Come, Follow Me
Febụwarị 17–23: “N’isi Unu Ụmụ Odibo Ibe M”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12–17; Josef Smith—Agụgụala 1:66–75


“Febụwarị 17–23: ‘N’isi Unu Ụmụ Odibo Ibe M’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12–17; Josef Smith—Agụgụala 1:66–75,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12–17; Josef Smith—Agụgụala 1:66–75,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Osimiri Susquehanna

Osimiri Susquehanna dị nso na Harmony, Pennsylvania

Febụwarị 17–23: “N’isi Unu Ụmụ Odibo Ibe M”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12–17; Josef Smith—Agụgụala 1:66–75

Ọtụtụ mmadụ gburugburu ụwa eleghị anya anụtụbeghị maka Harmony, Pennsylvania. Onyenwe anyị na-ahọkarị ebe dị nwayọọ maka ihe omume ndị kachasị pụọ iche niime alaeze Ya. Na mpaghara jupụtara na osisi dị nso na Harmony na Me 15, 1829, Jọn Omee Baptizim pụtara ihé n’ebe Josef Smith na Oliver Cowdery nọ. Ọ tụkwasịrị aka ya n’elu isi ha ma nyefee Ọkwa nchụaja nke Erọn n’isi ha, na-akpọ ha “ụmụ odibo ibe m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1).

Jọn Omee Baptizim bụ nwa odibo nke Chineke pụrụ ịtụkwasị obi onye mere Onye Nzọpụta baptizim ma kwadoo ụzọ maka ọbịbịa Ya (lee Matiu 3:1–6, 13–17). Nye ndịikom nta abụọ ndịa nọ n’afọ iri abụọ na ụma ha, ọ ga-abụrịrị ihe dị umeala, elemaanya ọbụna ihe dị ukwuu, ịbụ onye akpọrọ nwa odibo ibe Jọn. N’oge ahụ, Josef na Oliver ka a na-amachaghị, dị ka otu Harmony dị. Mana ije ozi n’ọrụ Chineke abụrụworịị banyere otu anyị si eje ozi, abụghị gbasara onye matara. Agbanyeghị otu ịdị obere ma ọ bụ ahụtaghị onyinye gị nwere ike ịdị oge ụfọdụ, gị nwakwa bụ nwa odibo ibe “n’ọrụ dị ukwuu ma dị ịtụnaanya” nke Onyenwe anyị (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:1).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12; 14

E nwere m ike isoro “n’ọrụ dị ukwuu ma dị ịtụnaanya” nke Chineke.

Josef Knight na Devid Whitmer ha abụọ chọbuuru ịma otu ha nwere ike i si nye aka n’ọrụ nke Onyenwe anyị. Dị ka ị na-agụ azịza nke Onyenwe anyị nye ha (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12; 14), chee echiche banyere ihe ọ pụtara nye gị “iweta niihu ma hiwe ụzọ nke Zayọn” (12:6; lee kwa 14:6). Kedụ ụkpụrụ niile na njirimara ịdị ka Kraịst ndị ị na-ahụ niime nkeji ndịa nke nwere ike i nyere gị aka mee nke a?

Lee kwa “ndị Ezi na ụlọ Knight na Whitmer,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 20-24.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13

Jizọs Kraịst zigara Jọn Omee Baptizm iweghachite Ọkwa nchụaja nke Erọn.

Jọn Omee Baptizm kpọrọ Josef Smith na Oliver Cowdery “ụmụ odibo ibe” ya. Kedụ ihe i chere na ọ pụtara ị bụ nwa odibo ibe Jọn Omee Baptizm? (Lee Matiu 3:13–17; Luk 1:13–17; 3:2–20).

Dị ka ị na-agụ ihe Jọn Omee Baptizm kwuru banyere Ọkwa nchụaja nke Erọn niime nkeji 13, tulee otu ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja nke a si enye aka mejupụta ije ozi nke Jọn iji kwadoo ụzọ nke Onyenwe anyị. N’ịmaatụ:

Olee otu emume nsọ niile nke Ọkwa nchụaja nke Erọn (dị ka baptizim na oriri nsọ) si enye aka kwadoo ụzọ maka gị ịnata Onye Nzọpụta niime ndụ gị?

Gịnị bụ ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja?

