Come, Follow Me
Febụwarị 3–9: “Nke a Bụ Mmụọ nke Mkpughe”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6-9


“Febrụwarị 3–9: ‘Nke a Bụ Mmụọ nke Mkpughe’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6–9,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6–9,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025

oyiyi nke Oliver Cowdery ji mkpịsị odee na-ede ihe

Febrụwarị 3–9: “Nke a Bụ Mmụọ nke Mkpughe”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6–9

N’oge fall nke 1828, onye nkuzi ụlọakwụkwọ nta akpọrọ Oliver Cowdery naara ọrụ nkuzi na Manchester, New York, ma nọrọ na ezi na ụlọ Lucy na Josef Smith Ukwu. Oliver anụwo ihe banyere nwa ha nwoke Josef na nhụmiihe ya ndị pụrụ iche, ma Oliver, onye kpọrọ onwe ya onye na-achọ eziokwu, chọburu ị makwu karịa. Ezi na ụlọ Smith kọwara nleta niile sitere n’aka ndị mmụọ ozi, ndekọihe mgbe ochie, na onyinye ịtụgharị asụsụ site n’ike nke Chineke. Oliver nwere mmasị na ya. O nwere ike ị bụ eziokwu? Lucy na Josef Ukwu nyere ya ndụmọdụ nke metụtara onye ọbụla na-achọ eziokwu: kpee ekpere ma jụọ Onyenwe anyị.

Oliver mere, ma Onyenwe anyị zara, na-ekwu “udo niime obi [ya]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:23). Mkpughe, Oliver chọpụtara, abụghị nnọọ maka ndị amụma dị ka Josef Smith. Ọ bụ maka onye ọbụla chọrọ ya ma na-achọsi ya ike. Oliver ka nwere ọtụtụ ihe ịmụ, mana ọ maara nke ọma iji gaa nzọụkwụ nke n’esote. Ọ maara na Onyenwe anyị nọ na-eme ihe dị mkpa site n’aka Josef Smith, ma Oliver chọrọ i so na ya.

Lee kwa Ndị nsọ, 1:58–64; “Days of Harmony” (video), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

25:0

Days of Harmony

Witness Oliver Cowdery’s experience as Joseph Smith’s scribe during the translation of the Book of Mormon.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6; 8–9

akara ngosi semịnarị
Nna nke Eluigwe na-agwa m okwu site na Mmụọ Nsọ.

N’oge spring nke 1829, Oliver Cowdery wepụtara onwe ya ịbụ ode akwụkwọ nke Josef Smith dị ka ọ garaniihu ịtụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Nhụmiihe ahụ nyere ya obi ụtọ, ma o juru ya anya ma o nwekwara ike ịnata mkpughe na onyinye nke ntụgharị asụsụ. Nnwale mbụ ya, na-agbanyeghị, agaghị nke ọma.

Ọ bụrụ ma ị gbawo mbọ ịnata ma ọ bụ ghọta mkpughe, ikekwe i nwere ike ghọta nhụmiihe nke Oliver—ma mụta ihe site na ya. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6, 8, na 9, mata ihe Onyenwe anyị kuziiri Oliver banyere mkpughe nke onwe. N’ịmaatụ:

Nhụmiihe nke Oliver nwere ike mee gị “itinye uche gị” n’oge niile mgbe i nweteworo mmetụta na Onyenwe anyị na-agwa gị okwu (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22). Ị dedatuwo echiche gị ma ọ bụ mmetụta gị niile banyere nhụmiihe ndịa? Ya bụrụ otu ahụ, tulee ịgụ ihe i dere. Ma ọ bụghị, were nwa oge iji dedata ihe i chetara. Tulee otu i nwere ike i si gaaniihu ịnata ike site na nhụmiihe ndịa. Maka ụfọdụ nchepụta, lee ozi nke Okenye Neil L. Andersen “Ncheta ndị Na-enwe nkọwa Ime mmụọ” (Liahona, Me 2020, 18–22).

