“Eprel 14–20: ‘A Bụ M Ya Onye Na-adị ndụ, A Bụ M Ya Onye Egburu egbu’: Ista,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ista,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Eprel 14–20: “A Bụ M Ya Onye Na-adị ndụ, A Bụ M Ya Onye Egburu egbu”
Ista
Eprel 3, 1836, bụ Ista Sọnde. Mgbe o nyesịchara aka nye Ndị nsọ oriri nsọ na Tempụl Kirtland aranyere ọhụrụ, Josef Smith na Oliver Cowdery chọtara ebe dị jụụ dị n’azụ akwa mgbochi ma hụdata n’ekpere ekwupụtaghị okwu. Mgbe ahụ, n’ụbọchi nke a dị nsọ mgbe ndị Kristian ebe niile nọ na-echeta Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst, Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ N’onwe Ya pụtara niime tempụl Ya, na-ama ọkwa, “A bụ m ya onye na-adị ndụ, a bụ m ya onye ahụ egburu egbu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:4).
Kedụ ihe ọ pụtara ikwu na Jizọs Kraịst bụ “onye na-adị ndụ”? Ọ bụghị na ọ pụtara naanị na O bilitere site n’ili ma pụta ihé nye ndị na-eso ụzọ Ya na Galili. Ọ pụtara na Ọ dị ndụ taa. Ọ na-ekwu okwu site na ndị amụma taa. Ọ na-edu Nzukọ nsọ Ya taa. Ọ na-agwọ mkpụrụ obi ndị merụrụ ahụ na obi tiwara etiwa taa. Ya mere anyị nwere ike ime ka okwu nille nke ama siri ike nke Josef Smith hie ụda: “Mgbe ọtụtụ ama ndị nke agbaworo maka ya gasịrị, nke a bụ ama … nke anyị na-agba maka ya: Na ọ na-adị ndụ!” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:22). Anyị nwere ike ịnụ olu Ya niime mkpughe ndị a, gbaa aka ebe aka Ya niime ndụ anyị, ma nwee mmetụta nke “ọńụ ahịrịokwu nke a na-enye: ‘Ama m na Onye Mgbapụta m na-adị Ndụ!’” (Abụ niile, no. 136).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Jizọs Kraịst na-adị ndụ.
Ọtụtụ niime anyị ahụbeghị Jizọs Kraịst dị ka Onye amụma Josef Smith hụrụ. Mana anyị nwere ike ịmata, dị ka o si mata, na Onye Nzọpụta na-adị ndụ, na Ọ maara ọganiihu na ndọlị anyị, ma na Ọ ga-enyere anyị aka n’oge mkpa. Tulee ama nke onwe gị nke Kraịst dị ndụ dị ka ị na-atule ajụjụ ndị dị n’okpuru ma mụọ akụrụngwa ndị sotere.
-
Onye bụ Jizọs Kraịst? Gịnị mere anyị ji na-efe Ya ofufe? (lee “Kraịst Ahụ Dị ndụ: Ama nke Ndị Ozi”).
-
Kedụ ihe Mmụọ na-akuziri m banyere nhụmiihe niile nke Josef Smith na ndị ọzọ hụrụ Onye Nzọpụta? Olee otu ama ha si agbam nke m ume? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:11–14, 20–24; 110:1–10; Josef Smith—Agụgụala:17).
-
Kedụ ihe m na-amụta banyere ije ozi na isinachi nke Onye Nzọpụta site na mkpụrụ okwu nke onwe Ya? (see Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:5; 38:7).
-
Olee otu Onye Nzọpụta ga-esi enyere m aka taa? (lee Aịzaya 53:3–5; Ndị Hibru 2:17–18; Mozaya 3:7; Alma 7:11–13; 36:3; Ịta 12:27; Moses 5:10–12).
Niime vidiyo “Ebumnobi Ime mmụọ M,” otu onyeikom nta kpebiri ibu n’isi “Kraịst Ahụ Dị ndụ” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Kedụ ihe na-emetụta gị banyere nhụmiihe ya? Kedụ mmetụta na-akpali gị ime iji nata eziokwu niile dị niime “Kraịst Ahụ Dị ndụ” niime obi na uche gị?
Ịmụtakwu banyere otu Onye Nzọpụta si agọzi anyị taa, i nwere ike mụọ, gee ntị na, ma ọ bụ gụọ “A maara M Na Onye Mgbapụta M Dị Ndụ” (Abụ niile, no. 136). O nwere ike kpalite mmụọ ịchọgharị eziokwu niile niime abụ nke a nke akuzikwara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:34; 84:77; 98:18; 138:23.
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Jizọs Kraịst,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
Niihi Jizọs Kraịst, aga m ebilite n’ọnwụ.
Josef Smith maara ụdị mmetụta ọ bụ iru uju ọnwụ nke ndị ahụrụ naanya, gụnyekọta nna ya na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ. Josef na Emma liri ụmụ ha isii, nke ọbụla erughị afọ abụọ. Site na mkpughe ndị Chineke nyere, Josef na Emma ritere nghọta ebighị ebi.
Chọgharịa eziokwu niile banyere ọnwụ na atụmatụ nke Chineke niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:26–27; 42:45–46; 63:49; 88:14–17, 27–31; 93:33–34. Olee otu eziokwu ndị a si emetụta ụzọ i si ahụta ọnwụ? Olee otu ha si emetụta ụzọ i si ebi ndụ?
Lee kwa 1 Ndị Kọrịnt 15; Nkuzi niile nke Ndịisi Nzụkọ nsọ a: Josef Smith (2007), 174–76; Easter.ChurchofJesusChrist.org.
Jizọs Kraịst mejupụtara “aja mgbaghara mmehie zuru oke” maka m.
Otu ụzọ iji lekwasị anya na Onye Nzọpụta n’oge Ista bụ ịmụ mkpughe niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile na-akuzi banyere aja mgbaghara mmehie Ya. E nwere ike ịchọta ụfọdụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10–13; 19:16–19; 45:3–5; 76:69–70. Tulee idepụta eziokwu ndị ịchọtara niime amaokwu ndịa. Imikpukwu ọmụmụ ihe gị, i nwere ike gbakwunye ndepụta gị site n’ịchọgharị Luk 22:39–44; 1 Jọn 1:7; 2 Nefi 2:6–9; Mozaya 3:5–13, 17–18; Moronaị 10:32–33.
Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ ndị nwere ike idu ọmụmụ ihe gị:
-
Gịnị bụ Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst?
-
Gịnị kpatara Jizọs Kraịst si họrọ ịta ahụhụ ma nwụọ niihi anyị?
-
Gịnị ka m ga-emerịrị iji nata uju ngọzi niile nke ịchụ aja Ya?
-
Olee otu m si enwe mmetụta banyere Jizọs Kraịst mgbe m gụsịrị amaokwu ndị a?
Lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Aja mgbaghara mmehie,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma; “Onye Nzọpụta Na-ata ahụhụ niime Getsemani” (vidiyo), Ọba akwụkwọ Ozi ọma
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Niihi Jizọs Kraịst, aga m ebilite n’ọnwụ.
-
Ikuziri ụmụ gị banyere mbilite n’ọnwụ, i nwere ike malite site na-igosi ha foto niile nke ọnwụ na Mbilite N’ọnwụ nke Onye Nzọpụta. Kwe ka ụmụ gị kekọrịta ihe ha maara banyere ihe omume ndị a. Unu nwekwara ike gụọ egwu dị ka “Jizọs N’ezie Ọ Dị Ndụ Ọzọ?” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 64).
-
Were otu ihe ọmụmụ nke nwere ike inyere ụmụ gị aka ghọta ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ (mmụọ anyị na ahụ ahụ ekewaa) ma mgbe anyị bilitere n’ọnwụ (mmụọ anyị na ahụ anyị abịaghachite ọnụ ọzọ, ma ahụ anyị e zuo oke ma bụrụ anwụghị anwụ). N’ịma atụ, gịnị na-eme mgbe anyị wepụrụ batịrị site na tọọchị ma ọ bụ akpa ịnkị site na mkpịsị odide ihe? Gịnị na-eme mgbe ejikọtara ha ọzọ? (Lee Alma 11:44–45.)
-
Ụmụ gị ha maara onye ọbụla nwụrụ anwụ? Kwe ka ha kesaa otu obere ihe banyere ndị mmadụ ndị a, ma emesịa gụkọtanu Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:17ọnụ. Kwukọrịtara ibe unu banyere otu o si emetụta ịmara na ndị anyị hụrụ naanya ga-ebilite n’ọnwụ ma nwete anụ ahụ ọzọ.
-
Ọ bụrụ na i nwere ụmụ ndị tolitere karịa, i nwere ike kpọkuo ha ịchọ nkebiokwu na-arụtụ aka n’ozi nke Ista niime edereede ndị a sotere: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 63:49; 88:14–17, 27; 138:11, 14–17. Ha nwere ike mee otu ahụ kwa jiri vidiyo “Niihi Ọ Na-adị ndụ” (Ọba akwụkwọ Ozi ọma). Olee otu anyị nwere ike isi kesaara ndị ọzọ ozi nke a?
Onye Amụma Josef Smith hụrụ Jizọs Kraịst.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike nwee mmasị ịgụ banyere oge atọ dị iche iche Jizọs Kraịst pụtakwuru Josef Smith na ndị ọzọ, dị ka edekọrọ niime Josef Smith—Agụgụala 1:14–17; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 76:11–24; 110:1–10. Ụmụ gị nwekwara ike lee foto ihe ndịa mere ndị dị niime ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a. Kedụ ihe anyị na-amụ banyere Jizọs Kraịst site na nhụmiihe ọbụla na ndị a? Gịnị kpatara o jiri bụrụ ngọzi ịmata na Josef Smith na ndị ọzọ hụrụ Onye Nzọpụta bilitere ebilite.
Niihi Jizọs Kraịst, enwere ike ịgbaghara m mmehie m.
-
Eziokwu ndị Josef Smith mụtara banyere mgbaghara site na Kraịst nwere ike inye ụmụ gị olileanya na enwere ike ịgbaghara ha njehie na mmehie ha. Tulee ịkpọku ụmụ gị imepụta tebụlụ nwere isiokwu dị ka ndị a: Ihe Onye Nzọpụta mere niihi m na Ihe m ga-emerịrị iji nata mgbaghara Ya. Nyere ụmụ gị aka chọgharịa edeerede ndị a sotere iji chọta ihe ndị sonyere n’okpuru isiokwu ndị a: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10–13; 19:16–19; 45:3–5; 58:42–43. Kekọrịtaranu unu na ibe unu ọńụ na obi ekele unu maka ihe Onye Nzọpụta mere niihi anyị.
-
I nwekwara ike lee vidiyo “The Shiny Bicycle” gị na ụmụ gị (Ọba akwụkwọ Ozi ọma) ma kesaa nhụmiihe niile mgbe i nwetere mgbaghara nke Onye Nzọpụta dị ka i chegharịrị.