Okenye Dale G. Renlund na nwunye ya, Ruth, nyere nkọwa nke a banyere ọtụghe ọkwa nchụaja niile:

Okwu ahụ ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ka a na-eji n’ụzọ abụọ dị iche iche. Nke mbụ na-arụtụ aka na ikike ma ọ bụ ohere a kpọrọ aha enyefere n’isi ndị niile natara Ọkwa nchụaja nke Erọn ma ọ bụ Melkizedek. … N’ịmaatụ, ndị ji Ọkwa nchụaja nke Erọn na-anata ọtụghe niile nke ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi na ọtụghe niile nke nkwadobe ozi ọma nke nchegharị na nke baptizim site na nrukpu maka mgbaghara mmehie niile (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13:1; 84:26-27). Ndị ji Ọkwa nchụaja Melkizedek na-anata ọtụghe nke ihe omimi niile nke alaeze, ọtụghe nke mmata ihe nke Chineke, na ọtụghe niile nke ngọzi ime mmụọ niile nke Nzukọ nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19; 107:18. …

“Ụzọ nke abụọ e si eji okwu ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja eme ihe na-arụtụ aka na odudu. Ndị ndu ọkwa nchụaja na-anata ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja agbakwunyere, ikike iduzi otu ngalaba nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ otu kworum. Gbasara nke a, ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike na ike ịtụziaka, idu, ma chịa niime Nzukọ nsọ” (Ọkwa nchụaja Melkizedek: Ịghọta Ozizi, Ibi ndụ Ụkpụrụ niile [2018], 26).

Josef Smith na-eme Oliver Cowdery baptizim

Josef Smith e mee Oliver Cowdery baptizim, site n’aka Del Parson

Josef Smith—Agụgụala 1:66-75

akara ngosi semịnarị
Emume nsọ niile na-enye m ohere ruo n’ike Chineke.

Ichetuwo echiche otu ọ gaara adị ka ya ịnọ gị na Josef Smith na Oliver Cowdery maka isi emume niile nke Mweghachite ahụ? Dị ka ị na-agụ Josef Smith—Agụgụala 1:66-75, tinyekọta nkọwa dị na ngwụcha nke amaokwu 71, i nwere ike ghọta opekempe ụfọdụ mmetụta ha nwere. Kedụ ihe na-emetụta gị banyere okwu ndịa? Hụba ama, tụmadị, ngọzi niile ha natara niihi na ha natara ọkwa nchụaja ma e mee ha baptizim. Kedụ ngọzi ndị Onye Nzọpụta nyeworo gị site n’emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja?

Ịmụtakwu ọzọ, tulee ikepụta tebụlụ nwere isiokwu ndị a Emume nsọ niile na Ngọzi niile. Emesịa i nwere ike nyochagharịa akwụkwọ nsọ niile dị ka ndị a iji depụta emume nsọ niile na ngọzi niile na-abịa site na ha: Jọn 14:26; Ọrụ 2:38; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–22; 131:1–4; Josef Smith—Agụgụala 1:73–74. Kedụ ngọzi ndị ọzọ I nwere ike ịgbakwunye na ndepụta a? Kedụ otu emume nsọ niile ị nataworo si wete ike nke Onye Nzọpụta niime ndụ gị?

Lee kwa Devid A. Bednar, “Site n’Ike Chineke n’Ebube Dị Ukwuu,” Liahona, Nov. 2021, 28–30; Ndị nsọ, 1:65–68; “Chineke nke Ike, Chineke nke Ziri ezi,” Abụ niile, no. 20; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọgbụgba ndụ niile na Emume nsọ niile,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15-16

Ịkpọta mkpụrụ obi nye Kraịst bụ ihe dị oke ọnụ ahịa.

Enwewo mgbe ituleworo, dị ka Jọn na Pita Whitmer mere, gịnị “ga-abụ ihe kachasị dị oke ọnụ ahịa” niime ndụ gị? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:4; 16:4). Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15–16, tulee ihe kpatara ịkpọta mkpụrụ obi nye Kraịst si dị oke ọnụ ahịa. Gịnị ka ị na-eme iji “kpọta mkpụrụ obi” nye Kraịst?

Lee kwa Ndị Nsọ, 1:68–71.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 17

Onyenwe anyị na-eji ndị aka ebe iji hiwe okwu Ya.

Gịnị bụ onye aka ebe? Gịnị kpatara Onyenwe anyị si eji ndị aka ebe n’ọrụ Ya? (lee 2 Ndị Kọrịnt 13:1). Tulee ajụjụ ndị a dị ka ị na-agụ okwu Chineke niile nye Ndị Aka ebe Atọ dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 17. (Lee kwa “Ama nke Ndị Aka ebe Atọ” dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn. Kedụ otu ndị aka ebe si enye aka weta “nzube ezi omume niile” nke Chineke? (amaokwu 4).

Kedụ ihe i nwere ike ịgba aka ebe maka ya?

Lee kwa Ndị nsọ, 1:73–75; “Ụbọchi maka Ebighị ebi niile” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

23:9

A Day for the Eternities

This film features the experiences of David Whitmer as Joseph Smith and Oliver Cowdery stay with his family in Fayette, New York, to finish the translation of the Book of Mormon.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13; Josef Smith—Agụgụala 1:68–74

Jọn Omee Baptizm weghachitere Ọkwa nchụaja nke Erọn.

  • Ọrụnka ahụ dị niime ndepụta nke a nwere ike inyere ụmụ gị aka jiri anya nke uche hụ mweghachite nke Ọkwa nchụaja nke Erọn (lee kwa “Isi nke 6: Josef na Oliver Ka Enyere Ọkwa nchụaja,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 26–27, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Ha ga-enwe obi ụtọ na-ise ihe osise foto nke ihe omume dabeere na ihe gị na ha gụrụ niime Josef Smith—Agụgụala 1:68–74?

    2:20

    Chapter 6: Joseph and Oliver Are Given the Priesthood: May 1829

  • I nwekwara ike gosi otu foto nke Jọn Omee Baptizim mgbe unu na-agụkọta ọnụ Matiu 3:13–17; Josef Smith—Agụgụala 1:68–70. Gịnị mere o jiri dị mkpa na Onyenwe anyị zigara Jọn Omee Baptizim inye Josef Smith ikike ọkwa nchụaja ime baptizim?

Kwadoo ụmụ gị maka oge ndụ n’ụzọ ọgbụgba ndụ nke Chineke. Maka nchepụta ndị ọzọ iji nyere ụmụ gị aka mụta banyere ike, ikike, na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, lee appendix A ma ọ bụ appendix B.

Jọn Omee Baptizim na-eme Jizọs Kraịst baptizim

Ngosipụta ebe a na-eme Jizọs baptizim, site n’aka Dan Burr

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13

Nna nke Eluigwe na-agọzi m site na Ọkwa nchụaja nke Erọn.

  • Ịkpalite mkparịta ụka banyere ọtụghe niile ekwuru niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13, gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na otu ọyọ ọtụghe ma kwuo banyere ihe ọtụghe niile na-ekwe anyị ime. E nwere ike gị enyere ha aka chọta mkpụrụ okwu ahụ ọtụghe niile niime nkeji 13. Kedụ mkpụrụ okwu ma ọ bụ nkebiokwu ndị ọzọ dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 13 na-akọwa ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja nke Erọn? Ụmụ gị nwekwara ike chọta ụzọ ndị Nna nke Eluigwe si agọzi anyị site na ọkwa nchụaja niime vidiyo “Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

3:4

Blessings of the Priesthood

The priesthood is the power of God, which is given to man to act in His name.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:4–6; 16:4–6

Inyere ndị ọzọ aka bịakwute Jizọs Kraịst bụ “nke kachasị oke ọnụ ahịa.”

  • Jọn na Pita Whitmer chọbuuru ịma ihe ga-abụ nke kachasị oke ọnụ ahịa nye ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:4; 16:4). Enwere ike gị na ụmụ gị ekwuo okwu banyere ihe ndị dị oke ọnụ ahịa nye unu. Dị ka unu na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 15:6 ma ọ bụ 16:6, gwa ụmụ gị ka ha welie aka ha mgbe ha nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru bụ “nke kachasị oke ọnụ ahịa.”

  • Gịnị ka ọ pụtara bụ “ịkpọta mkpụrụ obi niile nye [Jizọs Kraịst]”? Nyere ụmụ gị aka depụta nchepụta niile, dị ka ịbụ enyi nye ndị ọzọ, ikesa akwụkwọ nsọ nye otu enyi, ma ọ bụ ikpere onye nọ na mkpa ekpere. Ụmụ gị nwere ike chọgharịa foto nke ihe ndị a niime magazin niile nke Nzukọ nsọ ma ọ bụ Akwụkwọ Nka Ozi ọma. Ma ọ bụ ha nwere ike see foto onwe ha n’ihe osise. Kpọkuo ha ịhọrọ ihe site na nhọrọ ha ga-eme. Unu nwekwara ike gụkọọ amaokwu nke anọ nke “Ana M Enwe Mmetụta Ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta M” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 74–75).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 17

E nwere m ike ị bụ onye aka ebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

  • Isi nke 7: Ndị Aka ebe Hụrụ Epekele niile nke Ọlaedo” (niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 31–33, ma ọ bụ vidiyo kwekọrọ niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma) nwere ike inyere ụmụ gị aka mụọ ihe banyere Ndị Aka ebe Atọ. Mgbe ị gụsịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 17:5–6, gwa ụmụ gị otu i si mara na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu. Olee otu anyị nwere ike i si bụrụ ndị aka ebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn?

    2:7

    Chapter 7: Witnesses See the Gold Plates: 1829–1830

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Josef na Oliver na-anata Ọkwa nchụaja nke Erọn site n’aka Jọn Omee Baptizim

N’isi Unu Ụmụ Odibo Ibe M, site n’aka Linda Curley Christensen

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị