Ọgbakọ Zuru ọha
Mweghachite Kwa Ụbọchị
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


13:43

Mweghachite Kwa Ụbọchị

Anyị chọsịrị ike ihè nke eluigwe n’abịa kwa ụbọchị. Anyị chọsịrị ike “oge niile nke nnwogharị.” Oge nke mnweghachi azụ nke onwe.

Anyị agbakọwo n’ụtụtụ ọma nke Ụbọchị ezumike nke a ikwu maka Kraịst, ịn̄ụrị maka oziọma Ya, ma kwadoo ma kwagide onwe anyị dịka anyị n’eje ije nime “ụzọ ahụ” nke Ọnye nzọpụta anyị.1

Dị ka ndị otù Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-agbakọ maka ebumnobi nke a n’Ụbọchị ezumike ọbụla ruo n’afọ niile ahụ. Ọ bụrụna ị bụghị onye otù Nzukọ nsọ nke a, anyị na-anabata gị n’obi ọma ma n’ekele gị maka isonye anyị fee Onye nzọpụta ofufe ma mụta maka Ya. Dịka gị, anyị n’agba mbọ—agbanyeghi etozughi oke—ị bụ ndị ezi enyị karịa, ezi ndị agbata obi, ezi mmadụ,2 ma anyị n’achọ ime nke a site n’isoro Ọnye ọmụmatụ anyị, Jịzọs Kraịst.

Onyenwe anyị Jizọs Kraịst

Enwere m olileanya na unu ga-ahụta obiọcha dị nime ọgbụgba ama anyị. Jizọs Kraịst dị ndụ! Ọ bụ Ọkpara nke Chineke dị ndụ, ma Ọ na-edu ndị amụma n’elu ụwa n’ụbọchị nke anyị. Anyị na-akpọku onye niile ka ha bịa, nụrụ okwu nke Chineke, ma rite ịdịmma Ya! A na m agba akaebe nke onwe m na Chineke nọ n’etiti anyị makwa na n’ezie Ọ ga-abịaru nso nye ndị niile ahụ ga-abịaru Ya nso.3

Anyị weere ya dịka ihe nkwanye ugwu, anyị na unu ịjekọrịta ije nime ụzọ ahụ nke Nna ukwu nke guzoro kwem ma dị mkpafa.

Nka nke Ịga ije N’ahịrị nke Guzoro kwem

Enwere okwu a na-ekwukarị mgbe ọbụla, na ndị obụla furu efu na agakarị n’ije okirikiri. Oge n’etebeghị aka, ndị otù sayensị dị na Max Planck Institute maka Biological Cybernetics nwalere okwu ahụ. Ha kpọgara ndị sonyere gaa nime oke ọhịa ma nye ha ndụmọdụ dị mfe: “Ga ije n’ahịrị nke guzoro kwem.” Enweghi ihe akara ala enwere ike ịhụta. Ha niile ga-adabere naanị na mmetụta nke obi ha gwara ha.

Kedụ otu ịchere ha si wee mee?

Ndị sayensị ahụ kwupụtara, “Ndị mmadụ n’ezie [n’eje] ije okirikiri mgbe ha n’enweghi ezigbote ntụrụmaka maka ebe ha n’eje.”4 Emesịa mgbe ajụrụ ha ajụjụ, ụfọdụ ndị nsonye nnyocha ahụ jiri obisike kwuo na ha agagheghị ụzọ mọlị. Nagbanyeghi obisike ha, ozi si nime GPS gosiri na ha jere ije okirikiri.

Gịnị kpatara oji arara anyị ahụ ije ije n’ahịrị nke guzoro kwem? Ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwu na naanị obere ngahe nke anyị cheere na onweghi isi ga-emepụta ihe dị iche. Ụfọdụ arụtụwo aka n’ezi ụka nke a, na anyị niile nwere otu ụkwụ nke jiri ihe ntakịrị kara nke ọzọ sie ike. “Nke ka nke,” nagbanyeghi, anyị na-agba mbọ ije ije ruo nihu “[nihi] anyị amachaghị nke ọma ebe ihu dị.”5

Nagbanyeghi ihe kpatara ya, ọ bụ agwa mmadụ: ọbụrụ n’enweghi ezigbote akara ala, anyị g’esị n’ụzọ gahee.

Isite n’ụzọ Gahee

Ọ bụna ọdịghị ịtụnanya otu obere ihe ndị ọ dịka ha enweghi isi nwere ike iji bụrụ ihe ndị mepụtara ịdịche nime ndụ anyị?

A matara m nke a site na nhụmihe nkem dịka ọkwọ ụgbọelu. Mgbe ọbụla m bidoro fedawa na ọdụ ụgbọelu, A maaram na ihe ga-esonye nime ọtụtụ ọrụ m nke fọdụrụ bụ ị mezị ụfọdụ ntakịrị ụzọ ka m wee ike duru ụgbọelu ahụ kanyị fedaa n’ala n’ezi nchekwa.

Ị nwere ike nwee ụdị nhụmihe dị otu ahụ mgbe ị na-anya ụgbọala. Ikuku, adịghị mma nke okporoụzọ, adịghị mma nke ụkwụ ụgbọala, ịtụfu uche—mọbụkwanụ omume niile nke ndị ọkwọ ụgbọala ndị ọzọ—ihe niile ndịa nwere ike nupu gị n’ụzọ nke ịchọrọ ịga. Ọ bụrụ na itinyeghi uche nime ihe ndịa, ọ nwere ike mee gị ga enwe ụbọchị ọjọọ.6

Ụgbọala nọ nime mmiri

Nke a metụtara anyị n’ihe nke anụ ahụ.

Ọ metụkwara anyị n’ihe nke ime mmụọ.

Ọtụtụ mgbanwe nime ndụ nke ime mmụọ nke anyi—ma nke ọma ma nke ọjọọ—n’eme ntakịrị ntakịrị, otu nzọụkwụ n’otu oge. Dịka ndị sonyere nime nnyocha nke Max Plank, anyị nwere ike agaghị amata mgbe anyị jehere ụzọ. Anyị nwere ike nweedị ezigbo obisike n’anyị na-aga n’ụzọ guzoro kwem. Mana eziokwu bụ na ma enweghi enyemaka nke akara ala n’edu anyị, n’ezie n’ezie anyị g’esi n’ụzọ pụọ ma jeruo n’ebe anyị amaghị mọlị n’anyị ga-ejeru.

Nke a bụ eziokwu maka onye ọbụla. Nkea bụkwa eziokwu nyere obodo na mba niile ọbụla. Akwụkwọ nsọ nile juputara na ọtụtụ ọmụmatụ dị otu a.

Akwụkwọ nke Ndị Ikpe depụtara na mgbe Joshua wụrụ “enwere ọgbọ ndị ọzọ bilitere … ndị na-amaghị Onyenwe anyị, mọbụkwanụ ọrụ niile nke ọ meworo Izrel na mbụ.”7

Nagbanyeghi aka nile nke eluigwe dị ịtụnanya, nleta niile, nzọpụta niile, ma mmeri niile dị ebube nke ụmụ Izrel hụrụ n’oge ndụ nke Mosis na Joshua, naanị n’otu ọgbọ ndị mmadụ ahapụwo Ụzọ ahụ ma bido jewe ije dịka ọchịchọ obi niile sịrị dị. Ma n’ezie, o teghi aka tupu ha akwụọ ụgwọ ha maka akparama agwa ahụ.

Mgbe ụfọdụ udị ndapụ nke a n’ewe ọtụtụ ọgbọ. Mgbe ụfọdụ ọ n’eme naanị n’afọ ole n’ole mobụ n’ọnwa ole n’ole.8 Mana anyị niile nwere ike ịdabanye n’ihe a. Nagbanyeghi otu anyị siri sie ike mọbụ nhụmihe niile nke anyị nke mmụọ nke mere na mbụ, dịka mmadụ anyị nwere ike i gahe. Nkea abụrụwo otu ọdị bido kemgbe ụbọchị niile nke Adam na Iv ruo ugbua.

Lee nke abị Ozị Ọma

Mana ọnweghi ihe-ọbụla furu-efu. N’adịghị ka ndị ahụ n’ejegharị okirikiri, anyị nwere ezigbote akara ala a na-ahụ anya nke anyị were ike iji lee njem anyị ule.

Ma gịnị bụ akara ala ndị a?

N’ezie ha gụnyere ekpere ụbọchị niile, ma na-atule n’uche akwụkwọ nsọ niile ma jiri ngwa ọrụ nsọ dịka Bịanụ, Soro Mrụọ ọrụ. Ụbọchị ọbụla, anyị ga-abịakwute ocheze nke Chineke n’obi umeala na obiọcha. Anyị ga-atule omume anyị niile ma tulegharịa oge niile ahụ nke ụbọchị anyị—na-elebara anya maka otu uche na ọchịchọ obi anyị siri daba na nke Ya. Ọ bụrụ n’anyị agahewo, anyị arịọ Chineke ka eweghachi anyị azụ ma anyị ekpebie obi ị mee ihe ọma karịa.

Onye nzọpụta ka ọ n’edu atụrụ Ya

Oge ịme ntule nke obi bụ ohere ị nwogharị. Ọ bụ ọmarịcha ohere ntulegharị ebe anyị ga-ejekọrịta ije anyị na Onyenwe anyị ma nata nkuzi, mụta ihe ma nata nsacha site n’okwu nke Nna Eluigwe nke edere ede Mmụọ kpughere. Ọ bụ oge dị nsọ mgbe anyị ga-echeta ọgbụgbandụ anyị dị nsọ isoro Kraịst dị nwayọọ, oge anyị ga-etule ọganihu anyị ma dobe onwe anyị n’ụzọ akara ala niile dị nsọ nke Chineke rọpụtara ụmụ Ya.

Were ya dịka ihe mweghachi gị kwa ụbọchị. N’oge njem anyị dịka ndị njem n’ụzọ nke ebube, anyị maara otu osi dịrị mfe ị dapụ. Mana dịka otu ahụ ntakịrị ngahe nwere ike iji dọpụta anyị n’Ụzọ nke Onye nzọpụta, otu ahụkwa ka ntakịrị mmezi ndị dị mfe nwekwara ike iji kpọghachi anyị azụ. Mgbe ọchịchịrị rịbatara nime ndụ anyị, dịka otu o si eme, Mweghachite anyị kwa ụbọchị n’emepe obi anyị nye ihè niile nke eluigwe nke na-amuke mkpụrụ obi anyị, chụpụ onyinyo ma obi abụọ niile.

Ntakịrị Rudder, Nnukwu Ụgbọmmiri

Ọ bụrụ n’anyị chọọ ya, n’ezie “Chineke ga-enye [anyị] ọmụma-ihe site na Mmụọ Nso ya, e, site na onyinye ahụ dị ịtụnanya nke Mmụọ Nsọ.”9 Dịka otu esi ekwu ya mgbe niile, Ọ ga-akụziri anyị Ụzọ ahụ ma nyere anyị aka soro ya.

Nke a, n’ezie, n’ewe mgbalị akwụsịghị akwụsị n’aka anyị. Anyị agaghị enwe afọ ojuju site na nhụmihe mmụọ niile nke mere na mbụ. ihe anyị chọrọ bụ nke n’asọbata mgbe na mgbe.

Anyị agaghị adabere n’elu ịgba ama ndị ọzọ ruo ebighi ebi. Anyị ga-ewulite nke anyị.

Anyị chọsịrị ike ihè nke eluigwe n’abịa kwa ụbọchị.

Anyị chọsịrị ike “oge niile nke nnwogharị.”10 Oge nke mnweghachi azụ nke onwe.

“Mmiri niile na asọ-asọ” enweghi ike “ịnọ n’adịghị ọcha.” ruo ogologo oge11 Ọ bụrụ na-achọọ ịdebe uche na omume anyị niile ụcha, anyị ga-aga n’ihu n’asọ asọ!

N’ezie, Mnweghachi azụ nke oziọma ahụ ma Nzukọ nsọ ahụ abụghị ihe meworo naanị otu ugboro ma kwụsị. Ọ bụ ihe usoro na-aga nihu—otu ụbọchị n’otu oge, otu obi n’otu oge.

Dịka ụbọchị anyị niile n’aga, otu ahụ ka ndụ anyị si aga. Otu onye odee kwuru ya n’ụzọ dị otua: “Otu ụbọchị dịka ogologo niile nke ndụ. Ị n’ebido site nịme otu ihe, mana kwụsị nịme ihe ọzọ, ikpebie ije otu ozi, mana iruteghi n’ebe ahụ. … Na njedebe ndụ gị, ịdị adị gị niile nwekwara otu ụdị ejirimara nsogbu ahụ kwa. Ndụ gị niile nwekwara otu ụdị ejirimara ahụ dịkwa ka nke otu ụbọchị.”12

Ị chọrọ ị gbanwe ụdị ejirimara nke ndụ gị?

Gbanwe ụdị ejirimara nke ụbọchị gị.

Ị chọrọ ị gbanwe ụdị nke ụbọchị gị?

Gbanwe n’awa nke a.

Gbanwe ihe ị na-eche, mmetụta gị, ma mee ya ugbu ugbu a.

Ntakịrị rudder, nnukwu ụgbọmmiri.13

Obere okwute nwere ike ị bụrụ nnukwu ụlọ.

Obere mkpụrụ osisi nwere ike ị bụrụ sequoia dị ezigbo ogologo.

Nkeji na awa niile nke ejiri rụọ ọrụ nke ọma bụ okwute niile ndị ahụ ejiri wuo ndụ ebiri nke ọma. Ha nwere ike ikpake ịdị mma, bulie anyị site na ndopụ n’agha nke adịghị ike, ma kpọghachi anyị elu ruo n’ụzọ mgbapụta nke mgbaghara na ido nsọ.

Chineke nke ihe ndị ebidoro Ọhụrụ

Esokwara m gị n’ebuli obi m elu n’ekele nihi onyiinye pụrụ iche nke ohere ohụrụ, ndụ ọhụhụ, olileanya ọhụrụ.

Anyị n’eweli olu anyị n’ito Chineke anyị onye jupụtara n’ihe niile ma dị mgbaghara. N’ezie Ọ bụ Chineke nke ihe ndị ebidoro ọhụrụ. Ọrụ njedebe Ya niile nke dị ebube bụ ịnyere anyị, ụmụ Ya, aka ịnwete mmeri nime njem anyị maka ndụ anwụghị anwụ na nke ebighi ebi.14

Anyị nwere ike bụrụ ndị ekere eke ọhụrụ nime Kraịst, nihi Chineke ekwewo nkwa na “Ugbọrọ ole ọbụla ndị m chegharịrị ka m ga-agbaghara ha njehie ha nile megide m”15 ma “agaghị echetakwa ha ọzọ.”16

Ụmunne nwoke na ndi nwanyi, ndi enyi, anyi niile n’ejehie mgbe ụfọdụ.

Mana anyị nwere ike ịbịaghachi azụ n’ụzọ. Anyị nwere ike gawa njem anyị site n’ọchịchịrị ma nwale niile nke ndụ nke a ma chọta ụzọ anyị laghachi niihu Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnanya mọbụrụ n’anyị chọọ ma nabata akara ala nke ime mmụọ nke Ọ rọpụtara, makuo mkpughe nke onwe, ma gbalịsie ike ịnwete mweghachi azụ kwa ụbọchị Ọ bụ otu a k’anyị si abụ ezigbo ndị n’eso Onye nzọpụta anyị hụrụ n’anya Jịzọs Kraịst.

Dịka anyị n’eme nke a, Chineke ga-arara anyị ihu ọchị. “Onyenwe anyị … ga-agọzi gị n’elu ala ahụ nke Onyenwe Chineke gị na-enye gị. Onyenwe anyị ga-eme gị ịbụ ndị nsọ nye onwe ya.”17

N’anyị ga-achọ Mweghachite kwa ụbọchị ma gaa niihu gbalịa ije n’Ụzọ nke Jịzọs Kraịst bụ ekpere m. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Jizọs kuziri na, “A bụ M ụzọ, ezi-okwu na ndụ” (Jọn 14:6). Baịbụlụ Ọmụmụ nke NIV First-Century nwere nkọwa a nime ya: “ihe oyiyi nke otu ọkpọrọ mọbụ ụzọ nime Baịbụlụ ndị Hiburu mgbe ụfọdụ nochiri anya idobe iwu nsọ na nkuzi niile nke Chineke [lee Abụọma 1:1; 16:11; 86:11]. Nke abụ ihe atụ ama ama mgbe ochie maka isonye nime nkwenye ụfọdụ, nkuzi niile mọbụ omume niile. Ndị otù Dead Sea Scrolls kpọrọ onwe ha ndị neso ‘ụzọ ahụ,’ nke ihe ha nakọwa bụna ha bụ ndị neso nkọwa nke onwe ha banyere okporo ahụ natọ Chineke ụtọ. Pọl na ndị Kraịst nke mbụ ahụ kpọkwara onwe ha ‘[ndị] neso Ụzọ ahụ’ [lee Ọlụ 24:14]” (nime “Ihe Baịbụlụ kwuru maka Ụzọ ahụ, Eziokwu ahụ, ma Ndụ ahụ,” Bible Gateway, biblegateway.com/topics/the-way-the-truth-and-the-life).

    Nafọ 1873, otu akwụkwọ mgbe ochie akpọrọ Didache ka achọpụtara nime otu ọba akwụkwọ nke onye patriarch nke Jerusalem na Constantinople. Ọtụtụ ndị ọgụụ akwụkwọ kwere na edere ya ma jiri y rụọ ọrụ na ngwụcha senchuri nke mbụ (AD 80–100). Didache ahụ bidoro nokwu ndịa: “Ụzọ abụọ ka enwere, nke mbụ bụ nke ndụ ma nke ọzọ nke ọnwụ, mana enwere nnukwu ihe dị iche netiti ụzọ abụọ ahụ. Ụzọ nke ndụ ahụ, mgbe ahụ, bụ nke a: Nke mbụ, ị ga-ahụ Chineke mere gị nanya; nke abụọ, onye agbatobi gị dịka onwe gị” (Nkụzi nke Ndị Ozi Iri na bụọ, atụgharịrị naka. Roswell D. Hitchcock na Francis Brown [1884], 3).

    Ebe ndị ọzọ, dịka The Expositor’s Bible Commentary, kwuru na “noge mbido nzukọ nsọ, ndị ahụ nabatara na Jizọs bụ mezaya ma were ya dịka Onyenwe ha kpọrọ onwe ndị ‘ụzọ’ [lee Ọlụ niile19:9, 23; 22:4; 24:14, 22]” (ed. Frank E. Gaebelein na ndị ọzọ [1981], 9:370).

  2. Lee Mosaia 2:17.

  3. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 88:63.

  4. “Ịje ije na-okirikiri,” Aug. 20, 2009, Max-Planck-Gesellschaft, mpg.de.

  5. “Ije ije na-okirikiri,” mpg.de. Ihe oyiyi nke a gosiri ije GPS nke mmadụ anọ sonyere nime nnyocha ahụ. Mmadụ abụọ nime ha jere ije nụbọchị nụbọchị igwe oji nọ nelu. Otu nime ha (SM) bidoro jewe ije mgbe igwe oji niile kpuchiri anyanwụ, mana mgbe nkeji 15 gasịrị, igwe oji niile ahụ pụrụ, ma ndị ahụ sonyere na nnyocha ahụ nwere ike hụtụ anyanwụ anya. Ị hụtara na, notu ntabianya ahụ pụtara ihè, onye ije ahụ nwetere mmeri nije ije nogologo ahịrị.

  6. Maka otu ọmụmatụ dị ọghọm nke n’egosi otu njehie ụzọ ntakọrọ jiri mee ka otu ụgbọelu bụ ndị mmadụ jiri fegbuo na Mount Erebus in Antarctica, wee gbuo mmadụ ruru 257, lee Dieter F. Uchtdorf, “A Matter of a Few Degrees,” Liahona, May 2008, 57–60.

  7. Ndị Ikpe 2:10.

  8. Mgbe Kraịst jesịrị leta ndị America mgbe ochie, nezie ndị si na mmehie ha chegharịa, wee mee baptizim, ma nata Mmụọ Nsọ ahụ. Ebe ha bụbụụrụ ndị oke ndọrọ ndọrọ ma nwe mpako “ma e nweghị ndọrọ-ndọrọ ọbụla na ịrụ-ụka nile nʼetiti ha, ma onye ọbụla na-emeso otu ziri-ezi otu onye na ibe ya.” (4 Nefi 1:2). Oge eziomume nkea nọrọ ruo senchuri abụọ tupu nganga ebido mewe ka ndị mmadụ siwe nỤzọ ahụ pụọ. Otuozuiladị, njehie nke ime mmụọ nwere ike ime ọsịsọ karịa otu ahụ. Dịka ihe ịma atụ, afọ iri ole nole tupu nke a, nafọ 50 nke ọchịchị nke ndị-ikpe nime Akwụkwọ nke Mọmọn, e nwere “udo na an̄ụrị esepụghị-aka” netiti ndị mmadụ ahụ nile. Mana nihi mpako nke batara nime obi niile nke ndị otù Nzukọ nsọ ahụ, mgbe naanị afọ anọ gafere “e nwere ọtụtụ nghọtahie na nzukọ-nsọ ahụ, ma e nwekwara ndọrọ ndọrọ nʼetiti ndị ahụ, nke mere na e nwere nnukwu nkwafu-ọbara” (see Helaman 3:32–4:1).

  9. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:26.

  10. Ọlụ 3:19.

  11. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:33.

  12. Michael Crichton, Jurassic Park (2015), 190.

  13. Were nnukwu ụgbọmmiri dịka ihe ịma atụ. Nagbanyeghi na ha buru ezigbo ibu ma ikuku siri ike n’akwọ ha, ọ bụ ntakịrị rudder na-anyagharị ha ebe ọbụla ọkwọ ụgbọ chọrọ ị ga” (James 3:4; New International Version).

  14. Lee Mozis 1:39.

  15. Mozaya 26:30.

  16. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42.

  17. Deuteronomy 28:8–9lee kwa amaokwu ndịa 1–7.