Come, Follow Me
Ọgọst 18–24: “Ụkpụrụ nwere Nkwa”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89–92


“Ọgọst 18-24: ‘Ụkpụrụ nwere Nkwa’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89– 89,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89–92,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

di na nwunye na-esikọta nri ọnụ

Ọgọst 18-24: “Ụkpụrụ nwere Nkwa”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89–92

N’ụlọakwụkwọ nke Ndị Amụma, Onye amụma Josef Smith kuziiri ndị okenye nke Izrel banyere iwulite alaeze nke Chineke n’elu ụwa. Ha kparịtara eziokwu nke ime mmụọ niile, kpekọta ekpere ọnụ, buo ọnụ, ma kwadoo ikwusa ozi ọma. Mana enwere otu ihe banyere ihu eluigwe nke nwere ike ịgba iche nye anyị taa, ma o yighị ihe ziri ezi nye Emma Smith kwa. N’oge nzukọ ndị a, ndịikom sere ma taa ụtaba, nke na-abụghị ihe ọhụrụ oge ahụ, mana ọ tejiri ala osisi niile ma debe isi ọjọọ n’ikuku. Emma gwara Josef nchegbu ya, ma Josef jụrụ Onyenwe anyị. Azịza ya bụ mkpughe nke gafere anwụrụ na nteji ụtaba niile. O nyere Ndị nsọ, ruo ndudugandu ga-abịa abịa, “ụkpụrụ nwere nkwa”—nkwa niile nke ahụike anụ ahụ, “amamiihe,” na “nnukwu akụ ndị nke mmata ihe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89:3, 19).

Lee kwa Ndị Nsọ, 1:166–68.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi nakwa na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị nyere m Okwu nke Amamiihe iji nyere m aka nwee ahụike na anụ ahụ na mmụọ.

Mgbe ndị okenye nọ niime Ụlọakwụkwọ nke Ndị Amụma nụrụ na mbụ ka Josef Smith gụrụ Okwu nke Amamiihe, ha na-egbughị oge “tụbara ọkpọkọ na plọg ha ji ata ụtaba niime ọkụ” (Ndị nsọ, 1:168). Ha chọrọ igosi njikere ha irube isi nye Onyenwe anyị. Elemaanya enwere ike ị “tụsawo” rịị site na ndụ gị ụmụ ihe niile Okwu nke Amamiihe na-adọ aka na ntị maka ya, mana kedụ ihe ọzọ i nwere ike ịmụta site na mkpughe nke a? Tulee nchepụta ndị a:

  • Chee maka mkpughe dị ka “ụkpụrụ nwere nkwa” (amaokwu 3)—eziokwu ndị na-anọgide nke na-eduzi ime mkpebi. Kedụ ụkpụrụ ndị ị na-achọta nwere ike iduzi mkpebi gị? Kedụ ngọzi ndị Onyenwe anyị kwere nkwa? (lee amaokwu 18–21). Kedụ otu O siworo mejupụta nkwa ndị ahụ niime ndụ gị?

  • Kedụ ọmụmaatụ ndị i hụworo nke “ajọọ ihe na atụmatụ niile … niime obi nke ndịikom na-agba izu” nke metụtara Okwu nke Amamiihe? (amaokwu 4). Na mgbakwunye nye mkpughe nke a, gịnị ka Onyenwe anyị nyeworo iji nyere gị aka zere ma ọ bụ merie ajọọ ihe ndị a?

  • Kedụ ihe mkpughe nke a na-akuziri gị banyere Onyenwe anyị? Kedụ otu Okwu nke Amamiihe si metụta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:34–35?

  • Kedụ ihe na-akpali gị ime iji lekọtazie anụ ahụ gị?

E nwere ike i nwewo ohere niile iji kọwaara ndị ọzọ ihe mere iji ebi ndụ Okwu nke Amamiihe—ma i nwere ike inwe ohere ndị ọzọ n’ọdịniihu. Tulee otu i nwere ike i si jiri ohere ndị a ji gbaa ama nke Onye Nzọpụta, ịdị nsọ nke anụ ahụ anyị, na eziokwu ime mmụọ ndị ọzọ. Maka nchepụta niile, lee “Anụ ahụ Gị Dị nsọ,” Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa: Odudu maka Ime Nhọrọ niile, 22–29.

Lee kwa 1 Ndị Kọrịnt 6:19–20; Thomas S. Monson, “Ụkpụrụ niile na Nkwa niile,” Liahona, Nov. 2016, 78–79; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Okwu nke Amamiihe,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Okwu nke Amamiihe,” niime Mkpughe Dị n’ụdị, 183–91; “Addiction,” “Physical Health,” Enyemaka nke Ndụ, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

4:39

Principles and Promises

President Monson testifies of the blessings that come as we obey the Word of Wisdom.

Mụọ ma kuzie site n’ụkpụrụ niile. Karịa idepụta ndepụta niile nke ndị a ga-eme na ndị agaghị eme, anyị nwere ike bie ndụ site n’ụkpụrụ niile iji tinye n’ọrụ ohere nhọrọ na okwukwe anyị niime Kraịst. N’ịmaatụ, tulee ajụjụ ndị dabeere na ụkpụrụ dị ka ndị a gbasara Okwu nke Amamiihe: Olee ụkpụrụ ndị nwere ike inye mmadụ mgbam ume onye ọ na-ara ahụ irube isi nye Okwu nke Amamiihe? Olee ụkpụrụ ndị nwere ike ikasi m obi mgbe m nwere nsogbu ahụike na-agbanyeghị ibi ndụ Okwu nke Amamiihe?

nwanyị na-eme yoga

Nna nke Eluigwe chọrọ ka anyị lekọta anụ ahụ anyị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:1–17

Otu Ndịisi Mbụ ji “ọtụghe niile nke alaeze.”

Niime nkeji 90, Onyenwe anyị nyere ntuziaka niile banyere “ije ozi ahụ na otu ndịisi” (amaokwu 12) nke Josef Smith, Sidney Riddon, naa Frederick G. Williams—ndị otu nke ihe anyị na-akpọ ugbu a Otu Ndịisi Mbụ. Kedụ ihe ị na-amụta banyere Otu Ndịisi Mbụ site na amaokwu 1–17? Tulee inyochagharị ozi nso nso a niile sitere n’aka ndị otu nke Otu Ndịisi Mbụ. Kedụ ihe ha na-eme iji hazie n’usoro ihe niile gbasara nzukọ nsọ na alaeze nke a”? (amaokwu 16). Kedụ otu i ga-esi egosi na ha abụghị “ihe dị mfe” nye gị? (amaokwu 5).

Tulee ịgụ egwu ma ọ bụ ịgụ okwu niile iji “Bịa, Gee ntị nye Olu nke Onye amụma” (Abụ, no. 21) ma ọ bụ egwu ọzọ banyere ndị amụma nke metụtara nkuzi niile dị niime amaokwu ndị a. Kedụ otu ije ozi nke Otu Ndịisi Mbụ si nyere gị aka mata Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24

“Ihe niile ga-agakọta ọnụ maka ọdịmma [m].”

Tụgharịa uche nhụmiihe ọbụla ndị i nweteworo nke na-agba ama banyere nkwa nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24. Tulee idekọ nhụmiihe gị niile na ikesara ha ndị otu ezi na ụlọ ma ọ bụ onye ahụrụ naanya—ikekwe onye nwere mkpa mmasi obi ike ma ọ bụ mgbam ume. Ọ bụrụ na ị ka nọ na-eche ngọzi ndị dị ańaa, tulee ihe i nwere ike ime iji nọgide kwesị ntụkwasị obi dị ka ị na-echere ịhụ otu “ihe niile si agakọta ọnụ maka ọdịmma gị.”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:28–31

Onye bụ Vienna Jaques?

A mụrụ Vienna Jaques na Jun 10, 1787, na Massachusetts. Nwanyị nwere okwukwe onye kpatara ego, Vienna zutere ndị mgbasa ozi ọma na 1831 nke mbụ. Mgbe o nwetasịrị aka ebe nke ime mmụọ na ozi ha bụ eziokwu, o mere njem izute Onye amụma na Kirtland, Ohio, ebe e mere ya baptizim.

Vienna rubere isi na ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nyere ya dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:28–31. Nnyefechasị ya nye Onyenwe anyị, nke gụnyere ụtụ niile o meworo mbụ na Kirtland, bịara n’oge dị oke mkpa nye Nzukọ nsọ, mgbe ndị ndu naara achọ ịzụ ala ebe a ga-arụ Tempụl Kirtland. Vienna kwesịrị ntụkwasị obi, ma anọghị … nkịtị oge ndụ ya niile ma nwere ike n’ikpeazụ “ịnọzi n’udo” (amaokwu 31) na Ndagwurugwu Salt Lake, ebe ọ nwụrụ mgbe ọ gbara 96.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 91

“Mmụọ ahụ na-egosipụta eziokwu.”

Anyị niile na-ahụta ozi ndị nwere niime ya “ọtụtụ ihe … nke bụ eziokwu” na “ọtụtụ ihe … nke na-abụghị eziokwu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 91:1–2). Kedụ ndụmọdụ i nwere ike ịchọta niime nkeji 91 nke nwere ike inyere gị aka mata eziokwu dị niime ozi ndị ị na-ezute? Kedụ otu Mmụọ ahụ si enyere gị aka mata eziokwu site na njehie?

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89

Okwu nke Amamiihe na-enyere m aka nwee ahụike na anụ ahụ na ime mmụọ.

  • Iji nabata nkeji 89, elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke otu tempụl ma ọ bụ gụọ otu egwu banyere ahụike anụ ahụ, dị ka “Onyenwe anyị Nyere M otu Tempụl” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 153), iji kuzie na anu ahụ anyị dị ka tempụl maka mmụọ anyị. Nyere ụmụ gị aka gosipụta ụzọ ndị ha nwere ike i si lekọta anụ ahụ ha.

  • Iji mụọ banyere iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89:10–17, gị na ụmụ gị nwere ike see ihe ma ọ bụ lee anya na foto nke ezigbo ihe ndị anyị nwere ike iri ma ọ bụ ime iji debe anụ ahụ anyị na ahụike (lee foto na ịhuakwụkwọ ihe omume na ngwụcha ndepụta nke a). Gịnị ka Onyenwe anyị dọrọ anyị aka na ntị ghara iji eme ihe? Gịnị mere O ji chọọ ka anyị lekọta anụ ahụ anyị?

  • Okenye Gary E. Stevenson nyere ndị na-eto eto ndụmọdụ ime atụmatụ n’ọdịnihu ihe ha ga-eme mgbe anwara ha jiri mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ. Ọ kuziri: “Ị ga-ahụ na ọnwụnwa enwechaghị ike ịchịkwa gị. Ọ ga-abụ na i buwo ụzọ kpebie otu ị ga-esi kpaa agwa na ihe ị ga-eme. Ọ dighị mkpa na ị ga-eme mkpebi mgbe niile” (“Akwụkwọ egwuregwu Ọkwa nchụaja Gị,” Liahona, Me 2019, 48). Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 89:4 na nkwupụta nke Okenye Stevenson ọnụ, gị na ụmụ gị dụọ ọdụ banyere otu ha nwere ike isi kpebie ugbu a—ruo oge ndụ ha niile—ibi ndụ Okwu nke Amamiihe. I nwere ike gosipụta n’ụzọ ihe ejije otu ha nwere ike i si zaghachi mmadụ, ọbụna enyi, na-enye ha ihe nke megidere Okwu nke Amamiihe. Kedụ otu Onyenwe anyị si agọzi anyị dị ka anyị na-erube isi nye Okwu nke Amamiihe? (amaokwu 18-21).

ụmụntakịrị na-egwu egwuregwu na biichi

Anụ ahụ anyị bụ onyinye sitere na Chineke.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:5

Chineke na-enye m ndị amụma iduzi ma chekwaa m.

  • I nwere ike lee anya na foto nke ndị amụma mgbe gboo ma ọ bụ gụọ otu egwu dị ka “Soro Onye amụma” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 110–11). Kedụ otu Chineke si gọzie ụmụ Ya site na Ndị Amụma Ya? Gịnị mere anyị ga-esi ege ntị nye ndị amụma nke Chineke? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:5). Emesịa gị na ụmụ gị nwere ike lee anya na foto nke onye amụma dị ndụ ma kesaa ụfọdụ ihe ndị Onyenwe anyị kuziworo ma ọ bụ dọworo anyị aka na ntị maka ya site na ya. Kedụ otu anyị nwere ike i si soro onye amụma?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 91

Mmụọ pụrụ inyere m aka mata ihe bụ eziokwu.

  • I nwere ike chịkọta isi nkeji nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 91 iji nyere ụmụ gị aka ghọta ihe kpatara eji nye mkpughe nke a. Ha nweziri ike mgbe ahụ chee maka ebe niile, dị ka niime midia, ebe anyị na-achọta “ọtụtụ ihe ndị … bụ ezi okwu” na “ọtụtụ ihe ndị … na-abụghị eziokwu” (amaokwu nke 1-2). Kedụ ihe amaokwu nke 4-6 na-akuziri anyị banyere Mmụọ Nsọ? Kedụ otu Mmụọ Nsọ si enyere anyị aka mata ihe ziri ezi?

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

mkpụrụ

“Mkpụrụ akụkụ ubi dị mma maka nri nye mmadụ; dịkwa ka mkpụrụ nke vaịnị.”

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị