Ọgbakọ Zuru ọha
Ịhụnaanya nke Chineke: Nke Kachasị Obi ụtọ nye Mkpụrụ obi
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


10:24

Ịhụnaanya nke Chineke: Nke Kachasị Obi ụtọ nye Mkpụrụ obi

Ịhụnaanya nke Chineke abụghị nke a na-ahụ n’ime ọnọdụ niile nke ndụ anyị kama na ihu Ya n’ime ndụ anyị.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, unu maara otu Chineke, Nna anyị nke Eluigwe, siri hụ unu n’anya kpam kpam? Unu enwewo mmetụta ịhụnaanya Ya na-ime ime mkpụrụ obi unu?

Mgbe ị maara ma ghọta kpam kpam otu esi hụ gị n’anya dịka nwa nke Chineke, ọ na-agbanwe ihe niile. Ọ na-agbanwe otu i si enwe mmetụta banyere onwe gị mgbe i jehiere. Ọ na-agbanwe otu i si enwe mmetụta mgbe ihe siri ike mere. Ọ na-agbanwe echiche gị nke iwu nsọ niile nke Chineke. Ọ na-agbanwe echiche gị maka ndị ọzọ na maka ike gị ime ihe dị iche.

Okenye Jeffrey R. Holland kuziri: “ Iwu nsọ ukwuu nke mbụ nke ebighị ebi niile bụ iji obi anyị niile, ike, uche, na ume hụ Chineke n’anya—nke ahụ bụ iwu nsọ mbụ kachasị. Kama eziokwu ukwuu nke mbụ nke ebighị ebi niile bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya jiri obi Ya niile, ike, uche, na ume.”1

Olee otu onye ọbụla nime anyị ga-esi mara na-ime ime mkpụrụ obi anyị eziokwu ukwuu ahụ nke ebighị ebi?

Onye amụma Nefi ka egosiri n’ime ọhụ ihe akaebe kachasị sie ike nke ịhụnaanya nke Chineke. Na ile osisi nke ndụ ahụ, Nefi rịọrọ ị mara nkọwa ya nnọọ. Na azịza, otu mmụọ ozi gosịrị Nefi otu obodo, otu onye nne, na otu nwa. Dịka Nefi lere anya na obodo nke Nazaret na onye nne eziomume Meri, jidere nwa ọhụrụ ahụ Jizọs n’ogweaka ya, mmụọ ozi ahụ kwupụtara, “Lee Nwa atụrụ nke Chineke, ee, ọbụna Ọkpara nke Nna nke Eluigwe!”2

Na oge ahụ dị nsọ, Nefi ghọtara na nime ọmụmụ nke Onye Nzọpụta, Chineke naara egosipụta ịhụnaanya Ya dị ọcha ma zuo kpam kpam. Ịhụnaanya nke Chineke, Nefi gbara ama, “na-awụsa onwe ya n’ebe dị anya n’ime obi niile nke ụmụ mmadụ.”3

Osisi nke ndụ ahụ

Anyị nwere ike chee ịhụnaanya nke Chineke dịka ihè na-apụta site n’osisi nke ndụ ahụ, na-awụsa onwe ya n’elu ụwa niile n’ime obi niile nke ụmụ mmadụ. Ihè na ịhụnaanya nke Chineke n’ejupụta okike Ya niile dum.4

Mgbe ụfọdụ anyị n’amaghị ama na-eche na anyị nwere ike nwete mmetụta ịhụnaanya nke Chineke naanị mgbe anyị sorochaworo okporo igwe ahụ ma rachaa mkpụrụ osisi ahụ. Ịhụnaanya nke Chineke, kosiladị, abụghị naanị ndị ahụ bịara na osisi ahụ na-anata kama ọ bụ ike ahụ nnọọ na-akpali anyị ị chọ osisi ahụ.

“Ya mere, ọ bụ ihe kachasị amasị nihe niile dum,” Nefi kuziri, ma mmụọ ozi ahụ tiri mkpu, “Ee, na nke kachasị obi ụtọ nye mkpụrụ obi.”5

Afọ iri abụọ gara aga, otu onye otù ezinaụlọ a hụrụ n’anya sitere na Nzukọ nsọ pụọ. O nwere ọtụtụ ajụjụ azaghị aza. Nwunye ya, onye akpọbatara, kwusịrị ike n’okwukwe ya. Ha gbalisịrị ike idozi alụm di na nwunye ha n’etiti ihe nghọtahie niile malitere.

Afọ gara aga o dedatara ajụjụ atọ banyere Nzukọ nsọ nke tara ya akpụ imezi ma ziga ha nye di na nwunye abụọ ndị buruworo ndị enyi ya n’ọtụtụ afọ. Ọ kpọkuru ha ka ha tulee uche n’ajụjụ ndị ahụ ma bịa oge nri abalị ikesa echiche ha.

N’isote nleta ndị enyi nkea, ọ gara n’ime ụlọ ya ma bido ọrụ n’otu arụmarụ. Mkparịta ụka mgbede ahụ na ịhụnaanya egosiri ya site n’aka ndị enyi bịara n’ihu ihu nke uche ya. O mesiri dee na a manyere ya ịkwụsị ọrụ ya. O kwuru: “Ihè chapụrụ achapụ jupụtara n’ime mkpụrụ obi m. … A maara m nke ọma mmetụta ihe ọmụma nkea miri emi, kama banyere n’okwu nkea ọ gara n’ihu ịbawanye n’ike n’ike karịa nnọọ na mbụ ma nọọrụọ ọtụtụ nkeji. A nọdụrụ m nwayọ na mmetụta ahụ, nke m bịara ghọta dịka ngosipụta nke ịhụnaanya nke Chineke maka mụ. … E nwetere m mmetụta ime mmụọ gwara m na m nwere ike laghachi nzukọ nsọ ma gosipụta ịhụnaanya a nke Chineke n’ime ihe m na-eme ebe ahụ.”

Mgbe ahụ ya a tulee banyere ajụjụ ya niile. Mmetụta ọ natara bụ na Chineke nabatara ajụjụ ya niile ma na enweghị aziza doro anya ekwesịghị ịkwụsị ya site na ịga n’ihu.6 O kwesịrị ikesaa ịhụnaanya nke Chineke ya na ndị niile mgbe ọ garanihu ịtụgharị uche Dịka ọ mere ihe na mmetụta ahụ, ọ dịịrị ya ka Josef Smith bụ nwanne ya, onye kwupụtara mgbe Ọhụ nke Mbụ ya gasịrị, “Mkpụrụ obi m jupụtara n’ịhụnaanya, ma ruo ọtụtụ ụbọchi e nwere m ike ịńụrị nnukwu ọńụ.”7

Dị ịtụnaanya, mkpụrụ ọnwa ole ma ole gasịrị, onye otu ezinaụlọ nkea natara otu ụdị ọkpụkpọ okù ahụ o nweburu afọ 20 gara aga. Oge mbụ akpọrọ ya okù ahụ, ọ rụrụ ọrụ ya dịka ezigbo onye otù nke Nzukọ nsọ. Ugbu a ajụjụ nye ya abụghịzi “Olee otu m ga-esi mejupụta ọkpụkpọ okù a?” kama “Olee otu m ga-esi egosi ịhụnaanya nke Chineke site n’ije ozi m?” Site n’ụzọ ọhụrụ nke a, o nwetere mmetụta ọńụ, nkọwa, na ebumnobi n’akụkụ niile nke ọkpụkpọ okù ya.

Ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke, olee otu anyị nwere ike si nata ike mgbanwe ịhụnaanya nke Chineke? Onye amụma Mọmọn na-akpọku anyị i “jiri ike niile nke obi kpeere Nna, ka e wee mejupụta unu nʼihụnaanya nke a, nke o nyekwasịworo ndị niile bụ ndị na-eso Ọkpara ya, Jizọs Kraịst nʼeziokwu.”8 Mọmọn anaghị akpọku anyị naanị ikpe ekpere ka anyị wee nwee ike jupụta n’ịhụnaanya Ya maka ndị ọzọ kama ikpe ekpere ka anyị wee nwee ike mara maka ịhụnaanya nke Chineke n’enweghị ntụpọ maka anyị onwe anyị.9

Ka anyị na-anata ịhụnaanya Ya, anyị na-achọta nnukwu ọńụ n’ịgba mbọ inwe ịhụnaanya na ije ozi dịka O mere, bụrụzie “ezigbo ndị nsiso nke Ọkpara ya, Jizọs Kraist.”10

Ịhụnaanya nke Chineke abụghị nke a na-ahụ n’ime ọnọdụ niile nke ndụ anyị kama na ihu Ya n’ime ndụ anyị. Anyị maara maka ịhụnaanya Ya mgbe anyị natara ume karịrị nke onwe anyị na mgbe Mmụọ Ya wetere udo, nkasị obi, na ntụzi aka. Mgbe ụfọdụ o nwere ike sie ezigbo ike inwete mmetụta ịhụnaanya Ya. Anyị nwere ike kpee ekpere ka anya anyị wee meghee ịhụta aka Ya n’ime ndụ anyị ma hụta ịhụnaanya Ya n’ime ịma mma nke okike Ya niile.

Dịka anyị n’atụle ndụ nke Onye Nzọpụta na aja Ya n’enweghị ọgwụgwụ, anyị na-amalite ịghọta ịhụnaanya Ya maka anyị. Na nsọpụrụ anyị na-ekwe uke nke Eliza R. Snow: “ọbara Ya dị oke ọnụ ahịa ọ na-awufu n’efu; ndụ Ya o nyere n’efu.”11 Obi umeala nke Jizọs n’ịtara anyị ahụhụ na-asachapụ n’elu mkpụrụ obi anyị, na-emeghe obi anyị ịchọ mgbaghara n’aka Ya ma n’emejupụta anyị na ọchịchọ nke ibi dịka O si bie.12

Onyeisi Russell M. Nelson dere, “Ka anyị na-agbakwu mbọ ịhazi ndụ anyị dị ka nke Ya, ka ịhụnaanya anyị na-adizi ụcha ma dị nsọ karịa.”13

Nwaọkpara anyị kwuru: “Mgbe m gbara afọ 11, mụ na ndị enyi m kpebiri izoro onye nkuzi anyị ma hapụ ọkara nke mbụ nke klas Praịmarị anyị. Mgbe anyị rutere n’ikpeazụ, n’ịtụnaanya anyị, onye nkuzi kelere anyị n’obi ọma. Emesịa o kpere ekpere metụtara n’obi n’oge nke o kwupụtara ezi obi ekele ya nye Onyenwe anyị na anyị ekpebiwo ịbịa klas n’ụbọchi ahụ n’uche nke onwe anyị. E nweghị m ike icheta ihe ọmụmụ ihe ahụ bụ banyere ma ọbụ aha onye nkuzi anyị kama ugbu a, ihe dịka afọ 30 gasịrị, ịhụnaanya ahụ n’enweghị ntụpọ o gosiri m ụbọchị ahụ ka na emetụta m n’ahụ.

Afọ ise gara aga a hụtara m ọmụmaatụ nke ịhụnaanya si na chi mgbe m gara Praịmarị dị n’ime Russia. A hụrụ m otu nwanne nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi sekpuru n’ihu ụmụaka ma na-agba ama nye ha na ọbụrụgodi na ha bụụrụ naanị ndị biiri n’ụwa, Jizọs gaara ata ahụhụ ma nwụọ naanị n’ihi ha.

A na m agba ama na Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị n’ezie nwụrụ maka onye ọbụla n’ime anyị. Ọ bụụrụ ngosipụta nke ịhụnaanya Ya n’enweghị ọgwụgwụ maka anyị na maka Nna Ya.

A maara m na Onye Mgbapụta m dị Ndụ Ụdị nkasị obi ahịrị okwu nkea dị ụtọ n’enye! … Ọ dị ndụ ịgọzi [anyị] site na ịhụnaanya ya.”14

Ka anyị meghee obi anyị ịnata ịhụnaanya n’enweghị ntụpọ nke Chineke nwere maka anyị ma emesịa wụpụta ịhụnaanya Ya n’ime ihe niile anyị na-eme na ihe anyị bụ. Site na aha dị nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Jeffrey R. Holland, “Echi na-abịa abịa Onyenwe anyị Ga-eme Ihe Dị Ebube N’etiti Unu,” Liahona, Me 2016, 127.

  2. 1 Nịfaị 11:21.

  3. 1 Nifaị 11:22; okwu agbakwunyere.

  4. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 88:13.

  5. 1 Nifaị 11:22, 23.

  6. Lee 1 Nifaị 11:17.

  7. Josef Smith, nime Karen Lynn Davidson na ndị ọzọ, eds., The Joseph Smith Papers, Histories, Volume 1: Joseph Smith Histories, 1832–1844 (2012), 13; punctuation and capitalization modernized.

  8. Moronaị 7:48.

  9. Lee Neill F. Marriott, “Ịnọgide n’ime Chineke na Imezi Oke ahụ,” Liahona, Nov. 2017, 11: “Perhaps our life in a loving premortal world set up our yearning for true, lasting love here on earth. Chineke kere anyị inye ịhụnaanya na inwete ịhụnaanya, ma ịhụnaanya nke kachasị dị omimi na-abịa mgbe anyị na Chineke bụ otu.”

  10. Moronaị 7:48.

  11. “How Great the Wisdom and the Love,” Hymns, no. 195.

  12. Lee Linda S. Reeves, “Ntozu oke nke Ngọzi niile Ekwere nkwa,”,” Liahona, Nov. 2015, 11: “Ekwere m na ọbụrụ ma anyị ga-echeta kwa ụbọchi ma mata omimi nke ịhụnaanya nke Nna anyị nke Eluigwe na Onye Nzọpụta nwere maka anyị, anyị ga-adị njikere ime ihe ọbụla ịlaghachi nihu Ha ọzọ, nke ịhụnaanya Ha gbara anyị gburugburu mgbe ebighị ebi.”

  13. Russell M. Nelson, “Ịhụnaanya Si N’igwe,” Liahona, Feb. 2003, 17.

  14. “A maara M Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ,” Abụ, no. 136.