Ọgbakọ Zuru ọha
Ime Mgbanwe Anyị Niime Jizọs Kraịst ka Ọ dị Omimi
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


10:5

Ime Mgbanwe Anyị Niime Jizọs Kraịst ka Ọ dị Omimi

Akwụkwọ nsọ na ọmụma ihe anyị banyere Chineke bụcha onyinye—onyinye ndị anyị na-anaghị eji a kpọrọ ihe ọtụtụ mgbe. Ka anyị mee ka ngọzi ndị a dị irè niime obi anyị.

I meela nke ukwuu, Okenye Nielson, maka ọmarịcha ozi gị. Ọ bụ ihe anyị chọrọ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, Onyeisi Russell M. Nelson akụziworo anyị ihe na nso nso a: “Ime ihe ọbụla ya adị mma chọrọ mgbalị. Na ị bụ ezigbo onye n’eso ụzọ nke Jizọs Kraist agụpụghị gị. Ịmụbawanye okwukwe gị na ntụkwasị obi gị na Ya na-ewe mgbalị. ” Niime ntụpụta niile nke o nyeworo anyị iji mụbaa okwukwe anyị niime Jizọs Kraịst bụ na anyị ga-abụ ndị na-amụ ihe oge niile, nke na anyị ga-emikpu onwe anyị na akwụkwọ nsọ iji ghọta nke ọma ozi nke Kraịst na ije ozi nke Kraịst. (Lee “Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu niile Anọgharịa,” Liahona, Me 2021, 103.)

Anyị na-amụta niime Akwụkwọ nke Mọmọn na akwụkwọ nsọ bụrịị akụkụ ezi na ụlọ nke Lihaị dị mkpa—nke mere na Nifaị na ụmụnne ya ndị nwoke laghachiri na Jerusalem ịga nweta epekele niile nke bras (lee 1 Nifaị 3–4).

Akwụkwọ nsọ kpughere uche Chineke nwere maka anyị, dịkakwa ka Liahona meere Nifaị na nna ya. Mgbe ọ gbajichara ụbọ ya, Nifaị chọrọrịị ịmata ebe ọ ga-aga inwete ihe oriri. Nna ya, Lihaị, lere anya na liahona ahụ ma hụ ihe ndị e dere. Nifaị hụrụ na mkpịsị ụkwụ liahona ahụ naara arụ ọrụ dịka n’ụzọ okwukwe, ịrụsi ọrụ ike, na ntinye uche e nyere ha siri dị. Ọ hụkwara ederede nke dịịrị mfe ịgụ na nke nyere ha nghọta gbasara okporo ụzọ nke Onyenwe anyị. Ọ bịara mata na Onyenwe anyị na-eweta ihe ndị dị ukwuu site n’obere ụzọ. O nwere nrube isi n’ihe gbasara nduzi niile e nyere site na liahona ahụ. Ọ rịgooro n’elu ugwu ma nwete ihe oriri maka ezi na ụlọ ya, bụ ndị nke taworo ahụhụ nke ukwuu site na-enweghị ihe oriri. (Lee 1 Nifaị 16:23–31.)

Nifaị yiri m ka nwa akwụkwọ jiri akwụkwọ nsọ kpọrọ ihe. Anyị gụtara na Nịfaị nwere ańụrị niime akwụkwọ nsọ, na-enwe ntụgharị uche ha n’obi ya, ma dee ha maka ịmụ ihe na nrite uru nke ụmụ ya (lee 2 Nifaị 4:15–16).

Onyeisi Russell M. Nelson sịrị:

“Ọ bụrụ na anyị ga na-aga n’iru, n’eri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ma nagide ruo ọgwụgwụ, … [anyị] ga-enwe ndụ ebighi-ebi’ [2 Nifaị 31:20].

“Iri oriri pụtara karịa idetụ ọnụ. Iri oriri pụtara inwe ańụrị na nri dị ụtọ. Anyị na-enwe ańụrị n’ịdị ụtọ akwụkwọ nsọ site n’ịmụ ha na mmụọ nke nchọpụta n’obi ụtọ na nrube isi n’okwukwe. Mgbe anyị riri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ha na-emikpu ‘niime ala ala obi’ [2 Ndị Kọrịnt 3:3]. Ha na-abụ akụkụ nke ọdịdị anyị dị oke mkpa” (“Ibi ndụ site na Ntụzi aka nke Akwụkwọ nsọ,” Liahona, Jen. 2001, 21).

Kedụ Ụfọdụ Ihe ndị Anyị Ga-eme Ma ọ bụrụ na Mkpụrụ obi Anyị A na-ańụrị ọńụ n’Akwụkwọ nsọ?

Ọchịchọ anyị ị bụ akụkụ nke mkpokọta Israel n’ụzọ abụọ nke akwa mgbochi ga-abawanye. Ọ ga-abụ ihe a na-eme eme dị na ọdịdị anyị ịkpọku ndị ezi na ụlọ anyị na ndị enyi anyị ige ndị mgbasa oziọma ntị. Anyị ga-abụ ndị tozuru oke, ma anyị ga-ejide akwụkwọ nkwagide na-agarube iji hụ na-agara tempụl ọtụtụ mgbe dị ka o kwere omume. Anyị ga-arụ ọrụ iji chọta, kwadoo, ma nye aha ndị nna nna ochie anyị ha na tempụl. Anyị ga-enwe okwukwe n’idebe Ụbọchị ezumiike nsọ, na-aga nzukọ nsọ Sọnde ọbụla iji megharịa ọhụrụ ọgbụgba ndụ niile anyị na Onyenwe anyị gbara dị ka anyị na-eme ihe na ntozu oke n’iri oriri nsọ. Anyị ga-ekpebi ịnọgide n’okporo nke ọgbụgba ndụ ahụ, na-ebi ndụ site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:44).

Gịnị ka Ọ Pụtara Gị Inwe ọńụ Niihe niile nke Onyenwe anyị?

Ịdị na-enwe ọńụ niime akwụkwọ nsọ karịrị inwe agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ maka ọmụma ihe. Nifaị nwetara oke ọńụ n’oge ndụ ya. Otu osila dị, o zutekwara ọtụtụ ihe isi ike na obi ọjọọ (lee 2 Nifaị 4:12–13). “Na-agbanyeghị,” ọ sịrị, “A maara m onye m tụkwasịrị obi” (2 Nifaị 4:19). Dị ka anyị na-amụ akwụkwọ nsọ, anyị ga-aka aghọta nke ọma atụmatụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke, ma anyị ga-atụkwasị obi na nkwa niile O kwere anyị niime akwụkwọ nsọ, dị ka ọ dịkwa niime nkwa niile na ngọzi niile nke ndị amụma oge ugbu a.

Devid na Golayat

Otu ehihie, a kpọkuru mụ na nwunye m ịbịa n’ebe obibi nke otu enyi. Nwa ha gbara afọ asaa, Devid, anụtụbeghị akụkọ Baịbụl banyere Devid na Golayat, ma ọ chọrọ ịnụ ya. Dị ka m malitere ịkọ akụkọ ahụ, o metụrụ ya n’obi n’ụzọ Devid, site n’okwukwe ya na na-aha nke Chineke nke Israel, jiri merụọ ahụ ma gbuo onye Filistaịn jiri katapọt na otu okwute, na-ejighị mma agha ọbụla n’aka ya (lee 1 Samuel 17).

Dịka ọ n’ele m na nnukwu ọkpụrụkpụ anya ojii ya, ọ jụsiri m ike, “Onye bụ Chineke?” A kọwaara m ya na Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe ma na anyị na-amụ ihe gbasara Ya niime akwụkwọ nsọ.

Mgbe ahụ ọ jụrụ m, “Gịnị bụ akwụkwọ nsọ?” A gwara m ya na akwụkwọ nsọ niile bụ okwu Chineke ma na niime ha ọ ga-achọta ọmarịcha akụkọ ndị ga-enyere ya aka ịmata Chineke nke ọma. A gwara m nne ya ka o were Baịbụl nke o nwere n’ebe obibi ya na-eme ihe ma ka ọ hara ikwe ka Devid rahụ ụra na-agụraghị ya akụkọ ahụ niile. Obi tọrọ ya ụtọ ma ọ ńara ntị na ya. Akwụkwọ nsọ na ọmụma ihe anyị banyere Chineke bụcha onyinye—onyinye ndị anyị na-anaghị eji a kpọrọ ihe ọtụtụ mgbe. Ka anyị mee ka ngọzi ndị a dị irè niime obi anyị.

