Come, Follow Me
Maachị 31–Eprel 6: “Jizọs Kraịst Ga-ekpokọta Ndị Ya”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29


“Maachị 31–Eprel 6: ‘Jizọs Kraịst Ga-ekpokọta Ndị Ya’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Jizọs Kraịst ka ndị kwere ekwe gbara gburugburu

Maachị 31–Eprel 6: “Jizọs Kraịst Ga-ekpokọta Ndị Ya”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29

Ọbụna agbanyeghị Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ka ahaziworo na 1830, ọtụtụ eziokwu nke ozi ọma ka a na-ekpughebeghịrịị, ma ọtụtụ ndị òtù Nzukọ nsọ n’isi mbụ nweburu ọtụtụ ajụjụ. Ha agụwo ama niile dị niime Akwụkwọ nke Mọmọn banyere mkpokọta nke Isreal na mwulite Zayọn (lee 3 Nefi 21). Olee otu nke ahụ si eme? Mkpughe ndị Hiram Page kwuru na ya natara tulere isiokwu nke ahụ, nke naanị mụbara ọchịchọ ịmata ihe nke ndị òtù (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 28). Ndị ọzọ chere banyere Ọdịda nke Adam na Iv na ọnwụ ime mmụọ. Onyenwe anyị nabatara ajụjụ ndịa na 1830, ma Ọ na-anabata ajụjụ anyị taa. “Ihe ọbụla ọ bụ unu ga-arịọ n’okwukwe,” ka Ọ gwara Ndị nsọ, “ịdị n’otu n’ekpere dị ka otu iwu m siri dị, unu ga-anata” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:6). N’ezie, dị ka mkpughe bara ụbara n’ozizi dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29 na-egosipụta, Onyenwe anyị mgbe ụfọdụ na-aza ajụjụ anyị site na-inye anyị eziokwu na mmata ihe fere nke ukwuu ihe anyị rịọrọ.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29

Nna nke Eluigwe nwere atụmatụ maka nzọpụta nke ụmụ Ya.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29 na-akuzi ọtụtụ eziokwu banyere atụmatụ nke Chineke nwere maka gị. Dị ka ị na-agụ, chọọ eziokwu ndị ị na-amụ banyere akụkụ nke ọbụla nke atụmatụ Ya ndịa:

Kedụ nghọta ndị i nwetere? Ọ bụrụ ma ọ dị mkpa nye gị, i nwere ike dee ha n’oghere enyere ya na oyiyi niile dị na ngwụcha nke ndepụta nke a. Olee otu eziokwu ndị a si emetụta ndụ gị?

Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Atụmatụ nke Nzọpụta,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Bịakwute M

Nkọwa sitere na Bịakwute M, site n’aka Jenedy Paige

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:1–28

akara ngosi semịnarị
Jizọs Kraịst na-akpọku m inye aka kpokọta ndị Ya tupu Ọbịbịa Ya nke Ugboro Abụọ.

Jizọs Kraịst na-ekwu maka ikpokọta ndị Ya “dị ka nnekwu ọkụkọ si ekpokọta ụmụ ya n’okpuru nku ya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:2). Kedụ ihe ntụnyere nke a na-akuziri gị banyere Jizọs Kraịst? Kedụ echiche na mmetụta ndị agbakwunyere na-abịara gị dị ka ị na-amụ ngosipụta nke nnekwu ọkụkọ na ụmụ ọkụkọ dị niime ndepụta nke a? Chee banyere otu i siworo nwee metụta na Jizọs Kraịst na-ekpokọta ma na-echekwa gị.

Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:1–11, chọọ nghọta banyere:

  • Onye ka a ga-ekpokọta.

  • Ihe ọ pụtara “ikpokọta” nye Kraịst.

  • Ihe kpatara anyị si na-ekpokọta nye Ya.

Tulee ihe kpatara i jiri chọọ ka ekpokọta ndị ọzọ nye Jizọs Kraịst. Kedụ ihe metụtara gị ime iji nye aka?

I nwere ike jụọ onwe gị otu ụdị ajụjụ ndị ahụ mgbe i na-ele vidiyo “Onye Akaebe nke Chineke” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) ma ọ bụ ịgụ ihe ma ọ bụ ige ntị n’otu abụ banyere mkpokọta, dị ka “Israel, Israel, Chineke Na-akpọ” (Abụ niile, nọ. 7). Kedụ mmetụta ị na-enwe na Onyenwe anyị na-agbalị ikuziri gị banyere ọrụ nke mkpokọta Ya?

2:40

A Witness of God

Elder Neil L. Andersen describes how all of God's children are pieces of a large puzzle in preparation for the Second Coming of Jesus Christ.

Onyeisi Russell M. Nelson kwuru: “Ugbu a mkpokọta ahụ na-eme na mba niile. Onyenwe anyị amawo ọkwa mhiwe nke Zayọn n’alaeze ọbụla ebe O nyeworo Ndị nsọ Ya ọmụmụ na mba ha” (“Mkpokọta nke Israel Ekposara ekposa,” Liahona, Nov. 2006, 81). Olee otu mkpokọta n’ụzọ nke a si enyere anyị aka kwadoo n’ihe niile” maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta? (amaokwu 8; lee kwa amaokwu 14–28).

Lee kwa Russell M. Nelson na Wendy W. Nelson, “Olileanya nke Israel” (ofufe nro ndị ntorobịa zuru ụwa niile, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ Ozi ọma; D. Todd Christofferson, “Ozizi nke Isonye,” Liahona, Nov. 2022, 53–56; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mkpokọta nke Israel,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:31–35

“Ihe niile enyere m bụ nke ime mmụọ.”

Dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:31–35, jụọ onwe gị, “N’echiche dị aṅaa ka iwu nsọ niile si bụrụ nke ime mmụọ?” I nwere ike depụta iwu nsọ ole ma ole ma tulee eziokwu ime mmụọ metụtara nke ọbụla. Nnyochagharị nke Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Ihe Odudu maka Ime Nhọrọ niile nwere ike inye aka—ọ na-akuzi ụfọdụ eziokwu ebighị ebi so ọtụtụ iwu nsọ nke Chineke n’azụ.

Olee otu ịmara na “ihe niile … bụ nke ime mmụọ” si emetụta ụzọ i si ahụ iwu nsọ niile nke Chineke? Tulee ịchọta mpụtara ime mmụọ ma ọ bụ nzube n’akụkụ ndụ gị ndị ọzọ kwa.

Lee kwa 2 Nefi 9:39.

Lekwasị anya na Jizọs Kraịst. “Isiokwu ọbụla [bụ] ohere iji kuzie ihe ma mụta ihe banyere Jizọs Kraịst” (Ikuzi ihe N’ụzọ nke Onye Nzọpụta, 6). Gịnị ka ị na-amụ banyere njirimara Ya niile, ọrụ Ya niile, na ọmụmaatụ Ya dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:36–50

Jizọs Kraịst na-agbapụta anyị site na Ọdịda ahụ.

Olee otu i nwere ike iji Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:36–50 ji kọwaa ihe kpatara anyị si nwee mkpa mgbapụta site na Jizọs Kraịst?

Ọdịda nke Adam na Iv wetere ọnwụ na mmehie niime ụwa, mana ọ kwadokwara ụzọ nke mgbapụta na ọńụ site na Kraịst. Site n’ibu echiche nke ahụ n’uche, gụọ amaokwu 39–43 ma hụba ama mkpụrụ okwu niile na nkebiokwu niile na-ewetere gị ọńụ. Gịnị na-amasị gị banyere ihe Adam na Iv kwuru banyere Ọdịda ahụ niime Moses 5:10–12?

Lee kwa “Ihe Kpatara Anyị Si Nwee Mkpa Onye Nzọpụta” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

2:15

Why We Need a Savior

What would life be like without a Savior? There would be no joy, no forgiveness, no hope for the future. This Christmas, learn more about the hope, peace and happiness our Savior Jesus Christ can bring into our lives at christmas.mormon.org.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29

Nna nke Eluigwe nwere atụmatụ maka nzọpụta nke ụmụ Ya.

  • Ịmalite ịkpa nkata banyere atụmatụ nke Nna nke Eluigwe maka anyị, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere otu oge mgbe i tụrụ atụmatụ, dị ka maka ime njem ma ọ bụ imejupụta otu ọrụ. I nwere ike kesaa ọmụmaatụ ndị nke atụmatụ niile, dị ka kalenda nwere ihe omume ndị edepụtara na ya ma ọ bụ ntuzi aka niile iji mee otu ihe. Gịnị mere atụmatụ ji baa uru? Unu nwere ike kwuo banyere ihe Nna nke Eluigwe chọrọ imejupụta na otu atụmatụ Ya si enyere anyị aka mejupụta ya.

  • I nwere ike iji oyiyi niile dị na ngwụcha ndepụta nke a iji nyere ụmụ gị aka chọta amaokwu ndị nọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29 na-akuzi ihe banyere akụkụ dị iche iche nke atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. I nwekwara ike chapụta oyiyi ndị ahụ ma rịọ ụmụ gị ịgbazi ha n’usoro ziri ezi. Gịnị kpatara anyị si enwe obi ekele ịmara na Nna nke Eluigwe nwere atụmatụ maka anyị? Olee otu ịmara banyere maka ya si emetụta ụbọchi niile nke ndụ anyị?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:1–2, 7–8

Jizọs Kraịst na-ekpokọta ndị Ya tupu Ya abịa ọzọ.

  • Ngosipụta dị n’okpuru nke nnekwu ọkụkọ na-ekpokọta ụmụ ya ma ọ bụ vidiyo nke “Ụmụ ọkụkọ na Nnekwu ọkụkọ niile” (ChurchofJesusChrist.org) nwere ike inyere ụmụ gị aka jiri anya nke uche hụ ntụnyere ahụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:1–2. Mgbe ahụ unu nwere ike gụkọrịta amaokwu ndị a ọnụ ma kwurịtara ibe unu banyere otu nnekwu ọkụkọ si echekwa ụmụ ya na otu nke ahụ si yie ihe Onye Nzọpụta nwere ike imere anyị.

    1:24

    Chicks and Hens

    otu nnekwu ọkụkọ ya na ụmụ ọkụkọ gbakọtara n’okpuru nku ya

    Aga M Ekpokọta Gị, site n’aka Liz Lemon Swindle

  • Gịnị ga-akpatemmụọ ụmụ gị iji chọọ inyere Onye Nzọpụta aka kpokọta ndị Ya? Enwere ike ọ ga-amasị ha ịnụ nhụmiihe nke otu onye onye “kpokọtara” nye ya site n’isonye Nzukọ nsọ Ya. N’ịma atụ, onye kpọtara ezi na ụlọ unu na Nzukọ nsọ? Olee otu esiworo gọzie anyị site n’ịnabata ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ikpokọta nye Ya? Olee otu anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka gbakwute Ya? (Lee “Otu Ozi maka Ụmụntakịrị sitere n’aka Onyeisi Russell M. Nelson” [vidiyo], ChurchofJesusChrist.org.)

    3:30

    Video: A Message for Children from President Russell M. Nelson

    In the 2021 Friend to Friend event, President Russell M. Nelson gave this message to children around the world.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:11

Jizọs Kraịst ga-abịa ọzọ.

  • Otu foto nke Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onye Nzọpụta (dị ka Akwụkwọ Nka Ozi ọma, no. 66) ma ọ bụ egwu banyere ya (dị ka “Mgbe Ọ Ga-abịa Ọzọ,Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 82-83) nwere ike nyere gị na ụmụ gị aka kparịta nkata Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:11. Nyere ụmụ gị aka mata nkebiokwu niile dị niime akwụkwọ nsọ nke metụtara otu ihe niime foto ma ọ bụ egwu ahụ. Kesaara ibe unu otu o si metụta gị banyere ọbịbịa Jizọs Kraịst ọzọ n’elu ụwa.

The resurrected Jesus Christ (wearing white robes with a magenta sash) standing above a large gathering of clouds. Christ has His arms partially extended. The wounds in the hands of Christ are visible. Numerous angels (each blowing a trumpet) are gathered on both sides of Christ. A desert landscape is visible below the clouds. The painting depicts the Second coming of Christ. (Acts 1:11)

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.