Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
4. Odudu na Kansụl niile dị niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst


“4. Odudu na Kansụl niile dị na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023)

“4. Odudu na Kansụl niile dị niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
nzukọ kansụl ngalaba ukwu

4.

Odudu na Kansụl niile dị na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst

4.0

Ndubata

Dị ka onye ndu na Nzukọ nsọ ahụ, akpọwo gị site na mkpatemmụọ sitere n’aka ụmụ odibo nke Onyenwe anyị enyere ikike. I nwere ohere nke inye aka n’ọrụ nke Nna nke Eluigwe nke “[i]wete na mmezu anwụghị anwụ na ndụ ebighị ebi nke mmadụ” (Mozis 1:39).

4.2

Ụkpụrụ niile nke odudu niime Nzukọ nsọ

N’oge ije ozi Ya n’elu ụwa, Onye Nzọpụta hiwere ọmụmaatụ nke odudu maka Nzukọ nsọ Ya. Isi Ebumnoobi Ya bụ ime uche nke Nna Ya nke Eluigwe na inyere ndị ọzọ aka ghọta ma bie ndụ ozi ọma Ya (lee Jọn 5:30; Mozaya 15:7).

Chọọ nduzi nke Onyenwe anyị iji nyere gị aka mụta ma mejupụta ọrụ niile nke ọkpụkpọ okù gị.

4.2.1

Kwadoo niime Mmụọ

Jizọs kwadoro onwe Ya niime mmụọ maka ije ozi Ya n’elu ụwa (lee Luk 4:1-2). Gị nwakwa kwadoo niime mmụọ site na-ịbịaru Nna nke Eluigwe nso site n’ekpere, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, na nrube isi nye iwu nsọ Ya niile.

Chọọ mkpughe iji ghọta mkpa niile nke ndị ahụ ị na-edu na otu isi emejupụta ọrụ nke Chineke kpọworo gị ịrụ.

Onyenwe anyị ekwewokwa nkwa inye onyinye niile nke ime mmụọ n’isi ndị ahụ na-achọ ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 46:8).

4.2.2

Na-eIekọta Ụmụ Chineke niile

Hụ ndị i na-ejere ozi naanya dị ka otu Jizọs si mee. Kpee ekpere “jiri ume niile nke obi” iji jupụta n’ịhụnaanya Ya (Moronaị 7:48).

Nyere ndị mmadụ aka mee ka mgbanwe ha mie emie ma gbaa okwukwe ha niime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume. Nyere ha aka kwadoo ime ọgbụgba ndụ niile dị ka ha na-anata emume nsọ ha nke na-esote. Gbaa ha ume idebe ọgbụgba ndụ niile ha meworo ma keta oke ngọzi niile nke nchegharị.

4.2.3

Kuzie Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

Ndị ndu niile bụ ndị nkuzi. Gbalịa isoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta dị ka onye nkuzi (lee isi nke 17; Ikuzi ihe N’ụzọ nke Onye Nzọpụta). Site n’okwu na omume gị niile, kuzie ozizi nke Jizọs Kraịst na ụkpụrụ niile nke ozi ọma Ya (lee 3 Nefi 11:32–33; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:12–14).

Kuzie ihe site n’akwụkwọ nsọ na n’okwu niile nke ndị amụma ụbọchi ikpeazụ a (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 52:9).

Ọ bụrụ na akpọwo gị ma ọ bụ nye gị ọrụ iduzi na ọgbakọ ma ọ bụ ihe omume nke Nzukọ nsọ, hụ na nkuzi na-ewuli elu ma ozizi a bụrụ ihe ziri ezi (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 50:21–23).

4.2.4

Duzie N’ezi omume

Onye ọrụ nduzi ọbụla na-eje ozi n’okpuru ntuziaka nke onye ji ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja (lee 3.4.1). Ndokọ nke a na-ewete usoro na oke na ọrụ niile doro anya na ịnye nkọwa n’ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị.

Onyeisi nduzi nwere ike nyefee onye ọzọ ọrụ nke oge nta ije mee nduzi.

Onye ndu nke na-eduzi n’otu otu Nzukọ nsọ, nzukọ ma ọ bụ ihe omume na-ahụ na emejupụtara Ebumnoobi niile nke Onyenwe anyị. Site na-ime nke a, onye ndu ahụ na-esoro ụkpụrụ niile nke ozi ọma, atụmatụ niile nke Nzukọ nsọ, na ntuziaka nke Mmụọ Nsọ.

Ọkpụkpọ okù ma ọ bụ ọrụ enyere iduzi anaghị eme onye nke na-anata ya adị mkpa karịa ma ọ bụ baa uru karịa ndị ọzọ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:109–10).

O kwesịghị ekwesị mmadụ ịnwe masị ị bụ onye nduzi niime otù ọbụla dị na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–37).

4.2.5

Nyepụ Ọrụ ma Hụ na Enyere Nkọwa

Onye Nzọpụta nyere ndị na-eso ụzọ Ya ọrụ na oke na ọrụ ndị bara uru (lee Luk 10:1). O nyekwara ha ohere inye nkọwapụta n’ọrụ nke e nyeworo ha ịrụ (lee Luk 9:10).

Dị ka onye ndu, i nwere ike ịnyere ndị ọzọ aka too etoo site n’inyefe ha ọrụ dị iche iche. Gbalịa ime ka ndị otù niile tinye aka n’ịrụ ọrụ nke Chineke.

Ime nnyefe ọrụ gakwa eme ka ije ozi gị dịkwuo irè. Chọọ nduzi nke Mmụọ banyere ihe a ga-enyefe ka I nwee ike lekwasị anya n’ihe ndị kachasị dị gị mkpa.

4.2.6

Kwadoo Ndị Ọzọ Ịbụ Ndị Ndu na Ndị Nkuzi

Mgbe ị na-atule onye nwere ike ije ozi n’ọkpụkpọ okù ma ọ bụ n’ọrụ Nzukọ nsọ niile, kpesie ekpere ike. Cheta na Onyenwe anyị ga-akwado ndị ahụ Ọ kpọrọ. Ihe kachasị dị mkpa bụ na ha dị njikere ije ozi, ga-achọ enyemaka nke Onyenwe anyị n’umeala, ma na-agba mbọ itozu oke.

4.2.7

Jiri Ebumnoobi Doro anya Tụọ atụmatụ Nzukọ niile, Ihe Ọmụmụ niile, na Ihe omume niile

Chọọ nduzi nke Mmụọ n’ịtụ atụmatụ nzukọ niile, ihe ọmụmụ niile, na ihe omume niile nwere Ebumnoobi doro anya. Ebumnoobi ndị a kwesịrị ịgba ndị mmadụ na nndị ezi na ụlọ ume, kpọta ha nso na Kraịst, ma nye aka rụzuo ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke (lee isi nke 1 na nke 2).

4.2.8

Inyochagharị Mbọ Gị niile

Nyocha mgbe niile oke na ọrụ gị niile na uto nke ime mmụọ gị dị ka onye ndu. Tuleekwa uto nke ndị ahụ ị na-edu.

Ihe ịga nke ọma gị dị ka onye ndu ka a na-atụkarị site na mkpebi gị n’inyere ụmụ Chineke aka bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. I nwere ike mata na obi dị Onyenwe anyị ụtọ na mgbalị gị niile dị ka ị na-enwete mmetụta na Mmụọ na-esi na gị na-arụ ọrụ.

4.3

Kansụl ndị dị na Nzukọ nsọ

Onyenwe anyị agwawo ndị ndu nke Nzukọ nsọ Ya ịdị na-adụkọrịta ndụmọdụ ọnụ n’ịrụ ọrụ Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41:2-3). Kansụl niile na-ewete ohere dị iche iche maka ndị otù kansụl ịnata mkpughe dị ka ha na-achọ ịghọta mkpa nke ụmụ Chineke ma tụọ atụmatụ otu esi ezute ha.

4.4

Ụkpụrụ niile nke Kansụl Dị ire

4.4.1

Ebumnoobi niile nke Kansụl

Kansụl niile na-enye nkwusi ike pụrụ iche n’inyere ndị otù aka nata emume nsọ niile ma debe ọgbụgba ndụ ndị so ha.

4.4.2

Ime Nkwado maka Nzukọ Kansụl niile

Otu Ndịisi niile na kansụl niile ka a tụrụ anya izukọ mgbe niile. Ndị ndu ndị a na-achọ nduzi nke Onyenwe anyị n’ịtụ atụmatụ nzukọ kansụl niile. Ha nakwa achọ ntụnye uche site n’aka ndị otù kansụl n’ikpebi ihe a ga-akpa maka ya.

Ndị ndu na-ekwe ka ndị otù kansụl mara n’ọdịnihu maka ihe ndị a ga-akpa nkata ha. Ndị otù kansụl na-akwado ikesa nghọta niile banyere okwu ndị ahụ.

4.4.3

Mkparịta ụka na Mkpebi niile

Mgbe a na-eme nzukọ kansụl, onye ndu (ma ọ bụ onye onye ndu nyere ọrụ) na-akọwa okwu a ga-atule. Mgbe ahụ onye ndu akwado ka enwee mkparịta ụka n’etiti ndị otú kansụl niile, na-ajụ ajụjụ ma na-achọ echiche niile.

Ndị otù na-ekesa ntụnye uche niile ma gee onye na ibe ya ntị na nkwanye ugwu. Dị ka ha na-achọ ịmara uche nke Onyenwe anyị, mmụọ nke mkpatemmụọ na ịdị n’otu nwere ike nwee mmeri.

Na kansụl nke gụnyere ndịinyom na ndịikom, onye ndu na-achọ nghọta na echiche site n’aka ha abụọ. Ndịinyom na ndịikom mgbe ụfọdụ na-enwe echiche dị iche nke na-ewete ntule achọrọ achọ.

Onye ndu na-edu mkparịta ụka nke kansụl ahụ. Kosiladị, o kwesịrị ige ntị karịa ikwu okwu.

Mgbe mkparịta ụka ahụ gasịrị, onye ndu nwere ike kpebie ihe a ga-eme ma ọ bụ bugharịa mkpebi ebe a na-achọ ozi na nduzi agbakwunyere.

4.4.4

Ịdị n’otu

Ndị otù kansụl na-achọ ịbụ otu n’ọchịchọ na Ebumnoobi ha na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst. Ha na-agba mbọ ịdị n’otu na mkparịta ụka na mkpebi ha.

4.4.5

Emereme na Inye nkọwapụta

Ndị otù kansụl na-arụ ọrụ ha ndị kachasị tupu na mgbe nzukọ kansụl gasịrị. Mgbe a na-eme nzukọ niile, ha na-achọ mkpatemmụọ n’ịtụpụta atụmatụ niile iji tinye mkpebi niile n’ọrụ. Onye ndu kansụl na-akpọku ndị otù imejupụta ọrụ niile metụtara atụmatụ ndị a.

Ndị otù kansụl na-enye repọọtụ maka ọrụ ndị enyere ha. Ọganiihu na-achọkarị ịge ntị nke ga-anọgide ma tinyere isochi azụ ọrụ ndị ọzọ.

4.4.6

Ke Nzuzo

Ndị ndu n’eji ezi uche mgbe ha na-ekesara ndị kansụl ozi nke gbasara mmadụ. Ha na-achọkarị mgbe niile ikike nke onye otù tupu ekwupụta ozi nke a.

Ndị otù kansụl ekwesịghị ikesa ozi nke mmadụ n’ezi kansụl ewezuga na ọ dị mkpa iji mejupụta otu ọrụ sitere n’aka onye ndu kansụl.

Ụfọdụ okwu dị oke mmetụta uche iwete n’ihu kansụl dum.

Bipụta