Come, Follow Me
Maachị 10–16: “Mbilite nke Nzukọ nsọ nke Kraịst”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20–22


“Maachị 10–16: ‘Mbilite nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20–22,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20–22,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Joseph Smith na-ekwu okwu chukwu niime ụlọ jupụtara na mmadụ

Maachị 10–16: “Mbilite nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20–22

Ọrụ nke Onye Nzọpụta banyere iwepụta Akwụkwọ nke Mọmọn ezuwo ugbua. Mana ọrụ Ya banyere Mweghachite ka malitere ugbua. Na mgbakwunye iweghachi ozizi na ikike ọkwa nchụaja, Onyenwe anyị emewo ya edoo anya site na mkpughe ndị isimbụ ahụ na Ọ chọkwara iweghachi òtù ahaziri ahazi—Nzukọ nsọ Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:53; 18:5). Na Eprel 6, 1830, ihe karịrị 40 ndị kwere ekwe gbakọrọ niime ebe obibi ezi na ụlọ Whitmer eji osisi rụọ na Fayette, New York, ịgba aka ebe nhazi nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-atụgharị uche ihe kpatara Nzukọ nsọ ahaziri ahazi si dị mkpa. Azịza ka enwere ike ịchọta, opekempe ntakịrị, niime mkpughe niile jikọtara na nzukọ mbụ nke Nzukọ nsọ na 1830. Ha na-akọwa ngọzi ndị na-agaraghị adị ire ọ bụrụ ma ọ dịghị mgbe “ahaziri ma hiwe mgbe niile” ezi Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na ụbọchi ikpeazụ ndị a (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:1).

Lee kwa Ndị Nsọ, 1:84–86; “Wulite Nzukọ nsọ M”,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 29–32.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 20–21

Jizọs Kraịst eweghachitewo Nzukọ nsọ Ya.

Gịnị kpatara anyị jiri nwee Nzukọ nsọ ahaziri ahazi? Elemaanya azịza kachasị mma bụ “Niihi na Jizọs Kraịst haziri otu.” Dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20–21, i nwere ike mata nyiritara n’etiti Nzukọ nsọ O hiwere mgbe gboo na nke O weghachiteworo taa. Jiri amaokwu ndịa sotere iji mụọ banyere Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta n’oge mgbe gboo: Matiu 16:15–19; Jọn 7:16–17; Ndị Efesọs 2:19–22; 3 Nefi 11:23–26; Moronaị 4–5. Jiri amaokwu ndịa ji mụọ ihe banyere Nzukọ nsọ eweghachitere: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:17–25, 60, 72–79; 21:1–2. I nwere ike dedata ihe ị chọpụtara niime tebụlụ dị ka nke a:

Ozizi

Emume nsọ niile

Ikike Ọkwa nchụaja

Ndị amụma

Nzukọ nsọ nke Kraịst mgbe gboo

Ozizi

Emume nsọ niile

Ikike Ọkwa nchụaja

Ndị amụma

Nzukọ nsọ nke Kraịst eweghachitere

Ozizi

Emume nsọ niile

Ikike Ọkwa nchụaja

Ndị amụma

Gịnị ka ị na-amụ site na ihe omume nke a banyere ihe kpatara Jizọs Kraịst si hiwe—ma weghachite—Nzukọ nsọ Ya?

Lee kwa Dallin H. Oaks, “Mkpa maka Nzukọ nsọ,” Liahona, Nov. 2021, 24–26.

Kpọkuo nkesa. Mgbe ị na-akpọku ndị mmadụ ikesa ihe ha na-amụ n’onwe ha, ha ga-enwe mmetụta mgbam ume ịganiihu n’ihe ọmụmụ nke onwe ha. Kedụ ihe i nwere ike ịkpọku ndị ọzọ ikesa?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37, 75–7922

Emume nsọ niile dị nsọ nwere ike inyere m aka dịrị ka Onye Nzọpụta.

Mgbe ahaziri Nzukọ nsọ, Onyenwe anyị kuziiri Ndị nsọ Ya banyere emume nsọ niile dị nsọ, tinyekọta baptizim na oriri nsọ. Dị ka ị na-agụ ihe banyere emume nsọ ndịa, tulee otu ha ga-esi enyere gị aka nwee mmetụta njikọ ruo n’Onye Nzọpụta. Nịmaatụ, olee otu emume nsọ ndị a si enyere gị aka jikwata “mkpebi gị ijere [Jizọs Kraịst] ozi ruo ọgwụgwụ”? (amaokwu 37). I nwekwara ike gụọ ekpere oriri nsọ niile (amaokwu 77, 79) ma were onwe gị dị ka ị na-anụ ha n’oge mbụ. Kedụ nghọta ndị ị natara?

Lee kwa D. Todd Christofferson, “Ihe kpatara Ụzọ Ọgbụgba ndụ,” Liahona, Me 2021, 116–19.

onyeikom nta na-enye oriri nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:38–60

Ije ozi Ọkwa nchụaja na-agọzi ndị òtù Nzukọ nsọ na ndị ezi na ụlọ ha.

Ichewo mgbe ọbụla banyere ihe kpatara o jiri dị mkpa nye Onye Nzọpụta iweghachite ọkwa nchụaja niime Nzukọ nsọ Ya? Ịgụ ihe ọ gwara ndị ji ọkwa nchụaja mee niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:38–60 nwere ike nye gị nghọta ole ma ole. Olee otu Onye Nzọpụta siworo gọzie gị na ezi na ụlọ gị site n’ọrụ akọwara niime amaokwu ndị a?

Na mgbakwunye nye ndị ahụ echiri echichi na ọkwa nchụaja, ndịinyom edopụrụ iche ije ozi niime Nzukọ nsọ na-etinyekwa ikike ọkwa nchụaja n’ọrụ dị ka ha sonyere n’ọrụ Ya. Ịmụ otu esi eme ya, hụ ozi nke Onyeisi Dallin H. Oaks “Ọtụghe niile na Ikike nke Ọkwa Nchụaja,” (Liahona, Me 2014, 49–52).

Lee kwa isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Nkuzi nke Josef Smith niile banyere Ọkwa nchụaja, Tempụl, na Ndịinyom,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21

akara ngosi semịnarị
Irube isi n’okwu Chineke site na ndị amụma Ya ga-enye m nchekwa si na chi.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:4-9 nwere niime ya mkpọku niile iji soro onye amụma nke Onyenwe anyị na nkwa niile dị ike maka ndị na-eme otu ahụ. Nchepụta ndị a sotere nwere ike nyere gị aka tulee amaokwu ndị a:

  • Kedụ mkpụrụ okwu ndị dị niime amaokwu 4 ruo 5 na-akọwa ihe Onye Nzọpụta chọrọ ka i jiri mkpụrụ okwu niile nke onye amụma Ya dị ndụ mee? Kedụ ihe i chere mere “ndidi na okwukwe” jiri dị mkpa iji mee nke a?

  • Tulee ihe oyiyi Onye Nzọpụta jiri mee ihe niime amaokwu 6 iji kọwaa ngọzi niile nke isoro onye amụma Ya. Gịnị ka i chere “ọnụ ụzọ ama niile nke ala mmụọ” pụtara? Olee otu Onyenwe anyị si “agbasasị ike niile nke ọchịchịrị” niihi gị? Gịnị ka ọ pụtara maka “eluigwe niile ịma jijiji niihi ọdịmma gị”?

  • Gịnị ka Onyenwe anyị na-agwa gị ka i mee site n’aka Onyeisi Nzukọ nsọ nke ugbu a? Olee otu Onyenwe anyị si mejupụta nkwa Ya niile dị ka i soworo ndụmọdụ Ya?

Depụta mgbakwunye nghọta ị na-erite sitere na nkeji niile nke ozi nke Okenye Neil L. Andersen “Onye Amụma nke Chineke” (Liahona, Me 2018, 24–27):

  • Ihe kpatara Anyị si Na-eso Onye Amụma:

  • Onye nche nọ n’elu Tọwa:

  • Ya Atụla Gị Naanya:

Lee kwa “Onye nche nọ n’elu Tọwa” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndị Amụma,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Anyị Na-ege ntị Na Olu nke Onye Amụma,” Abụ niile, no. 22.

4:17

Watchman on the Tower

(Ezekiel 33:1-7) The Lord calls prophets to be the "watchmen" on the tower.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe

Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 20–21

Eweghachitewo Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst.

  • Tulee iji isi nkeji maka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21, isi nke 9 nke Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, ma ọ bụ vidiyo “Nhazi nke Nzukọ nsọ” (ChurchofJesusChrist.org) iji nyere ụmụ gị aka ghọta ihe mere n’ụbọchị ahaziri Nzukọ nsọ.

    1:35

    Chapter 9: Organization of the Church of Jesus Christ: 6•April 1830

  • Elemaanya ụmụ gị nwere ike tụnyere foto Jizọs Kraịst, onye na-eje ozi nlekọta, baptizim, na oriri nsọ ya na amaokwu ndị nọ niime nkeji 20 (lee amaokwu 21–23, 47, 72–74, 75–79). Jiri foto ndị a na amaokwu ndị a jiri kparịta ụka banyere ngọzi niile anyị nwere niihi na Jizọs Kraịst weghachitere Nzukọ nsọ Ya.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37, 41, 71–74

Mgbe e mere m baptizim ma nabata m, e kwere m nkwa isoro Jizọs Kraịst.

  • Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ịhụ foto nke otu nwata a na-eme baptizim ma nabata. Ha nwere ike kwupụta otu o si metụta ntuzi aka niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:41, 71–74. Gịnị ka ị na-amụ site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37 banyere ndị chọrọ ka e mee ha baptizim? I nwekwara ike bụkọrịta “Mgbe E Mere M Baptizim” ọnụ (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 103) ma ọ bụ lee vidiyo “Baptizim nke Jizọs” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).

    2:54

    The Baptism of Jesus

    Jesus seeks out John the Baptist and is baptized in order to fulfill all righteousness.

    nwantakịrị nwanyị a na-eme baptizim na nwantakịrị nwanyị a na-anabata
  • Ọ bụrụ ma ụmụ gị emeworịị baptizim ma anabata ha, jụọ ha maka nhụmiihe ha. Ha nwere foto ndị ha nwere ike ikesa? Kwurịta gị na ha banyere ihe ha na-eme iji soro Jizọs Kraịst na otu O si na-agọzi ha.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:75–79

E nwere m ike iwekwasị aha nke Jizọs n’isi m ma na-echeta Ya mgbe niile.

  • Ụmụ gị nwere ike chọọ mkpụrụ okwu ahụ “ịdị njikere” niime ma Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37 (banyere baptizim) ma amaokwu 77 (ekpere oriri nsọ). Gịnị ka Jizọs Kraịst chọrọ ka anyị dị njikere ime? Enwere ike ụmụ gị e lee anya n’otu ihe nwere aha na ya (dị ka aha eji ere ahịa ma ọ bụ aha nke onwe). Gịnị ka aha ahụ na-agwa anyị banyere ihe ahụ? Gịnị ka ọ pụtara iwekwasị aha nke Jizọs Kraịst n’isi anyị?

  • Tulee ịgụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77 ọnụ na ịrịọ ụmụ gị ịchọpụta nkwa niile anyị mere dị ka akụkụ nke oriri nsọ. E nwere ike ha otu otu e mee ejije otu ihe ha nwere ike ime iji na-echeta mgbe niile Onye Nzọpụta ma kọọ nkọ ihe omume onye nke ọbụla bụ. Dị ka otu amaokwu 77 siri dị, kedụ otu e siworo gọzie anyị mgbe anyị na-echeta Onye Nzọpụta mgbe niile.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:4–6

Jizọs na-agọzi m dị ka M na-esoro onye amụma Ya.

  • Mgbe achọpụtasịrị ịkpọ oku niile na nkwa niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:4-6, ụmụ gị nwere ike lee anya n’otu foto nke onye amụma nke ugbua ma kesaa otu ihe ha mụtaworo ma ọ bụ nụ site n’aka ya. Kesakọrịta onye ọbụla n’ibe ya ụzọ ndị ọzọ Jizọs Kraịst siworo gọzie gị na-isoro onye amụma Ya.

Onyeisi Nelson

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

Josef Smith mgbe a na-edopụ ya iche site n’aka Oliver Cowdery

Oliver Cowdery Echie Josef Smith Echichi, site n’aka Walter Rane

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị