Ọgbakọ Zuru ọha
Ị Bụ Onye n’eso Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Ị Bụ Onye n’eso Kraịst

Ị bụ onye n’eso Kraịst bụ ị gbalịsi ike ị debe omume anyị nile, agwa anyị, na ndụ anyị dịka nke ndị Onye nzọpụta.

Nime ọmụmụ akwụkwọ nsọ nile nke onwem, obi atowo m ụtọ maka nchegharị nke Saul onye Tarsus, onye emesịrị mara dịka Paul, dịka esiri kọwaa nime Baịbụlụ.

Pọl bụụbụrụ onye dị ike na imegide Nzukọ nsọ nakwa ndị ahụ n’eso Kraịst. Mana nihi ike nke eluigwe na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, a gbanworo ya kpam kpam, ma ọ buwoziri otu nime nnukwu odibo nke Chineke. Onye nlere anya ya maka ndụ bụ Onye nzọpụta Jizọs Kraịst.

Nime otu nkụzi niile nke Pọl nye Ndị Kọrịnt, ọ kpọkuru ha ka ha bụrụ ndị n’eso ya dịka ya onwe ya bụ onye n’eso Kraịst (lee 1 Ndị Kọrịnt 11:1). Nke a bụ ezigbote ọkpụkpọ okù bidoro n’oge Pọl ruo taa: ị bụ onye n’eso Jịzọs Kraịst.

E bidoro m tulewa ịhe ọ pụtara ị bụ onye n’eso Kraịst. Nke ka mkpa, e bidoro jụwa, “Kedụ ụzọ m g’eji eje Ya ejije?

Ị bụ onye n’eso Kraịst bụ ị gbalịsi ike ị debe omume anyị nile, omume, na ndụ anyị dịka nke ndị Onye nzọpụta. Ọ pụtara i webata agwa ọma nime anyị. Ọ pụtara ị bụ ezigbo onye n’eso Jizọs Kraịst.

A mụwo m ufọdụ akụkụ nke ndụ Onye nzọpụta, ma e dobewom, dịka otu akụkụ nke ozi m taa, ejirimara anọ nke Ya nke m na-agba mbọ ije ejije ma nke ọ masịrị m ị gwa unu.

Agwa mbụ nke Onye nzọpụta bụ obi umeala. Jịzọs Kraịst di ezigbo umeala bido na ndụ tupu ndụ anụ ahụ. Nime Ọgbakọ nke Eluigwe, Ọ ghọtara ma hapụ ka uche nke Chineke mee nime atụmatụ nke nzọpụta maka ụmụ mmadụ. O kwuru, “Nna, ka e mee uche gị, ma ka otuto ahụ bụrụ nke gị ruo mgbe nile.” (Mosis 4:2).

Anyị maara na Jizọs Kraịst kụziri banyere ịdị umeala ma nweda onwe Ya ala ka Nna Ya wee rie otito.

K’anyị bie ndụ nke ịdị umeala nihi ọ na-enwete udo (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:23). Ịdị umeala n’abịa tupu otuto, ma ọ na-enwetere anyị ngọzị nke Chineke: “Eeh, unu niile nọkọrịtanụ n’okpụrụ onwe unu niile, ma were obi umeala yibe dịka ákwà: nihina Chineke n’edo onwe ya ịmegide ndị mpako, ma n’enye ndị dị umeala amara” (1 Pita 5:5). Ịdị umeala n’enwete aziza dị jụụ. Ọ bụ ebe agwa eziomume si abịa.

Okenye Dale G. Renlund kụziri:

“Ndị mmadụ n’eji obi umeala n’ejekọrịta ije ha na Chineke na-echeta ịhe Nna nke Eluigwe na Jịzọs Kraịst meworo maka ha.”

Anyị na-akwanyere Chineke ugwu site n’iji obi umeala jekọrịta ije anyị na Ya” (“Kpe ikpe ziri ezi, Hụ Ebere nanya, ma Jiri Obi umeala Jekọrịta ije gị na Chineke,” Liahona, Nov. 2020, 111, 109).

Agwa abụọ nke Onye nzọpụta bụ agbam ume. Mgbe m n’eche banyere Jizọs Kraịst mgbe ọ dị afọ 12, dịka ọ nọdụrụ nime tempụl nke Chineke n’etiti ndị dọkịnta nke ọkaikpe ma na-akụziri ha ịhe ndị nsọ, ọ metụrụ m na Ọ diwo mbụ, kamgbe mbido ndụ Ya, nwee ezigbote agbam ume, otu agbam ume ama ama. Nagbanyeghi na ọtụtụ nime anyị ga-achọ ịhụ ndị dọkịnta ọkaikpe ahụ ka ha na-akụziri nwata nwoke ahụ, kama ọ bụ Ya na-akụziri ha ma “ha na-anụ ịhe niile ọ n’ekwu, ma n’ajụ ya ọtụtụ ajụjụ” (Ntụgharị Josef Smit nke Luk 2:46 [nime Luke 2:46, footnote c]).

Anyị jere ozi mgbasa oziọma nke uju-oge nime Democratic Republic nke Congo Mbuji-Mayi Mission bido na 2016 ruo na 2019. Ụzọ esi eme njem nime mission nkea site n’otu mpaghara ruo na nke ọzọ bụ site n’okporo ụzọ. Enwere ịhe mere n’ebe ahụ mgbe ndị ọji-egbe aga ji ngwa gha dị nkọ makapụta n’ụzọ ma bido sogbuwa ndị njem niile.

Ndị mgbasa oziọma ise a chọrọ iziga ebe ọzọ, nọ n’eme njem site n’otu mpaghara ruo na nke ọzọ so nime ndị mkpagbu a metụtara. Nihi ụdị ihe dị otua emetuwo anyị na mbụ, anyị bidoro tụwa ụjọ maka ndụ na nchekwa nke anyị niile, tụmadị ịnwe obi abụọ ịme njem n’ụzọ ndị ahụ ị ga leta ndị mgbasa oziọma ahụ ma mee ọgbakọ niile nke mpaghara ebe ahụ. Anyị amaghị mgbe ịhe ndịa ga-akwụsị. E depụtara m otu ndepụta nke m zigara Ndi Isi Mpaghara, ebe m kọwara ha mmetụta ụjọ nke anyị banyere ị ganiihu mee njem, ebe ọ bụ naanị otu ụzọ ahụ bụ nke enwere iji ruo n’ebe ndị mgbasa ozi anyị nọ.

Na nzaghachi, Okenye Kevin Hamilton, onye bụbụụrụ Onyeisi nke Africa Southeast Area, deere m: “Ndụmọdụ m bụ mee ihe niile ị nwere ike ị mee. Nwee akọ n’uche ma nọrọ n’ekpere. Akpachala anya tinye onwe unu mọbụ ndị mgbasa oziọma gị nime ụzọ mmerụ ahụ, mana n’otu aka ahụ ga niihu n’okwukwe. ‘N’ihi na Chineke enyebeghị anyị mụọ nke ịtụ egwu; kama nke ike, na nke ịhụnanya, na nke echiche zuru-oke’ (2 Timothy 1:7).”

Okwu nkasị obi nkea gbara anyị nnukwu ume ma mee k’anyị ga niihu n’eme njem ma jiri agbam ume n’eje ozi ruo na ọgwụgwụ mgbasa oziọma anyị nihi anyị nụrụ odudu sitere na Nna anyị nke Eluigwe site na akwụkwọ nsọ nke a.

Nime akwụkwọ nsọ nke agba ọhụrụ, anyị n’agụ okwu mkpali mmụọ nke Onye amụma Josef Smit mgbe ọ n’eche agbam ume nke Onyenwe anyị nye anyị: “Ụmụnna m, anyị agaghị a ga-n’iru n’ihe kpatara ihe ukwu dị otu a? Gaa n’iru ọbụghị azụ. Nwee nụ ume ụmụnne; gaa n’iru, n’iru ruo na-mmeri! (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 128:22)]

K’anyị nwee ume iji mee ịhe ziri ezi, tụmadị mgbe igwe mmadụ anabataghị ya—ume iji chekwaa okwukwe anyị ma mee ịhe n’okwukwe. K’anyị nwee ume iji chegharịa kwa ụbọchị, ume iji nabata uche nke Chineke ma rube isi nye iwu nsọ Ya niile. K’anyị nwee ume iji bie ndụ eziomume ma ịhe atụrụ n’aka anyị nime oke n’orụ na ọnọdụ anyị dị iche iche.

Agwa atọ nke Onye nzọpụta bụ ịme mgbaghara. N’oge ije ozi Ya nke ndụ anụ ahụ, Onye nzọpụta gbochiri ka agharị ịtụ otu nwanyị ejidere n’akwamiko okwute. Ọ nyere ya iwu sị “laa, ma ghara ime njọ ọzọ” (Jọn 8:11). Nke a mere o jiri chegharịa ma nata mgbaghara, nihi dịka akwụkwọ niile si dee, “nwanyị ahụ towere Chineke bido n’awa hụ ma kwere n’aha ya” (Ntụgharị nke Josef Smit, John 8:11 [nime John 8:11, footnote c])

N’oge ofufe nro nke ekeresimesi nke Ọnwa Disemba 2018, Onyeisi anyị hụrụ n’anya Russell M. Nelson kwuru maka onyinye anọ nke anyị natara n’aka Onye nzọpụta. Ọ kwuru na otu onyinye Onye nzọpụta n’enye anyị bụ ike anyị nwere ị gbagharammadụ:

“Site na Aja mgbaghara mmehie agwụghụ agwụ Ya, ị nwere ike ịgbaghara ndị ahụ mejọrọ gị ma ndị n’achọghị ị kwete na ha mere gị ezigbo ịhe ọjọọ.

“Ọ na-adịkarị mfe ịgbaghara onye ahụ ji obiọacha ma umeala chọọ mgbaghara anyị. Mana Onye nzọpụta ga-enye gị ike iji gbaghara onye ọbụla onye kpasịrị gị agwa ojoo n’ụzọ ọbụla” (“Onyinye Anọ nke Jịzọs Kraịst N’enye Gị” [Ofufe nro nke Ekeresimesi nke Ndị Isi Nduzi Mbụ, Dec. 2, 2018], broadcasts.ChurchofJesusChrist.org).

Ọ gadị mma m’anyị jiri obiọcha gbaghara onwe anyị k’anyị natakwa mgbaghara n’aka Nna. Mgbaghara na-atọghapụ anyị ma mee k’anyị tozuo oke iri oriri nsọ ụbọchị Sọnde niile. Achọrọ mgbaghara n’aka anyị tupu anyị abụrụ ezigbo ndị na eso-ụzọ Jịsọs Kraịst.

Agwa anọ nke Onye nzọpụta bụ ịme ichu-aja. Nkea bụ otu akụkụ dị nime oziọma nke Jizọs Kraịst. Onye nzọpụta nyere ndụ Ya dịka aja kacha ibe ya maka anyị, k’anyị nwee ike ịnata mgbapụta. Mgbe mgbu nke ịchụ aja ahụ metụtara ya, Ọ rịọrọ Nna Ya ka o wezuga iko ahụ, mana Ọ gara niihu ruo na njedebe nke ịchụ aja ebighi ebi ahụ. Nke a bụ Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Onyeisi M. Russell Ballard kụziri nke a: “Ịchụ aja bụ [ịhe] ngosipụta nke ịhụnanya n’enweghi ntupọ. Otu ogo ịhụnanya anyị nwere maka Onyenwe anyị ha, ma nke oziọma, ma nye mmadụ ibe anyị ka ewere ike ichọpụta site ịhe anyị dị na nikere ịchụrụ n’aja maka ha” (“Ngọzị niile nke Ịchụ aja,” Ensign, Mee 1992, 76).

Anyị nwere ike ịchụ oge anyị n’aja iji jee ozi nlekọta, iji jeere ndị ọzọ ozi, iji mee ihe ọma, iji mee agụgụala nke ezinaụlọ, ma iji bawanye ọkpụkpọ okù nke Nzukọ nsọ.

Anyị nwere ike nye onyinye ego anyị site n’ịkwụ otu ụzọ n’iri, onyinye niile nke ibu ọnụ, ma onyinye ego ndị ọzọ maka iwulite alaeze Chineke n’elu ụwa. Anyị kwesịrịrị ịchụ aja idobe ọgbụgba ndụ niile nke anyị meworo anyị na Onye nzọpụta.

Ekpere m bụ ka site n’isoro Jizọs Kraịst ma doro ngọzị niile nke Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị ga-enwe ike nwe obi umeala karịa, anyị ga-enwe ume karịa, anyị ga-agbaghara karịa ma karịa, ma anyị g’achụ aja karịa maka alaeze Ya.

A na m agba ama na Nna nke Eluigwe dị ndụ ma Ọ maara onye ọbụla nime anyị otu n’otu, ma Jịzọs bụ Kraịst ahụ, ma Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Chineke nke taa. A na m agba ama na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazu a bụ alaeze nke Chineke n’elu ụwa ma Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu. Site na aha nke Jịzọs Kraịst, Onye Mgbapụta anyị, amen.

Bipụta