“Febụwarị 10–16: ‘Ka I Wee Pụta Onye mmeri’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10–9,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10–11,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Febụwarị 10–16: “Ka I Wee Pụta Onye mmeri”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10–11
Dị ka ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn garaniihu, otu ajụjụ pụtara: Gịnị ka Josef Smith na Oliver Cowdery ga-eme banyere ihu akwụkwọ nke ntụgharị asụsụ ndị ahụ furu efu? O nwere ike ịbụ ezi uche ịtụgharịgharị akụkụ nke ahụ, mana Onyenwe anyị hụrụ ihe ha enweghị ike: ndị iro ha naara atụ atụmatụ ịgbanwe mkpụrụokwu dị na ihu akwụkwọ ndị ahụ iji tinye obi abụọ n’ọrụ mkpatemmụọ nke Josef. Chineke nwere otu atụmatụ iji zere nsogbu ahụ ma mee ka ọrụ ahụ na-aganiihu. Afọ puku kwuru puku isimbụ, Chineke kpateremmụọ Nefi ide ndekọihe nke abụọ nke kwukwara otu ụdị ihe n’oge ahụ kwa “niihi nzube nwere amamiihe niime Ya” (1 Nefi 9:5).
“Amamiihe m,” ka Onyenwe anyị gwara Josef, “karịrị aghụghọ nke ekwensu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:43). Nke ahụ bụ ozi na-enye mgbam ume n’ụbọchi dị ka nke anyị, mgbe onye iro na-amụbawanye mgbalị ya iji mee ka okwukwe ghara isi ike. Dị ka Josef, anyị pụrụ “ikwesị ntụkwasị obi ma gaaniihu esepụghị aka” n’ọrụ nke Chineke kpọworo anyị ịrụ (amaokwu nke 3). Mgbe ahụ anyị ga-ahụ na Ọ weteworịị ụzọ ka “ọnụ ụzọ ama nke ala mmụọ ghara imeri” megide anyị (amaokwu nke 69).
Lee Ndị nsọ, 1:51–61.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:1–33
Chineke “agaghị ekwe na Setan ga-emejupụta atụmatụ ọjọọ ya.”
Ọ ga-akara Setan mma ka anyị chefuo na ọ dị adị—ma ọ bụ na anyị opekampe ghara ịmata mbọ ya niile i na-emetụta anyị (lee 2 Nefi 28:22–23). Mana okwu niile nke Onyenwe anyị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10 kwetere na Setan dị adị—ma ọ na-arụsị ọrụ ike imegide ọrụ nke Onyenwe anyị. Niime amaokwu 1–33, chọpụta ihe Chineke maara banyere mgbalị niile nke Setan (lee kwa amaokwu 62–63). I nwere ike rio Onyenwe anyị inyere gị aka hụta otu Setan nwere ike isi na-anwa gị. Dị ka ị na-agụ nkeji nke 10, tulee otu Onye Nzọpụta nwere ike isi nyere gị aka guzogide mgbalị Setan niile.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:34–52
“Amamiihe nke Onyenwe anyị karịrị aghụghọ nke ekwensu.”
Nefi amaghị ihe kpatara o si nwee mkpatemmụọ i me mkpi ndekọihe nke ndị ya. Ma Mọmọn amaghị ihe kpatara o si nwee mkpatemmụọ ịgụnyekọta mkpi nke abụọ ahụ n’epekele niile nke ọlaedo. Mana ndị amụma abụọ a tụkwasịrị obi na Chineke nwere “nzube amamiihe” (1 Nefi 9:5; Okwu niile nke Mọmọn 1:7). Taa anyị maara opekempe akụkụ nke nzube ahụ: iji dochie ihu akwụkwọ 116 nke Akwụkwọ nke Mọmọn ahụ furu efu. Gịnị ka i chere Onyenwe anyị chọrọ ka ị mụta site n’ihe nke a niile? Tulee ajụjụ ahụ dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:34–52. I nwekwara ike mee ndepụta nke eziokwu ndị ị mụtara banyere Onyenwe anyị site na amaokwu ndị a. Olee otu eziokwu ndị a si emetụta mmekọrịta gị na Ya? Gịnị na-amasị gị banyere amamiihe na atụmanya nke Onyenwe anyị na-ịkwado maka ofufu nke ihu akwụkwọ 116 ahụ?
I nwekwara ike nwee mkpatemmụọ ịchọ ihe aka ebe nke amamiihe na atụmanya Ya niime ndụ gị. Gụọ nkọwapụta ndị dị niime ozi Okenye Ronald A. Rasband “Site N’atụmatụ Si na chi”—ha nwere ike wete ihe ọmụmaatụ nye uche gị (Liahona, Nov. 2017, 55–57) Tulee idedata ha dị ka ha na-abịara gị. Olee otu Onyenwe anyị si na-arụ ọrụ niime ndụ gị? N’ịmaatụ, kedụ “ọdakọ niile” Ọ kwadoworo? Kedụ ntọala ndị o tọworo maka ngọzi gị niile? Kedụ mgbe O duworo gị ilekọta onye nọ na mkpa?
Lee kwa Ndị Rom 8:28; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Atụmatụ nke Nzọpụta,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
“Tinye ntụkwasị obi gị niime Mmụọ [nke Onyenwe anyị].”
Hyrum nwanne nwoke Josef nke nnukwu dị njikere ịmata uche Onyenwe anyị maka ya, ya mere ọ rịọrọ Josef ịchọ mkpughe n’aha ya. Obi tọrọ Onye amụma ahụ ụtọ ime otu ahụ, mana opekempe otu ozi niime mkpughe ahụ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11) bụ na Hyrum nwekwara ike ịchọ mkpughe n’onwe ya. Ma otu ahụ ka “ndị nile nwere ọchịchọ dị mma, ma na-atụbawo kwa nma iwe ihe ubi ha ka ha ghọọ” (amaokwu nke 27). Dị ka ị na-agụ nkeji nke 11, gịnị ka i chere Onyenwe anyị na-akuziri gị banyere mkpughe nke onwe? Olee otu nke a si emetụta ihe Ọ kuziiri Oliver Cowdery niime nkeji nke 6–9? Kedụ ozi ndị ọzọ O nwere maka gị?
Lee kwa “Kwe ka Mmụọ Nsọ Duo,” Abụ niile, no. 143.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:15–26
Dị ka m na-achọ “inwete okwu [nke Chineke],” aga m anata Mmụọ na ike Ya.
Ọbụna tupu atụgharịa Akwụkwọ nke Mọmọn, Hyrum Smith chọsịrị ike inye aka n’ọrụ nke Mweghachite. Dị ka ị na-agụ azịza nke Onyenwe anyị nye ọchịchọ ya niile, tulee ihe ọ pụtara “inwete okwu [nke Chineke]” (amaokwu nke 21) Olee otu i na-enwete okwu nke Chineke si enyere gị aka iji ike jeere Ya ozi?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5
Dị ka m na-ekpe ekpere mgbe niile, ana m anata ume sitere na Chineke.
-
Ịkọwara ụmụ gị amaokwu nke a, i nwere ike jụọ ha banyere ihe ndị ha na-eme “mgbe niile”. Gịnị ka Onyenwe anyị na-ekwu n’anyị kwesịrị ịdị na-eme mgbe niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5? Gịnị mere O si na-achọ anyị ime nke a?
-
Olee otu i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka cheta ikpe ekpere mgbe niile? Enwere ike ha atụtụkọta obere okwute ole ma ole dị mụrụmụrụ ma tee ha agba “Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5” ma ọ bụ “Kpee ekpere Mgbe niile.” Ha nwere ike tinye okwute ha n’ebe dị iche iche ebe ha ga-achọ ka echetere ha ikpe ekpere, dị ka na akụkụ akwa ha, ya na akwụkwọ ụlọ akwụkwọ ha, ma ọ bụ ebe ha na-anọ eri nri. Dị ka otu Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:5 siri dị, olee otu Chineke si agọzi anyị mgbe anyị kpere ekpere? Ụmụ gị nwere ike chọta azịza ndị agbakwunyere niime egwu dị ka “Ekpere nke Nwata” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 13).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:12–13
Mmụọ Nsọ na-edu m ime ihe ọma.
-
Ụmụntakịrị nwere ike mụọ ịmata mgbe Mmụọ na-agwa ha okwu. Inyere ha aka, i nwere ike zoo bọọbụ ọkụ ma ọ bụ tọọchị na otu foto nke ihu nwere obi ụtọ otu ebe niime ọnụ ụlọ; emesịa gwa ụmụ gị ịchọta ihe ndị a. Gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:13, ma nyere ụmụ gị aka mata mkpụrụokwu ndị metụtara ihe ndị ha chọtara. Gịnị ka mkpụrụokwu ndị a na-akuzi banyere otu Mmụọ Nsọ si enyere anyị aka?
-
Ikekọrịta nhụmiihe ime mmụọ gị nwere ike inyere ụmụ gị aka mata mmetụta nke Mmụọ Nsọ niime ndụ ha. Dị ka ị na-ekekọrịta, rịọ ha ikekọrịta nhụmiihe ha kwa. Unu nwere ike gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:12-13ọnụ, na-achọ maka otu anyị nwere ike i si mata mgbe Mmụọ Nsọ na-edu anyị. Gbaa ama na Nna nke Eluigwe chọrọ idu anyị site na Mmụọ Nsọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:21, 26
E kwesịrị m ị ma ozi ọma ka m nwee ike nyere ndị ọzọ aka chọta eziokwu.
-
Dị nnọọ ka Hyrum Smith, ụmụ gị eleghị anya ga-enwe ọtụtụ ohere iji kesaara ndị ọzọ ozi ọma. Unu nwere ike gụkọrịta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:21, 26 ọnụ ma rịọ ụmụ unu ịchọta ihe Onyenwe anyị gwara Hyrum na o kwesịrị i me ka o wee nwee ike kuzie ozi ọma. Gịnị ka ọ pụtara “inwete” okwu nke Chineke? Olee otu anyị nwere ike i si eme nke a? Olee otu anyị si “edokwa” okwu nke Chineke niime obi anyị? Eleghị anya ụmụ unu nwere ike ime ejije ikekọrịta ihe banyere Jizọs Kraịst ma ọ bụ Akwụkwọ nke Mọmọn ha na ndị ọzọ.