Come, Follow Me
Febụwarị 24–Maachị 2: “Uru nke Mkpụrụ obi niile bara Dị Ukwuu”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18


“Febrụwarị 24–Maachị 2: ‘Uru nke Mkpụrụ obi niile bara Dị Ukwuu’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Kraịst na-amaku otu nwa ntakịrị

Febụwarị 24–Maachị 2: “Uru nke Mkpụrụ obi niile bara Dị Ukwuu”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18

E nwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche iji nwalee uru nke mmadụ bara. Onyinye chi, agụmakwụkwọ, akụ na ụba, na ọdịdị anụ ahụ ha niile nwere ike ịmetụta otu anyị si enyocha onye ọbụla—na onwe anyị Mana naanya Chineke, uru anyị bara bụ ihe dịkacha mfe karịa, ma ekwuru ya hoo haa niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18: “Chetanụ na uru nke mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu n’anya Chineke” (amaokwu nke 10). Eziokwu nke a dị mfe na-akọwa nke ukwuu banyere ihe Chineke na-eme na ihe kpatara O ji eme ya. Gịnị mere O jiri nye Josef Smith na Oliver Cowdery iwu ihiwe Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst n’ụbọchị anyị? (lee amaokwu 1–5). Niihi na uru nke mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu. Gịnị kpatara O ji “enye ụmụ mmadụ niile iwu ebe ọbụla ichegharị” ma ziga Ndị Ozi ikwusa nchegharị? (amaokwu 9). Niihi na uru nke mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu. Ma gịnị kpatara Jizọs Kraịst si taa ahụhụ “ọnwụ n’anụ ahụ” ya na “mgbu niile nke ụmụ mmadụ”? (amaokwu 11). Niihi na uru nke mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu. Ọbụna otu niime mkpụrụ obi ndị a họọrọ ịnabata onyinye nke Onye Nzọpụta, Ọ na-ańụrị ọńụ, niihi na “ịdị ukwuu ka ọńụ ya dị na mkpụrụ obi nke chegharịrị” (amaokwu 13).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:1-5

“Wulite nzukọ nsọ m.”

Niime nkeji 18, Onyenwe anyị nyere Oliver Cowdery nkuzi niile iji nye aka tụọ ntọala nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Kedụ ihe ị matara banyere ndụmọdụ O nyere—kachasị niime amaokwu 1–5? I nwere ike tulee otu otu ndụmọdụ nke a kwa si metụta gị dị ka ị “na-ewulite” okwukwe gị niime Kraịst. N’ịmaatụ:

  • Kedụ ihe ị “chọworo ịmata” site n’aka Onyenwe anyị? (amaokwu 1).

  • Kedụ ihe ọ pụtara nye gị “ịdabere n’elu ihe niile edere ede”? (amaokwu 3). Olee otu Mmụọ ahụ siworo “gosipụta nye gị” na ihe ndị a bụ eziokwu? (amaokwu 2; lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–24).

  • Olee otu i si ehiwe ndụ gị n’elu “ntọala nke ozi ọma [nke Onye Nzọpụta] na nkume [Ya]”? (amaokwu 5).

Jụọ ajụjụ niile. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile bụ ihe aka ebe na ajụjụ niile na-eduba na mkpughe. Dị ka ị na-amụ akwụkwọ nsọ, dekọọ ajụjụ gị niile nke i nwere. Emesịa tụgharịa uche ma kpee ekpere ịchọta azịza niile.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10–13

akara ngosi semịnarị
“Uru nke mkpụrụ obi niile bara dị ukwuu n’anya Chineke.”

Olee otu anyị ga-esi achọpụta uru nke otu ihe bara? N’ịmaatụ, gịnị mere otu ihe dị n’ahịa ji daa ọnụ karịa nke ọzọ? Dị ka ị na-agụ nkeji 18 n’izu ụka nke a, kachasị amaokwu 10–13, i nwere ike tulee ndịiche dị na otu ndị mmadụ na-esikarị achọta uru site na ihe na-eme mkpụrụ obi si baa uru n’anya Chineke. Tulee iji aha gị dochie mkpụrụ okwu ndị a “mkpụrụ obi,” “mkpụrụ obi niile,” na “ụmụ mmadụ niile.” Olee otu amaokwu ndị a si enyere onye na-ajụ ajụjụ uru ọ bara aka?

Ebe a bụ ụfọdụ ederede na-akuzi ihe banyere uru nke mkpụrụ obi bara: Luk 15:1–10; Jọn 3:16–17; 2 Nefi 26:24–28; Moses 1:39. Ịdabere na ederede ndị a, olee otu ị ga-esi achịkọta otu o si emetụta Chineke banyere gị? I nwekwara ike nyochagharịa ozi nke Onyeisi Dieter F. Uchtdorf “Enwere Ihe Ị bụ nye Ya” (Liahona, Nov. 2011, 19–22) iji chọta mkpụrụ okwu na nkebiokwu niile na-enyere gị aka mata banyere uru ị baraara Chineke.

Olee otu Chineke si egosi gị na ị baara Ya oke uru? Olee otu nke a si emetụta otu i si enwe mmetụta banyere onwe gị na ndị ọzọ?

Lee kwa Joy D. Jones, “Uru gafere Atụ,” Liahona, Nov. 2017, 13–15; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ụmụ Chineke,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:11–16

Onyenwe anyị na-ańụrị mgbe m chegharịrị.

Mata ugboro ole e jiri mkpụrụ okwu ndị dị ka chegharịa na nchegharị mee ihe oge niile Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18. Tụgharịa uche niihe ị mụtara site na mkpụrụ okwu ndị a mgbe ọbụla ejiri ha mee ihe. Tulee kachasị nke amaokwu 11–16. Olee otu amaokwu ndị a si emetụta otu i si enwe mmetụta banyere nchegharị—nchegharị nke onwe gị na ọrụ ịkpọku ndị ọzọ ichegharị ma nwee ọganiihu? Ebe a bụ otu ụzọ iji dedata ihe ị mụtara: depụta ọtụtụ ụzọ ị ga-esi emejupụta ahịrị okwu a “Nchegharị bụ .”

Lee kwa Alma 36:18–21; Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Nchegharị,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; Dale G. Renlund, “Nchegharị: Nhọrọ Jupụtara N’ọńụ,” Liahona, Nov. 2016, 121–24.

nna amakụọ nwa ya nwoke

Nkọwa sitere na Nwa Mmefu, site n’aka Clark Kelley Price

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:14–16

Ọńụ na-abịa site na-inyere ndị ọzọ aka bịakwute Kraịst.

Dị ka ị na-agụ amaokwu 14 16, tulee ihe ọ pụtara “iti mkpu nchegharị”—na ihe kpatara o si enye ụdị ọńụ a. Gịnị bụ ụfọdụ ụzọ ị chọtaworo iji nyere ndị ọzọ aka bịakwute Onye Nzọpụta ma nata mgbaghara? Olee otu ndị ọzọ siworo meere gị ya?

Lee kwa Craig C. Christensen, “Agaghị Enwe Ihe Ọbụla Mara Oke Mma ma Dị oke Ụtọ dị ka Ọńụ M Dịịrị,” Liahona, Me 2023, 45–47.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:34–36

E nwere m ike ịnụta olu nke Onyenwe anyị n’ime akwụkwọ nsọ.

Ọ bụrụ ma mmadụ jụọ gị ihe olu nke Onyenwe anyị dị ka ya, gịnị ka ị ga-ekwu? Chee echiche banyere ajụjụ nke a dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:34-36. Gịnị ka ị mụtaworo banyere olu nke Onyenwe anyị site na-ịgụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile? Kedụ ihe i nwere ike ime iji nụta olu Ya n’ụzọ doro anya karịa?

Lee kwa “Dị ka M Na-enyochagharị Akwụkwọ nsọ Dị Nsọ,” Abụ niile, no. 277.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10–13

Onye ọbụla niime anyị dị oke ọnụ ahịa nye Chineke.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10-13, tulee iji mkpụrụ okwu ndị a “mkpụrụ obi,” “mkpụrụ obi niile,” na “ụmụ mmadụ niile” wee dochie aha onye ọbụla I nweziri ike mgbe ahụ kwuo okwu banyere otu amaokwu ndị a si enyere anyị aka ghọta otu Nna nke Eluigwe si enwe mmetụta banyere onye ọbụla niime anyị.

  • I nwekwara ike jụọ ụmụ gị ajụjụ banyere ihe ndị mmadụ weere dị ka ihe bara uru. Ma ọ bụ i nwere ike gosi ha otu ihe baara gị uru. Olee otu anyị si elekọta ihe ndị baara anyị uru? Mgbe ahụ kwee ka ha n’otu n’otu lee anya na enyo. Dị ka ha na-eme, gwa nwa nke ọbụla na ha bụ nwa Chineke ma na ha bara oke uru. Olee otu anyị nwere ike isi gosi ndị ọzọ na uru nke mkpụrụ obi [ha] bara dị ukwuu n’anya anyị?

  • Ikwusi ike na mmadụ niile bara oke uru nye Nna nke Eluigwe, ụmụ gị nwere ike lee anya na foto ahụ dị na ngwụcha ndepụta nke a mgbe unu na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10–13. Ịgụkọta ọnụ otu egwu dị ka “Kpakpando Ọbụla Dị Iche” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 142–43) nwere ike nye aka kwusie ike okwu nke a.

Kraịst ji nwata

Nkọwa n’uju sitere na Uru nke otu Mkpụrụ obi bara, site n’aka Liz Lemon Swindle

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:13–16

Ikesa ozi ọma na-ewete oke ọńụ.

  • Ikpatemmụọ ụmụ gị ikesa ozi ọma nke Jizọs Kraịst, i nwere ike gị na ha ekwuo banyere nhụmiihe niile mgbe ị chọtara otu ihe ị chọbuuru ikesara ndị enyi ma ọ bụ ezi na ụlọ gị. Gịnị mere i jiri chọọ ikesa ya, ma olee otu ikesa ya si metụta gị? Mgbe ahụ unu nwere ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:13, 16. Kedụ ihe na-ewetere Onyenwe anyị ọńụ? Kedụ ihe Ọ sị ga-ewetere anyị ọńụ? Gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere nhụmiihe ndị unu nweteworo na-ikesa ọńụ nke ozi ọma nke Onye Nzọpụta.

  • Otu egwu banyere ikesa ozi ọma, dị ka “A Chọrọ M Ị Bụ Onye Mgbasa Ozi ọma Ugbua” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 168), nwere ike nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike isi kesaa ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:34–36

E nwere m ike ịnụta olu nke Onyenwe anyị n’ime akwụkwọ nsọ.

  • Ụmụ gị nwere ike nwee ọńụ na egwuregwu ebe ha na-anwa ịchọpụta olu nke ndị dị iche iche, dị ka ndị òtù ezi na ụlọ, ndị enyi, ma ọ bụ ndị ndu Nzukọ nsọ. Olee otu anyị ga-esi amata olu nke onye ọbụla? Olee otu anyị ga-esi amata olu nke Onyenwe anyị? Unu nwere ike gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:34-36 ọnụ iji kparịta ụka n’ajụjụ nke a. Unu nwekwara ike kwukọrịta n’onwe unu otu unu siworo nụ olu nke Onyenwe anyị niime akwụkwọ nsọ.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

foto ihu ndị mmadụ sitere n’ọtụtụ omenaala dị iche iche

Mkpụrụ obi niile dị oke mkpa nye Chineke.

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị