Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Ndị Akaebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn


“Olu niile nke Mweghachite: Ndị Akaebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ndị Akaebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akara ngosi nke olu niile nke mweghachite

Olu niile nke Mweghachite

Ndị Akaebe nke Akwụkwọ nke Mọmọn

Mmụọ ozi ahụ Moronaị gosiri Josef Smith, Oliver Cowdery, Devid Whitmer, na Martin Harris epekele niile nke ọlaedo n’ọdọ osisi dị n’akụkụ ebe obibi Whitmer dị na Fayette, New York. Ndị nne na nna Josef gara ileta ndị Whitmer n’oge ahụ. Lucy Mack Smith, nne Josef, kọwara mmetụta nhụmiihe nke a dị ebube nwere n’isi ndị aka ebe ahụ:

“Ọ bụ n’etiti elekere atọ na anọ. Oriakụ Whitmer na Maazi. Smith na mụ onwe m nọdụrụ ọdụ niime ụlọ ebe a na-arahụ ụra. A nọdụrụ m n’akụkụ akwa. Mgbe Josef batara, ọ tụdara onwe ya n’akụkụ m. ‘Nna! Nne!’ ka o kwuru. ‘Unu amaghị ụdị obi ụtọ m nwere. Onyenwe anyị emewo ka egosi mmadụ atọ ndị ọzọ epekele niile karịa mụ onwe m, ndị huwokwara mmụọ ozi ma gakwa agba ama eziokwu nke ihe ndị m kwuworo. Niihi na ha maara n’onwe ha na m anaghị agagharị gburugburu na-eduhie ndị mmadụ. Ma ọ na-adị m ka e bupụrụ m oke ibu arọ, nke dịịrị m oke ukwuu ịnagide. Mana ugbu a ha ga-eso ebu otu akụkụ, ma ọ na-enye mkpụrụ obi m ańụrị na m agaghịkwa anọ naanị m niime ụwa.’ Emesịa Martin Harris batara. Ọ dịkwara nnọọ ka o juputara n’oke ọńụ karịrị akarị. Emesịa ọ gbara ama n’ihe ọ hụworo ma nụ, dịkwa ka ndị ọzọ mere, Oliver na Devid. Ama ha bụ otu ụdị n’ọkpụrụkpụ dị ka nke ahụ dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn. …

“Martin Harris n’onwe ya dịịrị ka na o nweghị ike kpamkpam ikwupụta mmetụta ya na mkpụrụokwu. O kwuru, ‘Ugbua a hụwo m onye mmụọ ozi sitere N’eluigwe onye nke n’ezie gbaworo ama banyere eziokwu nke ihe niile m nụworo gbasara ndekọihe ahụ, ma anya m ahụwo ya. Elewokwam anya n’epekele niile ahụ ma jide ha n’aka m ma nwere ike ịgba ama nke ahụ nye ụwa dum. Mana anatawo m nye onwe m aka ebe nke mkpụrụokwu na-enweghị ike ịkọwa, nke na-enweghị ire pụrụ ịkọwa, ma ana m eto Chineke n’eziokwu nke mkpụrụ obi m na ọ rịdatawo ime m, ọbụna mụ, onye aka ebe nke ịdị ukwuu nke ọrụ na atụmatụ ya niile n’aha [nke] ụmụ mmadụ.’ Oliver na Devid sonyekwara ya n’otito ime mmụọ nye Chineke maka ịdị mma na ebere ya. Anyị lọghachiri n’ebe obibi [na Palmyra, New York,] ụbọchi sotere dị ka otù nwere obi ụtọ, na-ańụrị ọnụ.”

Oliver Cowdery, Devid Whitmer, na Martin Harris

Oliver Cowdery, Devid Whitmer, na Martin Harris

Lucy Mack Smith nọkwaya mgbe Ndị Aka ebe Asatọ lọghachiri site na nhụmiihe ha:

A painting depicting Lucy Mack Smith, mother of Joseph Smith.

“Mgbe ndị aka ebe ndị a lọghachiri n’ụlọ, onye mmụọ ozi ọzọkwa pụtara n’ihu Josef; n’oge nke Josef nyefere epekele niile ahụ n’aka ya. Na mgbede ahụ anyị nwere nzukọ, ebe ndị aka ebe niile gbara ama eziokwu dị ka edepụtara n’elu; ma ndị ezi na ụlọ anyị niile, ọbụna ruo Don Carlos [Smith], onye gbara naanị afọ 14, gbara ama eziokwu nke ọgbọ ụbọchi ikpeazụ a—na ewebatara ya mgbe ahụ n’uju.”

ọpịpịa osisi nke Josef Smith na Ndị Aka ebe Asatọ

Ọpịpịa osisi nke Josef Smith na Ndị Aka ebe Asatọ

Na mgbakwunye nye Ndị Aka ebe Atọ na Ndị Aka ebe Asatọ, Meri Whitmer, nne Devid Whitmer, ka a gọzikwara ịbụ onye akaebe nke epekele niile nke ọlaedo ahụ. Onye mmụọ ozi Moronaị gosiri ya ha dị ka ihe nnakwere nke aja niile ọ chụrụ ebe Josef, Emma, na Oliver biiri n’ebe obibi ya. “I kwesiwo ntụkwasị obi ma na-arụsị ọrụ gị ike,” ka Moronaị gwara ya. “Ọ bụ ihe ziri ezi, ya mere, na ị ga-anata ihe aka ebe ka okwukwe gị wee nwete mgbam ume.”

Hụba ama

  1. Lucy Mack Smith, Agụgụala, 1844–1845, akwụkwọ 8, 11 ruo na akwụkwọ 9, 1, josephsmithpapers.org; mkpụrụedemede ukwu na akara edemede ka-emegharịrị ịdị ọhụrụ.

  2. Lucy Mack Smith, Agụgụala, 1845, 156–57, josephsmithpapers.org.

  3. Niime Ndị Nsọ, 1:70-71.