Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Ịgbakọta gaa Ohio


“Olu niile nke Mweghachite: Ịgbakọta gaa Ohio,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ịgbakọta gaa Ohio,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akara ngosi nke olu niile nke mweghachite

Olu niile nke Mweghachite

Ịgbakọta gaa Ohio

Kirtland n’afọ ndị 1830

Ọmụmara Kirtland, site n’aka Al Rounds

Phebe Carter

Picture of Phoebe Carter Woodruff, wife of Wilford Woodruff, circa 1840.

N’etiti ọtụtụ ndị Nsọ gbakọtara ịga Ohio n’afọ ndị 1830 bụ Phebe Carter. O sonyere Nzukọ nsọ na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ United States mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na ụma ya, agbanyeghị ndị nne na nna ya esoghị. O mesịrị dee maka mkpebi ya ịkwaga Ohio ijikọta ya na ndị Nsọ:

“O juru ndị enyi m anya n’ihe m chọrọ ime, o jukwara m anya, mana enwere ihe dị niime na-akpali m iganiihu. Mwute nke nne m n’ọpụpụ m site n’ebe obibi gaara akarị nnọọ ihe m nwere ike ịnagide; ma a sị na ọ bụghị mmụọ nke nọ niime a gaara m ada n’ikpeazụ. Nne m gwara m na ọ ga-akara ya mma ịhụ na-eliri m karịa ịga naanị m niime alaịkpa baa niime ụwa na-enweghị obi.

“‘[Phebe],’ ka o kwuru, n’ụzọ dị mmasị, ‘ị ga-alọghachikwute m ọ bụrụ ma gị hụ òtù Mọmọn dị ụgha?’

“A zara m, ‘ee, nne; aga m.’ … Azịza m belatara nsogbu ya; mana o weteere anyị mwute niile dum ikewa. Mgbe oge ruru maka ọpụpụ m obi akaghị m ịnwa anwa ikwu nọọ nke ọma; ya mere e dere m ijeọma m niile nye onye ọbụla, ma n’idebe ha n’elu tebụlụ m, gbadara ala n’ọsọ ma wunye niime ụgbọ ịnyinya. Site otu a a hapụrụ m ebe obibi m hụrụ naanya nke oge nwata m ma jikọọ ndụ m na ndị nsọ nke Chineke.”

Niime otu ozi nọọ nke ọma ahụ, Phebe dere:

“Nne na nna m Hụrụ naanya—Ugbu a adị m njikere ịhapụ ụlọ nna m na nwa oge … Amaghị m ogologo oge ya—mana ọ bụghị na-enweghị mmetụta obi ekele maka obiọma nke m nweteworo site na nwata m tutu ruo oge ugbu a—mana Nlekọta anya nke Chineke nye mmadụ dịịrị ka ibugharị ya n’ụzọ ọzọ ugbua karịa ka ọ dịbuuru. Ka anyị ranye ihe ndị a niile n’aka Nlekọta anya nke Chineke nye mmadụ ma juputa n’ekele na ekwewo anyị ibikọta ndụ ọnụ oge ogologo nke a n’okpuru ọnọdụ niile dabara adaba dị ka anyị nwere, na-ekwere na ihe niile ga-emezu maka ọdịmma anyị ọ bụrụ ma anyị hụ Chineke naanya n’ụzọ kachasị. Ka anyị mata na anyị pụrụ ikpe ekpere nye otu Chineke onye ga-anụ ekpere ndị si n’obi nke okike ya niile ma nye anyị nke ahụ kachasị mma maka anyị. …

“Nne, ekwere m na ọ bụ uche Chineke maka m ịga mpaghara ọdịda anyanwụ ma o dowo m anya na o tewo aka arọpụtara ya ịdị otu a. Ugbu a ụzọ ahụ emeghewo …, E kwere m na ọ bụ mmụọ nke Onyenwe anyị meworo ya nke zuuru ihe niile. O echegbukwala onwe gị maka nwa gị; Onyenwe anyị ga-akasị m obi. E kwere m na Onyenwe anyị ga-elekọta m ma nye m nke ahụ bụ nke kachasị mma. … Ana m aga niihi na Nna m ukwu na-akpọ—o mewo ka ọrụ m doo anya.”

Hụba ama

  1. Edward W. Tullidge, Ndịinyom nke Mọmọndọm (1877), 412.

  2. Leta Phebe Carter nye ndị nne na nna ya, ọnụọgụgụ ụbọchi adịghị ya, Ọba akwụkwọ Agụgụala Nzukọ nsọ, Obodo ukwu Salt Lake; akara edemede ka-emegharịrị ịdị ọhụrụ. Phebe sonyere Nzukọ nsọ n’afọ 1834, kwaga Ohio ihe dị ka 1835, ma lụọ Wilford Woodruff n’afọ 1837.