“Maachị 7–13: ‘Welienu Olu Unu … iji Maa Ọkwa Ozi ọma M’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–36,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–36,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Eprel 7–13: “Welienu Olu Unu … iji Maa Ọkwa Ozi ọma M”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–36
Parley P. Pratt abụrụworịị onye otu Nzukọ nsọ ihe ruru otu ọnwa mgbe akpọbara ya “niime alaịkpa” ikwusa ozi ọma (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 32:2). Thomas B. Marsh abụrụworịị onye otu ihe na-erughị oge ahụ mgbe a gwara ya, “Awa nke mgbasa ozi gị eruwo” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31:3). Orson Pratt, Edward Partridge, na ọtụtụ ndị ọzọ otu aka ahụ emeworịị baptizim n’etebeghị anya mgbe oku mgbasa ozi ọma ha bịara. Elemaanya enwere ihe ọmụmụ n’usoro nke a nye anyị taa: ọ bụrụ ma gị mara ihe zuturu ezu ịnabata ozi ọma eweghachitere site na baptizim, ị maara nke ọma ikesa ya nye ndị ọzọ. N’ezie, anyị na-achọkarị ịbawanye mmata ihe anyị nke ozi ọma, mana Chineke alabeghị azụ mgbe ọ bụla ịkpọku “ndị na-enweghị mmụta” ikwusa ozi ọma Ya (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 35:13). N’ezie, Ọ na-akpọku anyị niile, “Meghee ọnụ gị ịma ọkwa ozi ọma m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30:5). Ma anyị na-emetazi nke ahụ abụghị site n’amamiihe na nhụmiihe nke onwe anyị mana “site n’ike nke Mmụọ [ahụ]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 35:13).
Lee kwa “Okwukwe na Ọdịda nke Thomas Marsh,” “Ezra Thayer: Sitere na Obi abụọ ruo na Onye kwere ekwe,” “Oku Ije ozi nke Orson Pratt,” niime Revelations in Context, 54–69.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–36
A kpọrọ m ịbụ onye aka ebe nke Jizọs Kraịst.
Ma i nwere ma i nweghị ọkpụkpọ oku a kpọrọ dị ka onye mgbasa ozi, i nwere ike ịbụ onye aka ebe nke Jizọs Kraịst “oge niile, ma nihe niile, ma n’ebe niile” (Mozaya 18:9). Dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–36, dekọọ ihe ị mụtara banyere ohere niile iji kesaa ozi ọma. I nwere ike depụta ihe niile Onyenwe anyị chọrọ n’aka gị ma depụtakwa ọzọ maka nkwa niile Onyenwe anyị kwere dị ka ị na-ekesa ozi ọma (n’ịma atụ, lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30:8; 31:3–5; 32:1, 5; 35:13–15, 24). I nwekwara ike chọpụta ụkpụrụ niile nwere ike inyere gị aka kesaa ozi ọma. Gịnị ka ị na-ahụta na-akpatemmụọ gị “ịma ọkwa ozi ọma nke oke ọńụ”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31:3).
Okenye Gary E. Stevenson kuziri na ịma ọkwa ozi ọma “ka enwere ike imejupụta site n’ụkpụrụ dị mfe, kwere nghọta akuziri nye onye ọbụla niime anyị site na nwata: ịhụnaanya, ikekọrịta, na ịkpọku” (“Ịhụnaanya, Ikekọrịta, Ikpọku,” Liahona, Me 2022, 85) Tulee ịmụ ozi ya mgbe ị na-eche banyere ndị ị maara, ndị enyi, na ezi na ụlọ gị. Kedụ nchepụta ndị na-abịara gị banyere otu i nwere ike ikesaara ha “ihe na-amasị [gị] banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst”? Kedụ ụzọ ndị ị ga-eji kpọkụọ ha “ịbịa ma lee,” “bịa ma jee ozi,” na “bịa ma sonyere”? Dị ka ị na-ekwe ma ọ bụ na-ege ntị na “Aga M Aga Ebe Ị Chọrọ Ka M Gaa” (Abụ niile, no. 270) ma ọ bụ abụ yiri ya, i nwere ike jụọ onwe gị, “Gịnị ka Onyenwe anyị chọrọ ka m kwuo ma bụrụ iji nwee ike kesaa ozi ọma Ya?”
Lee kwa Marcos A. Aidukaitis, “Welie Obi Gị ma Ńụrịa,” Liahona, Me 2022, 40–43; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma nke Jizọs Kraịst,” “Ije ozi nlekọta dị ka Onye Nzọpụta Mere,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Ịkpọku Ndị niile Ịbịakwute Kraịst: Ikesa Ozi ọma” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31:1–2, 5–6, 9, 13
Onyenwe anyị pụrụ inyere m aka na mmekọrịta ezi na ụlọ m niile.
Ezi na ụlọ niile n’oge 1830 gbara ọtụtụ mbọ niihe yiri ụdị nke ọtụtụ ezi na ụlọ na-ezute taa. Kedụ odudu na nkwa niile nke Onyenwe anyị nyere Thomas B. Marsh banyere ezi na ụlọ ya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31? (Lee nke ka nke amaokwu 1 ruo 2, 5 ruo 6, 9, 13). Olee otu okwu Ya niile ga-esi enyere gị aka na mmekọrịta ezi na ụlọ gị?
Maka ozi ndị ọzọ banyere Thomas B. Marsh, lee Ndị nsọ, 1:79–80, 119–20.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 32–33; 35
Onyenwe anyị na-akwado m maka ọrụ Ọ chọrọ ka m rụọ.
Ị na-amụ ndụ nke ndị ahụ ekwuru maka ha niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 32-33; 35 nwere ike inyere gị aka mata otu Onyenwe anyị si na-akwado gị maka ọrụ Ya. N’ịmaatụ, i nwere ike gụọ banyere mmekọrịta dị n’etiti Parley P. Pratt na Sidney Rigdon niime “Olu niile nke Mweghachite: Ndị Ntọghata Isimbụ.” Olee otu mmekọrịta nke a si gọzie ụmụ Chineke? (lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 35).
Ebe a bụ ọmụmaatụ ọzọ: Ezra Thayer dere na n’oge tupu e mee ya baptizim, ọ hụrụ ọhụ nke “otu nwoke bịara ma wetere m akwụkwọ apịakọtara apịakọta ma nye mụ ya, nakwa otu opiike ma gwa m [ịkpọ] ya. A gwara m ya na m ọdịbeghị mgbe m [kpọrọ] nke ọbụla na ndụ m. Ọ sịrị i nwere ike [ịkpọ] ya, nwaa ya. … O dara ụda kachasị mma nke m anụtụbeghi mbụ” (“Mkpughe, Ọktoba 1830–B, Akwụkwọ Mkpughe 1,” nnabata nke agụgụala, josephsmithpapers.org). Mgbe Josef Smith mesịrị nata mkpughe maka Ezra Thayer na Northrop Sweet, edekọrọ ugbu a dị ka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33, Ezra tapịara mkpughe ahụ dị ka akwụkwọ apịakọtara apịakọta dị niime ọhụ ya. Olee otu Onyenwe anyị si kwadoo Ezra maka mgbasa ozi O nyere ya niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:1–13?
Kedụ ihe aka ebe ị na-ahụ na aka Onyenwe anyị nọburu niime ndụ nke ndị òtù isimbụ nke Nzukọ nsọ ndị a? Kedụ ihe Onyenwe anyị debeworo niime ndụ gị iji nyere gị aka bịakwute Kraịst? Olee otu O si na-akwado gị ịgọzi ndị ọzọ site na ikwesị ntụkwasị obi gị, ịhụnaanya, ma ọ bụ ịkpọ oku gị?
Lee kwa “Mgbasa ozi gaa na Ndị Laman,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 45–49.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:12–18
Ọ bụrụ ma m wuo ndụ m n’elu ozi ọma nke Onye Nzọpụta, agaghị m ada.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33 ka enyere maka Northrop Sweet na Ezra Thayer, ndị òtù Nzukọ nsọ ọhụrụ abụọ. Northrop pụrụ Nzukọ nsọ mgbe na-adịghị anya enyere mkpughe nke a. Ezra jere ozi n’ikwesi ntụkwasị obi na nwa oge, mana n’ikpeazụ ọ dapụkwara. Ịgụ maka ha niime nkeji nke a nwere ike kpalie gị itule otu i si sie ike “n’elu nkume [ahụ]” (amaokwu 13) nke ozi ọma. Kedụ eziokwu dị niime amaokwu ndị a nwere ike inyere gị aka nọgide ikwesị ntụkwasị obi na Onye Nzọpụta?
Lee kwa Helaman 5:12.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30:1–2
Aga m elekwasịkwu anya niihe ndị nke Chineke karịa ihe niile nke ụwa.
-
O nwere ike na-enye ụmụ gị obi ụtọ ịgbalị ịrụ ọrụ abụọ otu mgbe, dị ka ịgụgharị n’isi mkpụrụokwu niile nke egwu kacha masị mgbe ha na-ededata aha nke ndị òtù ezi na ụlọ ha niile. Gịnị mere o ji ara ahụ ime ihe abụọ otu mgbe? I nweziri ike gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30:1–2 ọnụ. Kedụ ụfọdụ “ihe ndị nke ụwa” nke nwere ike imegherị anyị anya site na-icheta Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya? Olee otu anyị nwere ike isi lekwasị Ya anya?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 33:2–3, 6–10
E nwere m ike ikesa ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
-
Inyere ụmụ gị aka ghọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:8–10, i nwere ike kpọkuo ha ịnwa ikwu otu nkebiokwu mgbe ọnụ ha mechiri emechi ebe gị ma ọ bụ ụmụ gị ndị ọzọ na-akọta ihe ha na-ekwu. Gụọ amaokwu 8–10 ma gwa ha imeghe ọnụ ha oge ọbụla ekwugharịrị nkebiokwu nke a “meghee ọnụ gị”. Gịnị mere Nna nke Eluigwe ji chọọ ka anyị meghee ọnụ anyị ma kesaara ndị ọzọ ozi ọma? Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa ezi na ụlọ anyị na ndị enyi banyere Onye Nzọpụta ma ọ bụ ozi ọma Ya? I nwekwara ike gụọ otu egwu banyere ikesa ozi ọma, dị ka “Anyị Ga-ewetere Ụwa Eziokwu Ya” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 172–73).
-
Tulee ikesa nhụmiihe ndị i nweteworo metụtara ụkpụrụ niile ma ọ bụ nkwa niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 30–34. Gịnị ka ị mụtara ma ọ bụ mmetụta i nwetere banyere Onye Nzọpụta gị na ọrụ Ya dị ka i jeere Ya ozi?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:12–13
E nwere m ike iwulite ndụ m n’elu ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
-
I nwere ike kpọga ụmụ gị n’ezi ịhụ ntọala ebe obibi ha ma ọ bụ nke ụlọ Nzukọ nsọ ma rịọ ha ịkọwa ya. Gịnị mere o ji dị mkpa ụlọ inwe ntọala siri ike, kwụ chịm? Soro ha gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 33:12–13, ma kesaara onwe unu mmetụta unu banyere ihe kpatara Onyenwe anyị jiri chọọ ka anyị wulite ndụ anyị n’elu ozi ọma Ya. Gịnị mere “nkume” ji bụrụ ezigbo mkpụrụ okwu iji kọwaa ozi ọma? Olee otu anyị nwere ike isi wulite ndụ anyị n’elu nkume nke ozi ọma? (lee kwa Matiu 7:24–29).