“Olu niile nke Mweghachite: Ndị Ntọghata Isimbụ,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ndị Ntọghata Isimbụ,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Ndị Ntọghata Isimbụ
Ọbụna tupu ahazie Nzukọ nsọ na Eprel 1830, Onyenwe anyị mara ọkwa, “Ubi ama ahụ akaalarịị na-eche owuwe ihe ubi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:4). Nkwupụta nke a gosipụtara eziokwu n’ọnwa ndị sotere, ka ha ra bụ ndị na-achọ eziokwu ka e duuru site na Mmụọ nke Chineke ruo na-ịchọta Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst eweghachitere.
Ọtụtụ niime ndị isimbụ ndị a atọghatara atọghata bụụrụ ngwa ọrụ na-ịtọ ntọala nke Mweghachite, ma akụkọ ntọghata ha baara anyị uru taa. Okwukwe ha gosipụtara bụkwa otu ụdị okwukwe ahụ anyị chọrọ ịji tọghata anyị nye ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Abigail Calkins Leonard
Mgbe Abigail Calkins Leonard gbara afọ iri atọ na ụma, ọ chọburu ka agbaghara mmehie ya. Mgbe na mgbe ọ gụrụ Baịbụl, ma ndị mmadụ sitere na nzukọ okpukerechi Kraịst letara ya n’ebe obibi, mana o nwere mgbagwoju anya banyere ihe mere otu nzukọ nsọ jiri dị iche site na nke ọzọ. “Otu ụtụtụ,” o kwuru, “E weere m baịbụl m ma gaa n’ọdọ osisi, mgbe m dara n’ikpere m.” O kpesiri ekpere ike nye Onyenwe anyị. “Ngwa ngwa ọhụ gafere niihu m,” ka o kwuru, ma “okpukperechi dị iche iche gafere nihu m n’otu n’otu, ma otu olu kpọrọ m aha, na-asị: ‘Ewulitere ndị a maka uru.’ Emesịa, agafee, a hụtara m nnukwu ihe, ma otu olu sitere n’elu kwupụtara: ‘Aga m akpọlite ndị mmadụ, ndị ọ ga-amasị m inwe ma gọzie.’” Mgbe na-adịghị anya gasịrị, Abigail nụrụ banyere Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọbụnadị na ọ ka enwebeghị otu kọpị, o chọrọ “ịma eziokwu nke akwụkwọ nke a, site n’onyinye na ike nke Mmụọ Nsọ,” ma ọ “nwetere mmetụta ya n’otu ntabi anya.” Mgbe o mesịrị gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn n’ikpeazụ, ọ dịịrị “njikere ịnabata ya.” Ya na di ya, Lyman, mere baptizim na 1831.
Thomas B. Marsh
Mgbe Thomas B. Marsh bụ dimkpa nta, ọ gụrụ Baịbụl ma sonye otu nzukọ Ndị Otù Kraịst. Mana o jughị ya afọ, n’ikpeazụ pụọ kpam kpam site na nzukọ nsọ niile. “E nwetere m ezigbo mmụọ nke ibu amụma,” ka o kwuru, “ma gwa [otu onye ndu okpukpere chi] na a tụrụ m anya na otu nzukọ nsọ ọhụrụ ga-ebilite, nke ga-enwe eziokwu ahụ na-enweghị ntụpọ na ya.” Na-eteghị anya mgbe nke a gasịrị, Thomas nwetere nkwalite ime mmụọ ịhapụ ebe obibi ya na Boston, Massachusetts, ma jee mpaghara ọdịda anyanwụ. Mgbe ọ nọchara ọnwa atọ na mpaghara ọdịda anyanwụ New York na-achọtaghị ihe ọ na-achọ, ọ malitere ịla ebe obibi ya. N’ụzọ, otu nwanyị jụrụ Thomas ma ọ nụwo banyere “Akwụkwọ Ọlaedo otu nwa okoroọbịa akpọrọ Josef Smith hụrụ.” Ebe echiche nke a dọọrọ mmasị ya, Thomas ngwa ngwa gara Palmyra ma zute Martin Harris n’ụlọ ọrụ mbipụta, n’oge naanị dị ka ihu akwụkwọ 16 nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn naara apụta n’igwe mbipụta. E kwere ka Thomas were otu kọpị nke ihu akwụkwọ 16 ndị ahụ, ma o welatara ha n’ebe obibi nye nwunye ya, Elizabeth. “Nwanyị ya nwere mmasị nke ukwuu” n’ebe akwụkwọ ahụ nọ, o chetara, “ikwere na ọ bụ ọrụ nke Chineke.” Thomas na Elizabeth mesịrị kwaga New York ha na ụmụ ha ma mee baptizim. (Maka ozi ọzọ banyere Thomas B. Marsh, lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31.)
Parley and Thankful Pratt
Dị ka Thomas Marsh, Parley na Thankful Pratt zaghachiri nkwalite ime mmụọ ịhapụ ubi ha na-eme nke ọma na Ohio jiri ebumnuche ikwusa ozi ọma dị ka ha ghọtara ya site na Baịbụl. Dị ka Parley gwara nwanne ya nwoke, “Mmụọ nke ihe ndị a ewetewo ụdị dị ike n’uche m nso nso a nke mere na m enweghị ike izuike.” Mgbe ha rutere mpaghara ọwụwa anyanwụ New York, Parley nwetere mkpatemmụọ ịnọtụ nwa oge na mpaghara ebe ahụ. Thankful, ha kpebiri, ga-aganiihu hapụ ya. “E nwere m ọrụ m ga-arụ na mpaghara obodo a,” Parley gwara ya, “ma ihe ọ bụ, ma ọ bụ ogologo oge ole ọ ga-ewe iji mee ya, amaghị m; mana aga m abịa mgbe e mere ya.” Ọ bụ ebe ahụ ka Parley nụrụ na mbụ maka Akwụkwọ nke Mọmọn. “E nwetere m mmasị dị iche n’akwụkwọ ahụ,” ka o kwuru. Ọ rịọrọ maka otu kọpị ma gụọ n’abalị ahụ niile. N’ụtụtụ, ọ maara na akwụkwọ ahụ bụ eziokwu, na-akpọ ya ihe “karịrị akụ na ụba niile nke ụwa.” Niime ụbọchi ole ma ole e mere Parley baptizim. Emesịa ọ lọghachikwutere Thankful, onye emekwara baptizim. (Maka ozi ọzọ banyere Parley P. Pratt, lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 32.)
Sidney na Phebe Rigdon
Mgbe o si New York na-aga mishọn na Missouri, Parley Pratt na ndị ọrụ ibe ya kwụsịrị na Mentor, Ohio, n’ebe obibi Sidney na Phebe Rigdon—ndị enyi ochie nke Parley site n’ụbọchi ya na Ohio. Sidney bụ onye ụkọchukwu otu Otù ndị Kraịst, ma Parley bụbuuru onye òtù ọgbakọ ya ma were ya dị ka onye ndụmọdụ ime mmụọ. Parley n’ịnụ ọkụ n’obi gwara enyi ya banyere Akwụkwọ nke Mọmọn na Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Sidney n’onwe ya a nọworịị na-achọgharị mweghachite nke ezi Nzukọ nsọ nke ọ hụtara akọwara niime Agba Ọhụụ, agbanyeghị ọ nwere obi abụọ banyere Akwụkwọ nke Mọmọn na mbụ. “Mana aga m agụ akwụkwọ gị,” ka ọ gwara enyi ya Parley, “ma ga-agbalị ịghọta, ma ọ bụ mkpughe sitere na Chineke ma ọ bụ na ọ bụghị.” Mgbe izu ụka abụọ nke ọmụmụ ihe na ekpere gasịrị, ma ya ma Phebe matara eziokwu na akwụkwọ ahụ bụ eziokwu. Mana Sidney matakwara na isonye Nzukọ nsọ ga-abụ nnukwu ịchụ aja nye ezi na ụlọ ya. O doro anya na ọ ga-ahapụ ọrụ ya dị ka onye ụkọchukwu, ya na ọnọdụ ya n’obodo. Dị ka ya na Phebe kparịtara ịdị ire nke a, Phebe mara ọkwa, “Agụwo m ihe ọ ga-anapụ, ma … ọ bụ ọchịchọ m ime uche Chineke, ma na ndụ ma n’ọnwụ.”