Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Emma Hale Smith


“Olu niile nke Mweghachite: Emma Hale Smith,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Emma Hale Smith,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akara ngosi nke olu niile nke mweghachite

Olu niile nke Mweghachite

Emma Hale Smith

Emma Smith (Emma Hale Smith)

Okwu niile nke Onyenwe anyị nye Emma Hale Smith niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25 kpughere otu O si nwee mmetụta banyere ya na ntinye aka niile o nwere ike ime nye ọrụ Ya. Mana kedụ ihe Emma dị ka ya? Kedụ ihe anyị maara banyere àgwà ya, mmekọrịta ya niile, ume ya niile? Otu ụzọ esi amata “nwanyị a ahọpụtara” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:3) bụ ịgụ okwu niile nke ndị maara àgwà ya.

Josef Smith Nta., di ya

One drawing in pencil, charcoal and ink on paper.  A left profile, head/shoulders portrait of Joseph Smith; drawn basically in charcoal, highlighted with white paint and black ink.  titled at bottom "Jospeh Smith the Prophet."  Signed at left shoulder "Drawn from the most authentic sources by Dan Weggeland"  A drawn border surrounds it.  No date apparent.

“Jiri mmasị ọnụ apụghị ikwu, na ụdị ụgbọ niile nke ọńụ zara obi m, mgbe m kpọọrọ n’aka, n’abalị ahụ, Emma m hụrụ naanya—ya bụụrụ nwunye m, ọbụna nwunye nke ntoroọbịa m; na nhọrọ nke obi m. Ọtụtụ bụ ịmagharị jijijiji nke uche m mgbe m tụgharịrị uche na nwa oge ọtụtụ ọnọdụ ndị akpọworo anyị ịgabiga. Ike ọgwụgwụ niile, na ndọlị niile, mwute niile, na ntaram ahụhụ niile, na ọńụ na ngụgụ obi niile site n’oge ruo n’oge awụsawo n’ụzọ anyị ma gọzie ndụ anyị. O! ụdị njikọta echiche ọnụ jupụtara uche m na nwa oge ahụ. Ọzọkwa ọ nọkwa ebe a, ọbụna na nsogbu nke asaa, na-atụghị egwu, kwụrụ chịm, ma adịghị ada, adịghị agbanwe agbanwe, Emma dị ịhụnaanya.”

Lucy Mack Smith, nne di ya

“Ọ ka bụ agbọghọ mgbe ahụ, ma n’ịdị achọsi ihe ike n’onwe, obi ya dum nọọrọ n’ọrụ nke Onyenwe anyị, ma o nweghị mmasị ọbụla ọzọ ewezuga maka nzukọ nsọ na ihe gbasara eziokwu. Ihe ọbụla aka ya chọtara ime, ọ na-eme jiri ike ya ma ọ jụghị ajụjụ nke ọdịmma naanị onwe ahụ ‘Aga m eritekwu uru karịa onye ọ bụla ọzọ?’ Ọ bụrụ na edupụrụ ndị okenye ịga kwusaa ozi ọma, ọ bụ onye mbụ iwepụta onwe ya ije ozi iji nye aka iyiwe ha uwe maka njem ha, kwe unwu nke onwe ya bụrụ ihe ha ga-abụ.”

Josef Smith Ukwu., nna di ya

Ngọzi onye Petrak nke Emma, nke Josef Smith Ukwu., kwupụtara, onye naara eje ozi dị ka Petrak nye Nzukọ nsọ:

“Emma, nwunye nwa m, Onyenwe anyị agọziwo gị, niihi ikwesị ntụkwasị obi na eziokwu gị: di gị ga-agọzi gị, ma ńụrịa ọńụ n’ebube nke ga-adakwasị n’isi ya: Mkpụrụ obi gị enwewo mkpagbu niihi ajọọ omume nke ụmụ mmadụ n’ịchọgharị mbibi nke onye nsiso gị, ma mkpụrụ obi gị dum awụpụtawo n’ekpere niihi nnapụta ya: ńụrịa ọńụ, niihi na Onyenwe anyị Chineke gị anụwo arịrịọ gị.

“Iruwo uju niihi isi ike nke obi nke ụlọ nke Nna gị, ma i nweworịị olileanya maka nzọpụta ha. Onyenwe anyị ga-akwanyere mkpu gị niile ugwu, ma site n’ikpe ikpe ya ọ ga-eme ka ụfọdụ hụ nzuzu ha ma chegharịa site na mmehie ha; mana ọ ga-abụ site na mkpagbu ka a ga-esi azọpụta ha. Ị ga-ahụ ọtụtụ ụbọchi; ee, Onyenwe anyị ga-edebe gị tutu ruo mgbe i nwere afọ ojuju, niihi na ị ga-ahụ Onye Mgbapụta gị. Obi gị ga-ańụrị ọńụ nime nnukwu ọrụ nke Onyenwe anyị, ma ọ dịghị onye ọbụla ga-anapụ gị ańụrị gị.

“Ị ga-anọgide na-echeta nnukwu nrịdata nke Chineke gị na-ikwe gị isoro nwa m nwoke mgbe mmụọ ozi nyefere ndekọihe nke Ndị Nefi n’aka ya. Ị nwetewo ọtụtụ mwute niihi na Onyenwe anyị anapụwo gị ụmụ gị atọ: n’ihe nke a ekwesịghị ịta gị ụta, niihi na ọ maara ọchịchọ ndị dị ọcha izulite otu ezi na ụlọ ka enwee ike gọzie aha nwa m nwoke. Ma ugbu a, lee, a sị m gị, na site otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na ị ga-ekwenye, a ka ga-agọzi gị nihe nke a ma ị ga-amụkwa ụmụ ndị ọzọ, ruo n’ọńụ na afọ ojuju nke mkpụrụ obi gị, ma ruo n’ịńụrị ọńụ nke ndị enyi gị.

“A ga-agọzi gị jiri nghọta ihe, ma nwee ike ituziri ibe gị aka. Kuziere ezi na ụlọ gị ezi omume, ma ụmụ ntakịrị gị ụzọ nke ndụ, ma ndị mmụọ ozi dị nsọ ga-elekọta gị: ma a ga-azọpụta gị n’alaeze nke Chineke: ọ bụna otu a. Amen.”

Emma Smith na ụmụaka

Emma Smith na ụmụ ya. Oge eji Achị ọchị, site n’aka Lemon Swindle