Ọgbakọ Zuru ọha
Okwukwe iji Mee ihe ma Bụrụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Okwukwe iji Mee ihe ma Bụrụ

Site na ekpere, na ịmụ akwụkwọ nsọ, na ime ihe omume, anyị nwere ike ịtụghe ngọzi niile nke eluigwe ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kacha mma.

Mgbe na-adịghị anya a kpọchara m okù ije ozi dị ka Onye ji Ikike Zuru ọha Ndị Iri asaa, e nwetara m ohere ị ga leta Onyeisi Russell M. Nelson na nkeji ole na ole. Ọ bụ nzukọ na-echeghị eche mere n’ebe a na-eri nri, ma ọ metụtara ya nke ọma ịkpọ mụ na Okenye S. Mark Palmer ị nọdụ ọdụ ma soro ya rie nri ehihe.

“Gịnị ka anyị ga-ekwu ihe gbasara ya n’oge nri ehihe anyị na onye amụma?” bụrịị echiche batara na uche m. Ya mere e kpebiri m ịjụ Onyeisi Nelson ma o nwere ndụmọdụ ma ọ bụ nduzi ọ ga-enye m ebe m ka bidoro ọhụụ na-ọkpụkpọ okù m. Aziza ya dịịrị nnọọ mfe ma kwụọ ọtọ na-enweghị mgbagọ; o lere m anya ma sị, Okenye Schmeil, a kpọrọ gị okù maka ihe i nwere ike ịbụ.” A pụrụ m site na nhụmiihe ahụ na-atụgharị uche gbasara ihe Onyenwe anyị chọrọ m ịbụ. Ka m na-eche ihe gbasara nke a, a ghọtara m na Ọ chọrọ ka m bụrụ di kacha mma, nna kacha mma, na nwa nwoke kacha mma na nwa odibo kacha mma. Mgbe ahụ ka m ghọtara na ihe ndị a niile bụ ihe e nwere ike imejupụta dị ka m na-arụ ọrụ ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kacha mma.

Na ọgbakọ zuru ọha gara aga, Onyeisi Nelson sịrị: “Ime ihe ọbụla nke ọma chọrọ ka a gbaa mbọ. Ị bụ ezigbo onye n’eso ụzọ nke Jizọs Kraist abụghị nke a gụpụrụ agụpụ.”1 Onyeisi Nelson na-akpọku anyị ịrụsi ọrụ ike ịbụ ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst kacha mma. Ọ gwawo anyị na ịbịa ịdịkarị ka Onye Nzọpụta, anyị nwere ọrụ ime ka okwukwe anyị sie ike site na-ịjụ, site na-ịdị na-eme ihe, na site na-ịdị na-amụ ihe ọmụmụ, niime ihe ndị ọzọ.

1. Rịọ

Ọ sịrị, “Rịọ Nna gị nke Eluigwe, maka enyemaka, n’aha Jizọs Kraist.”2 Ịrịọ site na ekpere bụ otu niime ọtụghe nke ịmata otu esi abụzi onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst kacha mma.

Na-ebe ngwụcha nke ije ozi Ya na etiti ndị Nifaị nọ na Amerika, Jizọs Kraịst rịgooro n’eluigwe. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Ya gbakọtara ọnụ, “jikọta ọnụ n’ekpere na obubu ọnụ dị egwu. Ma Jizọs gosịrị ha onwe ya ọzọ, n’ihi na ha nọ na-ekpe ekpere nye Nna n’aha ya.”3 Gịnị mere Jizọs jiri gosị Onwe Ya ọzọ nye ndị na-eso ụzọ Ya? Niihi na ha nọ na-ekpe ekpere; ha nọ na-arịọ.

Mgbe ahụ ọ garaniihu:

“Ma ugbua a ga m agakwuru Nna. Ma n’ezie asị m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ Nna n’aha m a ga-enye unu ya.

“Ya mere, rịọnụ, ma unu ga-anata; kụọnụ aka, ma a ga-emeghere unu; n’ihi na onye nke na-arịọ, na-anata; ma onye nke na-akụ aka, a ga-emeghere ya.”4

Anyị kwesịrị ịrịọ n’okwukwe iji mara uche Onyenwe anyị ma nabata na Onyenwe anyị maara ihe kacha mma maka anyị.

2. Mee ihe

Ime ihe bụkwarị ọtụghe ọzọ dị oke mkpa na ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kacha mma. Dị ka anyị na-eme ihe, Ọ ga-eduzi ma tụziere anyị aka n’ụzọ ahụ. A maara m nke ọma na Nifaị naara achọ nduzi site n’aka Onyenwe anyị ị mara otu esi enweta epekele bras ndị ahụ site n’aka Laban, mana ya na ụmụnne ya ndị nwoke nwara ugboro abụọ na-enwetaghị ihe a chọrọ. Kama ha naara eme ihe, ma Onyenwe anyị naara eduzi ha n’ụzọ ahụ. N’ikpeazụ, Nifaị nwetara ihe a chọrọ n’oge nke ugboro atọ. O chetara, “Mmụọ ahụ wee duo m, na amaghị na mbụ ihe ndị m ga-eme.”5

Nke a bụ otu Onyenwe anyị na-esi arụ ọrụ mgbe anyị gbara mbọ ma mee ihe, ọbụla mgbe anyị na-enweghị nghọta doro anya banyere ihe e kwesịrị ime. Onyenwe anyị gwara Nifaị ihe a ga-eme: gaa weta epekele niile ahụ. Mana Ọ gwaghị Nifaị otu esi eme ya. Ọ hapụụrụ ya Nifaị ị chọpụta ka esi eme ya ma chọọ enyem aka nke Onyenwe anyị—ma ọtụtụ mgbe nke a bụ otu Onyenwe anyị na-esi arụ ọrụ niime ndụ anyị. Dị ka anyị na-eme ihe n’okwukwe, Onyenwe anyị na-eduzi ma na-atụziri anyị aka.

3. Mụọ ihe

Niime 3 Nifaị, ndị na-eso ụzọ gwara Onye Nzọpụta na e nwere arụmarụ ụka n’etiti ndị dị iche iche gbasara aha nke Nzukọ nsọ ahụ. Na nzaghachi, Onye Nzọpụta kuziri otu ụkpụrụ dị mkpa mgbe Ọ jụrụ, “Ọ bụ na ha agụbeghị akwụkwọ nsọ?”6 Ịmụ ihe bụkwarị ọtụghe ọzọ dị oke mkpa eji a bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kacha mma. Ekpere na ịmụ akwụkwọ nsọ na-aga aka na aka. Ha na-arụkọta ọrụ ọnụ maka ọdịmma anyị. Nke a bụ usoro nke Onyenwe anyị hiweworo. “N’eri nụ oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; n’ihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile unu kwesịrị ime.”7

Onye Nzọpụta kuzikwara na anyị ekwesịghị naanị ịmụ akwụkwọ nsọ kama na-akuzikwa ihe site na ha, dị ka O gosịrị ndị Nifaị: “Ma ugbua o wee ruo na mgbe Jizọs kọwadaruworo akwụkwọ nsọ niile ala n’otu, bụ nke ha deworo, o nyere ha iwu ka ha kụzie ihe ndị ahụ nke ọ kọwadaruworo ala nye ha.”8

Nke a bụ otu niihe ihe ndị mere o ji dị oke mkpa maka Nifaị ịlaghachi azụ ma weta epekele bras niile ahụ: ezi na ụlọ ya nwere mkpa akwụkwọ nsọ ọ bụghị naanị maka ịnyere ha aka mee njem gaa n’ala e kwere na nkwa kama maka ịnyekwara ha aka kụziere ụmụ ha ịhe. Anyị onwe anyị kwa garịrị achọ ntụzi aka site n’akwụkwọ nsọ maka njem anyị, ma anyị garịrị akuzi ihe site na ha niime ebe obibi anyị na ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ niile.

4. Mee ihe ka Ịbụrụ

Ọtụtụ mgbe azịza niile nye ekpere agaghị abịa ozugbo. Mana anyị garịrị enwe okwukwe iji gaaniihu, mee ihe n’ezi omume, ma kwụsie ike dị ka Nifaị mgbe ọ naara anwa inweta epekele bras niile ahụ. Onyenwe anyị ga-egosi anyị ihe obere obere n’otu oge; mgbe anyị na-amụ akwụkwọ nsọ, Onyenwe anyị ga-enye anyị ọsịsa niile ma ọ bụ ume dị mkpa iji gabiga otu ụbọchị ọzọ, otu izu ụka ọzọ, na ịnwakwa otu ugboro ọzọ. Okenye Richard G. Scott sịrị: “Nweenụ obi ekele na mgbe ụfọdụ Chineke na-ahapụ anyị ịgba mbọ ogologo oge tupu azịza ahụ abịa. Nke ahụ na-eme ka okwukwe gị mụbaa ma agwa gị a na-adịkwu mma.”9

Site na ekpere na ịmụ akwụkwọ nsọ, Onyenwe anyị na-enye anyị mgbe niile ume ime ihe ma nagide otu mkpụrụ ụbọchị ọzọ, otu izu ụka ọzọ, ma gbalịa kwa otu ugboro ọzọ. Ọtụtụ mgbe azịza niile abịaghị ozugbo. E nwere m ajụjụ ndị na-azabeghị nọkwanụ, mana a nọgidere m na-ajụ ma na-amụ ihe, ma obi dị m ụtọ na Onyenwe anyị nọgidere na-enye m ume ime ihe dị ka m nọ na-eche maka azịza niile.

Okenye Scott sịkwara, “Dị ka ị na-eru n’oke nke nghọta gị niime obere oge tupu chi ojiji nke ọnọdụ amaghị nke eriri, itinye okwukwe n’ọrụ, a ga-eduba gị na-ịchọta ọsịsa na ị gaghị enweta n’ụzọ dị iche.”10

Ịbụ onye na-eso Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst kacha mma bụ njem na-ewe oge ndụ niile, ma anyị niile nọ n’ogo dị iche iche, na-aga dị ka ike kwere onye ọbụla. Anyị garịrị ebu n’uche na nke a abụghị ihe ịsọmpi, ma anyị nọ ebe a ịhụ onye ọbụla naanya na ịnyere onye ọbụla aka. Anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe iji nye Onye Nzọpụta ohere i soro anyị na-arụ ọrụ niime ndụ anyị.

Ka ọ na-agwa Sidney Rigdon okwu, Onyenwe anyị kwuru okwu ndịa na-esota: “E lewo m gị na ọrụ gị niile anya. A nụwo m ekpere gị nile, ma kwado gị maka ọrụ nke karịrị akarị.”11 A na m agba ama na Onyenwe anyị na-anụ ma na-aza ekpere anyị; Ọ maara anyị; O nwere nnukwu ọrụ maka onye ọbụla niime anyị. Site na ekpere na ịmụ akwụkwọ nsọ, ma ị mee ịhe, anyị nwere ike ịtụghe ngọzi niile nke eluigwe ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kacha mma.

Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri na “Ikpe ikpe nke Ikpeazụ ahụ abụghị nnọọ naanị mnwale nke ihe ọma na ihe ọjọọ niile agụkọtara ọnụ—ihe anyị meworo. Ọ bụ nnakwere nke ndapụta ikpeazụ nke ihe ndị anyị mere na ihe ndị anyị chere—ihe anyị bụworo.”12

Obi m juru n’ekele maka ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe; ha bụ ndị nche nọ n’elu tọwa. Ha na-ahụ ihe ndị anyị na-anaghị ahụ. A na m agba ama na site n’okwu ha, anyị nwere ike ịbụ ndị na-eso Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst kacha mma ma nweta ihe anyị nwere ike mee. A na m agba ama na Kraịst dị ndụ ma maara onye ọbụla niime anyị otu na otu. Nke a bụ Nzukọ nsọ Ya. Site na aha di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen

Bipụta