Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
7. Otù Bishọp


“7. Otù bishọp,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“7. Otù bishọp,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nwoke na-ekwu okwu n’ikpo okwu

7.

Otù Bishọp

7.1

Bishọp na ndị Ndụmọdụ Ya

Bishọp na-eji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja iji duo ọrụ nke Nzukọ nsọ na ngalaba ukwu (lee 3.4.1). Ya na ndị ndụmọdụ ya mejupụtara otù bishọp.

Bishọp nwere ọkpụrụkpụ oke na ọrụ ise:

  • Ọ bụ onyeisi nduzi nchụaja dị elu niime ngalaba ukwu ahụ.

  • Ọ bụ onyeisi Ọkwa nchụaja nke Erọn.

  • Ọ bụ ọka ikpe nke ọha.

  • Ọ na-ahazi ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu, tinyekwara nlekọta maka ndị nọ na mkpa.

  • Ọ na-elekọta ndekọihe niile, ego niile, na otu esi eji ụlọ ụka eme ihe.

Ọrụ nke bishọp kachasị bụ nye ndudugandu n’eto eto niime ngalaba ukwu (ụmụntakịrị, ndị ntoroọbịa, na ndị dimkpa nta na-anọghị n’ọlụlụ). Iji nyere ya aka tinye uche n’ọrụ nke a, ọ na-enyepụ ọtụtụ ọrụ (lee 4.2.5).

7.1.1

Onye nduzi Nchụaja Dị elu

Bishọp bụ onyeisi ndu nke ime mmụọ nke ngalaba ukwu.

7.1.1.1

Otù niile nke Ngalaba ukwu na Kworum niile nke Ọkwa nchụaja

Bishọp nwere oke na ọrụ maka Otù Enyemaka na otu Ndịinyom Nta otù niile nke ngalaba ukwu. Ọ na-ekenye ndị ndụmọdụ ya ọrụ maka otù ụlọ akwụkwọ Sọnde na Praịmarị na atụmatụ ngalaba ukwu ndị ọzọ.

Oke na ọrụ niile nke bishọp maka kworum niile nke Ọkwa Nchụaja nke Erọn ka edepụtara na 7.1.2. Oke na ọrụ ya niile maka kworum niile nke ndị okenye ka edepụtara na 8.3.1.

7.1.1.2

Emume nsọ niile na Ngọzi niile

Bishọp na-eduzi nchịkwa nke emume nsọ niile na ngọzi ndị a sotere dị na ngalaba ukwu:

  • Oriri nsọ

  • Inye aha na ịgọzi ụmụntakịrị

  • Baptizim na Emume Nnabata nke ụmụntakịrị nke ndekọihe gbara afọ 8 (maka ndị atọghatara atọghata, lee 31.2.3.2)

  • Inyefe Ọkwa nchụaja nke Erọn na echichi n’ọkwa ọrụ niile nke dikọn, onye nkuzi, na onye nchụaja

7.1.1.3

Kansụl niile na Nzukọ niile

Bishọp na-edu kansụl ngalaba ukwu na kansụl ndị ntoroọbịa na ngalaba ukwu (lee 29.2.5 na 29.2.6).

Otù bishọp na-atụ atụmatụ nzukọ oriri nsọ na nzukọ ngalaba ukwu ndị ọzọ edepụtara na isi nke 29.

7.1.1.4

Ọkpụkpọ okù niile na Ntọghapụ niile

Oke na ọrụ niile nke bishọp niile maka ọkpụkpọ okù na ntọghapụ niile ka edepụtara na isi nke 30.

7.1.2

Onyeisi Ọkwa nchụaja nke Erọn

Bishọp nwere oke na ọrụ ndị na-esote dị ka onyeisi Ọkwa nchụaja nke Erọn niime ngalaba ukwu. Ndị ndụmọdụ ya na-enyere ya aka.

  • Na-akwado ndị nne na nna n’ikuziri ndị ntoroọbịa ihe.

  • Na-elekọta kworum niile nke Ọkwa Nchụaja Erọn na Klaasị niile nke Ndịiyom Nta. Bishọp bụ onyeisi kworum ndị nchụaja (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:87–87). Onye ndụmọdụ ya nke mbụ nwere oke na ọrụ maka kworum ndị nkuzi. Onye ndụmọdụ ya nke abụọ nwere oke na ọrụ maka kworum ndị dikọn.

  • Dụọ ndụmọdụ ya na onyeisi Ndịinyom Nta ngalaba ukwu.

  • Zukọọ mgbe niile ya na onye ntoroọbịa ọbụla.

7.1.3

Ọka ikpe Ọha

Bishọp bụ ọka ikpe ọha niime ngalaba ukwu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ 107:71–71). O nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Inyere ndị ntoroọbịa na ndị dimkpa aka itoozu maka ma tozuo oke inwe rekọmend tempụl.

  • Duo ịgba ajụjụ ọnụ niile dị ka ededatara na 31.2.

  • Zukọọ ya na ndị otù ngalaba ukwu ndị chọrọ nduzi nke ime mmụọ, ndị nwere nsogbu nke onwe ndị dị arọ, ma ọ bụ ndị meworo ajọọ mmehie, na-enyere ha aka dọrọ site n’ike ọgwụgwọ nke Jizọs Kraịst.

  • N’okpuru ntuziaka nke onyeisi stek, na-eme kansụl niile nke ịbụ onye otù dị ka ọ dị mkpa. Maka ntuziaka niile, lee isi nke 32.

7.1.4

Nhazi Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

Bishọp na-ahazi ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu niime ngalaba ukwu ahụ (lee isi nke 1). Ndị ndụmọdụ ya na ndị ndu ndị ọzọ nke ngalaba ukwu na-enyere ya aka.

7.1.4.1

Na-edu Mgbalị niile iji Lekọta maka Ndị Ahụ nwere Mkpa Nke Anụ ahụ

Maka ozi nndị ọzọ banyere otu bishọp si eme nlekọta maka ndị ahụ nọ na mkpa, lee 22.6.1.

7.1.5

Ndekọihe niile, Ego niile, na Ụlọ ụka

Maka ozi banyere ndekọihe niile, lee isi nke 33. Maka ozi banyere ego niile, tinyere ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri, lee isi nke 34. Maka ozi banyere ụlọ ụka niile, lee isi nke 35.

7.3

Onyeisi Odeeakwụkwọ Ngalaba ukwu na Ndị inyeaka Odeeakwụkwọ Ngalaba ukwu

Otu bishọp na-atụ arọ maka onye ji Ọkwa Nchụaja Melkizedek ije ozi dị ka onyeisi odeeakwụkwọ ngalaba ukwu.

O nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Izute ya na otù bishọp ma kwadoo ajenda dị ka enyere n’ọrụ.

  • Jee ozi dị ka onye otù kansụl nke ngalaba ukwu ma gaa nzukọ niile nke kansụl ngalaba ukwu.

  • Hazie oge nzute niile maka otù bishọp.

7.4

Klak Ngalaba ukwu na Ndị inyeaka Klak Ngalaba ukwu

Oke na ọrụ niile nke klak ngalaba ukwu na ndị inyeaka klak ngalaba ukwu ka edepụtara niime 33.4.2.

Bipụta