Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
8. Kworum Ndị Okenye


“8. Kworum Ndị Okenye,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“8. Kworum Ndị Okenye,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịikom na-ekwu okwu

8.

Kworum Ndị Okenye

8.1

Ebumnoobi na Otù

8.1.1

Ebumnoobi niile

Ndịikom tozuru oke gbara afọ 18 ma karịa nwere ike nata Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma e chie ha echichi ruo n’ọkwa ọrụ nke okenye. Nwoke echiri echichi ruo n’ọkwa ahụ na-abanye niime ọgbụgba ndụ dị nsọ iji nyere Chineke aka metazuo ọrụ Ya (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:33-44).

8.1.2

Ịbụ onye otù niime Kworum Ndị Okenye

Ngalaba ukwu ọbụla nwere kworum ndị okenye. Ọ gụnyere ụmụnne ndị nwoke ndị a sotere:

  • Ndị okenye niile dị niime ngalaba ukwu ahụ.

  • Ndị niile elereanya ịbụ okenye niime ngalaba ukwu ahụ (lee 8.4).

  • Ndịisi nchụaja niile dị niime ngalaba ukwu ahụ, ewezuga ndị ahụ nọ ugbua n’eje ozi n’otu ndịisi stek, na otu bishọp, nọ na kansụl dị elu, ma ọ bụ dị ka onye petrak.

Nwa okoroọbịa nwere ike malite ije nzukọ kworum ndị okenye niile mgbe ọ gbara afọ 18, ọbụna ọ bụrụ ma echibeghị ya echichi onye okenye. Mgbe ọ gbara afọ 19 ma ọ bụ mgbe o si n’ebe obibi na-apụ, dị ka ịga mahadum ma ọ bụ ije ozi mishọn, ekwesịrị ichi ya echichi onye okenye ọ bụrụ ma o tozuru oke.

Ndịikom luworo nwunye na-agbabeghị afọ 18 bụ ndị a na-eleanya ịbụ ndị okenye ma ha bụkwa ndị otù nke kworm ndị okenye.

8.2

Isonye n’Ọrụ nke Nzọpụta na Mbuli elu

8.2.1

Ibi ndụ Ozi ọma nke Jizọs Kraịst

8.2.1.2

Ọmụmụ Ozi ọma niime Nzukọ Kworum niile

Nzukọ niile ka a na-eme na Sọnde nke abụọ na nke anọ nke ọnwa ahụ. A na-emeru ha ruo nkeji 50. Otu ndịisi kworum ndị okenye na-atụ atụmatụ nzukọ ndị a. Otu onye otù nke otu ndịisi na-atụzi.

Nzukọ kworum niile na-elekwasị anya n’isiokwu ndị dị na otu okwu ma ọ bụ karịa sitere na ọgbakọ zuruọha kacha nsonso.

8.2.1.3

Ihe omume niile

Otu ndịisi kworum ndị okenye nwere ike tụọ atụmatụ ihe omume niile. Ọtụtụ ihe omume ka a na-eme n’oge ndị ọzọ na-abụghị na Sọnde ma ọ bụ mgbede Mọnde niile.

8.2.2

Ilekọta Ndị Ahụ nọ na Mkpa

8.2.2.1

Ije ozi Nlekọta

Ndị otù kworum ndị okenye na-anata ọrụ ije ozi nlekọta site n’aka otu ndịisi kworum. Maka ozi ndị ọzọ, lee isi nke 21.

8.2.2.2

Mkpa ndị Obere Oge

Ụmụnne nwoke na-eje ozi nlekọta na-achọ ịghọta ma gboo mkpa nke ndị ahụ ha na-ejere ozi. Ndị otù nwere ike mgbe ụfọdụ nwee mkpa enyemaka obere oge n’oge nrịanrịa, ọmụmụ nwa, ọnwụ, mfunarị ọrụ, na ọnọdụ ndị ọzọ.

Mgbe ọ dị mkpa, ụmụnne nwoke na-eje ozi nlekọta na-arịọ otu ndịisi kworum ndị okenye maka enyemaka.

8.2.2.3

Mkpa ndị Ogologo Oge na Ndabere N’onwe

Dị ka bishọp haziri, otu ndịisi kworum ndị okenye na otu ndịisi Otu Enyemaka na-enyere ndị otù aka na mkpa ndị nwere ogologo oge na ndabere n’onwe.

Onyeisi kworum ndị okenye, onyeisi Otu Enyemaka, ma ọ bụ onye ndu ọzọ na-enyere onye ahụ ma ọ bụ ezi na ụlọ aka mepụta Atụmatụ Ndabere N’onwe. Ụmụnne nwoke ma ọ bụ ụmụnne nwanyị na-eje ozi nlekọta nwekwara ike inye aka n’atụmatụ ahụ.

8.2.2.4

Mgbe onye otù Ngalaba Ukwu Nwụrụ

Mgbe onye otù ngalaba ukwu nwụrụ, otu ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyemaka na-enye nkasị obi na enyemaka. N’okpuru nduzi nke bishọp, ha nwere ike nye aka na olili ozu.

Maka ozi ndị ọzọ, lee 38.5.8.

8.2.3

Ịkpọku Ndị niile Ịnata Ozi ọma ahụ

Onyeisi kworum ndị okenye na-ekenye onye otù nke otù ndịisi inye aka duo n’ọrụ mgbasa ozi ọma ndị otù niime ngalaba ukwu ahụ. Ya na onye otù otu ndịisi Otu Enyemaka ekenyere ọrụ na-arụ ọrụ ịhazi mbọ ndị a.

Lee 23.5.1 na 23.5.3.

8.2.4

Ijikọta ndị Ezi na ụlọ ọnụ maka Ebighị ebi

Onyeisi kworum ndị okenye na-ekenye onye otù nke otu ndịisi ọrụ inye aka duo n’ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezi na ụlọ niime ngalaba ukwu ahụ. Ya na onye otù otu ndịisi Otu Enyemaka ekenyere ọrụ na-arụ ọrụ ịhazi mbọ ndị a.

Lee 25.2.2.

8.3

Ndị ndu Kworum Ndị Okenye

8.3.1

Otu Ndịisi Stek na Bishọp

Onyeisi kworum ndị okenye nọ nnọọ n’okpuru nduzi nke otu ndịisi stek. Ọ na-ezukọ mgbe niile ya na onye otù nke otu ndịisi ịnata ntuziaka ma nye nkọwa n’oke na ọrụ ya niile.

Onyeisi kworum ndị okenye nakwa anata nduzi site n’aka bishọp, onye bụ onyeisi nduzi niime ngalaba ukwu ahụ. Ha na-ezukọ mgbe niile.

8.3.2

Onye Kansụl Dị elu

Otu ndịisi stek n’ekenye onye kansụl dị elu ọrụ ịnọchite anya ha na kworum ndị okenye ọbụla. Oke na ọrụ ya niile ka edepụtara na 6.5.

8.3.3

Ndịisi Kworum Ndị Okenye

8.3.3.1

Ịkpọ Otù Ndịisi Kworum Ndị Okenye ọkpụkpọ okù

Mgbe ya na bishọp natasịrị ndụmọdụ, onyeisi stek na-akpọ onye okenye ma ọ bụ onyeisi nchụaja ije ozi dị ka onyeisi kworum ndị okenye.

Ọ bụrụ na ngalaba ahụ buru nnukwu ibu, onyeisi kworum ndị okenye na-arọpụta nye onyeisi stek otu okenye ma ọ bụ abụọ ma ọ bụ ndịisi nchụaja ije ozi dị ka ndị ndụmọdụ ya.

8.3.3.2

Oke na ọrụ niile

Onyeisi kworum ndị okenye nwere oke na ọrụ ndị a sotere. Ndị ndụmọdụ ya na-enyere ya aka.

  • Jee ozi na kansụl ngalaba ukwu.

  • Duo mbọ niile nke kworum ahụ iji sonye n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu (lee isi nke 1).

  • Hazie ma lekọta ije ozi nke ụmụnne nwoke na-eje ozi nlekọta.

  • N’okpuru nduzi nke bishọp, dụọ ndụmọdụ ya na ndị otù ngalaba ukwu toro eto.

  • Chịkọta mbọ niile nke kworum ndị okenye iji gbaa ndị dimkpa nta dị niime ngalaba ukwu ume, ma ndị na-anọghị n’ọlụlụ ma ndị lụworo nwunye.

  • Zukọọ ya na onye otù kworum ndị okenye ọbụla n’otu n’otu opekampe otu ugboro n’afọ.

  • Kuziere ndị otù kworum ọrụ ọkwa nchụaja ha (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:89). Nke a gụnyere ikuziri ha otu esi etinye ọkwa nchụaja ha n’ọrụ na-ime emume nsọ niile na ngọzi niile.

  • Lekọta ndekọihe niile nke kworum, repọọtụ niile, na ego niile (lee LCR.ChurchofJesusChrist.org).

8.3.3.3

Nzukọ nke Otu Ndịisi

Otu ndịisi kworum ndị okenye na odee akwụkwọ na-ezute ugboro ugboro. Onyeisi na-atụziaka na nzukọ ndị a. Onye kansụl dị elu enyere ọrụ nke kworum ahụ na-abịa kwa mgbe kwa mgbe.

Ajenda nwere ike gụnye ihe ndị a sotere:

  • Tụọ atụmatụ otu esi agba ndị otù kworum ume (tinyere ndị a na-eleanya ichi okenye) na ndị ezi na ụlọ ha.

  • Chịkọta ọrụ mgbasa ozi ọma na tempụl na agụgụala ezi na ụlọ.

  • Lebara ọrụ ndị sitere na nzukọ niile nke kansụl ngalaba ukwu anya.

  • Nyochaa ozi ndị sitere na-ịgba ajụjụ ọnụ nke ije ozi nlekọta.

  • Tụlee ụmụnne ndị nwoke ga-eje ozi n’ọkpụkpọ okù niile na ọrụ niile enyere.

  • Tụọ atụmatụ nzukọ niile na ihe omume niile nke kworum.

8.3.4

Odeakwụkwọ

Site na nkwado nke bishọp, onye otù nke ndịisi kworum ndị okenye nwere ike kpọọ onye otù kworum okù ịbụ odeakwụkwọ kworum ahụ.

8.4

Inyere Ndị a Na-Eleanya ichi Okenye aka Kwadoo Ịnata Ọkwa Nchụaja Melkizedek

Onye a na-eleanya ichi okenye bụ nwoke onye otu Nzukọ nsọ onye nke na-anatabeghị Ọkwa Nchụaja Melkizedek ma (1) ọ gbawo afọ 19 ma ọ bụ karịa ma ọ bụ (2) o rubeghị afọ 19 ma lụwo nwanyị.

Ịnyere ndị a na-eleanya ichi okenye aka kwadoo maka ịnata Ọkwa Nchụaja Melkizedek bụ otu niime ihe ndị kachasị mkpa nye otu ndịisi kworum ahụ.

Bipụta