“Ọgọst 4-10: ‘Guzoronụ N’ebe niile Dị nsọ’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85–87,’ Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85–87,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Ọgọst 4–10: “Guzorụ N’ebe niile Dị nsọ”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85–87
Ụbọchị ekeresimesi na-abụkarị oge iji tụgharịa uche n’ozi niile dị ka “udo n’elu ụwa” (lee Luk 2:14). Mana na Disemba 25, 1832, uche Josef Smith jupụtara na iyi egwu agha. Siteeti nke South Carolina dị na United States emegidewo gọọmentị ma nọ na-akwado maka agha. Ma Onyenwe anyị kpughere na nke a bụ naanị mbido: “Agha,” ka O kwupụtara, “ka a ga-awụkwasị mba niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:2). Ọ dịịrị ka amụma nke a ga-emejupụta oge na-adịghị anya.
Mana emesịa o meghị. Niime izu ụka ole ma ole, South Carolina na gọọmentị United States rutere otu nkwekọrịta, ma agha ahụ ka egbochiri. Amụma, kosiladị, a naghị emejupụta mgbe niile n’oge ma ọ bụ ụzọ anyị si tụọ anya. Ihe gaara eru afọ 30 gasịrị, ogologo oge gara aga mgbe egburu Josef Smith niihi okwukwe, South Carolina nupuru isi ma agha ime obodo esoro. Taa, agha gburugburu ụwa na-aganiihu ime ka “ụwa [na]-eru uju” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:6). Uru mkpughe nke a adịghị nnọọ nime ibu amụma mgbe ọdachi ga-abịa ma kama karịa na-ikuzi ihe a ga-eme mgbe ọ ga-abịa. Ndụmọdụ ahụ bụ otu ihe na 1831, 1861, na 2025: “Guzoronụ N’ebe niile Dị nsọ, ma ghara ịdapụ” (amaokwu 8).
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:1–2
Onyenwe anyị chọrọ ka m “debe agụgụala.”
Mata ihe Onyenwe anyị chọburu ịgụnye niime “agụgụala” akọwara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:1–2. Gịnị mere iji chee na Ọ chọrọ Ndị nsọ Ya idebe agụgụala? Kedụ ihe i nwere ike idekọ banyere ụzọ ndụ gị, okwukwe [gị], na ọrụ niile” nke nwere ike ịbụ ngọzi nye gị na ndudugandu dị niihu? Kedụ otu idebe agụgụala nke onwe si enyere gị aka bịakwute Kraịst?
Lee kwa “Jonaalụ niile: ‘Nke Kacha Baa Uru Karịa Ọlaedo,’” Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Wilford Woodruff (2011), 125–33; “Ịtụgharị Obi niile” (vidiyo), ChurchofJesusChrist.org.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:6
Mmụọ ahụ na-eji “olu nta dị duu” na-ekwu okwu.
Tụgharịa uche maka mkpụrụokwu niile nke Josef Smith jiri kọwaa Mmụọ ahụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:6. N’uche dị ọlịa ka olu nke Mmụọ si “dịrị duu” ma “dị nta”? Tulee nkọwa ndị a agbakwunyere enyere site n’aka Josef Smith: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–24; 8:2–3; 9:7–9; 11:12–13; 128:1. Kedụ otu Mmụọ ahụ si agwa gị okwu?
Lee kwa Luk 24:32; Mozaya 5:2; Alma 32:28; Helaman 5:30; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:22–23; 11:12–13.
Ndị ezi omume ka a na-ekpokọta nye Kraịst n’ụbọchị ikpeazụ ndị a.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 86 nwere niime ya ntapịa asụsụ nke nkọnilu nke wiiti na mkpụrụ ahụ na-epu ahịhịa, a hụrụ niime Matiu 13:24–30, 37–43. Dị ka ị na-amụ banyere mpụtara nke nkọnilu nke a, tulee idejupụta tebulu dị ka nke a:
Ọdịmara niile |
Mpụtara ndị pụrụ omume |
Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ya |
---|---|---|
Ọdịmara niile Ndị na-akụ mkpụrụ | Mpụtara ndị pụrụ omume Ndị amụma na ndị ozi | Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ya Kedụ ụdị “mkpụrụ” nke ndị amụma na ndị ozi na-akụ? |
Ọdịmara niile Onye iro | Mpụtara ndị pụrụ omume Setan | Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ya Kedụ otu onye iro si anwa ịkwụsị ọrụ nke Onyenwe anyị? |
Ọdịmara niile | Mpụtara ndị pụrụ omume | Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ya |
Ọdịmara niile | Mpụtara ndị pụrụ omume | Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ya |
Ndị a bụ ajụjụ ole ma ole agbakwunyere itule:
-
Mgbe ọ tapịasịrị nkọnilu ahụ, Onyenwe anyị kwuru maka ọkwa nchụaja, mweghachite, na nzọpụta nke ndị Ya (lee amaokwu nke 8-11). Kedụ njikọ ndị ị na-ahụ n’etiti isiokwu ndị a na nkọnilu nke wiiti na mkpụrụ ahụ na-epu ahịhịa?
-
Gịnị bụ ọrụ gị na-ịbụ “ìhè nye Ndị Mba ọzọ” na “onye nzọpụta nye ndị [nke Onyenwe anyị]”? (amaokwu 11).
Udo ka a na-ahụ “n’ebe niile dị nsọ.”
Amụma ahụ dị niime nkeji nke 87 na-adọ aka na ntị banyere ihe egwu a na-ahụ anya metụtara agha n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Mana ndụmọdụ dị niime mkpughe nke a metụtakwara ihe egwu nke ime mmụọ. Tụgharịa uche n’ụdị ajụjụ ndị a sotere:
-
Amụma bụ mkpughe sitere n’aka Chineke ruo na onye amụma, ọtụtụ mgbe na-abụkarị ihe banyere ọdịniihu. Kedụ ụfọdụ ọmụmaatụ nke amụma nke ndị amụma oge gboo na oge ugbu a nyeworo? (lee Jọn 3:14; Mozaya 3:5; Helaman 14:2–6). Kedụ otu esi mezo ha? (lee Luk 23:33; Matiu 15:30–31; 3 Nifaị 1:15–21).
-
Gịnị bụ ngọzi niile nke ịnabata amụma niile nke ndị amụma nke Chineke?
Jiri echiche ndị ahụ n’obi gị, gụọ nkeji nke 87. (Maka ụfọdụ ọnọdụ nke agụgụala, i nwekwara ike gụọ okwu nnabata nke ndepụta nke a.) Kedụ ihe ị na-amụta banyere ibu amụma site na mkpughe nke a na ụzọ eji mezu ya? Kedụ ihe ị ga-agwa onye na-enwe obi abụọ gbasara otu amụma niihi na emezughị ya ozugbo ozugbo?
Kedụ ndụmọdụ Onyenwe anyị nyere niime amaokwu 8? Gịnị bụ “ebe nsọ” gị niile ebe i ga-achọta udo na nchekwa? Gịnị na-eme ebe ọbụla adị nsọ? Na mgbakwunye ebe ndị a na-ahụ anya, ikekwe enwere oge ndị dị nsọ, omume ndị dị nsọ, ma ọ bụ echiche ndị dị nsọ nke nwere ike iwete udo. N’ịmaatụ, kedụ otu okwu niile nke ndị amụma Chineke si bụrụ ebe nsọ nye gị? Gịnị ka ọ pụtara “iguzoro” na “ghara ịda mba” site n’ebe ndị a?
Lee kwa “Ebe Ịhụnaanya Dị,” Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 138–39; Ndị nsọ, 1:163–64; “Udo na Agha,” in Mkpughe ndị dị na Ọnọdụ, 158–64.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:6
Mmụọ ahụ na-eji “olu nta dị duu” na-ekwu okwu.
-
Kedụ ihe ụmụ gị ga-ekwu ọ bụrụ ma mmadụ jụọ ha otu ha si ama mgbe Mmụọ Nsọ na-agwa ha okwu? Kpọkuo ha ịgụ banyere otu ụzọ Josef Smith si kọwaa olu nke Mmụọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 85:6. Mgbe ahụ ha nweziri ike mụgharịa ige ntị nye na ikwu okwu n’olu nta. I nwekwara ike kesaa nhụmiihe niile mgbe Mmụọ gwara gị okwu n’olu dị duu, dị nta.
-
Iji nyere ụmụ gị aka ghọta nkebiokwu ahụ “olu dị duu dị nta,” i nwere ike kpọọ egwu ụmụntakịrị nwayo nwayo dị ka “Mmụọ Nsọ Ahụ” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 105) Gwa otu niime ụmụntakịrị ahụ ka ọ maa amụma egwu nke ọ bụ ebe ụmụntakịrị ndị ọzọ na-eme mkpọtụ ndọpụ uche. Emesịa i nwere ike gụgharịa egwu ahụ na-enweghị ndọpụ uche ọbụla. Kedụ ndọpụ uche ndị anyị nwere ike iwepụ site na ndụ anyị iji nwee mmetụta Mmụọ ahụ mgbe niile karịa?
E nwere m ike inye aka kpokọta ndị nke Chineke.
-
Iji nyere ụmụ gị aka ghọta nkọnilu ahụ akọwara niime nkeji nke 86, i nwere ike kwadoo ụmụ obere foto dị iche iche ma ọ bụ ihe osise ndị nke wiiti ma zoo ha na akụkụ ime ụlọ. Kọwaara ụmụ gị nkọnilu nke wiiti na mkpụrụ ahụ na-epu ahịhịa (lee Matiu 13:24-30), ma gụkọta ọnụ okwu nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 86:1–7. Ụmụ gị nwere ike mgbe ahụ kpokọta foto wiiti ndị ezoro ezo ma dee na ha aha nke onye ha nwere ike “ikpokọta” nye Jizọs Kraịst. Gịnị ka ọ pụtara ikpokọta ndị mmadụ nye Jizọs Kraịst? Kedụ ụfọdụ ụzọ ndị anyị nwere ike i si mee nke a?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 86:11
Enwere m ike ịbụ ìhè nye ndị ọzọ.
-
Ebe a bụ ajụjụ ụfọdụ ndị i nwere ike ịjụ ụmụ gị dị ka unu na-akparịta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 86:11: Kedụ otu ìhè si agọzi anyị? Kedụ ihe ọ dị ka ya mgbe anyị na-enweghị ìhè? Kedụ otu anyị nwere ike i si a bụ ìhè nye ndị ọzọ? Nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị anyị nwere ike i si “gaaniihu niime ịma mma [nke Jizọs]” ma kọọrọ ya ndị ọzọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:6, 8
A pụrụ m “iguzoro … n’ebe niile dị nsọ.”
-
Gụkọtanụ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:6 iji mụọ banyere ihe ndị Onyenwe anyị kwuru ga-eme niime ụbọchị ikpeazụ ndị a. Mgbe ahụ unu nwere ike kwuo banyere ụfọdụ aka mgba ndị gị na ụmụ gị na-ezute. Niime amaokwu nke 8, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru anyị nwere ike ime n’oge ndị ihe i si ike?
-
Nyere ụmụ gị aka depụta ebe niile dị nsọ, echiche niile dị nsọ, na ihe omume niile dị nsọ nwere ike inyere ha aka zute ihe egwu nke ime mmụọ. Maka nchepụta niile, lee vidiyo niile “Iguzoro N’ebe niile Dị Nsọ” na “Guzoronụ N’ebe niile Dị nsọ—Too Ebe Akụrụ Gị” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).