“Olu niile nke Mweghachite: Ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn
Na Eprel 1829, ọnwa mgbe a natara nkeji 6-9 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, isi ọrụ nke Josef Smith bụụrụ ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Anyị amaghị ọtụtụ nkọwa n’uju banyere usoro dị ebube nke ntụgharị asụsụ ahụ, mana anyị maara na Josef Smith bụ onye na-ahụ ọhụ, nwere enyemaka ngwa ọrụ ndị Chineke kwadoworo: okwute abụọ na-ahụ ụzọ a kpọrọ Urim na Thummim na okwute ọzọ a kpọrọ okwute onye na-ahụ ọhụ.
Mgbe emesịrị jụọ ka ọ kọọ otu esi tụgharịa asụsụ ndekọihe nke a, Josef kwuru “na ọbụghị na-ebu n’uche ịgwa ụmụ ụwa ihe niile dị na ya.” Ọtụtụ mgbe o kwupụtara n’ụzọ dị mfe na atụgharịrị ya “site n’onyinye, na ike nke Chineke.”
Ahịrịokwu ndị a na-esote, sitere n’aka ndị aka ebe ji anya ha hụ usoro ntụgharị asụsụ ahụ, kwadoo aka ebe nke Josef.
Emma Smith
“Mgbe di m nọọrọ na-atụgharị Akwụkwọ nke Mọmọn, e dere m ụfọdụ niime ya, dị ka ọ kpọpụtara ahịrị nke ọbụla, mkpụrụokwu na mkpụrụokwu, ma mgbe ọ bịaruru n’ezigbo aha ndị ọ na-apụghị ịkpọpụta, ma ọ bụ ogologo mkpụrụokwu, ọ sụpere ha asụpe, ma mgbe m na-ede ha, ọ bụrụ ma m dejọọ na nsụpe, ọ ga-akwụsị m ma gbazie nsụpe m na-agbanyeghị na o kweghị omume na ọ ga-ahụ otu m si na-ededata ha mgbe ahụ. Ọbụna mkpụrụokwu ahụ Sarah ọ pụghị ịkpọpụtali ya na mbụ, mana ọ sụpere ya, ma m ga-akpọpụtara ya ya.”
Epekele ndị ahụ mgbe ụfọdụ na-anọ n’elu tebụlụ na-enweghị mgbalị ọbụla izo ya ezo, ekechiri na ntakịrị akwa oche linen, nke m nyeworo ya iji fuchie ha niime. Otu mgbe e metụrụ m epekele ndị ahụ aka, dị ka ha tọgbọrọ n’elu tebụlụ, na-arịrịa akụkụ na ọdịdị ha aka. Ọ dị nnọọ ka ha dị mfe ịgbagọ dị ka akwụkwọ gbara ọkpụrụkpụ, ma ga-eme mkpọtụ ụda igwe mgbe ejiri isimkpịsị aka sagharịa ha n’ọnụ ha, dị ka mmadụ mgbe ụfọdụ na-eji isimkpịsị aka emetụ ọnụ akwụkwọ. …
“Nkwenye m bụ na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu si na chi—enweghị m obi abụọ ọbụla banyere ya. E nwere m afọ ojuju na ọ dịghị onye ọbụla nwere ike ịkpọpụta odide nke nderenaaka ndị a ọ gwụla ma o sitere na mkpatemmụọ; niihi na, mgbe ịrụ dị ka odee ya, [Josef] ga-akpọpụtara m site n’awa ruo n’awa; ma mgbe alọghachiri ma erisịa nri, ma ọ bụ mgbe enwesịrị ọtụtụ ntinyeaka n’ọnụ, ọ ga-amalite ozugbo n’ebe ọ kwụsịrị, na-eleghị nderenaaka anya ma ọ bụ inwe akụkụ ọbụla agụpụtara nye ya. Nke a bụ ihe ọ na-emekarị mgbe niile. Ọ gaara abụ ihe na-agaghị ekwe omume na nwoke nwere mmụta nwere ike ime nke a; ma, nye onye amaghị ihe na onye na-enweghị mmụta dị ka ọ dị, o kweghị omume ma ọlị.”
Oliver Cowdery
“E ji m mkpịsị odide nke mụ onwe m dee Akwụkwọ nke Mọmọn dum (ewezuga ihu akwụkwọ ole ma ole) dị ka ọ dapụtara site n’ọnụ onye amụma, dị ka ọ tụgharịrị asụsụ ya site n’onyinye na ike nke Chineke, site n’ụzọ nke Urim na Thummim, ma ọ bụ, dị ka a kpọrọ ya site n’akwụkwọ ahụ, ndị ntapịa dị nsọ. A hụrụ m na anya m, ma jiri aka m metụ, epekele niile nke ọlaedo site n’ebe atụgharịrị ya. Ahụkwaara m ndị ntapịa ahụ.”