“Ọgọst 11-17: ‘Hiwe … Ụlọ nke Chineke’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87,’ Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Ọgọst 11–17: “Hiwe … Ụlọ nke Chineke”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88
Ọtụtụ mgbe na-erukarị, Onyenwe anyị na-egositụ anyị “ebube na ike” Ya na-enweghị oke (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:47) site na mkpughe ndị dị egwu. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88 bụ ụdị mkpughe ahụ—otu banyere ìhè na ebube na alaeze niile ndị nwere ike mee ka mkpa anyị nwere n’elu ụwa yie dị ka ọ dị ntakịrị site na ntulerịta. Ọbụrụgodu na anyị enweghị ike ịghọta ihe dum, anyị nwere ike opekempe mata na enwere ihe dị ukwuu karịrị akarị nye ebighị ebi karịa ka anyị maara. N’ezie, Onyenwe anyị anaghị ekesa eziokwu ukwuu ndị a iji menye anyị ụjọ ma ọ bụ mee anyị adị ntakịrị. N’ezie, O kwere nkwa, “Ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe ị ga aghọta ọbụna Chineke” (amaokwu 49; nkwusi ike agbakwunyere). Elemaanya ọ bụ niihi ebumnuche ahụ dị ebube ka Onyenwe anyị si nye Ndị nsọ Ya iwu na Kirtland ihiwe Ụlọakwụkwọ nke Ndị Amụma. “Hazie onwe gị,” ka O kwuru. “Kwadoo ihe niile dị mkpa; ma hiwe … ụlọ nke Chineke” (amaokwu 119). Karịa ebe ọbụla ọzọ, ọ bụ n’etiti ụlọ nsọ nke Chineke—ma niime ebe obibi anyị—ka O nwere ike ibuli ịhụ ụzọ anyị karịa ụwa anụ ahụ, “kpughee ihu ya nye [anyị],” ma kwadoo anyị “ịnọgide n’ebube selestịal” (amaokwu nke 68, 22).
Lee Ndị Nsọ, 1:164-66.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Jizọs Kraịst na-enye m udo.
Naanị ụbọchị ole ma ole mgbe adọsịrị aka na ntị na agha “ga-awụkwasị n’isi mba niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 87:2), Onyenwe anyị nyere mkpughe nke Josef Smith kpọrọ “akwụkwọ olive,” nke bụ ọdịmara ọdịnaala nke udo (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88, isi nkeji; lee kwa Jenesis 8:11). N’ọmụmụ ihe gị niile nke nkeji 88 n’izu ụka nke a, chọgharịa maka ozi niile nke udo nke Onyenwe anyị na-enye gị.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:6–67
Ìhè na iwu na-abịa site na Jizọs Kraịst.
Mkpụrụokwu ndị a ìhè na iwu ka ekwugharịrị ọtụtụ mgbe niime nkeji 88. Kanye ma ọ bụ hụba amaokwu ndị a ama ebe ị hụtara mkpụrụokwu ndị a niime amaokwu nke 6-67, ma dedata ihe ị mụtara banyere ìhè na iwu—na banyere Jizọs Kraịst. Kedụ ihe na-akpali mmụọ gị ime iji nata ìhè ma bie ndụ “iwu nke Kraịst”? (amaokwu 21).
Lee kwa Aịzaya 60:19; Jọn 1:1–9; 3 Nifaị 15:9; Timothy J. Dyches, “Ìhè Na-arapara n’Ìhè,” Liahona, Me 2021, 112–15; Sharon Eubank, “Kraịst: Ìhè Ahụ Na-amụke niime Ọchịchịrị,” Liahona, Me 2019, 73–76.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:62–64
“Bịaruo mụ nso.”
Kedụ nhụmiihe ndị gosiworo gị na nkwa niile dị niime amaokwu ndị a bụ eziokwu? Kedụ ihe ọzọ ị ga-eme iji “bịaruo Kraịst nso”? Tulee ime abụ “Nso nso, Chineke M, ruo Gị” (Abụ, no. 100) ịbụ akụkụ nke ọmụmụ ihe na ife ofufe gị.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:67–76
E nwere m ike ịdị ọcha site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.
Iwu nke Onyenwe anyị “ido onwe unu nsọ” pụtara ìhè ugboro abụọ niime nkeji 88 (amaokwu nke 68, 74). Gịnị ka i chere nkebiokwu nke a pụtara? I nwere ike nyochagharịa ụfọdụ niime edereede ndị dị n’okpuru “Ido Nsọ” niime Odudu nye Akwụkwọ nsọ (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kedụ otu a ga-esi doo anyị nsọ? Ka ajụjụ nke a duo ọmụmụ ihe gị nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:67–76, ma dekọọ nghọta ime mmụọ nke ọbụla i nwetere.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77–80, 118–26
“Chọọ mmụta, ọbụna site n’ọmụmụ ihe nakwa site n’okwukwe.”
Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ ihiwe “ụlọakwụkwọ nke ndị amụma” na Kirtland (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:137). Ọtụtụ ntuziaka ahụ dị niime nkeji 88 kuziiri ha otu esi eme ya. Ntuziaka nke a nwekwara ike nyere gị aka “hiwe … ụlọ nke mmụta” (amaokwu 119) niime ndụ nke onwe gị. N’ezie, i nwere ike lee anya na amaokwu nke 77–80 na 118–26 dị ka ụkpụrụ niile iji “hazigharịa ebe obibi gị [ma ọ bụ ndụ gị] ịghọ ọgba ọmụmụ ihe nke ozi ọma” na “ebe nsọ nke okwukwe” (Russell M. Nelson, “Ịbụ Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a Eji amaatụ,” Liahona, Nov. 2018, 113). O nwere ike dị mmasị ịdepụta ihe “nhazigharị” nke onwe gị nwere ike iyi, gụnyekọta nkebiokwu ndị sitere na amaokwu ndị i chere i kwesịrị itinye n’ọrụ.
O nwekwara ike nyee aka inyochagharị ajụjụ ndị a: Gịnị kpatara ọmụmụ ihe na agụmakwụkwọ ji dị mkpa nye Onyenwe anyị? Gịnị ka Ọ chọrọ ka m mụọ? Kedụ otu Ọ chọrọ ka m si mụọ ihe? Chọgharịa azịza niile nye ajụjụ ndị a niime amaokwu nke 77–80 ma niime “Eziokwu ga-eme gị enwere onwe gị” (Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 30–33).
Gịnị ka i chere ọ pụtara ịmụ ihe “site na mmụta nakwa site n’okwukwe”? (amaokwu 118). Kedụ nghọta ndị i nwetere site n’ozi nke Okenye Mathias Held “Ịchọ Mmata ihe site na Mmụọ”? (Liahona, Me 2019, 31–33).
Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịchọta Eziokwu na Izere Nduhie,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Otu Ụlọakwụkwọ na otu Onyinye dị nsọ,” niime Mkpughe ndị dị N’ụdị, 174–82.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:33
Nna nke Eluigwe na-enye onyinye ndị dị mma.
-
I nwere ike malite mkparịta ụka banyere Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:33 site na-ịrịọ ụmụ gị ikwu okwu banyere onyinye ndị enyeworo ha—ma ndị ahụ ha nataworo n’uju ọńụ na ndị ọzọ ha na-anataghị. Ikekwe ha nwere ike mee ejije ịnata otu onyinye n’ọńụ. Emesịa i nwere ike kwuo okwu banyere onyinye ndị Nna nke Eluigwe na-enye anyị (dị ka onyinye nke Mmụọ Nsọ). Kedụ otu anyị si anata onyinye ndị a n’ọńụ?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:63
Ọ bụrụ ma m chọọ Onye Nzọpụta, aga m achọta Ya.
-
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:63 nwere niime ya okwu omume ndị nwere ike ikpali ụfọdụ ihe omume ndị na-enye obi ụtọ iji gbaa ụmụ gị ume ịchọ ihu nke Onyenwe anyị niime ndụ ha. N’ịmaatụ, gị na ụmụ gị unu nwere ike chee maka otu ihe egwuregwu maka ikwurita nkebiokwu ahụ “chọsie m ike ma ị ga achọta m” (nkwusi ike agbakwunyere) ma ọ bụ “kụọ aka, ma aga emeghere gị ya”?
-
Iji kwusie ike ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta iji “bịaruo m nso,” i nwere ike rịọ otu nwantakịrị ka o jide foto nke Jizọs (dị ka foto dị na ngwụcha nke ndepụta nke a) n’otu akụkụ nke ọnụ ụlọ ahụ ebe ụmụntakịrị ndị ọzọ ga-eguzoro n’akụkụ nke ọzọ. Dị ka ụmụ gị na-eche maka ihe ndị ha nwere ike ime iji bịaruo Onye Nzọpụta nso, ha nwere ike zọpụ ụkwụ gaa niihu foto ahụ, ma nwa ahụ nke jidere foto ahụ nwere ike zọpụ ụkwụ gaaniihu ụmụntakịrị ndị ọzọ. Gị na ụmụ gị kwuo banyere otu unu nwere ike i si bịaruo Onye Nzọpụta nso na otu Ọ na-esi abịaru unu nso. I nwekwara ike soro ha gụkọọ otu egwu banyere isiokwu nke a, dị ka “Ana M Enwe Mmetụta Ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta M” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 74-75).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77–80, 118
Nna nke Eluigwe chọrọ ka m mụta ihe.
-
Rịọ ụmụ gị ịgwa gị banyere ihe ha na-amụ n’ụlọakwụkwọ ma ọ bụ Praịmarị. I nwekwara ike kọsaa ụfọdụ ihe ndị ị na-amụ. Mgbe ahụ i nwere ike gosi ụmụ gị mkpụrụ okwu ndị a Kedụ, Gịnị mere, na kedụ otu. Nyere ha aka nyochagharịa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:77–79 iji chọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka anyị mụọ banyere. Emesịa leekọtanu niime amaokwu 80 iji chọpụta ihe mere O ji chọọ anyị ịmụta ma niime amaokwu 118 iji chọpụta otu anyị ga-esi amụ ihe.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:119
Ebe obibi anyị nwere ike ịdị nsọ dị ka tempụl.
-
Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:119 nye ụmụ gị, ha nwere ike mee spire tempụl jiri ogweaka ha mgbe ọbụla ha nụrụ okwu ahụ “ụlọ.” Kọwaa na Nna nke Eluigwe chọrọ Josef Smith na Ndị nsọ iwu tempụl, ma ọ bụ “ụlọ nke Chineke.”
-
I nwere ike rịọ ụmụ gị ịhọrọ mkpụrụ okwu asaa nke na-akọwa ebe obibi ha. Mgbe ahụ nyere ha aka chọta, niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:119, mkpụrụokwu asaa nke Onyenwe anyị na-eji akọwa ụlọ Ya. Kedụ otu anyị nwere ike isi mee ebe obibi anyị “ụlọ nke Chineke”?