Na Ike nke Chineke nime Nnukwu Otuto
Ịrube isi nye ọgbụgba-ndụ niile na ewetere anyị ezi-omume na ike nke Chineke n’ime nnukwu otuto.
A na m ekpe ekpere na Mmụọ Nsọ ga akuziri ma bulie anyị nile dịka anyị na atulekọta ọnụ ọrụ magburu onwe ya nke nzọpụta na mbuli elu nime ọgbọ ozuzu oge akara aka.
Ọbịbia Mbụ nke Moronaị nye Josef Smit
Ihe dị ka afọ atọ Ọhụ Mbụ ahụ gachara,na abalị nke Septemba 21, 1823, nwanta Josef Smit nọ na ekpere ịnata nsachapụ nke mmehie ya nile ma ịmata ọnọdụ ya na ebe ọkwụniru Chineke.1 Oyiyi mmadụ pụtara n’akụkụ akwa ya, kpọọ nwata nwoke ahụ aha ya, ma kwuo na “ọ bụ onye ozi e zitere site n’ihu nke Chineke … Ma na aha ya bụụrụ Moroni.” Ọ kọwara “na Chineke nwere ọrụ maka [Josef] ịrụ” 2 ma kuziere ya gbasara ọbịbịa nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Dị ịrịba ama, Akwụkwọ nke Mọmọn Ahụ bụụrụ otu nime isiokwu mbụ nke ekwuru nime ozi nke Moronaị.
Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe aka ebe ọzọ nke JIzọs Kraịst ma bụrụ ngwa-ọrụ kachasị nke mgbanwe nime ụbọchị ikpeazụ nile. Ebum n’obi anyị na ịgbasa oziọma ahụ bụ ịkpọ unu biakwute Kraist,3 nata ngọzi nile nke oziọma ahụ eweghachitere, ma nọgide ruo ọgwụgwụ site na okwukwe nime Onye nzọpụta ahụ.4 Ịnyere ndị mmadụ aka inweta nnukwu mgbanwe nke obi5 ma nyakọta onwe ha nye Onyenwe anyị site na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ na emume nsọ nile bụ isi ebum n’uche nke mgbasa oziọma ahụ.
Ngosi Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ nke Moronaị gosiri Josef Smit bidoro ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu maka ndị mmadụ nọ na akụkụ a nke akwa-mgbochi nime ọgbọ ozuzu oge akara aka.
Ị ga n’ihu na nkuzi nile o nyere Josef, Moronaị agụpụta site n’akwụkwọ nke Malakaị n’ime Agba Ochie, nke nwere ọdịiche obere n’asụsụ nke edere n’ime Ụdị nke Eze Jemis:
“Lee, a ga m ekpughe nye unu Ọkwa Nchụ-aja ahụ, site n’aka nke Elaịja onye amụma, tutu ọbịbịa nke nnukwu ụbọchị ahụ dị egwu nke Onyenwe anyị.
“…Ma ọ ga-akụnye n’ime obi ndị bụ ụmụ nkwa niile e kwere ndị nna ha, ma obi niile ndị bụ ụmụ ga-atụgharịkwute ndị bụ nna ha. Asị ma-ọbụghị otu ahụ, ụwa nile ka a ga-ala n’iyi kpam kpam n’ọbịbịa ya.”6
E bu m n’uche anyị na ịrụ tempụl nile bụ ka enwee ebe nile dị nsọ enwere ike ime ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ na emume nsọ nile dị mkpa maka nzọpụta na mbuli elu nke ndị ezinaụlọ, maka ndị dị ndụ na ndị nwụrụ-anwụ. Nkuzi nke Moronaị nye Josef Smit gbasara ọrụ dị mkpa nke Elijah na ikike ọkwa nchụ-aja mebara ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu maka ndị mmadụ nọ na akụkụ a nke akwa-mgbochi ma o bidoro nime ọgbọ ozuzu anyị ọrụ maka ndị nwụrụ-anwụ na akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi
Na nchikọta, nkuzi nile nke Moronaị nime Septemba nke 1823 gbasara Akwụkwọ nke Mọmọn na ọbibia nke Elijah kepụtara ozizi ntọala maka ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu na akụkụ abụọ nke akwa mgbochi.
Nkuzi nile nke Onye amụma Josef Smit
Ihe mmụta nile Josef Smit mụtara n’aka Moronaị metụtara akụkụ ọbụla nke ịgbasa oziọma ya. Na ịma-atụ, na ọgbakọ di nro enwere nime Tempụl Kirtland na Eprel 6, 1837, Onye amụma ahụ mara ọkwa, “ Ka ekwuchara ihe nile, ihe kachasị ma bụrụ ọrụ kachasị mkpa bụ ịgbasa oziọma ahụ.”7
Ka afọ asaa gachara, na Eprel 7, 1844, Josef Smit kwuru okwuchukwu a mara taa dịka King Follett Discourse. O kwupụtara nime okwu ahụ, “Ọrụ kachasị mkpa na ụwa nke Chineke nyere anyị bụ ịchọpụta ndị anyị nwụrụ anwụ.”8
Kama olee ka ịgbasa oziọma na ịchọpụta ndị anyị nwụrụ anwụ ji bụrụ ọrụ na oke na ọrụ kachasị Chineke nyere anyị? E kwere m na Onye-amụma Joseph Smith na akọwa nime mkwupụta abụọ ahụ eziokwu dị na ntọala ahụ, na ọgbụgba-ndụ nile abanyere site na emume nsọ ọkwa nchụ-aja nile dị ire, nwere ike ijikọta anyị na Jizọs Kraịst ma bụrụ ihe dị mkpa nke ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu na akụkụ abụọ nke akwa mgbochi.
Ọrụ mgbasa oziọma, tempụl na agụgụala ezinaụlọ na enye aka ma bụrụ akụkụ nile nke otu ọrụ dị ukwuu na elegide anya na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ na emume nsọ nile n’eme ka anyị nata ike nke chinke nime ndụ anyị nile ma emesịa, laghachi na ihu nke Nna nke Eluigwe. Ya mere, okwu abụọ sitere na Onye amụma dịịrị na mbụ ka ọdabaghị, n’ezi ya, o gosipụtara isiokwu nke nnukwu ọrụ ụbọchị ikpeazụ a.
Njikọta anyị na Onye nzọpụta site na Ọgbụgba-ndụ na Emume nsọ nile
Onye nzọpụta kwuru:
“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.
“N’ihi na ihe nkekọta nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”9
Anyị na ewere nkekọta nke Onye nzọpụta dịka anyị na amụta gbasara itozu oke nata, ma kwanyere ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ na emume nsọ nile ugwu. Ekesịrị anyị na Onye nzọpụa ike dịka anyị n’eji okwukwe echeta ma mee ịhe nile anyị nwere ike ibi ndụ dabara na oke n’ọrụ nile anyị nabatara. Ma njikọta ahụ anyị na Ya bụ isi iyi nke ike mmụọ nime oge ọbụla nke ndụ anyị nile.
Ndị ọgbụgbandụ nke Onyenwe anyị
A na m akpọ unu itulee ngọzi nile ekwere na nkwa nye ndị na eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na edobe ọgbụgba-ndụ ha. Na ịma-atụ, Nifaị “hụrụ nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ nke Chineke [nime ụbọchị nile ikpeazụ], ma ọnụ-ọgụgụ niile ya dị ole na ole, … ndị nsọ nke Chineke, nọ kwa n’elu iru nile nke ụwa; ma ọnọdụ nile ha nwere … dị ntakịrị.”10
Ọzọ ọ “ hụrụ ike nke Nwa-atụrụ nke Chineke, na ọ dakwasịrị n’elu ndị nsọ nke nzukọ-nsọ nke Nwa-atụrụ, ma n’elu ndị ọgbụgba-ndụ nke Onyenweanyị, … ma ngwa-ọgụ ha ji bụ ezi-omume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto.”11
Ahịrịokwu ahụ “ ma ngwa-ọgụ ha ji bụ ezi-omume na ike nke Chineke n’ime nnukwu otuto” abụghị uche dị mma ma-ọbụ ịma-atụ nke asụsụ akwụkwọ-nsọ dị mma. Kama, ngọzi nile ndịa bụ ihe ana ahụ anya nime ndụ ndị nile na eso ụzọ Onyenwe anyị nke ụbọchị ikpeazụ.
Ọrụ m dịka onye otú nke Irii na Abụọ na ebugharị m ụwa nile. Ma enwetawo ngọzi ịhụ ma ịmụta ihe n’aka ọtụtụ unu. A na m agba-ama na ndị ọgbụgba-ndụ nke Onyenwe anyị taa neziya ji nkwa ọgụ eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otito. A hụla m ikwesịntụkwasị obi, mgbam ume, echiche, ntachi-obi, na ọńụ gafere mmadụ—nke naanị Chineke nwere ike nye.
A hụrụ m eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto, anatara site na ịdobe ọgbụgba-ndụ na emume-nsọ niile, nime ndụ nke onye otú nta onye ahụ ya kpọnwụrụ na ịhe mberede ụgbọ-ala. Ka ọtụtụ ọnwa gachara ebe ọ na agbake ma na amụta ụzọ ọhụrụ ịgagharị, A hụrụ m nwa-amadi a ma kwuoru ya okwu. Mgbe anyị na ekwurịta okwu a jụrụ m, “Gini ka nhụmihe nke a kuziri gị?” Ihe mbụ ọsara m bụ, “E nweghị m obi ọjọ. E nweghị m iwe. Ma ịhe nile ga Adị mma.”
A hụrụ m eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto, anatara site na ịdobe ọgbụgba-ndụ na emume-nsọ niile, nime ndụ nke ndị otú emere baptizim ọhụrụ nke Nzukọ-nsọ. Ndị a chegharịrị echegharị chọrọ ịmụta ịhe ma jee ozi, dị njikere kama amaghị ka ha ga eji hapụ agwa ochie nile na omenala siri ike, ma nwee ọńụ ịbụ “ndi amụrụ n’ala na ndị ezinaụlọ nke Chineke.”12
A hụrụ m eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto, anatara site na ịdobe ọgbụgba-ndụ na emume-nsọ niile, nime ndụ nke otu ezinaụlọ na elekọta di mọbụ nwunye na nne na nna dara n’ọrịa g’egbu ha. Ndị a na-eso ụzọ kọwara ọtụtụ oge ezinaụlọ ha chere na ụwa agwụla—ma oge nile ha maara na aka nke Onyenwe anyị nọnyere ha. Ezinaụlọ nke a gosiri ezi obi ekele maka nhụmihe nke ụwa nile nke na enye anyị ohere ito ma dịwa ka Nna anyị nke Eluigwe na Onye mgbapụta anyị, Jizọs Kraịst. Chineke nyere ezinaụlọ a aka ma were Mmụọ Nsọ gozie ha ma mee ka ebe-obibi ha dị nsọ dịka ebe nke mgbaba ka tempụl.
A hụrụ m eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto, anatara site na ịdobe ọgbụgba-ndụ na emume-nsọ niile, nime ndụ nke onye otú Nzukọ-nsọ onye nwere nhụmihe obi mgbu nke alụkwaghịm nke di na nwunye. Ọnọdụ nchekasị nke uche na nke ime mmụọ nke nwanne nwanyị a bawanyere mgbe ọ matara maka mmegbu nke di ya nke metụra imebi iwu nke ọgbụgba-ndụ nile na nkụsa nke alụm di na nwunye ha. Ọ chọrọ ikpe ziri ezi na ịza ajụjụ.
Dịka nwanyị a dị nkwesị ntụkwasị nọ na agba mgba ya na ihe ndị mere ya, ọ mụrụ ma chee echiche gbasara aja mgbaghara mmehie nke Onye nzọpụta karịa mgbe mbụ nime ndụ ya. Ntakịrị ntakịrị, nghọta dị omimi nke mgbapụta nke Kraịst dakwasị na mkpụrụ obi ya—ahụhụ Ọ tara maka mmehie anyị ma kwa mgbu anyị nile, adịghị ike nile, ndakpọ olile-anya nile, na nhụjuanya. Ma onwere nkwalite mmụọ ịjụ onwe ya otu ajụjụ dị omimi: ebe ọbụ na akwụọla ụgwọ maka mmehie nile ndị ahụ, ị ga asị ka akwụọ ụgwọ ahụ ugboro abụọ? Ọ chọpụtara na ụdị atụmanya ahụ ezighi ezi mọbụkwanụ nwee obi ebere.
Nwanyị a chọpụtara na ikegide onwe ya nye Onye nzọpụta site na ọgbụgba-ndụ na emume nsọ nile nwere ike gwọọ ọnya nile nke ajọ omume onye ọzọ butere nihi omume nke ohere nhọrọ ya, ma mee ka o nweta ike ịgbaghara ma nata udo, ebere, na ịhụnanya.
Nkwa na Ịgba-ama.
Nkwa na ngọzi nile nke ọgbụgba-ndụ dị ire naanị nihi Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ọ na asị anyị lekwasị Ya anya,13 bịakwute Ya,14 mụta ịhe gbasara Ya,15 ma jikọ onwe anyị nye Ya16 site na ọgbụgba-ndụ na emume nsọ nile nke oziọma Ya eweghachitere. A na m agba-ama ma na-ekwe nkwa na ịkwanyere ọgbụgba-ndụ nile ugwu na enye anyị eziomume na ike nke Chineke nime nnukwu otuto. Ma a na m agba aka-ebe na Onyewe anyị Jizọs Kraịst dị ndụ bụ Onye Nzọpụta anyị. Nke eziokwu ndị a ka m ji ọńụ agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.