“Maachị 17–23: ‘Chọọ maka Ihe niile nke Ụwa Ka mma’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 23–26,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 23–26,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Maachị 17–23:“Chọọ maka Ihe niile nke Ụwa Ka mma”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 23–26
Maka ọtụtụ ndị mmadụ, ime baptizim bụ nhụmiihe dị nsọpụrụ, jupụtara n’udo. Baptizim nke Emma na ndị ọzọ, kosiladị, ka ìgwè mmadụ na-ebuaghara na-akwa ha emo kụsasịrị, yie ha egwu, ma kwanye ha ịgbafusị. Emesịa, dị nnọọ ka Josef naara achọ ịnabata ndị òtù ọhụrụ, anwụchiri ya maka iji nkwusa ozi ọma ya akpasụ obodo ahụ iwe. Niime mmegide nke a niile, olee otu Emma si achọta mmasịgharị obi ike na ya naara eme ihe ziri ezi? Otu ebe ahụ kwa anyị niile nwere ike ịchọta ya—site na mkpughe sitere n’aka Onyenwe anyị. Ọ gwara Emma okwu banyere “ihe niile nke [ụwa] ka mma”—alaeze Ya—na ọnọdụ ya niime ya. Ọ gwara ya atụla egwu, “ka o bulie obi [ya] ma ńụrịa ọńụ,” ma “na-arapara n’elu ọgbụgbandụ niile [o mewororịị].” Ma okwu mgbam ume na ndụmọdụ ndị a bụ “olu Ya nye ndị niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:9–10, 13, 16).
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:89–90, 94–97.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Onye Nzọpụta pụrụ ibuli m “elu pụọ site na mkpagbu [m] niile.”
Mkpughe dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24 ka enyere iji “nye ike, gbaa ume, ma kuziere” Josef Smith na Oliver Cowdery ihe n’oge mnwale (isi nkeji; lee kwa Ndị nsọ, 1:94-96). Chọọ mkpụrụ okwu niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24 nke ị chere gaara abụ ihe n’enye ha ike na mgbam ume.
Kedụ ihe akwụkwọ nsọ ndị a sotere na-atụpụtara gị banyere otu Onye Nzọpụta si enyere gị aka na aka mgba gị niile?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:1–3
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:8
E nwere m ọrụ dị mkpa n’alaeze nke Chineke.
Dị ka Emma Smith hụrụ Mweghachite ka o mere site n’aka di ya, Josef Smith, o nwere ike ọ chewo ihe ọrụ ya nwere ike ịbụ. Chọọ maka azịza ndị Chineke rọpụtara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25. Ị na-achọta ihe ọbụla niime nkeji nke a ị na-eche bụ “olu Ya nye [gị]”? (amaokwu 16).
Lee kwa “Nwa Agbọghọ Ahọpụtara” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ị Bụ Nwa Agbọghọ Ahọpụtara,” dị niime Mkpughe dị N’ọnọdụ, 33–39; Joy D. Jones, “Otu Ọkpụkpọ oku Kachasị Dị Mma,” Liahona, Me 2020, 15–18.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:5, 14
“Gaaniihu na mmụọ nke ịdị nwayọ.”
Gịnị ka nkebiokwu ahụ “mmụọ nke ịdị nwayọ” pụtara nye gị? Tulee ịchọgharị nkeji 25 maka mkpụrụ okwu na nkebiokwu ndị na-enyere gị aka ghọta ihe ọ pụtara ịdị nwayọọ bụ. Ozi Okenye David A. Bednar “Ịdị nwayọọ ma Dị Umeala n’Obi” nwekwara ike inye aka (Liahona, Me 2018, 30–33). Olee otu Jizọs Kraịst si bụrụ ọmụmaatụ nke ịdị nwayọọ nye gị? (lee Matiu 11:28–30). Chee echiche banyere ihe ndị dị niime ndụ gị i nwere ike ime “na mmụọ nke ịdị nwayọ.”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:10, 13
“Debe n’akụkụ ihe niile nke ụwa a, ma chọọ maka ihe ndị kacha mma.”
Dị ka ị na-atule ndụmọdụ nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:10, o nwere ike inyere gị aka idepụta ihe niile nke ụwa a” Ọ chọrọ ka i “debe n’akụkụ.” Mgbe ahụ i nwere ike depụta “ihe niile nke [ụwa] kacha mma” nke Ọ chọrọ ka ị chọọ. I nwere ike họrọ opekempe otu ihe sitere na ndepụta nke mbụ nke ị ga-edebe n’akụkụ na otu ihe sitere na ndepụta nke abụọ ị ga-achọ.
Onyeisi Russell M. Nelson enyewo ndụmọdụ na nkwa niile banyere “[idebe] n’akụkụ ọtụtụ ihe nke ụwa a.” Chọọ ya na ihu akwụkwọ 77 nke ozi ya “Akụ niile nke Ime mmụọ” (Liahona, Nov. 2019). Olee otu ị ga-esi esoro ndụmọdụ ya?
Dị ka ị na-agụ amaokwu 13, chee banyere ọgbụgba ndụ ndị i gbaworo gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Gịnị ka ọ pụtara “ịrapara na” ọgbụgba ndụ ndị a? olee otu ọgbụgba ndụ gị niile si enyere gị aka “debe n’akụkụ ihe niile nke ụwa a, ma chọọ maka ihe ndị kacha mma”?
Ebe a bụ ụfọdụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka mara ndịiche n’etiti “ihe niile nke ụwa a” na “ihe niile kacha mma”: Matiu 6:19, 21, 25–34; Luk 10:39–42; 2 Nefi 9:51.
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Aja,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:11–12
Onyenwe anyị na-enwe mmasị na “abụ nke obi” m.
Gịnị bụ ụfọdụ “abụ [niile] nke obi”—egwu niile nke na-egosipụta mmetụta gị banyere Nna nke Eluigwe ma ọ bụ Jizọs Kraịst? Tulee ịgụ ma ọ bụ ịge tị nye ole ma ole niime ha. Gịnị ka ọ bụ banyere egwu ndị a nke na-eme ha a pụọ iche nye gị?
I nwekwara ike tulee otu abụ ndị a si dịrị ka ekpere. Gịnị ka egwu dị nsọ na ekpere nwere n’otu? Olee otu e siworo “jiri ngọzi zaa” egwu nsọ gị niile
Lee kwa “O, Lee Egwu niile nke Obi,” Abụ niile, no. 286.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 26:2
“Ihe niile ka a ga-eme site na nkwenye zuru ọha niime nzukọ nsọ.”
Nkebiokwu a “nkwenye zuru ọha” dị niime amaokwu nke a metụtara omume nke iweli aka anyị iji gosi na anyị na-akwado ma na-enye nkwado onye ahụ na-anata ọkpụkpọ oku ma ọ bụ echcihi ọkwa nchụaja. Olee otu i nwere ike isi kọwaara onye ọbịa na ọgbakọ Nzukọ nsọ ihe ọ pụtara mgbe anyị kwadoro mmadụ? Kedụ azịza ndị ị na-ahụ niime ozi nke Onyeisi Henry B. Eyring “Ike nke Okwukwe dị Nkwado”? (Liahona, Me 2019, 58–60).
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:1, 8
Onye Nzọpụta pụrụ ibuli m “elu pụọ site na mkpagbu [m] niile.”
-
Ịmụ ihe banyere ụfọdụ niime mkpagbu ma ọ bụ aka mgba niile Josef Smith na ndị Nsọ isimbụ gabigara, i nwere ike nyochagharịa “Isi nke 11: Ndị Mmadụ Ọzọ Sonyere Nzukọ nsọ,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 46–47, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma. Mgbe ahụ gị na ụmụ gị nwere ike chọpụta ihe Onyenwe anyị gwara Josef banyere mkpagbu ya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:1, 8. I nwekwara ike kesaa onye ọbụla otu Onyenwe anyị na-esi enyere gị aka n’oge ndị ihe siri ike.
-
Ịmụ ihe ọ pụtara “inwe ndidi niime mkpagbu [anyị],” gị na ụmụ gị nwere ike kepụtagharịa ihe nnyocha niime vidiyo “Gaaniihu na Ndidi” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Gịnị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 24:8 na-akuziri anyị banyere ndidi? Olee otu Onye Nzọpụta si eme ka anyị mara na Ya “nọnyeere [anyị] n’oge mkpagbu anyị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:11–12
Jizọs hụrụ “egwu nke obi” naanya.
-
Mgbe ị gụsịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:12, i nwere ike gwakọrịta onwe unu okwu banyere abụ ma ọ bụ egwu Nzukọ nsọ kacha masị gị—“egwu nke obi gị”—ma kwekọrịta ha ọnụ. Kekọrịta n’ibe unu ihe kpatara i jiri hụ egwu ndị a naanya. Gịnị mere Onyenwe anyị ji enwe obi ụtọ mgbe anyị na-agụ egwu ndị ahụ? Olee otu ịgụ egwu anyị si dịrị ka “ekpere nye [Ya]”?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:13, 15
Ọgbụgba ndụ mụ na Nna nke Eluigwe na-ewetere m ọńụ.
-
Ịghọta ihe ọ pụtara “ịrapara n’ọgbụgba ndụ niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:13), ụmụ gị nwere ike na-ejidesi ihe ike ka ha nwere ike ya otu otu. Emesịa gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere otu i si “rapara” ma ọ bụ jigide ọgbụgba ndụ gị niile. Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa, nyochagharịa gị na ụmụ gị ọgbụgba ndụ niile anyị na-eme (lee Mozaya 18:8–10; Ozizi na Ọgbụgba ndụ 20:37; na ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a).
-
Inye ụmụ gị ọnọdụ maka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:13, i nwere ike rụtụ aka na nke a bụ ihe Onyenwe anyị gwara Emma Smith ngwa ngwa o mesịrị baptizim ya. Gịnị mere nke a ji abụ ezigbo ndụmọdụ maka onye emere baptizim nso nso a?