Come, Follow Me
Olu niile nke Mweghachite: Kampụ nke Zayọn


“Olu niile nke Mweghachite: Kampụ nke Zayọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Kampụ nke Zayọn,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

akara ngosi nke olu niile nke mweghachite

Olu niile nke Mweghachite

Kampụ nke Zayọn

Niihi na Kampụ nke Zayọn enweghị mgbe o weghachitere Ndị nsọ n’ala ha dị na Ọgba Jackson, ọtụtụ ndị mmadụ chere na mbọ ha bụ ihe kụrụ afọ n’ala. Kosiladị, ọtụtụ ndị nsonye nke Kampụ nke Zayọn weghachiri uche azụ na nhụnmiihe ha ma hụta otu Onyenwe anyị si mezuo ebumnuche kacha dị elu niime ndụ ha na niime alaeze Ya. Nke a bụ ụfọdụ ama ha.

Joseph Smith

One drawing in pencil, charcoal and ink on paper.  A left profile, head/shoulders portrait of Joseph Smith; drawn basically in charcoal, highlighted with white paint and black ink.  titled at bottom "Jospeh Smith the Prophet."  Signed at left shoulder "Drawn from the most authentic sources by Dan Weggeland"  A drawn border surrounds it.  No date apparent.

Ihe karịrị afọ 40 mgbe Kampụ nke Zayọn gasịrị, Josef Young, onye buwororịị onye otu kampụ ahụ, dekọrọ na Josef Smith kwuru ihe ndị a sotere:

“Ụmụnne ndị nwoke, ụfọdụ niime unu na-ewere m iwe, niihi na unu alụghị ọgụ na Missouri; mana ka m gwa unu, Chineke achọghị ka unu lụọ ọgụ. O nweghị ike ịhazi alaeze ya jiri ndịikom iri na abụọ iji meghee ọnụ ụzọ ozi ọma nye mba niile nke ụwa, ma jiri ndịikom iri asaa n’okpuru ntuziaka ha i soro ntuwaraụzọ ha, ma ọ bụghị ma ọ kpọọrọ ha site n’otu ndịikom ndị nyere ndụ ha, na ndị chụworo nnukwu aja dị ka Abraham mere.

“Ugbu a, Onyenwe anyị enwetewo Iri na abụọ ya na Iri Asaa ya, ma aga enwe kworum ndị ọzọ nke Ndị Iri asaa a ga-akpọ, ndị ga-achụ aja, ma ndị ahụ na-achụbeghị aja ha na onyinye ha ugbu a, ga-eme ha ma emesịa.”1

Brigham Young

Photograph of Brigham Young in stately side pose.

“Mgbe anyị bịarutere Missouri Onyenwe anyị gwara nwa odibo ya Josef okwu ma sị, Anabatawo m onyinye unu,’ ma anyị nweburu ohere ịlaghachi ọzọ. Mgbe m lọghachiri ọtụtụ ndị enyi jụrụ m kedụ uru dị na ịkpọrọ ndịikom site n’ọrụ ha ịgaru Missouri ma emesịa lọghachi, na-emepụtaghị ihe ọbụla doro anya. ‘Onye ka ọ baara uru?’ ka ha jụrụ. ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nyere ya n’iwu ka e mee ya, kedụ ihe o bu n’uche na-ime otu a?’ … A gwara m ụmụnne ndị nwoke ahụ na anatara m nnukwu ụgwọ ọrụ—akwụrụ jiri oke nnukwu uru—ee na atụ m jupụtara na mmata ihe fere oke ka m nataworo site na ime njem mụ na Onye amụma.”2

Wilford Woodruff

Photograph of Brigham Young in stately side pose.

“A nọ m na Kampụ nke Zayọn mụ na Onye amụma nke Chineke. A hụrụ m ọrụ niile nke Chineke n’ebe ọ nọ. A hụrụ m ike nke Chineke n’ebe ọ nọ. A hụrụ m na ọ bụ Onye Amụma. Ihe pụtara ihe nye ya site n’ike nke Chineke n’ihi ozi ahụ bụụrụ ihe bara oke uru nye m ma nye ndị niile natara nkuzi ya niile.”3

“Mgbe akpọrọ ndị otu Kampụ nke Zayọn ọtụtụ niime anyị ahụtụbeghị mbara ihu ibe anyị; anyị bụụrụ ndị ọbịa nye onye ọbụla ma ọtụtụ ahụtụbeghị onye amụma ahụ. Ekposasịwo anyị na ebe dị anya, dị ka ọka eji nyọ yọchaa, gburugburu mba ahụ. Anyị bụụrụ ndịikom nta, ma akpọkuru anyị n’isimbụ ụbọchị ahụ ịgbago ma gbapụta Zayọn, ma ihe ọbụla anyị nwere ime anyị mere n’okwukwe. Anyị gbakọtara ọnụ site na Siteeti dị iche iche na Kirtland ma gbagoo ịgbapụta Zayọn, na mmezu iwu nsọ nke Chineke nyere anyị. Chineke nabatara ọrụ anyị dị ka o mere ọrụ niile nke Abraham. Anyị mezuru nnukwu ihe, agbanyeghị ndị ngọnarị okwukwe na ndị na-ekweghị ekwe ọtụtụ mgbe na-ajụ ajụjụ ‘kedụ ihe i meworo?’ Anyị nwetere nhụmiihe nke anyị agaraghị enwe ike enwete [n]’ụzọ ọbụla ọzọ. Anyị nwetere ohere ịhụ ihu nke onye amụma, ma anyị nwetere ohere ime njem maịlụ puku kwuru puku anyị na ya, ma na-ahụ ịrụ ọrụ niile nke mmụọ nke Chineke na ya, na mkpughe niile nke Jizọs Kraịst nye ya na mmezu nke mkpughe ndị ahụ. Ma ọ kpọkọtara ihe dị ka narị ndị okenye abụọ sitere gburugburu mba ahụ niile nisimbụ ụbọchị ahụ ma zigara anyị ozi nzipụ niime ụwa ikwusa ozi ọma nke Jizọs Kraịst. A sị na m esoghị kampụ nke Zayọn agaraghị m enwe ike a nọ ebe a taa [niime Obodo ukwu Salt Lake, na-eje ozi niime Kworum nke Iri na abụọ]. … Site na-ịga ebe ahụ akwabara anyị niime ubi vaịnị ikwusa ozi ọma, ma Onyenwe anyị nabatara ọrụ anyị. Ma niime ọrụ anyị na mkpagbu, na ndụ anyị na-anọkarị n’ihe ize ndụ ọtụtụ mgbe, anyị kwesịziri ịrụ ọrụ ma bie ndụ n’okwukwe.”4

“Nhụmiihe ahụ [anyị] nwetere na ime njem Kampụ nke Zayọn bara uru karịa ọlaedo.”5

Hụba ama

  1. Niime Josef Young Sr., Agụgụala nke Nhazi nke Ndị Iri Asaa (1878), 14.

  2. “Mkparịta ụka,” Deseret News, Dec. 3, 1862, 177.

  3. Niime Repọọtụ Ọgbakọ, Apr. 1898, 29–30; lee kwa Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Wilford Woodruff (2004), 135.

  4. “Mkparịta ụka,” Deseret News, Dec. 22, 1869, 543; lee kwa Nkuzi niile: Wilford Woodruff, 138.

  5. Deseret News: Ọkara Izu ụka, Julaị 27, 1880, 2; lee kwa Nkuzi niile: Wilford Woodruff, 138.