Ọgbakọ Zuru ọha
Onye Agọziri agọzi nke Onyenwe anyị n’Ụbọchị M Niile
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Onye Agọziri agọzi nke Onyenwe anyị n’Ụbọchị M Niile

O lee otu anyị ji emeso nsogbu anyị nile? Anyị ọ n’enwe mmetụta obi ekele site n’anyị legidere anya na ngọzi anyị nile karịa nsogbu anyị nile?

Ọrịa mkpochapụ COVID-19 bụ otu nime ọtụtụ mnwale na akamgba nke ụmụ Chineke hụrụla na oge nile agụgụala nke ụwa. Na mbido nke afọ a, ezinaụlọ m hụrụ n’anya na M biri ndụ nhụsianya ọtụtụ ụbọchị. Ọrịa mkpochapụ ahụ na ihe ndị ọzọ wetara ọnwụ na mgbu nye ezinaụlọ anyị site na ọnwụ nke ụfọdụ ndị anyị hụrụ n’anya. Agbanyeghị nlekọta ahụisike, ibuọnụ, na ekpere, nime izuụka ise nwanne m nwoke Charly, nwanne m nwanyị Susy, na ọgọ m nwoke Jimmy nwụrụ.

Mgbe ụfọdụ a na m eche ihe mere Onye nzọpụta ahụ jiri bee akwa mgbe ọ hụrụ obi jọrọ Mary njọ site na ọnwụ nke nwanne ya nwoke, Lazarus, agbanyeghị na Ọ mara na O nwere ike ịkpọlite Lazarus ma mgbe adịghị anya Ọ ga eji ike a zọpụta enyi Ya na ọnwụ.1 Anya juru M site na ọmịiko na obi ebere nke Onye nzọpụta maka Mary; Ọ ghọtara mgbu ahụ n’enweghị nkọwa nke metụtara Mary mgbe nwanne ya nwoke, Lazarus nwụrụ.

Anyị na enwe otu ụdị mgbu ahụ mgbe ọnwụ kewara anyị na ndị anyị hụrụ n’anya. Onye nzọpụta nwere ọmịiko zuru oke ebe anyị nọ. Ọ naghị ata anyị ụta maka echiche anyị nke pere mpe na maka etozughị na echiche nke njem ebighi ebi anyị. Kama, O nwere ọmịiko maka obi ọjọọ na ịta ahụhụ anyị.

Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, chọrọ ka anyị nwee ọńụ.2 Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Ọńụ ahụ anyị n’enwe nwere ntakịrị mmetụta nye ọnọdụ niile nke ndụ anyị kama ọ metụtara ihe niile nye olileanya nke ndụ anyị niile. Mgbe olileanya nke ndụ anyị bụ n’elu atụmatụ nke nzọpụta nke Chineke, … anyị nwere ike nwee ọńụ agbanyeghị ihe ọbụla n’eme—ma ọbụ anaghị eme—n’ime ndụ anyị.”3

Mgbe M bụ onye mgbasa oziọma nta, E chetara m mgbe otu onye mgbasa oziọma na amasị m natara ozi na agbawa obi. Nne ya na nwanne ya nwoke nta nwụrụ na ihe ọghọm. Onyeisi mgbasa oziọma nyere okenye a ohere ịla ụlọ maka olili ha. Ka osi dị, ka ya na nna ya kwuchara na ekwe ntị, onye mgbasa oziọma a kpebiri ịnọrọ mecha ọrụ mgbasa oziọma ya.

Foto, oyiyi
Ileta onye mgbasa oziọma nime ụlọ-ọgwụ

Na oge adịghị anya, mgbe anyị na eje ozi n’ime otu zone ahụ, onye-nsiso m na m natara okù atụghị anya ya; ụfọdụ ndị oshi ezuwo igwe nke otu onye mgbasa oziọma ahụ ma were mma merụọ ya ahụ. Ya na onye-nsiso ya gara ije ruo ụlọ ọgwụ dị nso, ebe onye-nsiso m na m gakwuru ha. Ka anyị nọ n’ụzọ ụlọ ọgwụ, enwere m mwute maka onye mgbasa oziọma a. E chere m na obi ga-ada ya mba ma na nke ga emerịrị, mgbe ihe ndị ọjọọ ndịa mechara ya, ọ ga achọ ịla ụlọ.

Ka osi dị, mgbe anyị rutere na ụlọ ọgwụ, a hụrụ m onye mgbasa oziọma a ka o dinara na akwa ya, na-eche ka awaa ya ahụ—ma ọ na awa eze ọchị. E cherem, “Olee otu o si awa eze ọchị na oge dị otu a?” Mgbe ọ na-agbake n’ime ụlọ-ọgwụ, o jiri obi ụtọ nye ndị dọkinta, nọọsụ, na ndị ọrịa ọzọ kọpị niile nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Nagbanyeghi mnwale ndịa niile, ọ chọghị kwa ịla ụlọ. Kama, o jere ozi n’okwukwe, ume, na obi ụtọ, ruo ụbọchị ikpeazụ nke mgbasa oziọma ya.

Na mbido nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Nifaị kwupụtara, “Ebe ọ bụ na ahụwo m ọtụtụ mkpagbu n’ụbọchị ndụ m niile, otu o sila dị, ebe ọ bụ na onye agọziri agọzi n’anya Onyenwe anyị n’ụbọchị ndụ m niile ka m bụ.”4

A na m eche banyere ọtụtụ mnwale niile Nifaị hụrụ, ọtụtụ nke etinyere nime odide ya. Mnwale ya niile na-enyere anyị aka ịghọta na anyị niile nwere ụbọchị ndị siri ike. Otu n’ime mnwale ndịa mere mgbe enyere Nifaị iwu ịlaghachi Jerusalem iweta epekele bras ahụ dị n’aka Laban. Ụfọdụ ụmụnne nwoke nke Nifaị bụ ndị nwoke nwere obere okwukwe, ma ha ji kwa osisi kụọ Nifaị. Nifaị nwetere mnwale ọzọ mgbe ọ gbajiri ọbọ ya mere o nweghị ike iweta nri maka ezinaụlọ ya. Mgbe e mechara, mgbe enyere Nifaị iwu ịrụ ụgbọ mmiri, ụmụnne ya nwoke mere ya akaja ma jụ inyere ya aka. Agbanyeghị ihe ndị a na ọtụtụ mnwale ndị ọzọ ọ hụrụ na ndụ ya, Nifaị kwenyere na ịdị mma nke Chineke mgbe ọbụla.

Foto, oyiyi
Ekegidere Nifaị na ụgbọ mmiri ahụ

Dịka ezinaụlọ ya na agafe oke osimiri n’ụzọ ala ahụ ekwere na nkwa, ụfọdụ ndị ezinaụlọ Nifaị “ bidoro ime onwe ha obi ọma, “ kwuo okwu ike, ma chefuo na ọbụ ike nke Onyenwe anyị dobere ha. Mgbe Nifaị bara ha mba, iwe were ha mere ha jiri kee ya eriri ka ọghara imegharị ahụ. Akwụkwọ nke Mọmọn kwuru na ụmụnne ya “mesoro [ya] na nnukwu mmesike”; nkwo-nkwo aka na nkwo-nkwo ụkwụ ya,” zara nke ukwuu, ma nnukwu ka ọnya dị na ya dị.”5 Nifaị nwere mnwute n’ihi ịdị ike nke obi nke ụmụnne ya nwoke ma mgbe ụfọdụ ume gwụrụ ya maka ọnụma.6 “Otu o sila dị,” o kwuru,” elekwasịrị m Chineke m anya, ma a na m enye ya otuto n’ogologo ụbọchị niile; ma a tamughị m megide Onyenwe anyị n’ihi mkpagbu m niile.”7

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, o lee otu anyị ji emeso nsogbu anyị nile? Anyị ọ na atamu n’ihu Onyenwe anyị maka ha? Ma ọbụ, dịka Nifaị na enyi m onye mgbasa oziọma gara-aga, anyị ọ n’enwe mmetụta obi ekele site n’okwu ekwuru, echiche, na omume maka n’anyị legidere anya na ngọzi anyị nile karịa nsogbu anyị nile?

Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, nyere anyị ihe ịma-atụ n’oge nkuzi oziọma Ya n’ụwa. Nime oge nke ihe isi ike na mnwale, enwere ihe ole na ole na ewetara anyị udo karịrị na afọ ojuju karịa ijere nwoke ibe anyị ozi. Akwụkwọ nke Matiu kọrọ ihe mere mgbe Onye nzọpụta nụrụ na nwanne John the Baptist ka Eze Herod gbupụrụ isi ịkpa nwa nwanyị nke Herodias obi ọma:

“Ma ndị n’eso ụzọ ya biara, ma buru ozu ya, ma liekwa ya, ma jee kọrọ Jizọs.

“Mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ si n’ebe ahụ wezuga onwe ya n’ụgbọ jee ebe bụ ọzara: mgbe igwe mmadụ nile nụrụ ya, ha soro ya si na obodo ahụ nile pụọ n’ụkwụ ala.

“Ma Jizọs pụtara, wee hụ oke igwe mmadụ, o wee nwee ọmiko n’ahụ ha, ma gwọọ ndị ọrịa.

“Ma mgbe oruru anyasi, ndị na-eso ụzọ ya biakwutere ya, sị, ebe a bụ ọzara, oge agawokwa ugbua; zilaga igwe mmadụ ndị a, ka ha wee jee n’obodo nta nile, zụtara onwe ha ihe oriri.

“Kama Jizọs sịrị ha, Ọ dịghị mkpa ka ha laa; unu onwe unu nye ha ihe ka ha rie.”8

Jizọs Kraịst gosiri anyị na orue oge nile nke ọnwụnwa na ihe isi ike, anyị nwere ike ịhụ mmekpa ahụ nke ndị ọzọ. Ijiri ọmiko, anyị nwere ike imetụrụ ha ma bulie ha elu. Ma ka anyị na eme nke a, anyị na enwekwa mbuli elu site na ije ozi dịka Kraịst anyị. Onyeisi Gordon B. Hinckley sịrị: “Ihe m mara kachasị mma eji agwọ nsogbu bụ ọrụ. Ọgwụ kachasị mma ịgwọ obi ịda mba bụ ije ozi. Ọgwụ kachasị mma ịgwọ ike ọgwụgwụ bụ aka mgba nke inyere onye ọzọ ike gwụrụ aka.”9

Nime nke a, Nzukọ nke Jizọs Kraịst, E nwela m ọtụtụ ohere ikuzi ma jere mmadụ ibe m ozi. Ọ bụ na oge ndị ahụ ka m nwere mmetụta na Nna nke Elu-igwe na ebelata ibu m nile. Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma nke Chineke n’ụwa; ọ bụ ọmụma-atụ dị ike nke otu anyị kwesịrị iji kuziere ndị ọzọ mgbe mnwale nile siri ike. A na m etikọta ịgba-ama m na nke ọtụtụ ndị Nsọ ndị ọzọ na Chineke bụ Nna anyị nke Elu-igwe anyị hụrụ n’anya. E nwela m mmetụta ịhụnanya Ya mgbe ụbọchị nile siri m ike. Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ghọtara mgbu na mkpagbu anyị nile. Ọ chọrọ ịbelata ibu anyị nile ma kasie anyị obi. Anyị ga esorịrị ihe ịma-atụ Ya site na ije ozi na ikuziri ndị ibu ha kaa nke anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Bipụta