Mgbe m na-eje ozi mgbasa ozi ọma dị ka nwa okoroọbịa, a hụtara m na site na anyị iji akwụkwọ nsọ kuzie ihe, ndụ nke ọtụtụ mmadụ nwogharịrị. A bịara m mata maka ike dị na ha na otu ha nwere ike iji gbanwee ndụ anyị. Onye ọbụla nke anyị kuziiri ozi ọma nke eweghachitere bụ mmadụ pụrụ iche nwere mkpa dị iche iche. Akwụkwọ nsọ niile dị nsọ, ee, amụma niile nke ndị amụma dị nsọ— wetara ha n’inwe okwukwe niime Onyenwe anyị na inwe nchegharị ma gbanwee obi ha.

Akwụkwọ nsọ mere ka ha jupụta n’ọńụ dị ka ha natara mkpake mmụọ, nduzi, nkasi obi, ume, na ọsịsa nye mkpa ha niile. Ọtụtụ niime ha kpebiri ime mgbanwe na ndụ ha ma malite idebe iwu nsọ niile nke Chineke.

Nifaị na-agba anyị ume ka anyị na-enwe ọńụ n’okwu ndị nke Kraịst, niihi na okwu niile nke Kraịst ga-agwa anyị ihe niile anyị kwesịrị ime (lee 2 Nifaị 32:3).

Ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke ezi na ụlọ

A na a kpọku unu inwe atụmatụ na-adịgide iji mụọ akwụkwọ nsọ niile. Bịanụ, Soro M bụ nnukwu akụ anyị nwere maka ikuzi na ịmụ oziọma, ime mgbanwe anyị dị omimi niime Jizọs Kraịst, na ịnyere anyị aka ịdị ka Ya. Mgbe anyị na-amụ ozi ọma, anyị anaghị nnọọ achọ ozi dị ọhụụ; kama, anyị na-achọ ịbụ “onye e kere ọhụụ” (2 Ndị Kọrịnt 5:17).

Mmụọ Nsọ na-edu anyị chewe ihu n’ebe ezi okwu nọ ma na-agbara anyị ama banyere ezi okwu (lee Jọn 16:13). Ọ na-enye uche anyị ihè, mee nghọta anyị adị ọhụụ, ma metụ obi anyị aka site na mkpughe nke Chineke, isi nke ezi okwu niile. Mmụọ Nsọ na-asacha obi anyị. Ọ na-akpake mmụọ anyị inwe ọchịchọ ibi ndụ dị ka usoro ezi okwu siri dị ma takanyere anyị ụzọ ndị anyị si eme otu ahụ. “Mmụọ Nsọ … ga-akuziri gị ihe niile” (Jọn 14:26).

N’ikwu okwu banyere okwu niile O kpugheere Onye amụma Josef Smith, Onye Nzọpụta anyị sịrị:

Okwu ndị a esighị n’aka ndị mmadụ ma ọ bụ nke mmadụ, kama ha sitere na mụ; …

Niihi na ọ bụ olu m nke na-ekwu ha nye gị; niihi na enyere gị ha site na Mmụọ m … ;

“Ya mere, I nwere ike ịgba ama na Ị nụwo olu m, ma mara okwu m niile (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile” 18:34–36).

Anyị kwesịrị ịchọ nnonyere nke Mmụọ Nsọ. Ebumnuche nke a kwesịrị ị na-achị mkpebi anyị niile ma duzie echiche niile na ihe niile anyị na-eme. Anyị garịrị achọ ihe niile na-akpọbata mmetụta nke Mmụọ ma jụ ihe ọbụla na-apụ site na mmetụta nke a.

A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Nna anyị nke Eluigwe hụrụ naanya. A hụrụ m Onye Nzọpụta m naanya. Obi m juru na-ekele maka akwụkwọ nsọ Ya niile na maka ndị amụma Ya dị ndụ. Onyeisi Nelson bụ onye amụma Ya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.