Ọtụtụ ndị ndu Nzukọ nsọ ekesawo nhụmiihe ha jiri mkpughe dị niime nchịkọta vidiyo “Nụrụ Ya”. Mgbe elechara vidiyo otu ma ọ bụ karịa nke ndị a, i nwere ike nwee mmetụta mkpatemmụọ idetu nhụmiihe nke onwe gị niile, na-akọ otu Onyenwe anyị siworo gwa gị okwu.

Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mkpughe Nke onwe,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Onyinye nke Oliver Cowdery,” dị niime Revelations in Context, 15–19.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:18–21, 29–37

Lekwasịnụ Kraịst anya n’echiche ọbụla.

Onyenwe anyị maara na Josef Smith ga-agabiga “ọnọdụ ndị siri ike” n’afọ ndị na-abịa abịa (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:18). Ọ maara ụdị mnwale ndị nọkwa n’ọdịniihu gị. Gịnị ka ị na-ahụ na ndụmọdụ Ya nye Josef na Oliver niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:18–21, 29–37 nke na-enyere gị aka ịtụkwasị obi na Ya?

Kedụ ihe i chere ọ pụtara “ilekwasị anya na [Kraịst] n’echiche ọbụla”? (amaokwu 36). Olee otu i nwere ike isi na-emekarị nke a mgbe niile—n’oge ndị dị mma na “ọnọdụ ndị siri ike”? Tulee ndụmọdụ nke a sitere n’aka Onyeisi Russell M. Nelson: “Ọ na-agba isi ghara ghara ịgbalị ilekwasị anya na Ya niime echiche ọbụla . Mana mgbe anyị na-eme, obi abụọ na ụjọ anyị agbafuo” (“Ịdọta Ike nke Jizọs Kraịst niime Ndụ Anyị,” Liahona, 41).

Lee kwa Neil L. Andersen, “Uche M Jigidere Echiche Nke a banyere Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2023, 91–94.

oyiyi nke aka nke Onye Nzọpụta, nwere apa ntu niime ọba aka Ya ghere oghe

Nkọwa nke Lee Aka M, site n’aka Jeffrey Ward

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:29-37

“Atụla egwu ime ihe ọma.”

Gịnị mere mgbe ụfọdụ anyị ji “atụ egwu … ime ihe ọma”? (amaokwu 33). Kedụ ihe ị na-ahụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:29–37 na-enye gị mgbam ume ime ihe ọma? Tulee ịgụ ma ọ bụ ige otu egwu na-akpali mmụọ gị inwe mgbam ume niime Kraịst, ụdị dị ka “Ka Anyị Niile Na-aganiihu” (Abụ niile, no. 243).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6–7; 9:3, 7–14

“Ọbụna dị ka i nwere ọchịchọ na m otu ahụ ka ọ ga-adị.”

Mata ugboro ole mkpụrụokwu dị ka “ọchịchọ” ma ọ bụ “ọchịchọ niile” pụtara niime nkeji 6 na 7. Kedụ ihe ị mụtara site na nkeji ndịa banyere mkpa Chineke na-atụkwasị n’elu ọchịchọ gị niile? Jụọ onwe gị ajụjụ nke Onyenwe anyị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 7:1: “Gịnị ka ị chọrọ?”

Otu niime ọchịchọ ezi omume nke Oliver Cowdery—ịtụgharị asụsụ dị ka Josef Smith mere—ka a na-emejupụtaghị. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 9:3, 7-14, kedụ mmetụta ndị ị na-anata nwere ike i nyere gị aka mgbe a na-emejupụtaghị ọchịchọ ezi omume gị niile ugbu a?

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 11:8; Dallin H. Oaks, “Ọchịchọ,” Liahona, Me 2011, 42–45.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

nkeji nke ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:5, 15–16, 22–23; 8:2; 9:7–9

Nna nke Eluigwe na-agwa m okwu site na Mmụọ Nsọ.

  • Eziokwu niile Oliver Cowdery mụtara banyere mkpughe nke onwe nwere ike inyere ụmụ gị aka dị ka ha na-ewulite ike ha iji mata Mmụọ Nsọ. I nwere ike jiri “Isi nke 5: Josef Smith na Oliver Cowdery” (dị niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 22–25, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma) iji kuziere ha ihe banyere Oliver na ihe ọ mụtara. Kesaara onye ọbụla akụkụ akụkọ ahụ kacha masị gị. Dị ka ị na-eme, kwusie ike maka ihe ndị Onyenwe anyị kuziiri Oliver banyere otu esi anụ olu nke Chineke, ma gụọ amaokwu ndị dị mkpa, dị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:23 ma ọ bụ 9:7-9.

    2:49

    Chapter 5: Joseph Smith and Oliver Cowdery: February–April 1829

    Oliver Cowdery na-ede ihe, ebe Josef Smith na-ele anya

    Oliver Cowdery mụtara ihe banyere mkpughe mgbe ọ naara enyere Josef Smith aka tụgharịa asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn.

  • I nwekwara ike kpọkuo ụmụ gị imetụ isi ha na obi ha aka dị ka ị na-agụ okwu ndị a “uche” na “obi” dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 8:2. Gwa ụmụ gị, site na nhụmiihe gị niile, ihe ọ dị ka ya mgbe Mmụọ Nsọ na-agwa gị okwu n’uche na obi gị. Nyere ha aka chọta azịza niile nye ajụjụ ahụ “Olee otu Mmụọ Nsọ si agwa anyị okwu?” dị niime amaokwu ndịa: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:15–16, 22–23; 8:2; 9:7–9.

Jiri akụkọ niile. Akụkọ na-enyere ụmụntakịrị aka ghọta ụkpụrụ niile nke ozi ọma niihi na ha na-egosipụta otu ndị ọzọ si ebi ndụ jiri ụkpụrụ ndị a. Dị ka ị na-akuzi ihe, chọta ụzọ niile iji agụnye akụkọ niile—sitere na akwụkwọ nsọ, sitere na agụgụala Nzukọ nsọ, ma ọ bụ site na ndụ nke onwe gị—nke na-egosipụta ụkpụrụ niile dị niime akwụkwọ nsọ.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:34

Niihi Jizọs Kraịst, e nwere m ike “ghara ịtụ egwu.”

  • Onyenwe anyị gwara Josef na Oliver, “Atụla egwu, obere igwe atụrụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:34). I nwere ike kpọkuo ụmụ gị isoro gị kwugharị nkebiokwu ahụ ọtụtụ ugboro. Ha nwekwara ike nwee obi ụtọ ime ka a ga-asị na ha bụ igwe atụrụ nke atụrụ oke egwu na-atụ. Gịnị ka igwe atụrụ nwere ike ịtụ egwu ya? Emesịa gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke Onye Nzọpụta dị ka onye ọzụzụ atụrụ (e nwere otu na ngwụcha ndepụta nke a) ma kwuo okwu banyere otu O si na-elekọta anyị dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-elekọta igwe atụrụ Ya.

  • Tulee ịkpọ egwu ma ọ bụ ịgụ otu egwu banyere ịchọta mgbam ume niime Kraịst, dị ka “Nwaa i Me Ihe ọma” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 158) ma ọ bụ “Ka Anyị Na-aganiihu” (Abụ niile, no. 243). Gịnị ka egwu ahụ na-akuzi banyere otu Onye Nzọpụta si enyere anyị aka ghara ịtụ egwu?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36

Enwere m ike ilekwasị Kraịst anya niime echiche ọbụla.

  • Mgbe agụsịkọtara Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36 ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike see eserese niile iji nyere gị aka cheta “ilekwasị anya na [Jizọs Kraịst] niime echiche ọbụla.” Kekọrịtara n’onwe unu ihe eserese unu niile, ma nyere ụmụ gị aka iche echiche maka ebe ndị ha nwere ike itinye ha ka ha nwee ike na-ahụ ha ọtụtụ mgbe.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Kraịst na igwe atụrụ

Onyenwe anyị Bụ Onye ọzụzụ atụrụ M, site n’aka Yongsung Kim

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị