Ọgbakọ Zuru ọha
Ihe niile nke Mkpụrụ obi M
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Ihe niile nke Mkpụrụ obi M

Kedụ ụdị ịhe niile ị na-atule n’obi? Kedụ ihe ndị ijiri kpọrọ ihe? Kedụ ihe bụ ihe niile nke mkpụrụ obi gị?

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, dịka m guzoro ọzọ n’ebe Ụlọ Ọgbakọ anyị hụrụ n’anya, ọ na-echetara m okwu niile nke Onye ozi Pita: “Onyenwe anyị, ọ dị mma n’anyị nọ n’ebe a.”1

Echiche m niile taa ga-elekwasị anya n’okwu niile nke onye amụma Nifaị, onye debere akụkọ ndekọta nke ndị ya mgbe nna ya Lihaị nwụrụ. Nifaị dere, “Ma n’elu ndị a ka m dere ihe niile nke mkpụrụ-obi m.”2

Na mbụ, a na m agafe amaokwu nke a, wee na-eche na mkpụrụ okwu a ihe niile enwechaghị ugwu mọbụ ịdị nsọ, nakwa na otozughi oke itikọta ya na “mkpụrụ obi m”.” Mana a mụtawom na mkpụrụ okwu nke a ihe niile ka ekwuru nime akwụkwọ nsọ ugboro 2,354.3 N’ọmụmatụ, nime Mosis: “Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ, Chineke Pụrụ Ime Ihe niile; site n’Onye nke m Mụrụ Naanị Ya ka m kere ihe ndị a niile.”4 Ma okwu niile nke Nifaị: “Lee, mkpụrụ-obi m nwere mmasị n’ihe niile nke Onye-nwe; ma obi m na-aga n’iru na-eche maka ihe niile ndị m hụworo na ndị m nụworo.”5

Okwu niile nke Nifaị kpalitere ajụjụ a “Kedụ ihe niile ị na-atule n’uche?” “Kedụ ihe ndị ijiri kpọrọ ihe?” “Kedụ ihe bụ ihe niile nke mkpụrụ obi gị?”

Ihe niile nke mkpụrụ obi anyị mgbe ụfọdụ bụ ihe ndị a na-akọwa nke ọma ma ha na-abawanye site n’ịjụ ajụjụ.

Foto, oyiyi
Okenye Rasband nime ọgbakọ nke intanet
Foto, oyiyi
Ofufe nro nke Ntorobịa nta
Foto, oyiyi
Mgbasa ozi n’ikuku nke ndị Ntorobịa

N’oge ọrịa mkpochapụ ụwa, e zutere m ndị ntorobịa si gburugburu ụwa nime emume ofufe nro, ma nke ukwu na nke nta, site na mgbasa ikuku ma soshial midia, ma anyị akparịkọtawo ajụjụ ha.

Josef Smit dị afọ iri na anọ nwere ajụjụ nime ala ala mkpụrụ obi ya, ma ọ wegaara ya Onyenwe anyị. Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo nkea ọzọ: “Were ajụjụ gị niile gakwuru Onyenwe anyị makwa ndị ọzọ ahụ dị ntụkwasị obi. Mụọ ihe site n’inwe ọchịchọ i kwere karịa ịnwe olileanya na ị ga-ahụta ntụpọ nime ndụ nke onye amụma mọbụ ihe n’ezighi ezi dị nime akwụkwọ nsọ. Kwụsị ịmụba obi abụọ gị site nịkwugharị ihe ndịa gị na … ndị obi abụọ. Hapụ ka Onyenwe anyị duru gị na njem gị nke nchọpụta nke ime mụọ.”6

Ndị ntorobịa na-ajụkarị m ihe m kwere na ya ma ihe kpatara m jiwe kwere.

A na m echeta mgbe m jiri internet leta otu iyom nta n’ebe obibi ya. A jụrụ m ma ugbua ọ bụ nke mbụ Onye ozi nabata n’ebe obibi ya. O jiri ọsịsọ saa ihu ọchị ma zaghachi, “Eeh.” Ajụjụ ọ jụrụ dị mma: “Kedụ ihe ndị kachasị mkpa nke m kwesịrị ị mata?”

A sara m ya site n’ikwu ihe niile nke mkpụrụ obi m, ihe niile nke na-akwado m ị nụ mkpali mmụọ, nke n’eme ka m hụ ụzọ karịa otu ụwa si ahụ, nke n’eme ka ọrụ m nime oziọma nkea na nime ndụ nwee ebunmuche.

Unu ọ ga-enye m ohere ka m kesara unu ihe niile nke mkpụrụ obi m? Ihe niile ndịa gbasara onye ọbụla na-achọ ịbụ ezigbote onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Ọ dịka ihe iri ga-abụ ezigbote ọnụ ọgụgụ. Taa a ga m enye unu ihe asaa ma enwere m olileanya na unu ga-emezu ya asatọ, itolu na iri site na nhụmihe nke onwe unu.

Nke mbụ, hụ Chineke Nna na Jizọs Kraịst Onye Nzọpụta anyị n’anya.

Jizọs nyere nnukwu iwu nke mbụ nke a: “Ị ga-ewere obi gị niile, werekwa mkpụrụ obi gi niile, werekwa uche gị niile hụ Onye nwe gị Chineke gi n’anya.”7

Onyeisi Nelson kwupụtara uchu ọ nwere na Chineke, Nna anyị nke Ebighi ebi, ma Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, mgbe a kpọrọ ya ka ọ duo Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị, ọ kwuru, “A maara m Ha, hụ Ha n’anya, ma kwe nkwa ịjere Ha ozi—ma unu—jiri ume ndụ m niile nke fọdụrụ m.”8

Nihi nkea, nke mbụ, hụ Nna na Ọkpara ahụ n’anya.

Nke abụọ, “Hụ onye agbataobi gị n’anya.”9

Nke a abụghị naanị echiche ọma; ọ bụ nnukwu iwu nsọ nke abụọ. Ndị agbataobi gị bụ di na nwunye gị ma ndị ezi na ụlọ gị, ndị otù ngalaba ụka, ndị ebe ọrụ gị, ndị ebe imeulọ gị, ndị n’abụghị ndị okpukpere chi anyị, ndị ahụ chọrọ enyemaka, ma n’ezie, ndị ọbụla. Mkpa dị nime okwua “hụ agbatobi gị n’anya” ka ekwupụtara nime abụ a “Hụkọrịta Onwe unu N’anya.”10

Onyeisi Nelson na-echetara anyị na, “Mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya jiri obi anyị niile, Ọ na-atụgharị obi anyị ịchete ọdịmma nke ndị ọzọ.”11

Nke atọ, hụ onwe gị n’anya.

N’ebe a ka ọtụtụ na-agba mgba. Ọ bụna ọtụghị gị n’anya na ị hụ onwe anyị n’anya dị ka osiri ike karịa ị hụ ndị ọzọ n’anya? Otuosiladị, Onyenwe anyị ekwuwo, “Hụ onye agbataobi gị n’anya dịka onwe gị.”12 Ọ jiri ịdị nsọ nọ anyị nime kpọrọ ihe; ma nihi nkea anyị kwesịrịrị ịmekwa otu ahụ. Mgbe ebokwasịrị anyị ibu nke njehie, obi mgbu, mmetụta nke adighi ike, ngharịpụ, iwe, mọbụ mmehie, ike nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye nzọpụta bụ, site n’atụmatụ dị nsọ, otu nime ihe niile n’ebuli mkpụrụ obi.

Nke anọ, debe iwu nsọ niile.

Onye Nzọpụta ekwuwo ka o do anya: “Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ m n’anya, debe iwu nsọ m niile”13 Gba mbọ ụbọchị niile i dị ma ị mee ihe dị mma karịa, ma gaa n’ihu nime eziomume.

Nke ise, tozuo oke mgbe niile ị ga tempụl.

A na m akpọ ya i mee ka Onyenwe anyị mata gị. Ọ bụrụ ma ị nwere ike ị banye nime tempụl mọbụ ị nweghi, i tozu oke ijide temple rekọmend dị kọrentị n’eme ka ịlekwasị anya n’ihe ndịa ahụ dị mkpa, ụzọ nke ọgbụgbandụ ahụ.

Nke isii, nwe obi ụtọ ma nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ.

“Ya mere, nọrọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, ma atụla ụjọ,”14 ka Onyenwe anyị kwuru. Gịnị mere? Kedụ otu ọ bụ, mgbe ọtụtụ ịma aka nọ anyị n’ihu mgbe ọbụla? Ọ bụ nihi nkwa ahụ nke Jịzọs Kraịst kwere n’asị: “Mụ Onyenwe nọnyere unu, ma ga-eguzogide unu.”15

Onyeisi Nelson akọwawo oziọma eweghachitere dịka “ozi nke obi ụtọ!”16 Ma ọ kọwara, “Obi ụtọ ahụ anyị n’enwete abụchaghị maka ọnọdụ nke ndụ anyị ma ọ gbasara ihe niile metụtara ebe uche nke ndụ anyị nọ,”17

Nke asaa, soro onye amụma dị ndụ nke Chineke.

Nke a nwere ike bụrụ nke asaa nime ndepụta m niile, mana ọ nọ n’isi uche m ma-abịa na mkpa ọ dị taa.

Anyị nwere ọnye amụma nke Chineke nime ụwa taa! Atụfukwala mọlị ihe nke a pụtara maka gị. Cheta nwa agbọghọ ahụ m kwuru maka ya na mbido. Ọ chọrọ ị mata ihe niile ndịahụ kachasị mkpa. Soro onye amụma dị ndụ,” ka m kwuru na n’oge ahụ, ma taa a na m ekwugharịkwa ya ọzọ.

A maara anyị dịka ndị Nzukọ nsọ a na-edu site n’aka ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe Chineke kpọrọ maka oge nke a. A na m ekwe nkwa n’ọbụrụ na ị gee ntị ma soro ndụmọdụ ha, a gaghị eduhe gị mọlị. Ma ọlị!

Anyị bi n’oge mgbe “a na-atụgharị anyị site n’ebe a ruo n’ebe a,”18 mgbe a na-ebuso agha megide ihe ime mmụọ, ezi agwa, eziokwu ma nkwanye ugwu. Anyị ga-ahọrọ nhọrọ. Anyị nwere olu nke Onyenwe anyị site n’onye amụma Ya ikụda ụjọ anyị ma ibuli anya anyị, nihi mgbe Onyeisi Nelson kwuru okwu, ọ na-ekwuchitere Onyenwe anyị.

E jiri akwụkwọ nsọ niile na ọtụtụ nkuzị gozie anyị nke na-echetara anyị na, “Echiche m niile abụghị echiche unu niile, maọbụkwanụ ma ụzọ unu niile ọ bụ ụzọ m niile, ka Onyenwe anyị kwuru.”19

Otu a ka ọ dịịrị Naaman, nnukwu onye isi ndị agha nke Syria, onye ekpenta, onye agwara na onye amụma Elaisha nwere ike ị gwọ ya. Elaisha zigara onye ozi ya ị gwa Naaman ka ọ saa ahụ nime Osimiri Jodan ugboro asaa ma ọ g’adị ọcha. Naaman kwara emo. N’ezie enwere nnukwu osimiri karịrị nke Jodan, ma gịnị kpatara ejiri zite onye odibo mgbe ọ chere na Elaisha onye amụma g’eji aka ya bịa ma gwọ ya? Naaman siri ebe ahụ pụọ, ma ndị odibo ya mesiri mee ka ọ kwere: “ọ bụrụ na onye amụma gwara gị mee ihe dị ukwuu, ọ bụna ị gaghị eme ya?”20 N’ikpeazu, Naaman rukpuru onwe ya nime Jodan ugboro asaa ma agwọ ya.

Akụkọ Naaman nke a na-echetara anyị ihe egwu dị nime ịhọrọ ụfọdụ akụkụ nke ndụmọdụ onye amụma nke dabara otu echiche anyị, atụmanya anyị ma otu omenala nke taa si wee dị. Onye amụma anyị mgbe niile na-atụrụ anyị aka n’ebe Osimiri nke Jodan anyị nọ ka agwọ anyị.

Okwu ndị kachasị mkpa anyị nwere ike ị nụ, itule n’uche, ma soro, bụ ndị ahụ ekpughere site n’ọnụ onye amụma anyị dị ndụ. A na m agba akaebe na a nọduwo m ọdụ kparịta ụka mụ na Onyeisi Nelson banyere nnukwu ihe ndị ukwuu metụtara Nzukọ nsọ nke a ma nke metụtara ụwa, ma ahụwom m ka mkpughe si nime ya apụta. Ọ mara Onyenwe anyị, ọ mara ụzọ Ya, ma ọ nwere mmasị ka ụmụ niile nke Chineke nụrụ Ya, Onyenwe Jịzọs Kraịst.

Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị na-anụ olu onye amụma nanị ugboro abụọ n’ọgbakọ zuru ọha. Mana dịka otu ụwa siri gbawojuanya n’ụbọchị nke anyị, Onyeisi Nelson na-ekwuzi ugboro ugboro n’ebe niile,21 soshia mida,22 ofufe nro,23 ma mkparita ụka ya na ndị nta akụkọ.24 A huwom ya dịka ọ na-akwado ma na-ekwupụta ozi mkpughe dị ike nke mere ka obi ekele bawaanye, mee ka njikọ ụmụnne ndị nwoke na nwanyị dịkwuo elu, udo abawanye, olileanya, obi ụtọ, ahụike, ma ọgwụgwọ nime ndụ anyị niile.

Onyeisi Nelson nwere onyinye ikwu okwu, mana nke kacha mkpa, ọ bụ onye amụma nke Chineke. Nke ahụ na-eme ka mmadụ maa jijiji mgbe ị chere maka ya, mana ọ dị oke mkpa ị mata na odudu ya nke doro anya ga-egbochi anyị site na nghọgbu, aghụghọ, ma ụzọ niile nke juptara na ụwa taa nke chefuru okpukpere chi.25

Ike nke onye amụma bụ nnọ maka mkpughe. “Mweghachi nke Ozuzu nke Oziọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Emume ncheta Narị Afọ Abụọ nye Ụwa,” nke enyere n’ọgbakọ zuru-ọha Eprel 2020, kwugharịrị na Onyenwe anyị n’edu ọrụ nke a. Nime nkwupụta nke a, ndị otù Ndịisi Mbụ na Kworum nke Ndị Ozi Iri na abụọ kwuru na: “Anyị ji obi ụtọ na-ekwupụta na Mweghachi ahụ ekwere na nkwa na-aga n’ihu site mkpughe na-aga n’ihu. Ụwa agaghị ma ọlị abụrụ otu ọ dị ọzọ, dịka Chineke ga ‘achịkọta n’otu ihe niile n’ime Kraịst’ (Ndị Efesọs 1:10. ”26

“Ihe niile n’ime Kraịst”27 ma “ihe niile nke mkpụrụ obi m”28 bụ ihe Nzukọ nsọ nke a, ihe ọziọma nke a, ma ihe niile ndị mmadụ ndịa pụtara.

A na m emechi site na-ịkpọ okù nye onye ọbụla nime unu ka unu chee maka “ihe niile nke mkpụrụ obi m” nke m kesaara unu taa: hụ Chineke Nna na Jizọs Kraịst n’anya; hụ onye agbataobi gị n’anya; hụ onwe gị n’anya; debe iwu nsọ niile; tozuo oke mgbe niile ijide mpempe akwụkwọ nke tempụl; nwe obi ụtọ ma nọọrụ nụ n’aṅụrị; ma soro onye amụma dị ndụ nke Chineke. A na m akpọku unu ka unu chọpụta nke asatọ, nke itolu na nke iri unu. Chee maka ụzọ ị nwere ike iji kesara ndị ọzọ “ihe ndị” metụtara gị ma gba ha ume ịkpe ekpere, ịtule uche, ma ị chọta odudu nke Onyenwe anyị.

Ihe niile nke mkpụrụ obi m dịịrị m oke ọnụ ahịa dịka otu nke gị siri dịịrị gị. Ihe ndịa na-agba ije ozi nime Nzukọ nsọ nke a ume makwa nime mpaghara niile nke ndụ. Ha na-arara anyị nyefe Jịzọs Kraịst, ha na-echetara anyị maka ọgbụgbandụ anyị niile, ma ha na-enyere anyị aka nwete mmetụta nchekwa nime ogweaka nke Onyenwe anyị. A na m agba ama na Ọ nwere mmasị na mkpụrụ obi anyị “agaghị enwe agụụ mọbụ akpịrị ịkpọ nkụ, mana ọ ga-ejupụta”29 na ịhụnanya Ya dịka anyị na-chọ ị bụ ndị ezigbo ndị n’eso Ya, ị bụ otu anyị na Ya dịka Ọ dị ya na Nna. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Bipụta