Come, Follow Me
Septemba 15–21: “Mgbe Ọtụtụ Mkpagbu Gasịrị … Ka Ngọzi Ga-abịa”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102–105


“Septemba 15–21: ‘Mgbe Ọtụtụ Mkpagbu Gasịrị … Ka Ngọzi Ga-abịa’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102–105,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102–105,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Kampụ nke Zayọn

C.C.A. Christensen (1831–1912), Kampụ nke Zayọn, c. 1878, tempera n’elu muslin, 78 x 114 inches. Ọba nkaọkpụ nke Mahadum Brigham Young, onyinye nke ụmụ ụmụ C.C.A. Christensen, 1970.

Septemba 15–21: “Mgbe Ọtụtụ Mkpagbu Gasịrị … Ka Ngọzi Ga-abịa”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102–105

Obi gbawara Ndị nsọ nọ na Kirtland ịnụ na-achụpụrụ ụmụnne ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ na Ọgba Jackson, Missouri, site n’ebe obibi ha. Ọ ga-abụrịrị na ọ na-enye mgbam ume, mgbe ahụ, mgbe Onyenwe anyị mara ọkwa na “mgbapụta nke Zayọn” “ga-abịa site n’ike” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:15). Site na nkwa ahụ nọ niime obi ha, ihe karịrị ndịikom dị 200 na ihe ruru ndịinyom 25 na ụmụntakịrị denyere aha n’ihe ha kpọrọ Kampụ nke Izrel, nke amazi dị ka Kampụ nke Zayọn. Ozi ya bụ ịzọrọ njem gaa Missouri ma gbapụta Zayọn.

Nye ndị otu nke kampụ ahụ, ịgbapụta Zayọn pụtara iweghachite Ndị nsọ n’ala ha. Mana naanị tupu nrute ha na Ọgba Jackson, Onyenwe anyị gwara Josef Smith ịgbasasị Kampụ nke Zayọn. Ụfọdụ ndị otu kampụ ahụ nwere mgbagwoju anya na obi ọjọọ; ọ dịịrị ka njem ahụ adawo ma nkwa niile nke Onyenwe anyị emezughị. Ndị ọzọ, kosiladị, hụrụ ya n’ụzọ ọzọ. Ebe Ndị nsọ achụpụrụ achụpụ enweteghị ala ha na ebe obibi ha ọzọ, nhụmiihe ahụ wetere ogo nke mgbapụta nye Zayọn, ma ọ “bịara site n’ike.” Ndị otu nke Kampụ nke Zayọn kwesịrị ntụkwasị obi, ọtụtụ niime ndị mesịrị bụrụ ndị ndu Nzukọ nsọ, gbara ama na nhụmiihe ahụ mikpukwuru okwukwe ha n’ike Chineke, niime ọkpụkpọ oku sinachi nke Josef Smith, na niime Zayọn—ọbụghị naanị Zayọn ebe ahụ mana Zayọn ndị nke Chineke. Kama ịjụ ajụjụ uru nke ọrụ nke a yiri ihe na-emeghị nke ọma, ha mụtara na ezigbo ọrụ ya bụ isoro Onye Nzọpụta, ọbụna mgbe anyị aghọtaghị ihe niile. Otu a ka a ga-esi agbapụta Zayọn, n’ikpeazụ.

Lee Ndị Nsọ, 1:194–206; “Onyinye Kampụ nke Zayọn Kwere Nnabata,” niime Mkpughe ndị dị N’ụdị, 213–18.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102:12–23

Gịnị bụ ebumnoobi nke kansụl ịbụ onye otu?

Nkeji 102 nwere niime ya ndekọ niile nke nzukọ ahụ niime Kirtland, Ohio, ebe ahaziri kansụl dị elu nke mbụ nke Nzukọ nsọ. Niime amaokwu 12–23, Onyenwe anyị kọwara usoro niile nke kansụl dị elu na-esoro mgbe ha na-eme kansụl ịbụ onye otu maka ndị ahụ meworo mmehie siri ike.

Onyeisi M. Russell Ballard kuziri: “Ndị otu mgbe ụfọdụ na-ajụ ihe mere eji eme kansụl [ịbụ onye otu] Nzukọ nsọ. Ebumnobi ya dị ụzọ atọ: ịzọpụta mkpụrụ obi nke onye mmehie, iji chekwaa onye aka ya dị ọcha, na iji chekwaa enweghị ntupọ, eziokwu, na aha ọma nke Nzukọ nsọ” (“Ohere Ibidoghachi N’isi: Kansụl Ịdọ aka na ntị nke Nzukọ nsọ na Mweghachite nke Ngọzi niile,” Ensign, Sept. 1990, 15).

Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Kansụl Ịbụ Onye otu,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:1–12, 36; 105:1–19

Zayọn ka enwere ike iwu naanị n’ụkpụrụ niile nke ezi omume.

Gịnị mere ala e kwere na nkwa nke Ndị nsọ jiri funarị ha na Missouri? Enwere ike inwe ọtụtụ ihe kpatara ya—opekampe otu, Onyenwe anyị kwuru, bụ “njehie niile nke ndị m.” Ma ọ bụghị maka nke ahụ, Zayọn “ka a gaara enwe ike agbapụta” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 105:2). Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:1–12, 36; 105:1–19, i nwere ike mata ụfọdụ ihe ndị gbochiri nhiwe nke Zayọn na Missouri na ihe ndị ọzọ gaara enye aka. Kedụ ihe ị na-amụ nwere ike inyere gị aka hiwe Zayọn niime obi, ebe obibi, na obodo unu?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:12–13, 36; 105:1–6, 9–19

akara ngosi semịnarị
Ngọzi niile na-abịa mgbe mnwale nke okwukwe gasịrị.

N’ọtụtụ ụzọ, isonye niime Kampụ nke Zayọn bụ mnwale nke okwukwe. Njem ahụ toro ogologo, ihu eluigwe naara ekpo ọkụ, ma nri ma mmiri mgbe ụfọdụ dị ụkọ. Ma n’ihe niile ha nagidere, Kampụ nke Zayọn ka dị na-emeghị nke ọma na-ịkpọghachi Ndị nsọ n’ala ha. Chee na i nwere ohere ide leta nye onye otu Kampụ nke Zayọn onye okwukwe ya niime Onyenwe anyị ka nhụmiihe ahụ kwagahrịrị. Gịnị ka i nwere ike ikwu iji gbaa onye a ume? Kedụ eziokwu ndị i nwere ike ịchọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:5–7, 12–13, 36; 105:1–6, 9–19 nke nwere ike inye aka?

Mgbe ahụ i nwere ike chee banyere ọmụmaatụ kacha ọhụrụ ugbu a nke mnwale dị ka Kampụ nke Zayọn—dị ka onye mgbasa ozi ọma onye na-arụsi ọrụ ike, mana enweghị onye sonyere Nzukọ nsọ niihi mgbalị ya niile. Ịdabere n’ihe anyị mụworo, kedụ otu i ga-esi enyere onye mgbasa ozi ọma ahụ aka hụta na mgbasa ozi ya gakwara nke ọma?

Kedụ otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị “mgbe ọtụtụ mkpagbu gasịrị”? (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:12).

Lee kwa 1 Nifaị 11:16–17; Alma 7:11–12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:33–36; 84:88; 101:35–36; David A. Bednar, “Na Akụkụ nke Onyenwe anyị: Ihe ọmụmụ niile sitere na Kampụ nke Zayọn,” Ensign, Julaị 2017, 26–35, ma ọ bụ Liahona, Julaị 2017, 14–23; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Nagide ruo Ọgwụgwụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Lee Otu Ntọala si Sie ike,” Abụ, no. 85.

Kwadoo site na-ịmụ ọnọdụ agụgụala nke mkpughe niile. Ịghọta ntọ nke mkpughe niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile nwere ike nyeere gị aka ghọta ma tinye n’ọrụ ụkpụrụ niile ha na-akuzi. Bịanụ, Soro M na-ewete njikọ niile nye ọtụtụ niime akụrụngwa ndị a. Maka Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 102–5, see Saints, 1:194–206; “Onyinye Kampụ nke Zayọn Kwere Nnabata,” niime Mkpughe ndị dị N’ụdị, 213–18; na “Olu niile nke Mweghachite: Kampụ nke Zayọn.”

osimiri nọ na Missouri, USA

Kampụ nke Izrel nọọrọ n’ụzọ ọnụ mmiri nke Osimiri Little Fishing.

Gịnị bụ ebumnoobi nke mnwale niile?

Tulee ndụmọdụ nke Okenye Orson F. Whitney banyere ebumnoobi nke mnwale niile: “Ọdịghị ihe mgbu nke anyị na-agabiga, ọdịghị mnwale nke anyị na-ahụta bụ ihe furu ọhịa. Ọ na-enye aka na mmụta anyị, ruo na izulite ụdị àgwà ndị dị ka ndidi, okwukwe, obi ike na obi ume ala. Ihe niile anyị na-agabiga na ihe niile anyị na-anagide, kacha nke mgbe anyị na-anagide ya na ndidi, na-ewulite omume anyị, sachaa obi anyị, mee ka mkpụrụ obi anyị saa mbara, ma mee anyị adị nro ma nwee afọma karịa, dị ntozu oke karịa ka e wee kpọọ anyị ụmụ Chineke … ma ọ bụ site na mwute na ntaram ahụhụ, ndọlị na mkpagbu, ka anyị na-enwete mmụta nke anyị bịara ebe a inwete ma nke ga-eme anyị adị ka Nna anyị na Nne anyị bi n’eluigwe” (niime Spencer W. Kimball, Okwukwe Na-ebute Ọrụ ebube ụzọ [1972], 98).

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:11–18, 78–83

Onyenwe anyị emewo m “onye nlekọta na-ahụ maka ngọzi elu ụwa niile.”

Na mgbakwunye nye mnwale niile na Missouri, na 1834 Nzukọ nsọ zutere nsogbu ego, gụnyere nnukwu ụgwọ na mmefu ego. Niime nkeji 104 Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ niihi ọnọdụ ego nke Nzukọ nsọ. Kedụ otu i nwere ike i si tinye n’ọrụ ụkpụrụ niile dị niime amaokwu nke 11-18 na 78-83 nye mkpebi ego nke onwe gị niile?

Lee kwa “Akụ dị niime Eluigwe: Akụkọ nke Jọn Tanner” na “Ọrụ nke Aka Ya” (vidiyo niile), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

2:3

Treasure in Heaven: The John Tanner Story

John Tanner freely gave all he had, giving us an example of generosity and consecration in serving the Lord.

3:42

The Labor of His Hands

Church members around the world volunteer both time and money to serve others-- members and nonmembers alike--as Christ would serve.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:9

E nwere m ike ị bụ “ìhè nye ụwa” site na-isoro Jizọs.

  • I nwere ike kpọkuo ụmụ gị ijide foto nke bọọbụ ọkụ, oriọna, ma ọ bụ ihe ọzọ esi enwete ọkụ dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 103:9. Kedụ otu anyị nwere ike isi dị ka ìhè nye ndị ọzọ mgbe anyị na-esoro Jizọs Kraịst? Lee kwa “Jizọs Chọrọ M maka Ụzarị anwụ” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 60–61).

mụnye oriọma

E nwere m ike ị dị ka ìhè nye ndị ọzọ mgbe m na-esoro Jizọs Kraịst.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:13–18

Onyenwe anyị chọrọ ka m kesaa ihe m nwere mụ na ndị nọ na mkpa.

  • I nwere ike nye ụmụ gị nkeji ole ma ole iji depụta ngọzi niile Chineke nyeworo ha (dị ka nri, uwe, onyinye chi niile, okwukwe, na ebe obibi). Gbaa ha ume idepụta ka ha ra bụ ihe ndị ha nwere ike ime. Emesịa unu nwere ike gụkọọ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:13–18, na-achọ azịza niile nye ajụjụ niile dị ka ndị a: Onye bụ ezigbo onye nwe ihe niile? Gịnị ka Ọ chọrọ ka anyị ji ihe ndị a mee? Gị na ụmụ gị nwere ike kọọ maka nhụmiihe niile noge otu onye nyere gị ihe ị chọrọ (lee kwa “The Coat” [vidiyo], Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

    2:7

    The Coat

    The Coat is a children’s story that depicts a young boy giving selflessly to another child in need.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:42

Onyenwe anyị ga-agọzi m dị ka m na-edebe iwu nsọ Ya niile.

  • Ọtụtụ mgbe niime nkeji 104 Onyenwe anyị kwere nkwa “mbawanye nke ngọzi” nye ndị na ekwesị ntụkwasị obi na-irube isi niwu nsọ Ya niile. Inyere ụmụntakịrị aka ghọta ihe “mbawanye” pụtara, i nwere ike see otu okirikiri ma rịọ ụmụ gị inyere gị aka mụbaa ọnụọgụgụ nke okirikiri niile—na-ese abụọ, emesịa anọ, emesịa asatọ, emesịa iri na isii, na ndị ọzọ. Oge ọbụla ị gbakwunyere okirikiri, nyere ụmụ gị aka chee maka ngọzi Nna nke Eluigwe nyeworo ha.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 105:38–40

Enwere m ike ịbụ onye ome udo.

  • Iji nyere ụmụ gị aka mụọ akụkọ nke Kampụ nke Zayọn, i nwere ike kọọ “Isi nke 36: Kampụ nke Zayọn” (niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 135-39, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma). Kwụsị ugboro ugboro ikwu banyere ihe ọmụmụ ndị anyị nwere ike ịmụ site na Kampụ nke Zayọn—iji maa atụ, na Onyenwe anyị chọrọ anyị inwe udo ma rụkọọ ọrụ ọnụ kama ịrụ ụka na ịlụ ọgụ (lee kwa Russell M. Nelson, “Achọrọ ndị Omee Udo,” Liahona, Me 2023, 98-101.

    3:30

    Chapter 36: Zion’s Camp: February–June 1834

  • I nwekwara ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 105:38–40 ma gwa ụmụaka iguzoro oge ọbụla ha nụrụ mkpụrụokwu ahụ “udo.” Kọwaa na Onyenwe anyị chọrọ ka Ndị nsọ mee udo ha na ndị ahụ na-emejọ ha. Nyere ụmụ gị aka chee maka ihe ndị ha nwere ike ime iji bụrụ ndị ome udo, ma kpọkuo ha ime ejije ọnọdụ ụfọdụ.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

otite agba nke Kampụ nke Zayọn

Kampụ nke Zayọn (Kampụ nke Zayọn nọ na Osimiri Fishing), site n’aka Judith A. Mehr

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị