“Septemba 1–7: ‘Maka Nzọpụta nke Zayọn’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94–97,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94–97,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Septemba 1–7 : “Maka nzọpụta nke Zayọn”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94–97
Mgbe gboo, Onyenwe anyị nyere Mosis iwu maka iwu otu tabanakụl “dị ka otu atụmatụ egosiri ya n’elu ugwu sịrị dị” (Ndị Hibru 8:5; lee kwa Ọpụpụ 25:8–9). Tabanakụl kwesịrị ị bụ isi kampụ alaịkpa nke Izrel (lee Ọnụọgụgụ 2:1-2).
Na 1833, Onyenwe anyị nyere Josef Smith iwu maka iwu tempụl niile “na-abụghị site n’ụdị nke ụwa” mana kama “site n’ụdị nke m ga-egosi” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:13–14; lee kwa 97:10). Dị ka tabanakụl dị niime alaịkpa, tempụl niile bụ nke kwesịrị ị bụ isi njirimara na Kirtland (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94:1).
Taa, a na-ahụta ọtụtụ tempụl na gburugburu ụwa. Ọbụrụgodụ na ha anọghị n’etiti obodo ukwu anyị, ha na-atụrụ anyị aka na Kraịst, onye kwesịrị ị bụ isi nke ndụ anyị. Agbanyeghị tempụl nke ọbụla dị iche iche n’ọdịdị, niime ha anyị na-amụ otu ụdị atụmatụ sinachi—atụmatụ nke si n’eluigwe iji kpọtaghachị anyị n’ihu Chineke. Emume nsọ na ọgbụgba ndụ ndị dị nsọ na-ejikọ anyị na Kraịst ma gbaa ezi na ụlọ anyị ume “na-abụghị n’usoro nke ụwa” mana n’usoro Chineke gosiworo anyị.
Lee Ndị Nsọ, 1:169–70; “Ụlọ maka Chineke anyị,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 165–73.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94; 97:10–17
Enwere ike “ịranye m kpamkpam nye Onyenwe anyị.”
Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94, Onyenwe anyị na-enye nkuzi banyere iwu ụlọ nchịkwa niime Kirtland—ụlọ ọrụ na ụlọ ọrụ mbipụta. Gịnị na amasị gị banyere ihe Onyenwe anyị na-ekwu banyere ụlọ ndị a niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 94:2–12? Kedụ otu o si atụnyere ihe O kwuru banyere tempụl niime 97:10–17?
Gịnị ka ọ pụtara nye gị “ịranye kpamkpam nye Onyenwe anyị”?
Onyenwe anyị na adọ ndị Ọ hụrụ naanya aka na ntị.
Mgbe anatara mkpughe dị niime nkeji 95, ihe ruru ọnwa ise agafewo kemgbe Onyenwe anyị nyere Ndị nsọ iwu maka iwu ụlọ nke Chineke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:117–19)—ma ha a kaa bidobeghị. Mata otu Onyenwe anyị siri gbazie ha olu niime mkpughe nke a. I nwekwara ike nnọọ depụta ụkpụrụ niile ị chọtara maka ịgbazi olu sitere na mkpatemmụọ. Gịnị ka ị na-amụ banyere Onyenwe anyị site n’ụzọ O siri gbazie Ndị nsọ olu?
Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:43–44; D. Todd Christofferson, “Ka Ha ra bụ ndị M Hụrụ naanya, Ana M Abara mba ma Dọọ aka na ntị,” Liahona, Me 2011, 97–100.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8, 11–17; 97:10–17
Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị.
Mgbe adọsịrị ya aka na ntị niihi ewughị ụlọ nke Onyenwe anyị na Kirtland, ndị ndu Nzukọ nsọ họọrọ ala niime ubi ama whiiti ebe ha ga-ewu ụlọ. Hyrum Smith, nwanne nwoke nke Onye amụma, ozugbo gbapụrụ iwete scythe iji bido ịsụchasị ubi ama ahụ. “Anyị na-akwado iwu ụlọ nke Onyenwe anyị,” ka o kwuru, “ma ekpebiri m ịbụ onye mbụ n’ọrụ ahụ” (niime Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smith [2007], 271, 273). Kedụ ihe i chere mere Hyrum ji enwe ịnụ ọkụ n’obi iwu tempụl? Tulee nke a dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8, 11–17; 97:10–17.
N’ụbọchị anyị, Onyenwe anyị “na-eme ka a na-arụ tempụl ngwa ngwa” (Russell M. Nelson, “Lekwasị anya na Tempụl,” Liahona, Nov. 2022, 121). Ọ bụrụ ma mmadụ ajụọ gị ihe mere Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst si arụ ọtụtụ tempụl, gịnị ka i ga-ekwu? Chọọ azịza ndị nwere ike ịdị mma niime:
-
Ozi niile nke ịma ọkwa tempụl ọhụrụ nke Onyeisi Russell M. Nelson (dị ka “Ugbu a Bụ Oge ahụ,” Liahona, Me 2022, 126).
-
“Ihe Mere Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a si Arụ Tempụl niile” (temples.ChurchofJesusChrist.org).
-
Vidiyo ahụ “Tempụl niile” (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).
I nwere ike tụnyere mbọ nke Ndị nsọ nye iwu Tempụl Kirtland na mbọ gị niile ikwado maka nhụmiihe bara uru gị na Onyenwe anyị niime tempụl. Kedụ otu i nwere ike i si gosi otu ụdị uche nke ime ngwa ngwa nke metụtara Hyrum Smith maka ụlọ nsọ nke Onyenwe anyị. N’ịmaatụ, gịnị ka i nwere ike ime nke ga-eyi ịsụchasị ubi ama ahụ, dị ka Hyrum mere? Kedụ aja ndị i chere Onyenwe anyị chọrọ ka gị mee? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:12).
Lee kwa “Tempụl nsọ niile nọ n’elu Ugwu Zayọn,” Abụ niile, no. 289; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Tempụl niile,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:8–9
“A nabatara M ha.”
Chee maka otu oge mgbe anabatara gị—ma ọ bụ anabataghị gị—bata niime otu ma ọ bụ tiim. Kedụ otu nke ahụ si yie na ma ọ bụ dịrị iche site n’ihe Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:8–9 na-akuzi banyere ihe ọ pụtara ị bụ onye anabatara nke Onyenwe anyị? Kedụ ihe i chere Onyenwe anyị na-agbalị ikuziri gị jiri ihe atụ niime amaokwu 9?
Lee kwa Erich W. Kopischke, “Ịbụ onye Anabatara anabata site naka Onyenwe anyị,” Liahona, Me 2013, 104–6.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:18–28
Zayọn bụ “ndị ahụ dị ọcha n’obi.”
Nye Ndị nsọ niime 1830 niile, Zayọn bụụrụ ebe. Niime mkpughe dị niime nkeji 97, Onyenwe anyị gbatịrị nkọwasị ahụ iji kọwaa ndị mmadụ—“ndị dị ọcha n’obi” (amaokwu 21). Dị ka ị na-agụ amaokwu nke 18–28, i nwere ike dochie nkọwasị nke a mgbe ị na-agụ mkpụrụokwu ahụ Zayọn. Gịnị ka ọ pụtara nye gị ịbụ onye dị ọcha n’obi?
Lee kwa Mosis 7:18.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8; 97:10–17
Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị.
-
Maka ndabere ole ma ole nke nkeji 95 na 97, i nwere ike kesaara ụmụ gị “Tempụl Kirtland” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile maka Ndị nta Na-agụ ihe (Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; lee kwa Ndị nsọ, 1:210). Ụmụ gị nwere ike nwee mmasị ime ka ha na-enye aka iwu Tempụl Kirtland (igbuji osisi, ịkụba ntu niile, ite mgbidi agba, na ndị ọzọ). I nwekwara ike gosi ha foto nke Tempụl Kirtland, dị ka ndị ahụ nọ niime ndepụta nke a, mgbe ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 95:8 iji kuziere ụmụ gị ihe mere Onyenwe anyị ji na-achọ anyị iwu tempụl niile.
-
Mgbe unu gụkọtachara Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:15–16ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike kesaara ibe unu ihe kpatara tempụl ji pụọ iche nye unu. Unu nwekwara ike gụkọta otu egwu ọnụ iji nyere ụmụ gị aka kwanyere ụlọ nke Onyenwe anyị ugwu, dị ka “Ọ Na-amasị M Ịhụ Tempụl” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 95). Gịnị mere tempụl ji dị nsọ?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:1–2, 8–9, 21
Zayọn bụ “ndị dị ọcha n’obi.”
-
Inyere ụmụ gị aka ghọta ihe mkpụrụokwu ahụ dị ọcha nwere ike ịpụta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:21, unu nwere ike lekọta anya ọnụ na glasị mmiri dị ọcha ma gbakwunye otu ihe na mmiri ahụ nke na-eme ya ahara ịdị ọcha (dị ka unyi ma ọ bụ ose). Gịnị mere ọ ji dị mkpa na mmiri ga-adị ọcha? Mgbe ahụ ụmụ gị nwere ike gụọ amaokwu 21 ma tinye mkpịsị aka ha n’elu mkpụrụokwu ahụ dị ọcha. Gịnị ka ọ pụtara maka obi anyị ịdị ọcha? Amaokwu nke 1–2 na 8–9 nwere ike wete nchepụta ụfọdụ. Kedụ otu Onye Nzọpụta si enye aka mee obi anyị adị ọcha?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:8–9
Onyenwe anyị na-agọzi ndị mmadụ na-edebe ọgbụgba ndụ Ya na ha.
-
Ụmụ gị ha maara ụdị ọgbụgba ndụ ndị anyị na Onyenwe anyị na-eme mgbe anyị mere baptizim ma ọ bụ niime tempụl? Tulee inyochagharị ọgbụgba ndụ ndị ahụ gị na ha site na-ịgụ Mozaya 18:9–10, 13 ma ọ bụ Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 27.2. Kesaara ibe unu otu i si na-agba mbọ “idebe ọgbụgba ndụ [unu] site n’ịchụ aja” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:8).
-
I nwere ike kpọkuo ụmụ gị ise ihe osise foto nke ihe Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 97:9 na-akọwa. Dị ka ha na-ekesa foto ha, kwuo banyere otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị maka idebe ọgbụgba ndụ gị. Kedụ otu ngọzi ndị ahụ si dị ka ịbụ “osisi juputara na mkpụrụ nke a kụrụ … n’akụkụ iyi dị ọcha”?