Ọgbakọ Zuru ọha
Nkwado maka Ọbịbịa Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Nkwado maka Ọbịbịa Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst

Karịa kemgbe niile, a tụrụanya n’aka anyị izute ezi okwu ahụ na anyị na-erute nso nso na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst.

Dị ka e dere niime Akwụkwọ nke Mọmọn, afọ isii tupu ọmụmụ nke Jizọs Kraịst, Samuel onye ezi omume nke si na ndị Leman, buuru ndị Nifaị amụma, bụ ndị kachasị bụrụ ndị dapụrụ n’okwukwe oge ahụ,1 banyere ihe iriba ama ndị ga-eso ọmụmụ nke Onye Nzọpụta anyị abịa. Na nke jọgburu onwe ya bụ na ndị Nefi karịrị akarị jụrụ ihe iriba ama ndị ahụ niihi na “ọ dịghị akọ na uche dị na ụdị ihe dị ka otu Kraịst [ga] abịa.”2

Nke ka njọ, dị ka esi dee n’akwụkwọ nsọ, ọtụtụ ndị Juu, n’ụdị dị otu ahụ, enweghị ike anabata na otu nwoke a kpọrọ Jizọs, si na mpaghara Galili a na-amachaghị maka ya, bụrịị Mezaya ahụ a na-atụ anya ya kemgbe.3 Jizọs, onye bịaworo n’ezia imejuputa ọtụtụ amụma nke ndị amụma ndị Hibru buworo, ka a jụrụ ma ọbụla kpọgbuo n’obe niihi na, dị ka onye amụma Jekọb dị n’Akwụkwọ nke Mọmọm siri kuzie, ndị Juu “nwere olileanya karịa ihe e chere.” Ya mere, Jekọb gbara ama sị na “Chineke ewepụwo ịdị mfe nghọta ya site n’ebe ha nọ, ma nyefee n’aka ha ọtụtụ ihe ndị ha na-enweghị ike ịghọta, n’ihi na ha chọrọ ya. Ma n’ihi na ha chọrọ ya Chineke emewo ya, ka ha wee kpọbie ụkwụ.”4

Dị ka o nwere ike yie ka ihe anụbeghị mbụ, enweghị nkuzi, enweghị ọrụ ebube, ma enweghị mpụtara ihe ọbụla nke mmụọ ozi nke eluigwe, dị ka nke Laman na Lemuel hụtara,5 dị ka ihe nwere ike nkwagide ime ka ụfọdụ ndị mmadụ gbanwee ụzọ ndụ ha, ka ha si ahụ ihe, ma ọ bụ kwere na ihe ahụ bụ ezi okwu. Nke a na-abụkarị otu ọ na-adị mgbe nkuzi niile ma ọ bụ ọrụ ebube niile na-adabaghị niihe mmadụ na-ebuwo ụzọ chee na ọ ga-adị otu ahụ, nchekube niile, ma ọ bụ echiche ndị ebunobi.

Biko tulee nwa oge nta ndiiche dị na ụzọ akwụkwọ nsọ abụọ a na-esote, nke mbụ si n’aka Pọl Onye ozi na-ekwu maka ụbọchị ikpeazụ ndị a, na-akọwa ụzọ niile nke mmadụ, ma nke abụọ si n’aka Alma onye amụma na-egosi otu Chineke na-esi arụ ọrụ Ya n’etiti ụmụ mmadụ. Nke mbụ si n’aka Pọl:

“Mara kwanụ nke a, na “n’ụbọchị ikpeazụ ndị a oke ihe isi ike ga-abịa.

“Niihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha naanya, ndị hụrụ ego naanya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupuru ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị enwe obi ekele, ndị na-anaghị edebe onwe ha nsọ,

“Ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-anaghị achọ inwe nkwekọrịta ọbụla, ndị nkwutọ, ndị na-anaghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-anaghị ahụ ezi ihe naanya,

“Ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ naanya karịa ịbụ ndị hụrụ Chineke naanya; …

“Ndị na-amụ ihe mgbe niile, ma ha enweghị ike inweta ọmụmaihe nke ezi okwu.”6

“Ma ugbua site n’aka Alma, na-ekwu nke bụ isi ụkpụrụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst: “Ugbu a unu nwere ike iche na nke a bụ nzuzu n’ime m; mana lee asị m unu, na site n’ihe ndị dị ntakịrị ma dị mfe ka nnukwu ihe si abịa na mmezu; ma ụzọ dị nta ọtụtụ mgbe na-agbagwọjụ ndị amamiihe anya.”7

Anyị bi n’ime ụwa ọhụụ nke juputara n’oke ọmụmaihe na oke ike ọgụ. Ka osila dị, ihe ndị a ọtụtụ mgbe na-adị ka ụzọ esi ekpuchi ntọala na-akwụsighi ike bụ n’elu nke ewukwasịrị ha. Ya mere, ha anaghi eduba na nke bụ ezi okwu ma gaaniihu n’ebe Chineke nọ na ike nke ịnata mkpughe, nweta ọmụmaihe nke ime mmụọ, ma wulite okwukwe niime Jizọs Kraịst na-eduba na nzọpụta.8

Echetaara anyị n’ụzọ dị omimi okwu niile nke Onyenwe anyị gwara Tọmọs na Ndị ozi ndị ọzọ na mgbede tupu ụbọchi nke aja mgbaghara mmehie Ya: “Jizọs sịrị ya, A bụ m ụzọ, ezi okwu, na ndụ, ọ dighị onye ọbụla na-abịakwute Nna, kama site na mụ.”9

Maka ndị ahụ nwere anya ịhụ ụzọ, ndị nwere ntị ịnụ ihe, na ndị nwere obi inwe mmetụta, karịa ka enwetụrụ na mbụ a chọrọ n’aka anyị izute ezi okwu ahụ na anyị na-aganiihu erute nso na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst. Ezi okwu, oke ihe isi ike n’ọkwa na-eche ndị ga-anọ n’ụwa n’oge nlọghachi Ya, mana banyere nke a, ndị nwere okwukwe ekwesighị ịtụ egwu.

Ugbu a ana m eńomi oge nta site na Isi okwu niile nke Ozi ọma nke Nzukọ nsọ dị n’okpuru isi okwu ahụ “Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst”:

“Mgbe Onye Nzọpụta ga-abịa ọzọ, Ọ ga-abịa niike na ebube iwere ụwa dị ka alaeze Ya. Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ Ya ga-egosi mmalite nke Otu Puku Afọ.

“Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ ahụ ga-abụ oge ịtụ egwu, iru uju maka ndị ajọọ omume, mana ọ ga-abụ ụbọchị udo maka ndị ezi omume. Onyenwe anyị amaala ọkwa:

“‘Ndị ahụ maara ihe ma na-anabatawokwa ezi okwu ahụ, ma werewokwa Mmụọ Nsọ dịka onye ndu ha, ma eduhieghi kwa ha—n’ezie a sị m unu, agaghị egbutu ha ma tụba ha n’ime ọkụ mana ha ga-anọ n’ụbọchị ahụ.

“‘Ma a ga-enyefe ha ụwa dịka ihe nketa; ma ha ga-amụba ma gbasie ike, ma ụmụ ha ga-etọpụta n’enweghi mmehie ruo na nzọpụta.

“‘N’ihi na Onyenwe anyị ga-anọ n’etiti ha, ma ebube ya ga-adakwasị ha, ma ọ ga-abụ eze ha na onye na-enye ha iwu’ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:57–59).”10

Na nkwado anyị maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst, ana m eweta ihe e dere ede, na-enye nkasi obi dị mkpa, maka ndị nwere okwukwe nke esi n’aka Emọs onye amụma Agba Ochie were: “Na-ezia Onyenwe anyị Chineke agaghị eme ihe ọbụla, tutu ya ekpughee ihe nzuzo ya nye ndị odibo ya ndị amụma.”11

Na mmụọ nke a, onye amụma nke Onyenwe anyị dị ndụ taa n’elu ụwa, Onyeisi Russell M. Nelson, enyewo anyị ndụmọdụ na-akpake mmụọ na nsonso a: “Ozi ọma nke Jizọs Kraịst bụ ozi ọma nke nchegharị. Niihi Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, ozi ọma Ya na-eweta ọkpụkpọ okù ịdị na-agbanwe, na-eto eto, ma na-adị ụcha karịa. Ọ bụ ozi ọma nke olileanya, ozi ọma nke ọgwụgwọ ọrịa, na nke ọganiihu. Ya bụ, ozi ọma ahụ bụ ozi nke ọn̄ụ! Mmụọ anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ n’obere mbọ ọbụla anyị mere na-ịganiihu.”12

Ana m agba ama na-eleghị anya na-azụ ma na-ekwu ezi okwu banyere ịdị adị nke Chineke na ọrụ ebube niile nke ụbọchị ndụ niile nke mmadụ a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị si n’ogo dị elu ma nke dị ala nke ndụ. Ezi okwu, ọ na-ara ahụ ikwu okwu banyere ọtụtụ nhụmiihe dị nsọ, na mpaghara niihi aka Chineke dị na mbido ha na ikekwe ime akaja na-adapụta site n’aka ụfọdụ ndị na-amachaghị nke ọma.

Niihe banyere nke a, onye amụma ikpeazụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Moroni, na-echetara anyị:

“Ma ọzọ ana m agwa unu okwu unu bụ ndị na-agọnarị mkpughe niile nke Chineke, ma sị na-ewezugawo ha, na enweghị mkpughe ọbụla dị, ma ọbụ amụma niile, ma ọbụ onyinye niile, ma ọbụ ọgwụgwọ, ma ọbụ ịsụ nʼire nʼire, na ịsụgharị asụsụ niile;

“Lee asị m unu, onye nke na-agọnarị ihe ndị a amaghị ozi ọma nke Kraịst; ee, ọ gụbeghị akwụkwọ nsọ niile; ọbụrụ otu ahụ, ọ ghọtaghị ha.

“Ma ọ bụ na anyị anaghị agụta na Chineke bụ otu ihe ahụ ụnyahụ, taa, na ruo mgbe niile, ma nʼime ya ọ dịghị mgbanwe dị ọbụghị ma enwere onyinyo nke ịgbanwe agbanwe?”13

Emechiri m okwu m site n’iji ọkwa e buru na-amụma na-akpake mmụọ sitere n’aka Onye Amụma Josef Smit, e nyere na ngwụcha nke ije ozi ya dị ka ọ na-atụ anya Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst: “Ọ bụ na anyị agaghị aganiihu n’oke ụzọ dị otu a? Gaa n’ihu ọbụghị ịla azụ. Nwee nụ mgbam ume ụmụnne ndị nwoke [ma, ka m gbakwunye, ụmụnne ndị nwanyị]; gaa n’ihu, n’ihu ruo na mmeri! Ka mkpụrụ obi unu n̄ụrịa, ma nwebiga obi ụtọ oke.”14 Nke m na-agbakwunye ama m n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta