Come, Follow Me
Ọgọst 25–31: “Nara Uju Ya”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93


“Ọgọst 25-31: ‘Nara Uju Ya’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist.

Nkọwa sitere na A Hụrụ M Nwa nke Mmadụ, site n’aka Walter Rane

Ọgọst 25–31: “Nara Uju Ya”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93

“Mgbe i na-arigo elu ubube,” ka Josef Smith kuziri, “i ghaghị imalite bido n’ala, ma gbagoo otu nzọụkwụ site n’otu nzọụkwụ, tutu ruo gị abịaruo n’elu; otu ahụ ka ọ dị na ụkpụrụ niile nke ozi ọma—ị ga-ebidorịrị na nke mbụ, ma gaaniihu tutu ruo gị amụta ụkpụrụ niile nke mbuli elu” (Nkuzi niile Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith [2007], 268).

Mgbe ụfọdụ ubube ahụ nke mbuli elu yiri ka nnukwu ihe na-adịghị ekwe omume, mana amụrụ anyị irigoruo elu jiri enyemaka na-adịgide adịgide nke Onye Nzọpụta . Mmachi niile ọbụla anyị na-ahụ n’onwe anyị, Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya na-ahụ ihe dị ebube niime anyị, ihe yiri chi. Dị ka nnọọ Jizọs Kraịst “nọ na mmalite ya na Nna,” otu ahụ “ka unu nọkwa” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:21, 23). Dị ka nnọọ Ọ “si gaaniihu site n’amara ruo n’amara, tutu ruo ya anata uju,” otu ahụ kwa “ka ị ga-esi anata amara maka amara” (amaokwu 13, 20). Ozi ọma ahụ eweghachitere na-akuzi banyere ezigbo ọdịdị nke Chineke, ma otu ahụ ka ọ na-akuzikwa banyere ezigbo ọdịdị na akara aka gị. Ị bụ ezigbo nwa nke Chineke nwere ikike mmepụta “nke n’oge kwesịrị ekwesị anata nke uju ya” (amaokwu 19).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi nakwa na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93

Dị ka Jizọs Kraịst, e nwere m ike nata ebube ma nata “uju” nke Chineke.

Josef Smith kuziri, “Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ aghọtaghị agwa Chineke, ha aghọtaghị onwe ha.” (Nkuzi niile: Josef Smith40). Dị ka unu na-amụ ihe banyere Onye Nzọpụta site na-ịmụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93, chọọ maka ihe ị na-amụkwa banyere onwe gị. N’ịmaatụ, kedụ ihe ị na-amụ banyere Ya site na amaokwu nke 3, 12–13, 21, na 26? Kedụ eziokwu ndị yiri ha i nwere ike ịchọta banyere onwe gị niime amaokwu nke 20, 23, na 28–29? (lee kwa 1 Jọn 3:2; 3 Nifaị 27:27). Ajụjụ ndị sotere nwere ike nyere gị aka ghọta ma tinye n’ọrụ eziokwu niile niime nkeji nke a:

  • Kedụ ihe i chere ọ pụtara ịnata “amara maka amara” ma gaaniihu site “na amara ruo na amara” (amaokwu niile nke 12-13) Ọ bụrụ na o nyee aka, i nwere ike gụọ “Amara” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  • Kedụ ihe i na-achọpụta niime mkpughe nke a banyere otu Chineke si enyere gị aka too ma mụta ihe? Kedụ otu ịmata nke a si emetụta ụzọ i si akpasị ndị ọzọ agwa—ma onwe gị?

  • Gịnị ka ị na-amụ banyere “otu esi efe ofufe, na … ihe ị ga-efe ofufe”? (amaokwu 19; lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ofufe,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:1-39

akara ngosi semịnarị
Ebube nke Chineke bụ ìhè na eziokwu.

I nwere ike mata na mkpụrụokwu ndị dị ka ebube, ìhè, na eziokwu pụtara ihe ugboro ugboro niime mkpughe nke a. Dị ka ị na-amụ amaokwu nke 20-39 n’ụzọ kachasị, depụta eziokwu ndị ị na-amụ banyere echiche ndị a. Idepụta ihe dị ka nke a nwere ike inye aka:

Amaokwu

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Amaokwu

24

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Enwere ọtụtụ nduhie niime ụwa. Kedụ otu m ga-esi ama eziokwu? (lee kwa Jekọb 4:13).

Amaokwu

28

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Amaokwu

36

Ihe m na-amụ

Chineke bụ onye ìhè na eziokwu.

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Amaokwu

37

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Onye ka m maara yiri ka o nwere ike iguzogide mmetụta ihe ọjọọ niile? Kedụ ihe mere ha jiri nwee ike ime nke a?

Amaokwu

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Amaokwu

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Amaokwu

Lee kwa: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:24

Ihe m na-amụ

Ajụjụ ndị a ga-atụgharị uche na ha

Gịnị ka ị na-ahụta niime amaokwu ndị a na-akpate mmụọ gị ịchọ ìhè na eziokwu kacha ukwuu? Gịnị mere ìhè na eziokwu jiri bụrụ ezigbo etutuaha maka Jizọs Kraịst? (lee Jọn 8:12; 14:6). Kedụ otu eziokwu ndị a si emetụta ndụ gị?

I nwekwara ike detuo nhụba ama nke nkwa niile banyere akara aka ebighị ebi gị dị niime amaokwu nke 20, 22, 28, 33–35. Kedụ mmekọrịta dị n’etiti nkwa niile na inwete ìhè?

Tulee ịchọgharị “Jee ije n’ìhè nke Chineke” (Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 18-21) Vidiyo ndị a “Ìhè na Eziokwu, Nke 1” na “Nke 2” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma) nwere ike wete nchepụta ndị agbakwunyere.

Lee kwa “Kuziere M ije Ije n’ìhè ahụ,” Abụ, no. 304; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Mmụọ Nsọ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

6:39

Light and Truth, Part 1

(D&C 88:6-13) This video examines God's attributes of light and truth as explained in section 88 of the Doctrine and Covenants.

6:49

Light and Truth, Part 2

(D&C 93:28,36-40) This video examines God's attributes of light and truth as explained in section 88 of the Doctrine and Covenants.

ọnụmpio dị na tempụl

“Ebube nke Chineke bụ … ìhè na eziokwu.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:40–50

“Dozie n’usoro ụlọ nke onwe unu.”

Iwu ahụ “idozi n’usoro ụlọ nke onwe unu” (amaokwu 43) abụghị banyere ihazi kọbọọdụ na ime ụlọ niile mana banyere ikuzi ihe—na-ịmụ ihe—“ìhè na eziokwu” (amaokwu 42). Tulee otu i si na-agbalị isoro ndụmọdụ nke a. Kedụ aka mgba ndị ị na-ezute? Olee eziokwu ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93 nwere ike inye aka?

Kedụ nghọta ndị i nwetere site na nkuzi ndị a sitere n’aka Okenye David A. Bednar?

“Niime ụlọ ọrụ m ka edobere ọmarịcha esereese nke ubi ama whiit. Esereese ahụ bụ nchịkọta buru ibu nke akara brọọshị onye ọbụla—enweghị nke ọbụla na nnọpụ iche ya dị oke mmasị ma ọ bụ maa oke mma. N’ezie, ọ bụrụ gị guzoro nso na eterete ahụ, ihe niile ị ga-ahụ bụ ahịrị na-acha odo odo na ọla edo na agba aja aja ndị yiri ka ha enweghị njikọ na-adịghị mmasị. Kosiladị, dị ka ị na-esite na kanvas ahụ na-apụ ntakịrị ntakịrị, akara brọọshị niile n’otu n’otu tikọtara ọnụ ma mepụta landscape nke ubi ama whiit magburu onwe ya. Ọtụtụ akara brọọshị nkịtị n’otu n’otu na-arụkọ ọrụ iji mepụta eterete na-adọ adọ naanya ma maa mma.

“Ekpere ezi na ụlọ ọbụla, oge ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke ezi na ụlọ ọbụla, na nnọkọ mgbede n’ebe obibi ọbụla bụ akara brọọshị nọ n’elu kanvas nke mkpụrụ obi anyị. O nweghị otu ihe omume nwere ike iyi ka ihe magburu onwe ya ma ọ bụ kwesịrị ncheta. Kama dị ka otite agba ọbụla nke na-acha odo odo na nke na-acha ka ọla edo, na nke na-acha aja aja na-enyere ibe ha aka ma na-ewepụta agba magburu onwe ya, otu ahụkwa ka anyị ịkwụsi ike n’ihe anyị na-eme nwere ike yie ihe nta nwere ike iduba na ndapụta ihe ndị nke ime mmụọ bara uru. ‘Ya mere, ike agwụla unu n’obi na-ime ihe ọma, n’ihi na unu na-atọ ntọala nke oke ọrụ. Ma site na ihe ndị dị nta ka oke ihe si apụta’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:33]. Ịkwụsị ike n’ihe ị na-eme bụ isi ụkpụrụ dị ka anyị na-atọ ntọala nke oke ọrụ niime ndụ anyị n’otu n’otu ma dị ka anyị na-arụsị ọrụ ike ma nwee nchegbu niime ebe obibi anyị” (“Dịrị Uchu ma Nwee Nchegbu n’Ebe obibi,” Liahona, Nov. 2009, 19–20).

Lee kwa Henry B. Eyring, “Ebe obibi Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị Bi,” Liahona, Me 2019, 22–25.

ezi na ụlọ na-ekpekọta ekpere ọnụ

Onyenwe anyị nyere ndị nne na nna iwu “izulite ụmụ [ha] na ìhè na eziokwu.”

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:2–21

Jizọs Kraịst bụ Ìhè na Ndụ nke Ụwa.

  • Tulee igosi foto nke Onye Nzọpụta ma jụọ ụmụ gị ihe kpatara ọ ji dị mkpa ịmụ ihe banyere ma soro Jizọs Kraịst. Mgbe ahụ unu nwere ike gụkoọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:19 ọnụ iji chọpụta otu nzube dị mkpa.

  • I nwere ike chọọ ịhọrọ eziokwu dị iche iche banyere Kraịst niime nkeji 93 nke na-akpate mmụọ gị ma nyere ụmụ gị aka chọpụta ma ghọta ha (lee kwa “Isi nke 33: Mkpughe banyere Jizọs Kraịst,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 126-27, ma ọ bụ vidiyo kwekọtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Maka eziokwu nke ọbụla ị họọrọ, i nwere ike nye ụmụ gị otu mkpụrụokwu ma ọ bụ nkebiokwu ige ntị na ya dị ka unu na-agụkọta amaokwu ahụ ọnụ. N’ịmaatụ, Jizọs Kraịst:

    1:18

    Chapter 33: A Revelation about Jesus Christ: May 1833

Nteji banyere Kraịst

Nkọwa sitere na Ìhè nke Ụwa, site n’aka Howard Lyon

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:23, 29, 38

Mụ na Nna nke Eluigwe biiri tutu mụ abịa n’ụwa.

  • Onye Nzọpụta kwusiri ike ugboro atọ niime nkeji 93 na anyị na Chineke biiri “na mmalite” (amaokwu nke 23, 29, 38). Inyere ụmụ gị aka chọpụta nke a, i nwere ike kpọkuo ha ịgụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:23, 29, 38 ma chọọ maka eziokwu banyere onwe ha nke ekwugharịrị niime amaokwu ndị a. Gịnị mere Nna nke Eluigwe si chọọ anyị ịmata eziokwu nke a? I nwekwara ike jụọ ụmụ gị ihe ha maara banyere ndụ anyị na Nna nke Eluigwe tutu a mụọ anyị. Inyere ha aka mụtakwuo, soro ha gụọ otu niime edereede akwụkwọ nsọ ndị a sotere ma ọ bụ karịa: Jeremayah 1:5; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:53–56; Mosis 3:5; Abraham 3:22–26.

  • Unu nwekwara ike gụkọọ egwu ọnụ “A bụ M Nwa Chineke” ma ọ bụ “E Biri M N’eluigweAkwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 2-3, 4) ma kparịta ụka na eziokwu ndị anyị na-amụta site na egwu ndị a banyere ebumnuche anyị maka ọbịbịa n’ụwa.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:24–39

Ana m anata ihè na eziokwu dị ka m na-erubere Chineke isi.

  • Inyere ụmụ gị aka tinye n’ọrụ eziokwu niile banyere nrube isi dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93, tulee ide nrụaka akwụkwọ nsọ ole ma ole sitere na nkeji nke a na mpempe akwụkwọ. Na mpempe akwụkwọ dị iche iche, dee eziokwu ndị nke amaokwu ọbụla niime ndị a na-akuzi. Ụmụ gị nwere ike rụkọọ ọrụ ọnụ ịgụ amaokwu niile ma jikọọ eziokwu niile nye nrụaka akwụkwọ nsọ niile. Ọmụmaatụ nwere ike gụnye:

    • Amaokwu 24: Eziokwu bụ ịmara ihe ndị dị adị nke oge gara aga, nke ugbu a, na ọdịniihu.

    • Amaokwu 28: Enwere m ike nata ihè na eziokwu dị ka m na-edebe iwu nsọ niile.

    • Amaokwu 37: Mgbe m nwere ihè na eziokwu, e nwere m ike iguzogide ajọọ ihe.

    • Amaokwu 39: Ihè na eziokwu n’efunarị m mgbe m nupuru isi.

    I nwere ike kesaa ọmụmaatụ nke eziokwu niile ị bịaworo mata dị ka ị na-edebe iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị.

Mee ka ọ daba adaba n’afọ ole ole nke ụmụ gị gbara. Ị maara mkpa niile na ike niile nke ụmụ gị; inwere ohere ihazigharị nchepụta niile nke ihe omume ahụ ka o gboo mkpa ha nwere. N’ịmaatụ, niime ihe omume nke a, ọ bụrụ na ị na-akuziri ụmụntakịrị nta, o nwere ike ka mma ilekwasị anya n’otu eziokwu dị mfe sitere na nkeji 93.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

nteji banyere Kraịst na-ekwusa ozi ọma site na Torah

Ìhè na Eziokwu, site n’aka Simon Dewey

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị