Jenụwarị 27–Febụwarị 2: ‘Ọrụ M Ga-aganiihu’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3–5,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3–5,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jenụwarị 27–Febrụwarị 2: “Ọrụ M Ga-aganiihu”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3–5
N’oge afọ mbụ ole ma ole ya dị ka onye amụma nke Onyenwe anyị, Josef Smith amatabeghị ihe niile banyere “ọrụ ebube” akpọworo ya ịrụ. Mana otu ihe nhụmiihe isimbụ ya kuziiri ya bụ na ịrụ ọrụ Chineke, anya ya ahaghị ịbụ “otu nye ebube nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:1, 5). N’ịmatụ, ọ bụrụ na Onyenwe anyị nyere ya ndụmọdụ ime otu ihe na-edoghị ya anya na ọ chọrọ ime, ọ dịrịị mkpa na o sooro ndụmọdụ nke Onyenwe anyị. Ma ọbụna ma o natara “ọtụtụ mkpughe, na … ike ịrụ nnukwu ọrụ,” ọ bụrụ ma o chee na ihe ọ chọrọ ime dị mkpa karịa uche Chineke, ọ haghị ịda” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:4). Mana Josef mụtara otu ihe ọzọ dịkwa nnọọ mkpa banyere ịrụ ọrụ Chineke: “Chineke dị ebere,” ma ọ bụrụ ma Josef chegharịa n’ezie, “a ka chọrọ” ya (amaokwu 10). Ọrụ Chineke bụ, emesịa ihe niile, ọrụ nke mgbapụta. Ma ọrụ ahụ ka “enweghị ike ịda mba” (amaokwu 1).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:1-16
E nwere m ike ịtụkwasị Chineke obi.
Isimbụ nke ije ozi nke Josef Smith, ezigbo ndị enyi rara ahụ ịchọta—kachasị ndị enyi dị ka Martin Harris, nwoke nwere ugwu, bara ọgaraanya onye chụrụ nnukwu aja iji kwadoo ọrụ nke Josef. Ya mere Martin rịọrọ maka ikike igosi ihu akwụkwọ nderenaaka 116 mbụ nke ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn nye nwunye ya, Josef n’onwe ya chọrọ ịkwado arịrịọ ya, ọbụna agbanyeghị Onyenwe anyị adọwo ya aka na ntị megide ya. Dị mwute, ihu akwụkwọ niile ahụ furu efu mgbe ọ nọ n’aka Martin, ma Josef na Martin ka atara ahụhụ nke ukwuu site n’aka Onyenwe anyị (lee Ndị Nsọ, 1:51–53).
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:1–15, tulee ihe Onyenwe anyị chọrọ gị ịmụta site na nhụmiihe ha. N’ịmaatụ, kedụ ihe ị na-amụ banyere:
-
Ọrụ Chineke? (Lee amaokwu 1–3, 16).
-
Nsonazụ nke ịtụ mmadụ egwu karịa ịtụkwasị Chineke obi? (Lee amaokwu 4–8).
-
Ngọzi niile na-abịa site na-ịnọgide ịkwesị ntụkwasị obi? (Lee amaokwu 8).
-
Ụzọ Onyenwe anyị si mezie ma gbaa Josef ume? (Lee amaokwu 9–16).
N’ozi ya “Olee Ụzọ I Chewere Ihu?,” Okenye Lynn G. Robbins nyere ọtụtụ ọmụmaatụ akwụkwọ nsọ nke ndị mmadụ tụrụ egwu Chineke na ndị mmadụ dabara na nkwagide site n’aka ndị ọzọ (Liahona, Nov. 2014, 9–11). Tulee ịgụ ọmụmaatụ ndị a dị niime akwụkwọ nsọ ọ na-arụtụ aka. Kedụ ihe ị na-amụ site na nkọwapụta ndị a? Kedụ nhụmiihe ndị i nweteworo mgbe ị tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị mgbe i zutere nrụgide ime ihe n’ụzọ dị iche? Gịnị bụ nsonaazụ nke omume gị niile?
Lee kwa Dale G. Renlund, “Mkpuchi nye Mkpughe nke Onwe,” Liahona, Nov. 2022, 16–19; “Onyinye niile nke Martin Harris,” niime Ọnọdụ Mkpughe niile (2016), 1–9; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ị na-achọ Isiokwu ma Na-ezere Aghụghọ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “How Gentle God’s Commands,” Hymns, no. 125.
A pụrụ m ijere Chineke ozi jiri obi m, ike, uche, na ume m niile.
Nkeji 4 ka a na-atụnyekarịrị ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge. Kosiladị, ọ bụ ihe dị mmasị ịmata na mkpughe nke a ka enyere Josef Smith Ukwu., onye a naghị akpọ ije ozi mgbasa ozi ọma mana ka nwere “ọchịchọ ijere Chineke ozi” (amaokwu 3).
Otu ụzọ iji gụọ nkeji nke a bụ iwere ya dị ka nkọwa ọrụ maka onye chọrọ inye aka n’ọrụ nke Onyenwe anyị. Gịnị ka Onyenwe anyị na-achọ? Kedụ uru ndị Ọ na-enye?
Kedụ ihe unu na-amụ banyere ijere Onyenwe anyị ozi site na mkpughe nke a?
Onyeisi Russell M. Nelson kpọrọ mkpokọta nke Isreal ihe “aka mgba kachasị ukwuu, ụzọ kachasị ukwuu, na ọrụ kachasị ukwuu n’elu ụwa” (“Olileanya nke Isreal” [ofufe nro ndị ntorobịa zuru ụwa niile, June 3, 2018], Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Gịnị ka ị na-ahụta n’okwu ya nke na-akpatemmụọ gị isonye n’ọrụ nke a?
Site na Mmụọ Nsọ, e nwere m ike inwete aka ebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn.
Na Maachị 1829, nwunye Martin Harris, Lucy, tinyere akwụkwọ n’ụlọ ikpe na Josef Smith naara edufu ndị mmadụ site na-ime ka a ga-asị ọ na-atụgharị asụsụ epekele niile nke ọlaedo (lee ndị Nsọ, 1:56–58). Ya mere Martin arịọ Josef maka ihe aka ebe ndị ọzọ na epekele niile nke ọlaedo ahụ dị adị. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5 bụ mkpughe iji zaghachi arịrịọ nke Martin. Kedụ ihe ị na-amụ site na nkeji nke a banyere ndị a sotere:
-
Ihe Onyenwe anyị kwuru ga-eme ọ bụrụ ma egosipụta epekele niile nke ọlaedo ka ụwa wee hụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:7). Gịnị mere i jiri chee nke ahụ bụ ọnọdụ a?
-
Ọrụ nke ndị aka ebe nime ọrụ nke Onyenwe anyị (lee amaokwu 11-15; lee kwa 2 Ndị kọrịnt 13:1).
-
Otu esi enwete ama nke Akwụkwọ nke Mọmọn maka onwe gị (lee amaokwu 16, 24; lee kwa Moronaị 10:3–5).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:1-10
Jizọs Kraịst nyere anyị okwu Ya site n’aka Josef Smith.
Gịnị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:1-10 na-akuziri gị gbasara ọrụ Josef Smith n’ụbọchi anyị—ma niime ndụ gị? (Lee kwa 2 Nefi 3:6–24.)
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:5–10; 5:21–22
E nwere m ike ịhọrọ ihe ziri ezi mgbe ndị ọzọ na-anwa m ime ihe n’ezighị ezi.
-
Iji malite mkparịta ụka banyere ịmụ ịtụkwasị Nna nke Eluigwe obi, i nwere ike chọọ inyochagharị akụkọ nke ihu akwụkwọ nderenaaka furu efu (lee Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 18-21). I nweziri ike mgbe ahụ mee ejije jiri ọnọdụ ụmụ gị mgbe ọnwụnwa nwere ike ịbịara ha ime ihe ha maara na-ezighị ezi. Kedụ mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:5-8; 5:21-22 nwere ike inyere ha aka n’ọnọdụ ndị a?
Onyenwe anyị na-akpọku m inye aka n’ọrụ Ya.
-
Amaokwu ọbụla dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4 nwere niime ya eziokwu ndị dị bara oké uru nwere ike inyere ụmụ gị aka mụọ banyere ijere Chineke ozi. Ebe a bụ ụfọdụ nchepụta iji nyere ha aka chọpụta eziokwu ndị a:
-
I nwere ike gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:1 ọnụ ma gosi foto ndị na-egosi ọrụ ụbọchi ikpeazụ a “dị ebube” (dị ka ndị mgbasa ozi ọma, tempụl niile, na Akwụkwọ nke Mọmọn).
-
Ụmụ gị nwere ike chee maka omume niile ma ọ bụ see foto na-egosi nkebiokwu a “jeere ya ozi jiri obi gị niile, ike, uche, na ume” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:2).
-
Unu nwere ike lekọọ anya na ngwa ọrụ niile eji arụ ọrụ n’ubi ama. Olee otu ngwa ọrụ ndị a si enyere anyị aka? Emesịa ụmụ gị nwere ike chọta ụmụ ihe niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ 4:5-6 ndị dị ka ngwa ọrụ maka ịrụ ọrụ Chineke.
-
Ụmụntakịrị ndị tolitere nwere ike nyochagharịa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4 n’onwe ha ma depụta ihe ndị ha mụrụ banyere ihe ọ pụtara ijere Chineke ozi.
-
Unu nwere ike gụkọta egwu gbasara ọrụ mgbasa ozi ọma ọnụ, dị ka “A chọrọ m Ịbụ Onye mgbasa ozi ọma Ugbu a” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 168).
-
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5: 1–7, 11, 16, 23–24
E nwere m ike ị bụ onye aka ebe na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu.
-
Iji kuziere ụmụ gị ihe banyere ndị aka ebe, i nwere ike gwa ha iche n’obi ha na otu enyi gwara ha na ha hụrụ pusi ji ụkwụ ihu ya n’aga ije. Ha ga-ekwere ya? Ọ bụrụkwanụ na otu enyi ọzọ kwuo otu ụdị ihe ahụ kwanụ? Kwuo banyere ihe onye aka ebe bụ na ihe kpatara ndị aka ebe jiri dị mkpa. Inweziri ike nyere ụmụ gị aka nyochagharịa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:1-3, 7, 11 maka azịza niile nye ajụjụ dị ka ndịa:
-
Gịnị ka Martin Harris chọrọ ịmata?
-
Onye ka Josef Smith nwere ike igosi epekele niile nke ọlaedo ahụ?
-
Gịnị mere ịhụ epekele niile ahụ eleghị anya agaghị edo onye ọbụla anya na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu?
-
Kedụ ihe anyị nwere ike ime iji bụrụ ndị aka ebe Akwụkwọ nke Mọmọn? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 5:16; Moronaị 10:3–5).
-