Come, Follow Me
Septemba 8–14: “Dere Duu ma Mata Na A Bụ M Chineke”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98–101


“Septemba 8–14: ‘Dere Duu ma Mata Na A Bụ M Chineke’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98–101,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98–101,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Ìgwè ndị na-eme ọgba aghara na-awakpo Ndị nsọ na Missouri

C.C.A. Christensen (1831–1912), A Chụpụrụ Ndị nsọ site na Ọgba Jackson Missouri, c. 1878, tempera n’elu muslin, 77 ¼ x 113 inches. Ọba nkaọkpụ nke Mahadum Brigham Young, onyinye nke ụmụ ụmụ C.C.A. Christensen, 1970.

Septemba 8–14: “Dere Duu ma Mata Na A Bụ M Chineke”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98–101

Maka Ndị nsọ noge 1830 na-ọma, Independence, Missouri, bụ nnọọ ala e kwere na nkwa. Ọ bụ “ebe mgbakọ” nke Zayọn (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 57:3)—obodo ukwu nke Chineke n’elu ụwa—na mkpokọta nke Ndị nsọ ebe ahụ bụ ihe mmalite mara mma nye Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ. Mana ndị agbata obi ha niime mpaghara ahụ hụrụ ụmụ ihe n’ụzọ dị iche iche. Ha kwugidere mgbarakwa ahụ na Chineke enyewo Ndị nsọ ala ahụ, ma obi erughị ha ala na nsonazụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke akụ na ụba, na nke ọha na eze nke oke ọtụtụ ndị mmadụ ana amaghị na-akwabata ọsọ ọsọ. Enweghị obi iru ala na-egbughị oge ghọrọ mkpagbu na ọgba aghara. Na 1833, e bibiri ụlọ ọrụ mbipụta nke Nzukọ nsọ, ma achụpụrụ Ndị nsọ site n’ebe obibi ha n’ike.

Josef Smith nọ ebe dị anya karịrị maịlụ 800 site na Kirtland, ma ozi nke were ọtụtụ izu ụka irute ya. Mana Onyenwe anyị maara ihe na-eme, ma O kpughewo nye Onye amụma Ya ụkpụrụ niile nke udo na mgbam ume nke ga-akasị ndị nsọ obi—ụkpụrụ ndị nwekwara ike inyere anyị aka mgbe anyị na-ezute mkpagbu, mgbe ọchịchọ ezi omume anyị emejuputaghị, ma ọ bụ mgbe anyị chọrọ ihe ncheta na mkpagbu anyị kwa ụbọchị n’ikpeazụ n’ụzọ dị ańaa “na-agakọta ọnụ maka ọdịmma [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:3).

Lee Ndị Nsọ, 1:171–93; “Na-echere maka Okwu nke Onyenwe anyị,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 196–201.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:1–3, 11–14, 22; 101:1–16, 22–31, 36

akara ngosi semịnarị
Mnwale m niile nwere ike ịgakọta ọnụ maka ọdịmma m.

Ụfọdụ niime aka mgba anyị na ndụ bụ nke nhọrọ anyị kpatara. Ndị nke ọzọ ka nhọrọ ndị ọzọ kpatara. Ma mgbe ụfọdụ ụmụ ihe na-eme nke bụ akụkụ ndụ anụ ahụ. Agbanyeghị ihe kpatara ya, ahụhụ nwere ike nye aka mezuo nzube sinachi dị ka anyị na-echigharị nebe Chineke nọ.

Nke a bụ eziokwu maka Ndị nsọ nọ na Missouri na 1833, ma ọ bụ kwa eziokwu maka anyị taa. Dị ka ị na-agụ ihe Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98 na 101, tụgharịa uche otu ozi Ya si metụta mnwale niile ma ọ bụ ihe isi ike niile i nwere ike inwe. Ndị a bụ ụfọdụ ajụjụ na akụrụngwa iji nyere gị aka.

Ọ bụrụ na mnwale bụ niihi nke:

  • Nhọrọ niile nke Onwe: Kedụ ndụmọdụ—na nkwa ndị—ị na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:11–12; 101:1–9? Kedụ ihe ị na-amụta site na amaokwu ndị a banyere Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraist? Gịnị ka i chere Chineke ga-achọ ka i mee?

  • Nhọrọ niile nke ndị ọzọ: Kedụ nkasị obi i na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:1–3, 22; 101:10–16, 22? Kedụ otu Onyenwe anyị si na-achọ anyị ịzaghachi mmetọ, mmegbu, ma ọ bụ ọgba aghara? (Lee Life Help, “Abuse,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Abuse,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.) Gịnị ka amaokwu ndị a na-akuzi banyere otu i si etinye ntụkwasị obi gị na Onyenwe anyị?

  • Ihe isi ike niile nke ndụ anụ ahụ: Kedụ nhụnuuche obi i na-enwete niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:1–3; 101:22–31, 36? Kedụ ihe ị na-amụta site na mnwale gị niile? Kedụ ihe ị na-eme iji kpọkuo enyem aka nke Chineke? Kedụ otu O si na-enyere gị aka?

Ịmụtakwu banyere otu Chineke nwere ike isi mee “ihe niile ebe e siworo na-akpagbu gị … na-agakọ maka ọdịmma gị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:3), tulee ịmụ ozi nke Okenye Anthony D. Perkins “Cheta Ntaram ahụhụ Ndị nsọ Gị, O Chineke Anyị” (Liahona, Nov. 2021, 103–5). I nwere ike chọọ maka otu edereede niime ozi ya nke na-enyere gị aka ghọta otu Onye Nzọpụta si na-akpọku gị ịhụta aka mgba gị niile. Kedụ ụzọ ndị mnwale gị niile gakọtaworo ọnụ maka ọdịmma gị ma ọ bụ mepụtawo nzube niile nke Chineke?

Lee kwa Ndị Rom 8:28; 2 Nifaị 2:2; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 90:24; D. Todd Christofferson, “Bịa na Zayọn,” Liahona, Nov. 2008, 37–40; “Mnwale nke Mkpagbu,” “Inwete Mmetụta Ịhụnaanya nke Onyenwe anyị na Ịdị mma niime Mnwale niile,” “Ọkụ nke Onye Nńụcha” (vidiyo niile), ChurchofJesusChrist.org.

2:3

Trial of Adversity

Katie, who was paralyzed in an auto accident, shares how she exercises her faith to embrace her new life.

4:17

Feeling the Lord's Love and Goodness in Trials

When Darlyn learned of her illness, she feared she would not see her children grow up. But through her trial, she felt the Lord’s love and immense goodness. How does He comfort you in times of trial?

5:2

The Refiner's Fire

The refiner’s fire is not a comfortable place to be. It involves intense heat and repeated hammering. But it is in the refiner’s fire we are purified and prepared to meet God.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:23–48

Onyenwe anyị chọrọ ka m chọọ udo n’ụzọ Ya.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraist kwesịrị ihiwe ọmụmaatụ ahụ nke ụwa niile ga-eso. Ana m arịọ unu ka unu mee ihe niile unu nwere ike ime iji kwụsị esemokwu ndị nke na-ere oke ọkụ n’obi unu na niime ndụ unu ugbu a (“Ike Mgbasị ike Ime Mmụọ,” Liahona, Me 2022, 97).

Ebe ọbụghị ihe niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:23–48 ga-emetụta mmekọrịta nke onwe gị na ndị ọzọ, kedụ ụkpụrụ ndị ị na-achọta nwere ike idu gị ịkwụsị esemokwu nke onwe niime ndụ gị? I nwere ike chọta eziokwu ndị agbakwunyere n’egwu banyere udo ma ọ bụ mgbaghara, dị ka “Eziokwu Na-achapụta n’Uche Anyị” (Abụ, no. 273).

nteji nke Jizọs Kraịst

Uju sitere na Kraịst na Onye ọchịchị Nta Bara ụbasite n’aka Heinrich Hofmann

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 99–100

Onyenwe anyị na-elekọta ndị na-ejere Ya ozi.

Mkpughe ndị dị niime nkeji 99 na 100 ka enyere ndị mmadụ ndị nwere ọrụ Nzukọ nsọ dị mkpa mana nwekwara nchegbu banyere ndị ezi na ụlọ ha. Gịnị ka ị na-achọta nime mkpughe ndị a nke gaara enyere ha aka? Kedụ ozi ndị Onyenwe anyị nwere maka gị niime mkpughe ndị a?

Lee kwa “Mgbasa ozi nke John Murdock na Missouri” niime “‘A Hapụwo M Azụm ahịa Ndị ọzọ’: Ndị Mgbasa ozi ọma Isimbụ” na “Otu Mgbasa ozi gaa Canada,” niime Mkpughe ndị dị n’ụdị, 87–89, 202–7.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:43–65

Isoro ndụmọdụ nke Chineke na-enyere m aka nwee nchekwa.

Nkọnilu dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:43–62 kọwara ihe mere Onyenwe anyị si kwere ka achụpụ Ndị nsọ site na Zayọn. Dị ka ị na-agụ amaokwu ndị a, enwere ụzọ ndị i na-ahụta otu i si dịrị ka ụmụ odibo niime nkọnilu ahụ? Kedụ otu i si egosi Chineke na ị “dị njikere ka e duo gị n’ụzọ ziri ezi na nke kwesịrị ekwesị maka nzọpụta [gị]”? (lee amaokw nke 63-–65).

Mee ejije nke nkọwapụta niile ma ọ bụ nkọnilu niile. Mgbe ụfọdụ ọ na-adịkarịsị mfe ịmụ ihe site na ma mata otu akụkọ niile na nkọnilu niile dị niime akwụkwọ nsọ si gbasa anyị mgbe anyị tinyere onwe anyị n’ọnọdụ nke ndị ahụ ha na-akọwa. Ọ bụrụ na ị na-akuzi Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:43–62, i nwere ike kpọkuo ndị na-amụ ihe ime ejije nkọnilu ahụ dị ka otu onye na-agụpụta ya n’olu dara ụda. Kedụ nghọta ndị ị na-enwete site na-itinye omume niile nime mkpụrụokwu ndị ahụ?

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 93:1-3

Jizọs Kraịst nwere ike ịtụgharị mnwale m niile ịghọ ngọzi.

  • I nwere ike bido mkparịta ụka site na-ịjụ ụmụ gị banyere ụfọdụ aka mgba ndị ụmụntakịrị ọgbọ ha na-ezute. Unu nweziri ike gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 98:1–3 ọnụ ma kwuo banyere otu Jizọs Kraịst nwere ike i si tụgharịa mnwale niile ịghọ ngọzi. I nwere ike kesaara ụmụ gị ọmụmaatụ niile otu O siworo tụgharịa mnwale gị niile ịghọ ngọzi.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:39–40

Onye Nzọpụta na-enyere m aka ịgbaghara.

Hụba ama: Dị ka ị na-akuziri ụmụ gị ịdị mkpa nke mgbaghara, lezie anya hụ na ha ghọtakwara na ọ bụrụ ma mmadụ mejọọ ha, ha kwesịrị mgbe niile ịgwa dimkpa ha tụkwasịrị obi.

  • Isi nke 34 na 35 niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile (128–34) nwere ike inyere gị aka kuzie banyere otu esi kpasị Ndị nsọ agwa na Missouri na 1833. Gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere otu o siworo metụta Ndị nsọ ndị a. Emesịa unu nwere ike gụkọọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 98:23, 39–40 iji chọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka ha mee. Gị na ụmụ gị nwere ike kwuo maka oge niile i kwesịrị ịgbaghara mmadụ na otu Onye Nzọpụta siri nyere gị aka.

  • I nwekwara ike gosi ụmụ gị foto ndị nke ihu nwere obi ụtọ na ihu obi na-ajọ njọ. Kwuo maka ọnọdụ niile nke mmadụ na-enweghị obi ọma, ma rọpụta ụzọ ndị eji azaghachi. Nyere ụmụ gị aka họrọ ma nzaghachi nke ọbụla ọ ga-eme ha obi ụtọ ma ọ bụ obi ọjọọ site na-ịrụtụ aka na ihu nke kwekọrịtara. Gịnị mere Jizọs si na-achọ ka anyị gbaghara ndị mmadụ, ọbụna ndị ahụ ndị na-anaghị eme anyị ihe dị mma?

2:42

Chapter 34: God Warns the People of Zion: July–August 1833

2:10

Chapter 35: The Saints Leave Jackson County, Missouri: September–December 1833

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:16, 23–32

Jizọs Kraịst nwere ike iwetere m udo.

  • Mgbe unu gụchara Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:16, nyere ụmụ gị aka mata mmetụta ndị juputara n’udo nke na-abịa mgbe anyị deere duu ma na-eche banyere Jizọs—na-ịmaatụ, mgbe anyị na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-eri oriri nsọ. Unu nwekwara ike gụkọta otu egwu banyere nkwanye ugwu ọnụ, dị ka “Na nsọpụrụ, Nịdị Jụụ” ma ọ bụ “Iche banyere Jizọs” (Akwụkwọ ukwe Ụmụntakịrị, 26, 71). Kedụ otu anyị nwere ike i si enwe mmetụta udo Ya n’ebe obibi anyị?

  • Ụmụ gị nwere ike nwee mmasị na-ịmụ ihe banyere ihe ndụ ga-adị ka ya mgbe Jizọs Kraịst ga-abịa ọzọ. Gụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 101:23–32 ọnụ, ma kwuo okwu banyere ihe ndị ha chọtara niime amaokwu ndị a nke ga-ewetere anyị ọńụ mgbe Ọ ga-abịa. Gịnị mere o ji na-enye aka ịmara banyere ihe ndị a mgbe anyị na-agabiga oge siri ike?

Jizọs Kraịst na-amakụ otu nwa ntakịrị

Jizọs Kraịst ga-ewete udo na ọńụ mgbe Ọ ga-abịa ọzọ.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

otite agba nke igwe ndị na-eme ọgbaaghara na-akpagbu Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu isimbụ

Missouri Na-agba ọkụ, site n’aka Glen S. Hopkinson

peeji ihe omume maka ụmụntakịrị