“Eprel 21–27: ‘Ọ Bụrụ Na Unu Abụghị Otu Unu Abụghị Nke M’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37–40,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37–40,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Eprel 21–27: “Ọ Bụrụ Na Unu Abụghị Otu Unu Abụghị Nke M”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37–40
Nye Ndị nsọ isimbụ, Nzukọ nsọ karịrị ebe a na-anụ ụmụ nkwusa ozi ọma na Sọnde. Mkpughe niile jiri mkpụrụ okwu dị ka kpatara, alaeze, Zayọn, na, ọtụtụ mgbe, ọrụ. Nke ahụ nwere ike bụrụ akụkụ nke ihe dọtara ndị mmadụ na Nzukọ nsọ eweghachitere. Ka ha ra bụ otu ha si nwee ịhụnaanya n’ebe ozizi dị, ọtụtụ chọkwara ihe dị nsọ ha nwere ike ịranye ndụ ha na ya. Ọbụna otu a, irube isi nye iwu 1830 nke Onyenwe anyị ịgbakọta na Ohio adịghị mfe. Nye ọtụtụ, ọ pụtara ịhapụ ebe obibi doro ha ahụ maka ebe amaghi ama (lee “Olu niile nke Mweghachite: Ikpokọta gaa Ohio”). Taa anyị nwere ike hụta nke ọma ihe Ndị nsọ ndị ahụ nwere ike ịhụ naanị nanya nke okwukwe: Onyenwe anyị nwere nnukwu ngọzi ndị na-echere ha na Ohio.
Mkpa ịgbakọta na Ohio agafeworịị kemgbe, mana Ndị nsọ taa ka na-adị n’otu n’okpuru otu ụdị mkpa ahụ: “iwete Zayọn niihu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:13). Dị ka Ndị nsọ isimbụ ahụ, a na-akpọku anyị ịhapụ “mkpa niile nke ụwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 40:2) ma tụkwasị obi na nkwa nke Onyenwe anyị: “Ị ga-anata … ngọzi dị ukwuu dị ka ị na-amatabeghị mbụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:10)
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:109–11.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37–38
Chineke na-akpọkọta anyị iji gọzie anyị.
Ndị òtù Nzukọ nsọ niime Fayette, New York, ahaghị ịchụ àjà ndị siri ike iji kwaga Ohio (ihe karịrị maịlụ 250) n’oge winta nke 1831. Dị ka ị na-agụ banyere iwu nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37:3–4, i nwere ike chee banyere aja ndị Onyenwe anyị chọworo n’aka gị. Emesịa, dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:1–33, chọọ maka eziokwu niile banyere Onye Nzọpụta nke na-enye gị okwukwe isoro ndụmọdụ Ya. Kedụ ihe ị na-amụ site na amaokwu 11–33 banyere ngọzi niile nke mgbakọta dị ka ndị na-eso Jizọs Kraịst?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:22
“Nụrụ olu m ma soro m.”
Olee otu i ga-esi eme Jizọs Kraịst “onye na-enye iwu” gị? Olee otu isoro iwu Ya niile ga-esi eme unu “ndị nweere onwe ha”?
Lee kwa 2 Nefi 2:26–27.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30
Ọ bụrụ ma m dị njikere, ekwesịghị m ịtụ ụjọ.
Kedụ mgbe ị nweworo nhụmihe nke ụkpụrụ Onyenwe anyị kpughere niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30: “Ọ bụrụ ma gị dị njikere ị gaghị atụ ụjọ”? Dị ka ị na-amụ nkeji 38, mata otu Onyenwe anyị si akwado Ndị nsọ Ya ka ha nwee ike jiri mgbam ume zute ọdịniihu. Olee otu O si chọọ gị ịkwado maka aka mgba niile ka i nwee ike ghara ịtụ ụjọ?
Lee kwa Devid A. Bednar, “Anyị Ga-egosi Ha N’ebe a,” Liahona, Nov. 2020, 8–11.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:24–27
Chineke chọrọ ka anyị “bụrụ otu.”
Ndị gbakọtara na Ohio sitere n’ọnọdụ dị iche iche bịa. Nke ahụ nwekwara ike bụrụ eziokwu nye ndị nọ na ngalaba ukwu gị. Mana Onyenwe anyị nyere ndị Ya iwu ị “bụrụ otu” (amaokwu 27). Olee otu anyị ga-esi emejupụta ụdị ịdị n’otu nke a? Kedụ nchepụta ndị na-abịa n’uche dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:24–27? Gịnị kpatara o ji dị mkpa ijikọta iji nwee ike bụrụ ndị nke Chineke?
Ịgụ amaokwu ndị a nwekwara ike kpatee mmụọ gị iche banyere mmekọrịta gị niile—ịma atụ, gị na ndị òtù ezi na ụlọ, ndị òtù ngalaba ukwu, na ndị òtù kworum na klas. Kedụ ihe nwere ike ịdị na-edebe gị site na-ịdị n’otu niime Kraịst? Olee otu Onye Nzọpụta ga-esi enyere gị aka “bụrụ otu”? Vidiyo niile “Enyi nye Ndị Niile” ma ọ bụ “Ịhụnaanya niime Obi Anyị” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) nwere ike nyere gị aka zaa ajụjụ ndị a. I nwekwara ike chọta nchepụta ndị dị niime ozi nke Okenye Dale G. Renlund “Udo nke Kraịst Na-ewepụ Ibu iro,” Liahona, Nov. 2021, 83–85.
Olee otu ị ga-esi enyere ndị òtù ndị a aka dịkarịa n’otu? N’ịma atụ, tulee iziga ma ọ bụ idega ozi nye ndị òtù nke kworum, klas, ma ọ bụ ezi na ụlọ gị. Onye na-emetụta gị na obi ịkpọtụrụ?
Gịnị na-akpate mmụọ gị banyere ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta dị niime Ndị Efesọs 2:14, 18–22; 2 Nefi 26:24–28?
Lee kwa Quentin L. Cook, “Obi ndị Ejikọtara N’ezi omume na Ịdị n’otu,” Liahona, Nov. 2020, 18–21; “Hụ Onye N’ibe Naanya,” Hymns, no. 308; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Isonye na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:39; 39–40
Nna nke Eluigwe chọrọ inye m akụ na ụba nke ebighị ebi.
N’uche nke gị, gịnị bụ ndịiche dị n’etiti “akụ na ụba nke ụwa” na “akụ na ụba nke ebighị ebi”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:39). Kedụ nhụmiihe ndị kuziwooro gị iji akụ na ụba niile nke ebighị ebi kpọrọ ihe?
Buru nke a n’uche dị ka ị na-agụ banyere Jemis Covel niime nkeji 39–40 (gụnyekọta esiripụta nke agụgụala dị niime isi nkeji niile). Tulee otu nhụmiihe nke a nwere ike isi metụta gị. Ịmaatụ, chee maka oge mgbe “obi gị … ziri ezi niihu [Chineke]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 40:1). Olee otu esi gọzie gị maka ikwesị ntụkwasị obi gị? Cheekwa maka ụdị “mkpa niile nke ụwa” ị na-ezute. Olee otu ha nwere ike i si gbochie gị site na-ịnata okwu Chineke “n’obi ụtọ”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:9; 40:2). Kedụ ihe ị na-ahụta na nkeji ndị a na-akpate mmụọ gị ịnọgidesi ike karịa na nrube isi nye Chineke?
Lee kwa Matiu 13:3–23.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37; 38:31–33
Chineke na-akpọkọta anyị iji gọzie anyị.
-
Maapụ ahụ na ihu akwụkwọ ihe omume na ngwụcha ntụpụta nke a nwere ike nyere ụmụ gị aka ghọta ihe Chineke nyere n’iwu niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 37:3. Enwere ike gị enyere ha aka chọta ebe niile a kpọrọ aha niime mkpughe ndị a. I nwekwara ike nyere ha aka chọta nkebiokwu sitere na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:31–33 nke na-akọwa ihe kpatara Chineke ji chọọ ka ndị Ya gbakọta ọnụ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:24–27
Chineke chọrọ ka anyị “bụrụ otu.”
-
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:24–25 gị na ụmụ gị, kwuo okwu banyere ihe ọ pụtara iwere nwanne gị nwoke ma ọ bụ nwanne gị nwanyị dị ka onwe gị (lee kwa Matiu 7:12). Nyere ha aka ikwugharị akwụkwọ nsọ ahụ, na-edoghachi “nwanne ya nwoke” jiri aha nke onye ọbụla.
-
Ikuziri ụmụ gị ihe ọ pụtara ị “bụrụ otu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:27), i nwere ike nyere ha aka dọta ọnụọgụgụ buru ibu 1 ma chọọ ya mma jiri aha niile na ihe eserese niile ma ọ bụ foto niile nke onye ọbụla niime ezi na ụlọ ma ọ bụ klas gị. Nke sotere 1, i nwere ike dee ihe ndị ị ga-eme iji dịrị n’otu karịa.
-
Tulee ihe ọmụmụ a na-emetụ aka na-egosi otu enwere ike i si tinyekọta ma ọ bụ jikọọ iji bụrụ otu, dị ka iberibe akwa eji akpa otu quilt ma ọ bụ ngwa nri ndị na-emepụta otu ogbe achịcha. Gịnị ka ọmụmaatụ ndị a na-akuziri anyị banyere ịbụrụ otu dị ka ndị nke Chineke?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30
Ọ bụrụ ma m dị njikere, ekwesịghị m ịtụ ụjọ.
-
Dị ka ị na-agụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:30, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere nhụmiihe ndị nso nso a nke na-achọ nkwado. Emesịa i nwere ike jụọ ụmụ gị banyere ihe ndị Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị kwadoo maka ya. Kesaara ụmụ gị otu nhụmiihe nke na-egosi na ịkwado akwado nyeere gị aka ghara ịtụ egwu. Unu nwekwara ike ilekọta ọnụ vidiyo “Obi nke Ụmụ mmadụ Ga-agbagha Ha” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:6, 23
Ana m anata onyinye nke Mmụọ Nsọ mgbe anabatara m.
-
Tulee igosi otu foto nke onye a na-anabata. Rịọ ụmụ gị ịkọwa ihe na-eme niime foto ahụ. I nwekwara ike kpọkuo ha ịtụ foto ahụ aka mgbe ọbụla ha nụrụ mkpụrụ okwu a Mmụọ Nsọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 39:6, 23 (ma ọ bụ otu egwu dị ka “Mmụọ Nsọ Ahụ,” Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 105). Kesaara onwe unu otu onyinye nke Mmụọ Nsọ siworo gọzie unu.