Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
3. Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja


“3. Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“3. Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

ezi na ụlọ na-aga ije n’akụkụ tempụl

3.

3. Ụkpụrụ niile nke Ọkwa nchụaja

3.0

Ndubata

Ọkwa nchụaja bụ ikike na ike nke Chineke. Site na ọkwa nchụaja, Nna nke Eluigwe na-emetazu ọrụ Ya “iwete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Mozis 1:39). Chineke na-enye ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị ikike na ike n’elu ụwa iji nye aka rụọ ọrụ nke a (lee isi nke 1).

3.2

Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja

Site na ọgbụgba ndụ na emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja, Chineke na-eme ka ngọzi ndị dị ukwuu dị adị nye ụmụ Ya niile. Ngọzi ndị a gụnyere:

  • Baptizim na Emume Nnabata niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

  • Onyinye nke Mmụọ Nsọ.

  • I na-eri oriri nsọ.

  • Ikike na ike iji jee ozi n’ọkpụkpọ okù na ọrụ niile nke Nzukọ nsọ.

  • Ịnata ngọzi niile nke onye petrak na ngọzi ọkwa nchụaja ndị ọzọ nke ọgwụgwọ, nkasị obi, na nduzi.

  • Ịbụ onye nataworo onyinye dị nsọ ya na ike nke Chineke niime tempụl.

  • Ịrachinyere ndị otù ezi na ụlọ nke onye maka mgbe ebighị ebi.

  • Nkwa ndụ ebighị ebi.

3.3

Ọkwa nchụaja Melkizedek na Ọkwa nchụaja nke Erọn

Na Nzukọ nsọ, ọkwa nchụaja nwere akụkụ abụọ: Ọkwa nchụaja Melkizedek na Ọkwa nchụaja nke Erọn (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 107:1).

3.3.1

Ọkwa Nchụaja Melkizedek

Ọkwa nchụaja Melkizedek bụ “Ọkwa nchụaja Dị nsọ, nke si n’usoro Ọkpara Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:3). Ọ bụ ike nke site na ya ụmụ ndị nwoke na ụmụada nke Chineke nwere ike ịdịrị ka Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19-21; 132:19-20).

Site na ikike nke a, ndị ndu Nzukọ nsọ na-enye ntuzi aka ma na-elekọta ọrụ nke ime mmụọ niile nke Nzukọ nsọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:18).

Onyeisi stek bụ onye nchụaja dị elu na-eduzi niime stek ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:8, 10; lee kwa isi nke 6 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a). Bishọp bụ onye nchụaja dị elu na-eduzi niime ngalaba ukwu ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:17; leekwa isi nke 7 niime Akwụkwọ Ntuziaka nke a).

Maka ozi banyere ụlọ ọrụ niile na oke na ọrụ niile nke Ọkwa Nchụaja Melkizedek, lee 8.1.

3.3.2

Ọkwa Nchụaja nke Erọn

Ọkwa nchụaja nke Erọn bụ “ihe agbakwunyere nye … ọkwa Nchụaja Melkizedek” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:14). Ọ gụnyere ọtụghe niile nke:

  • Ije ozi nlekọta nke ndị mmụọ ozi.

  • Ozi ọma nke nchegharị.

  • Ije ozi n’emume nsọ ndị a na-ahụ anya, tinyere baptizim maka mgbaghara mmehie niile.

(Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 13:1; 84:26-27; 107:20.)

Bishọp bụ onyeisi Ọkwa nchụ aja nke Erọn niime ngalaba ukwu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:15).

Maka ozi banyere ụlọ ọrụ niile na oke na ọrụ niile nke Ọkwa Nchụaja nke Erọn, lee 10.1.3.

3.4

Ikike nke Ọkwa nchụaja

Ikike nke Ọkwa nchụaja bụ ikikere nke ịnọchite anya Chineke ma mee ihe n’aha Ya. Niime Nzukọ nsọ, ikike ọkwa nchụaja niile ka a na-etinye n’ọrụ n’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja.

3.4.1

Ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike nke iji duzie otu esi etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ n’aha ụmụ Chineke.

3.4.1.1

Ndị Ahụ Ji Ọtụghe Ọkwa nchụaja niile

Onyenwe anyị enyefewo n’isi Ndị Ozi Ya ọbụla ọtụghe niile nke gbasara alaeze Chineke n’elu ụwa. Onyeisi Ndị ozi, Onyeisi Nzukọ nsọ, bụ naanị onye nọ n’ụwa nwere ikike itinye ọtụghe ọkwa nchụaja niile n’ọrụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 81:1–2; 107:64-67; 91-92; 132:7).

N’okpuru ntuziaka nke Onyeisi Nzukọ nsọ, ndị ndu ọkwa nchụaja ka a na-enye ọtụghe niile ka ha nwee ike duzie na ngalaba niile nke ọrụ ha. Ndị ndu ndịa gụnyere:

  • Ndịisi stek na distrikt.

  • Ndị Bishọp na ndịisi ngalaba nta.

  • Ndịisi kworum Ọkwa Nchụaja Melkịzedek na nke Erọn.

  • Ndịisi tempụl.

  • Ndịisi mishọn na ndịisi ogige ọzụzụ ndị mgbasa ozi ọma.

Ndị ndu ndị a na-anata ọtụghe ọkwa nchụaja niile mgbe edopụrụ ha iche n’ọkpụkpọ okù ha.

Ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ka na-anaghị enye ndị ọzọ, tinyere ndị ndụmọdụ nye ndị ndu ọkwa nchụaja nọ n’obodo ma ọ bụ ndịisi otù Nzukọ nsọ. Ndịisi otu Nzukọ nsọ na-eduzi n’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja (lee 4.2.4).

3.4.1.2

Usoro nye Ọrụ nke Onyenwe anyị

Ọtụghe Ọkwa nchụaja niile na-ahụ na ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu ka emetazuru n’usoro dị mma (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 42:11; 132:8). Ndị ahụ ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja na-eduzi ọrụ nke Onyenwe anyị na mpaghara niile nke oke na ọrụ ha. Onye nduzi nke a ji ikike dị irè naanị maka ọrụ niile nke enyere onye ndu ahụ n’ọkpụkpọ oku ya. Mgbe atọghapụrụ ndị ndu ọkwa nchụaja site n’ọkpụkpọ okù ha, ha anaghịkwa eji ọtụghe ndị ahụ ọzọ.

3.4.2

Inyefe Ọkwa nchụaja na Ichi echichi

N’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ ji ọtụghe ọkwa nchụaja niile, Ọkwa Nchụ aja nke Erọn na Ọkwa Nchụaja Melkizedek ka a na-enyefe ndị otù Nzukọ nsọ ndị nwoke tozuru oke (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:14-17). Mgbe enyefesịrị ọkwa nchụaja kwesịrị ekwesị, onye ahụ ka a na-echi echichi nye n’ọkwa dị niime ọkwa nchụaja ahụ, dị ka dikọn ma ọ bụ okenye. Onye ji ọkwa nchụaja na-etinye ọkwa nchụaja n’ọrụ dị ka otu ike na ọrụ niile nke ọkwa ọrụ ahụ siri dị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:99).

Maka ozi ndị ọzọ banyere inyefe ọkwa nchụaja na ichi echichi, lee 8.1.1 na 18.10.

3.4.3

Nnyefe Ikike nke Ọkwa nchụaja iji Jee Ozi niime Nzukọ nsọ

3.4.3.1

Idopu iche

Mgbe edopuru iche ndị nwoke na ndị nwanyị n’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ ji ọtụghe ọkwa nchụaja niile, a na-enye ha ikike sitere n’aka Chineke iji rụọ ọrụ n’ọkpụkpọ okù ahụ. Mgbe atọghapụrụ ha site n’ọkpụkpọ okù, ha enweghịkwa ikike metụtara ya ọzọ.

Ndị otù Nzukọ nsọ niile ndị edopụrụ iche ije ozi ka enyere ikike na oke na ọrụ si n’igwe iji mee ihe n’ọkpụkpọ okù ha. Iji maatụ:

  • Otu nwanyị a kpọrọ ma dopụ iche site n’aka bishọp dị ka onyeisi Otù Enyemaka ngalaba ukwu ka enyere ikike iduzi ọrụ nke Otù Enyemaka na ngalaba ukwu ahụ.

Ndị niile a kpọrọ ma dopụ iche na-eje ozi n’okpuru ntuziaka nke ndị ahụ na-eduzi ha (lee 3.4.1.2).

3.4.3.2

Ọrụ e nyere

Ndị ndu Nzukọ nsọ na-eduzi nwere ike nyefee ikike site n’inye ọrụ. Mgbe ndị nwoke na ndị nwanyị natara ọrụ ndị a enyere, a na-enye ha ikike sitere na Chineke iji mee ihe. Iji maatụ:

  • Otù Ndịisi Mbụ na Kworum Ndị Ozi Iri na abụọ na-enyefe ikike na Ndị Iri Asaa ndị e kenyere ọrụ ilekọta mpaghara niile na iduzi na ọgbakọ stek niile.

  • Ikike ka a na-enyefe ndị otù Nzukọ nsọ iji jee ozi dị ka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta.

Ikike enyefere site n’inye ọrụ jedebere n’ọrụ ahụ a kpọrọ aha na oge akapụtara maka ọrụ ahụ enyere.

3.4.4

Itinye n’ọrụ Ikike Ọkwa nchụaja N’ezi Omume

Ikike nke a ka e nwere ike iji mee ihe naanị n’ezi omume (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 121:36). A na-etinye ya n’ọrụ site na nkwagide, ogologo ntachi obi, inwe obi ọma, ịdị nwayọọ, ịhụnaanya, na obi ebere (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:41-42).

Ndị ahụ na-etinye ikike ọkwa nchụaja n’ọrụ anaghị amanye uche ha na elu nke ndị ọzọ. Ha anaghị eji ya maka Ebumnoobi nke naanị onwe.

3.5

Ike nke Ọkwa nchụaja

Ike nke ọkwa nchụaja bụ ike ahụ nke Chineke si na ya na-agọzi ụmụ Ya. Ike ọkwa nchụaja nke Chineke na-erutere ndị otù Nzukọ nsọ niile—nwanyị na nwoke—dị ka ha na-edebe ọgbụgba ndụ niile ha na Ya meworo. Ndị otù na-eme ọgbụgba ndụ ndị a dị ka ha na-anata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja. (Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–20.)

Ngọzi niile nke ike ọkwa nchụaja nke ndị otù nwere ike ịnata gụnyere:

  • Nduzi maka ndụ ha.

  • Mkpali mmụọ iji mata otu esi ejere ndị otù ezi na ụlọ na ndị ọzọ ozi.

  • Ume iji nagide ma merie aka mgba niile.

  • Onyinye niile nke Mmụọ iji bulie ike ha.

  • Mkpughe iji mata otu esi emejupụta ọrụ echiri ha echichi maka ya, dopụ iche, ma ọ bụ ekenyere ime.

  • Enyemaka na ume iji bịa dịkarịa ka Jizọs Kraịst na Nna nke Eluigwe.

3.5.1

Ọgbụgba ndụ niile

Ọgbụgba ndụ bụ nkwa dị nsọ dị n’etiti Chineke na ụmụ Ya. Chineke na-enye ọnọdụ niile maka ọgbụgba ndụ ahụ, ma ụmụ Ya ekwere irube isi nye ọnọdụ ndị ahụ. Chineke na-ekwe nkwa ịgọzi ụmụ Ya dị ka ha na-emejupụta ọgbụgba ndụ ahụ.

Ndị niile nagidere ruo ọgwụgwụ n’idebe ọgbụgba ndụ ha ga-anata ndụ ebịghị ebi (lee 2 Nefi 31:17–20; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 14:7).

Ndị nne na nna, ndị ndu Nzukọ nsọ, na ndị ọzọ na-enyere ndị mmadụ aka kwadoo ime ọgbụgba ndụ dị ka ha na-anata emume nsọ niile nke ozi ọma. Ha na-ahụ na onye ahụ ghọtara ọgbụgba ndụ niile ọ ga-eme. Mgbe mmadụ mechara ọgbụgba ndụ, ha na-enyere ya aka debe ya. (Lee Mozaya 18:8–11, 23– 26.)

3.5.2

Emume nsọ niile

Emume nsọ bụ otu ihe omume dị nsọ e mere site n’ikike nke ọkwa nchụaja.

N’ọtụtụ emume nsọ, ndị mmadụ na-eme ọgbụgba ndụ ha na Chineke. Ọmụmaatụ niile gụnyere baptizim, oriri nsọ, onyinye dị nsọ, na emume nsọ nrachi alụm di na nwunye.

Emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu dị oke mkpa maka ndụ ebighị ebi. Maka ozi ndị ọzọ, lee 18.1.

3.6

Ọkwa nchụaja na Ebe obibi

Ndị otù Nzukọ nsọ niile ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ha---ụmụ nwanyị, ụmụ nwoke, na ụmụntakịrị---ka agọziri site n’ike ọkwa nchụaja nke Chineke n’ebe obibi ha iji gbaa onwe ha na ezi na ụlọ ha ume (lee 3.5). Ike nke a ga-enyere ndị otù aka n’ịrụ ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke niime ndụ nke onwe ha na ndị ezi na ụlọ (lee 2.2).

Ndị nwoke ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek nwere ike inye ndị otù ezi na ụlọ ngọzi niile nke ọkwa nchụaja iji wete ntuziaka, ọgwụgwọ, na nkasi obi. Mgbe ọ dị mkpa, ndị otù Nzukọ nsọ nwekwara ike chọọ ngọzi ndị a site n’aka ndị otù ezi na ụlọ ukwu, ụmụnne nwoke na-eje ozi nlekọta, ma ọ bụ ndị ndu Nzukọ nsọ nke obodo.