“Maachị 24–30: ‘Ihe Niile Ka A Na-ahaghị Ime N’usoro’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27–28,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27–28,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Maachị 24–30:“Ihe Niile Ka A Na-ahaghị Ime N’usoro”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27–28
Mkpughe ka bụkwa ihe ọhụrụ nye ndị Nsọ dị ka Mweghachite garaniihu na-apụta esepụghị aka. Ndị òtù Nzukọ nsọ isimbụ maara na Onye amụma Josef Smith nwere ike ịnata mkpughe maka Nzukọ nsọ. Mana ndị ọzọ ha nwere ike? Ajụjụ niile dị ka nke a bụrụziri ihe dị oke mkpa mgbe Hiram Page, otu niime Ndị Aka ebe Asatọ nke epekele ọlaedo niile, kwere na ya anatawo mkpughe maka Nzukọ nsọ. Ọtụtụ Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi kwenyere na mkpughe ndị a sitere n’aka Chineke. Onyenwe anyị zaghachiri site na-ikuzi na niime Nzukọ nsọ Ya “ihe niile ka a na-ahaghị ime n’usoro” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:13). Nke a pụtara inwe naanị otu onye “ahọpụtara ịnata iwu nsọ niile na mkpughe niile” maka Nzukọ nsọ dum (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:2). Ndị ọzọ, kosiladị, nwere ike ịnata mkpughe nke onwe maka akụkụ nke ha niime ọrụ nke Onyenwe anyị. N’ezie, okwu nke Onyenwe anyị nye Oliver Cowdery bụ ihe ncheta nye anyị niile: “A ga-enye gị ya … ihe ị ga-eme” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:15).
Lee kwa “Ihe Niile Ka A Na-ahaghị Ime N’usoro,” dị niime Mkpughe niile dị N’ọnọdụ, 50–53.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:1–4
Ana m eri oriri nsọ na ncheta nke Jizọs Kraịst.
Sally Knight na Emma Smith ka e mere baptizim na Jun 1830, mana nnabata ha ka igwe mmadụ na-eme ọgbaaghara kụsasịrị. Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, Sally na di ya, Newel, gara leta Emma na Josef, ma ekpebiri na a ga-anabata ha ugbu a ma na ndị òtù ahụ ga-erikọta oriri nsọ ọnụ. Mgbe ọ nọ n’ụzọ iwete mmanya maka oriri nsọ, onye mmụọ ozi kwụsịrị Josef.
Gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:1–4 ịchọta ihe mmụọ ozi ahụ kuziiri ya banyere oriri nsọ. Kedụ ihe amaokwu ndị a na-arọpụta banyere otu Onye Nzọpụta si chọọ ka ị mee oriri nsọ? Kedụ ihe i chere ọ pụtara iri ya “jiri anya naanị ruru n’ebube [Ya]”? Tulee nke a—ma chọgharịa maka nghọta niile banyere oriri nsọ—dị ka ị na-agụ Luk 22:19–20 na 3 Nefi 18:1–11. (Lee kwa vidiyo ndị a “Nri abalị nke Ikpeazụ,” “Jizọs Kraịst Na-agọzi Achịcha na Ncheta nke Ya,” ma “Jizọs Kraịst Na-agọzi Mmanya na Ncheta nke Ya,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Ịmụ ihe banyere ime oriri nsọ ịbụ nhụmiihe jupụtara n’ofufe, tulee ị mụ ozi nke Okenye D. Todd Christofferson “Achịcha ahụ Dị ndụ Nke Sitere N’eluigwe Gbadata” (Liahona, Nov. 2017, 36–39). Gịnị ka Okenye Christofferson kuziri nwere ike inyere gị aka nwee mmetụta njikọ na Onye Nzọpụta karịsịa site n’oriri nsọ? Tulee ihe i nwere ike ime iji kwadozie iri ihe nnọchianya niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta ma nye ha nkwanye ugwu ma ọ bụ nzube dị ukwuu.
Tulee ịgụ, ịge ntị nye, ma ọ bụ ịgụ abụ oriri nsọ, dị ka “Dị ka Ugbu a Anyị Na-eri Oriri nsọ” (Abụ niile, no. 169), na idedata mmetụta gị banyere isonye n’emume nsọ nke a dị nsọ.
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77, 79; 59:9–13; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Oriri nsọ,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ịnata na Idote Mgbaghara nke Mmehie site N’emume nsọ niile,” dị niime Devid A. Bednar, “N’edote Mgbe niile Mgbaghara nke Mmehie Gị niile,” Liahona, Me 2016, 60–62.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:5–14
Onyenwe anyị na-enye ụmụ odibo Ya ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja iji duzie ọrụ Ya.
Gịnị ka ị maara banyere ndị amụma akpọrọ aha niime amaokwu ndịa? Unu nwere ike chọgharịa maka ozi banyere ha niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ. Kedụ ngọzi ndị pụtaworo nye gị site n’ọtụghe niile nke ndị amụma ndịa ji?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:15–18
Uwe igwe nke Chineke na-enyere m aka guzogide ajọọ ihe.
Onyeisi M. Russell Ballard kwuru: “Enweghị otu ihe dị ukwuu ma dị nnukwu anyị nwere ike ime iji chekwaa onwe anyị niime mmụọ. Ezigbo ike ime mmụọ dabeere na ụmụ obere imerime omume ejikọtara ọnụ n’akwa nke nchekwa ime mmụọ na-echekwa ma na-egbochi site n’ajọọ ihe niile” (“Sie ike niime Onyenwe anyị,” Ensign, Julaị 2004, 8).
Dị ka ị na-amụ banyere uwe igwe nke Chineke niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:15–18, i nwere ike kepụta tebụlụ dị ka nke a. Gịnị ka i na-eme iji yinye otu ibe uwe igwe nke Chineke ọbụla?
Ibe uwe igwe |
Akụkụ ahụ echekwara |
Ihe akụkụ ahụ ahụ nwere ike ịnọchite |
---|---|---|
Ibe uwe igwe Ngwa nchekwa obi nke ezi omume | Akụkụ ahụ echekwara Obi | Ihe akụkụ ahụ ahụ nwere ike ịnọchite Ọchịchọ m na ịhụnaanya m niile |
Ibe uwe igwe Okpu igwe nke nzọpụta | Akụkụ ahụ echekwara Isi ma ọ bụ uche | Ihe akụkụ ahụ ahụ nwere ike ịnọchite |
Ibe uwe igwe | Akụkụ ahụ echekwara | Ihe akụkụ ahụ ahụ nwere ike ịnọchite |
Ibe uwe igwe | Akụkụ ahụ echekwara | Ihe akụkụ ahụ ahụ nwere ike ịnọchite |
Lee kwa Ndị Efesọs 6:11–18; Jorge F. Zeballos, “Iwulite Ndụ Guzogidere Onye iro,” Liahona, Nov. 2022, 50–52.
Jizọs Kraịst na-atuziri Nzukọ nsọ Ya aka site na onye amụma Ya dị ndụ.
Chee ihe ọ ga-adị ka ya ọ bụrụ ma onye ọbụla nwere ike ị nata iwu nsọ niile na mkpughe maka Nzukọ nsọ dum. Mgbe Hiram Page kwuru maka ịnata ụdị mkpughe a, ọtụtụ ndị otu Nzukọ nsọ nwere mgbagwoju anya. Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28, Onyenwe anyị kpughere usoro maka mkpughe niime Nzukọ nsọ Ya. Gịnị ka ị na-amụta site na nkeji nke a banyere ọrụ a kpọrọ aha nke Onyeisi Nzukọ nsọ? Gịnị ka ị na-amụ banyere otu Chineke nwere ike isi tuziere gị aka?
Lee kwa Dale G. Renlund, “Mkpuchi maka Mkpughe Nke Onwe,” Liahona, Nov. 2022, 16–19.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:8–9
Kedụ ihe kpatara ozi mgbasa ozi nye ndị Laman si dị mkpa?
Otu nzube Akwụkwọ nke Mọmọn bụ “na ndị Laman nwere ike bịa na mmata ihe nke ndị nna nna ha ha, ma na ha nwere ike mara nkwa niile nke Onyenwe anyị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 3:20). Nke a kwekọrọ na nkwa niile ahụ Onyenwe anyị kwere ọtụtụ ndị amụma Akwụkwọ nke Mọmọn (lee, n’ịma atụ, 1 Nefi 13:34–41; Enọs 1:11–18; Helaman 15:12–13). Ndị otu Nzukọ nsọ isimbụ weere ndị India Amerịka ịbụ ụmụ ụmụ nke ndị nke Akwụkwọ nke Mọmọn. (Ọnọdụ iwu nke Nzukọ nsọ taa bụ na ndị Laman so n’etiti ndị nna nna nke ndị India Amerịka” [nkọwa nke Akwụkwọ nke Mọmọn].)
Ịgụkwu ọzọ banyere mgbasa ozi Oliver Cowdery na ndị India Amerịka nọ nso, lee, “Mgbasa ozi gaa na Ndị Laman,” Mkpughe dị na Ọnọdụ, 45–49. Gịnị ka mgbasa ozi nke a na-akuziri gị banyere Onyenwe anyị na ọrụ Ya?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:1–2
Oriri nsọ na-enyere m aka cheta Jizọs Kraịst.
-
Ụmụntakịrị nwere ike na-eche ihe mere anyị si eji mmiri maka oriri nsọ mgbe Jizọs jiri mmanya (lee Luk 22:19–20; 3 Nefi 18:1–11). I nwere ike gụkọọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:1–2 ọnụ ma kparịta ihe ọ pụtara iri oriri nsọ “jiri anya ruru naanị n’otito nke [Chineke]” (amaokwu 2). Gịnị ka anyị nwere ike ime iji lekwasị Onye Nzọpụta anya mgbe anyị na-eri oriri nsọ?
-
Elemaanya inwe foto, amaokwu akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ ahịrịukwe banyere Onye Nzọpụta nwere ike nyere ụmụ gị aka cheta Ya mgbe a na-eri oriri nsọ. Ha nwere ike nwee obi ụtọ ikepụta akwụkwọ nta nwere ụfọdụ niime foto, amaokwu, na ahịrịukwe ndị a. Ha nwere ike see foto nke onwe ha ma ọ bụ chọta ụfọdụ niime magazin Friend.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:15–18
Uwe igwe nke Chineke na-echekwa m.
-
I nwere ike gosi ụmụ gị otu foto nke uwe igwe dị ka otu nke dị niime ndepụta nke a ma ọ bụ dị na ihu akwụkwọ ihe omume niime ndepụta maka Ndị Efesọs niime Bịanụ, Soro M—Maka Praịmarị: Agba Ọhụrụ 2023. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 27:15–18, nyere ha aka chọta ụmụ iberibe nke uwe igwe niime foto ahụ. Olee otu uwe igwe nke Chineke ga-esi enyere anyị aka “guzogide ụbọchi ọjọọ ahụ”? (amaokwu 15).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:2, 6–7
Onye amụma na-anata mkpughe maka Nzukọ nsọ; e nwere m ike ịnata mkpughe maka ndụ nke m.
-
Ọ bụrụ na i nwere ọtụtụ ụmụ, i nwere ike kpọkuo ha ime ejije “isoro onye ndu,” mana rịọ ụmụ abụọ ma ọ bụ karịa ịbụ ndị ndu otu oge ahụ kwa. Gịnị na-eme mgbe enwere karịa otu onye ndu? I nweziri ike mgbe ahụ mụọ banyere Hiram Page (lee “Isi nke 14: Onye Amụma na Mkpughe niile maka Nzukọ nsọ,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 56–57, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara dị niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma; ma ọ bụ isi nkeji nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28). Olee otu Nna nke Eluigwe si metazie mgbagwoju anya nke ndị òtù Nzukọ nsọ isimbụ? Olee otu O si na-edu Nzukọ nsọ taa?(lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:2). Kesaa ama gị na onye amụma nke ugbua ka akpọrọ site n’aka Onyenwe anyị idu Nzukọ nsọ Ya n’ụbọchi anyị.
-
Ebe mkpughe maka Nzukọ nsọ ga-abụkarị nke enyere mgbe niile site n’aka onye amụma, enwere ike idu anyị niile site na Mmụọ Nsọ. I nwere ike nyere ụmụ gị aka chọgharịa ụfọdụ niime akwụkwọ nsọ ndị a sotere ma depụta ụzọ niile Mmụọ Nsọ nwere ike isi duo anyị: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28:1,4, 15; Jọn 14:26; Moronaị 8:26; 10:4–5. Kekọrịtara unu na ibe unu otu esiworo duo gị site n’aka Mmụọ Nsọ.