nsachapụ nke mmehie ha niile” (Matiu 26:26–28).
Nime Jerusalem na America, Onye nzọpụta dobere oriri-nsọ na otu usoro ahụ.
“Lee, ụlọ nke m bụ ụlọ nke-usoro, ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, na-abụghị ụlọ nke ọgba aghara” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 132:8).
Nchegharị bụ n’usoro. Ọ na ebido na okwukwe nime Jizọs Kraịst, obụrụgodi nanị otu urughuru. Okwukwe chọrọ ịdị umeala, nke bụ ihe dị mkpa nke inwe “obi tiwara etiwa na mụọ nchegharị.”(2 Nephi 2:7).
N’ezie, mkpụrụ anọ nke mbụ nke oziọma dị n’usoro. “Anyị kwere na ụkpụrụ mbụ niile na emume-nsọ niile nke Oziọma bụ: nke mbụ, Okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst; nke abụọ, Nchegharị; nke atọ, Baptism site na-imikpu n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie niile; nke anọ, Ibikwasị aka niile n’isi maka onyinye nke Mmụọ Nsọ” (Ndepụta nke Okwukwe 1:4).
Eze Benjamin kuziri ndị ya eziokwu nke a dị mkpa: “Ma hụ na ihe niile ndị a e mere ha na amamihe na n’usoro; n’ihi na ọ bụghị ihe a chọrọ na mmadụ ga-agba ọsọ ngwa ngwa karịa ka o nwere ume. Ma ọzọ, ọ dị mkpa na ọ ga-arụsi ọrụ ike, ka site n’ebe ahụ ọ ga-erita ụgwọ ọrụ ahụ; ya mere, ihe niile ka a ga-emerịri n’usoro”(Mosaia 4:27) .
Ka anyị bie ndụ anyị n’usoro ma chọọ isoro usoro ahụ nke Onyenwe anyị dowere anyị. Anyị ga enweta ngọzi dịka anyị na eleanya maka ma soro atụmatụ niile na usoro nke Onyenwe anyị kuziri ihe nke kachasị Ya mkpa. Site na aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen