“Jun 2-8: ‘Nọrọ N’oke Agụụ Na-ịchụso Ihe ọma’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58–59,’ Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58–59,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Jun 2– 8: “Nọrọ N’oke Agụụ Na-ịchụso Ihe ọma”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58–59
Mgbe ndị okenye nke Nzukọ nsọ buru ụzọ hụ ebe a ga-ewu obodo ukwu nke Zayọn—Independence, Missouri—ọ bụghị ihe ha tụrụ anya ya. Ụfọdụ chere na ha ga-achọta obodo na-eme nke ọma, na-arụsị ọrụ ike nwere otu Ndị nsọ dị ike. Kama, ha hụtara ebe nọpụrụ anọpụ dị anya na-enweghị ọtụtụ mmadụ, na-emepeghi emepe otu maara ha ahụ ma jupụta na ndị bi n’ókè ala nwere agwa na-adịghị mma karịa ịbụ Ndị nsọ. O mesịrị bụrụ na Onyenwe anyị anaghị nnọọ agwa ha ị bịa na Zayọn—Ọ chọrọ ka ha wuo Zayọn.
Mgbe atụmanya anyị adabakọtaghị na nsiridị, anyị nwere ike cheta ihe Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ na 1831: “Unu apụghị ịhụ site nanya eke unu, maka oge nke ugbu a, atụmatụ nke Chineke unu … na ebube nke ga-esote mgbe oke mkpagbu gasịrị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:3). Ee, ndụ jupụtara na mkpagbu, ọbụna ajọọ omume, mana anyị ka nwekwara ike “iwete na mmezu nnukwu ezi omume; niihi na ike ahụ dị niime [anyị]” (amaokwu 27–28).
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:127–33.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:1–5; 59:23
“Mgbe ọtụtụ mkpagbu gasịrị ọtụtụ ngọzi na-abịa.”
Ndị nsọ tụrụ anya na n’oge ndụ ha niile, Ogbe Jackson ga-aganiihu ime nke ọma ghọọ Zayọn, ebe Ndị nsọ niile nwere ike ịgbakọta. Kosiladị, oge ha na Ogbe Jackson jupụtara na mkpagbu. Niime afọ ole ma ole, amanyere ha ịhapụ ma “chere nwa oge maka mgbapụta nke Zayọn” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 105:9).
Kedụ ihe ị na-amụ banyere mkpagbu ma ọ bụ aka mgba niile sitere n’okwu niile nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:1–5? Gịnị mere i ji chee na ụfọdụ ngọzi na-abịa naanị mgbe mkpagbu gasịrị? Kedụ ngọzi ndị ị nataworo mgbe mkpagbu gasịrị?
Kedụ ihe ị na-amụta site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:23 nke na-ewetere gị olileanya?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:26–29
A pụrụ m “ịweta na mmezu nnukwu ezi-omume.” site na “nhọrọ nke onwe m.”
Dị ka akụkụ ihe ọmụmụ gị nke amaokwu ndị a, i nwere ike depụta ụfọdụ niime ihe ndị ị “na-achuso n’oke agụụ ”. Ha niile ha bụ “ihe [ndị] dị mma”? Tulee ihe i nwere ike ime iji “weta na mmezu ezi omume dị ukwuu”—ma tụlee ihiwe ebumnuche ndị eji mee ya.
Gịnị mere ijiri chee na Onyenwe anyị chọrọ ka gị mee “ọtụtụ ihe na nhọrọ nke onwe [gị]”? Gịnị ga-abụ rịzọọtụ ya ma ọ bụrụ ma “a kwagidere gị n’ihe niile”? Gịnị ka 2 Nifaị 2:27 gbakwunyere na nghọta gị maka ụkpụrụ nke a?
Lee kwa Dale G. Renlund, “Họrọ Gị n’Ụbọchi Nke a,” Liahona, Nov. 2018, 104–6.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42–43
Onyenwe anyị na-agbaghara m dị ka m na-echegharị.
Nkwa nke Onyenwe anyị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42 ịgbaghara kpamkpam ndị ahụ chegharịrị na-akpate mmụọ, agbanyeghị ọ nakwa akpali ụfọdụ ajụjụ: Gịnị ka ọ pụtara ichegharị? Olee otu m ga-esi ama na echegharịwo m? Kachasị mma, Onyenwe anyị garaniihu, “Site na nke a unu nwere ike mara…” (amaokwu 43).
Ebe a bụ ụfọdụ ajụjụ ndị agbakwunyere ndị mmadụ mgbe ụfọdụ na-enwekarị banyere nchegharị. Gịnị ka Mmụọ ahụ na-akuziri gị dị ka ị na-amụ akụrụngwa niile atụpụtara enyere n’okpuru?
Olee otu ikwupụta mmehie m niile si enyere m aka chegharịa? Lee Abụ ọma 32:1–5; Ilu 28:13; Mozaya 27:34–37; Alma 39:12–13.
Ana m anwa ịhapụ mmehie m niile, mana a ka m na-emekwa mmejọ. Nchegharị m ọ ka dịkwa ire? Lee Bradley R. Wilcox, “Ntozu oke Abụghị Enweghị Ntụpọ,” Liahona, Nov. 2021, 61–67; “Mweghachite Kwa Ụbọchị” (vidiyo), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Kedu ka m ga-esi jide aka na Onye Nzọpụta agbagharawo m? Lee Tad R. Callister, “Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Me 2019, 85–87, kacha nke nkeji ahụ akpọrọ aha “2. Mmehie.”
I nwere ike chọta nghọta niile niime “Ajụjụ niile na Azịza niile” banyere nchegharị niime Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile (peeji 8–9).
Leekwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Nchegharị,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Onye bụ Polly Knight?
Polly Knight na di ya, Josef Knight Ukwu., bụụrụ ụfọdụ niime ndị mbụ kwenyere na ọkpụkpọ oku amụma nke Josef Smith. Polly na Josef nyere Onye Amụma nkwado dị mkpa n’ọrụ nke ntụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn. Ezi na ụlọ Knight hapụrụ Colesville, New York, isoro Ndị nsọ gbakọta na Ohio ma emesịa nye ha iwu ịkwaga Ogbe Jackson, Missouri. Dị ka ha mere njem, ahụike nke Polly malitere ịgbada, mana o kpebiri ịhụ Zayọn tupu ya anwụọ. Ọ nọworịị na Missouri naanị mkpụrụ ụbọchi ole ma ole mgbe ọ nwụrụ (lee Ndị nsọ, 1:127–28, 132–33). Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59 ka anatara n’ụbọchị ọnwụ ya, ma amaokwu 1 na 2 nwere ike rụtụ aka na ya kpọmkwem.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:4–19
Iwu nsọ niile bụ ngọzi.
Kedụ ihe i chere ọ pụtara “ịkpukwasị okpu eze … jiri iwu nsọ niile”? (amaokwu 4). Tulee otu Onyenwe anyị si agọzi gị dị ka ị na-agbalịsike irube isi nye iwu nsọ nke ọbụla niime amaokwu 5–19.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:9–19
Ụbọchi Izuike bụ ụbọchi nke Onyenwe anyị.
Mgbe o kwesịrị nkwa ịgọzi Ndị nsọ nọ na Zayọn “jiri iwu nsọ niile na-abụghị ole ma ole,” Onyenwe anyị kwusiri ike n’ụzọ pụrụ iche maka otu iwu nsọ kachasị: iwu nke ịsọpụrụ “ụbọchi nsọ” Ya (Ozizi na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:4, 9). Dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:9-19, tụgharịa uche ihe kpatara ịsọpụrụ Ụbọchị Izuike gaara eji adị oke mkpa nye Ndị nsọ ndị a dị ka ha chọrọ iwu Zayọn. Gịnị mere o si dịrị gị mkpa?
I nwekwara ike tụgharịa uche ma ị na-eji Ụbọchị Izuike eme ihe n’ụzọ Onyenwe anyị zubere. Kedụ otu idebe Ụbọchị Izuike nsọ si enyere gị aka nọgide “na-enweghị ntụpọ sitere n’ụwa”? (amaokwu 9). Gịnị ka i nwere ike ime iji enye “nranye gị n’aka onye Kachasị Elu”? (amaokwu 10).
I nwere ike mata na Onyenwe anyị na-eji mkpụrụ okwu dị ka “ịńụrị ọńụ,” “obi ańụrị,” na “obi ụtọ” iji kuzie ihe banyere ụbọchi Izuike. Kedụ ihe na-eme ụbọchi Izuike ejupụta n’ọńụ nye gị? Kedụ otu i ga-esi akọwara mmadụ ihe kpatara i ji họrọ ịsọpụrụ ụbọchi nke Onyenwe anyị?
Kedụ ihe ịmụtara site na abụ a “Gently Raise the Sacred Strain” (Abụ niile, no. 146) banyere ebumnuche niile na ngọzi niile nke ụbọchị Izuike?
Lee kwa Jenesis 2:2–3; Aịzaya 58:13–14; Russell M. Nelson, “Ụbọchị Izuike Bụ Obi ụtọ,” Liahona, Me 2015, 129–32.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:26–28
Nna nke Eluigwe enyewo m ike ime nhọrọ.
-
Ịgụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:26–28 ọnụ nwere ike inye gị na ụmụ gị otu ohere ikwu okwu banyere ike Nna nke Eluigwe nyeworo anyị iji họrọ ime ihe ọma. Unu nwere ike gwa ibe unu banyere nhọrọ dị iche iche unu meworo na ihe mere dị ka nsonazụ. E nwere ike ya amasị ụmụ gị ise otu foto nke nhụmiihe ha.
-
I nwere ike dee nhọrọ notu akụkụ nke mpempe akwụkwọ na nsonazụ nakụkụ nke ọzọ ma jiri akwụkwọ nke a ji gosipụta na nhọrọ anyị na nsonazụ ha enweghị nkewa. Elemaanya ụmụ gị nwere ike depụta nhọrọ ole ma ole ma kwuo okwu banyere nsonazụ niile na-abịa site na ha. Emesịa unu nwere ike gụkọọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:27–28 ọnụ ma kwuo okwu banyere nhọrọ niile nke “na-eweta na mmezu ọtụtụ ezi omume” ma ọ bụ nsonazụ niile dị mma. Kedụ otu Nna nke Eluigwe si “akwụ ụgwọ ọrụ” ma ọ bụ agọzi anyị dị ka anyị na-agbalisike ime ihe dị mma? (amaokwu 28).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:7, 18–21
“Keleenụ Onyenwe anyị Chineke unu n’ihe niile.”
-
Tulee ịgụ amaokwu ndị a mgbe gị na ụmụ gị na-aga ije ma ọ bụ lee anya na foto niile nke eke, na-ahụta ihe niile na “adị mmasị naanya ma … mee ka obi dị ụtọ” (amaokwu 18). I nwekwara ike mata ihe ndị yiri ha niime egwu dị ka “Nna M nke Eluigwe Hụrụ M Naanya” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 228-29). Ma ọ bụ i nwere ike kpọkuo ụmụ gị ise foto nke ihe ndị ha jupụtara n’ekele maka ha ma kwe ka ha gwa gị ihe banyere foto ha ndị ahụ. Kedu otu anyi nwere ike isi gosi obi ekele anyi maka ihe ndị a?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:9–12
Ụbọchị Izuike bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị.
-
Gịnị ka anyị nwere ike ime na Sọnde iji fee Onyenwe anyị ofufe ma chọta ọńụ? Nyere ụmụ gị aka chọta nchepụta niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:9–12 na ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a. Ma eleghị anya ha nwekwara ike chọta foto niile ma ọ bụ ihe ndị ga-anọchite ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị Izuike (dị ka foto niile nke oriri nsọ dị niime ndepụta nke a). Kedụ otu ihe ndị a si enyere anyị aka nwee mmetụta ịbịaru Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nso?