Akwụkwọ ntụziaka niile na Ọkpụkpọ oku niile
33. Ndekọihe niile na Repọọtụ niile


“33. Ndekọihe niile na Repọọtụ niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe (2023).

“33. Ndekọihe niile na Repọọtụ niile,” Nhọrọ niile sitere na Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe

Foto, oyiyi
ndịikom na-ele anya na kọmputa

33.

Ndekọihe niile na Repọọtụ niile

33.0

Ndubata

Idebe ndekọihe adịwo mkpa na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị mgbe niile. N’ịmaatụ:

Adam debere “akwụkwọ nke ncheta” (Mozis 6:5).

Moronaị kuziri na aha ndị ahụ emere baptizim niime Nzukọ nsọ nke Kraịst ka edekọrọ ka “e wee nwee ike cheta ma zụọ ha site n’okwu ọma nke Chineke” (Moronaị 6:4).

Josef Smith nyere iwu na e kwesịrị ịkpọ onye ndekọihe niime ngalaba ukwu ọbụla iji “mee ndekọihe nke eziokwu n’ihu Onyenwe anyị” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 128:2).

33.1

Nnyocha Ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ

Ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ dị nsọ. Ozi ndị dị niime ha dị mmetụta uche ma ekwesịrị ichekwa ha. usoro ndekọihe Nzukọ nsọ na-enye ikike inwete ozi ịbụ onye otù nke dabeere n’ọkpụkpọ okù niile.

Ndekọihe niile nwere ike inyere ndị ndu aka:

  • Mata onye nwere mkpa nlekọta pụrụ iche.

  • Mata emume nsọ niile nke nzọpụta nke mmadụ nataworo ma ọ bụ nwere mkpa ya.

  • Chọta ebe ndị otù nọ.

Ụdị ndekọihe ndị a sotere ka a na-edebe na ngalaba niile nke Nzukọ nsọ:

  • Ndekọihe niile nke nsonye nke onye otù (lee 33.5)

  • Ndekọihe niile ịbụ onye otù (lee 33.6)

  • Ndekọihe niile nke agụgụala (lee 33.7)

  • Ndekọihe niile nke ego (lee isi nke 34)

33.2

Ntuziaka Izugbe maka ndị Klak

Ha kwesịrị inwe rekọmend tempụl dị ugbua.

Ndị klak na mkpachapụ anya na-esoro atụmatụ niile nke ugbua iji chekwaa ego niile nke Nzukọ nsọ ma hụ na ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ bụ nke eziokwu. Ndị klak ozugbo na-agwa onye ndu ọkwa nchụaja maka ihe ọbụla ndị na-adịghị mma. Ọ bụrụ ma ihe siri ike ọbụla malite n’idozi ihe ndị na-adịghị mma, ndị klak kwesịrị ịkpọtụrụ Ụlọ ọrụ Ndekọihe keNzuzo dị na isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ.

Ekwe ntị: 1-801-240-2053 ma ọ bụ 1-800-453-3860, mgbatị 2-2053

Toll free (GSD phone): 855-537-4357

Email: ConfidentialRecords@ChurchofJesusChrist.org

Oge ije ozi nke ndị klak kwesịrị izuru ha ịmụta ọrụ ha ma dekwaa nsochiụda n’ọrụ ha. N’ihi na ha abụghị ndị otù nke otu ndịisi stek ma ọ bụ otu bishọp, ọ dịghị mkpa na atọghapụrụ ha n’ọrụ mgbe ahazigharịrị otu ndịisi stek ma ọ bụ otu bishọp.

33.4

Ndekọihe niile na Repọọtụ niile nke Ngalaba ukwu

33.4.1

Otu Bishọp

Bishọp na-ejikwa ndebe ndekọihe nke ngalaba ukwu.

33.4.2

Klak Ngalaba ukwu

Ngalaba ukwu ọbụla kwesịrị inwe klak ngalaba ukwu tozuru etozu na-arụ ọrụ. A na-akwado ya site n’aka otù bishọp ma kpọọ ya okù ma dopụ ya iche site n’aka onye otù ndịisi stek ma ọ bụ onye kansụl dị elu enyere ọrụ. O kwesịrị iji Ọkwa nchụaja Melkizedek ma nwee rekọmend tempụl dị ugbua. Ọ bụ onye otù nke kansụl ngalaba ukwu. Ọ na-abịa nzukọ niile nke ngalaba ukwu dị ka egosipụtara na 29.2.

Klak ngalaba ukwu ka a na-enye iwu site n’aka otu bishọp na site n’aka ndị klak stek. Ndị enyemaka klak ngalaba ukwu ka enwere ike ịkpọ inye aka.

33.4.2.1

Oke na Ọrụ niile nke Idebe Ndekọihe

Klak ngalaba ukwu, ma ọ bụ onye enyemaka klak, nwere oke na ọrụ ndị a sotere:

  • Debe ndekọihe nke ọrụ niile enyere na mkpebi niile emere niime nzukọ odudu niile nke ngalaba ukwu.

  • Hụ na ndekọihe niile na repọọtụ niile bụ nke eziokwu na nke emere n’oge.

Klak ngalaba ukwu kwesịrị ịmara nke ọma ngwa niile nke Nzukọ nsọ maka idebe ndekọihe (lee 33.0). Ọ na-eji ngwa ndị a iji nyere ndị ndu aka mata:

  • Mkpa niile nke ndị otù na otu niile.

  • Ịdịadị nke akụrụngwa niile, tinyere ego niile.

Klak ngalaba ukwu niile na-agba ndị otù ume inye repọọtụ mmejọ ọbụla dị n’ozi ịbụ onye otù ha.

Ọrụ idebe ndekọihe ndị ọzọ nwere ike gụnye:

  • Ịhụ na edekọrọ emume nsọ niile nke ọma n’egbughị oge.

  • Ịkwadobe fọm Ndị Ọrụ akwadoro maka ọgbakọ ngalaba ukwu.

  • Idekọ ozi maka kansụl niile nke ịbụ onye otù nke ngalaba ukwu.

  • Ijigide ndekọihe niile nke ego (lee isi 34.2.2).

33.5

Repọọtụ niile nke Nsonye Onye otù

Repọọtụ niile nke nsonye onye otù na-enyere ndị ndu aka lekwasị anya na ọganiihu na mkpa niile nke ndị otù.

33.5.1

Ụdị Repọọtụ niile

33.5.1.1

Repọọtụ Ọbịbịa niile

Ọbịbịa na nzukọ oriri nsọ niile na nzukọ Sọnde niile nke ọkwa nchụaja na otu niile ka a na-edekọ ihe niile n’ikuku jiri LCR ma ọ bụ Ngwa niile nke Onye otù.

Nzukọ Oriri nsọ. Ọbịbịa na nzukọ oriri nsọ ka a na-ededata izu ụka ọbụla site n’aka klak ngalaba ukwu ma ọ bụ onye enyemaka klak ngalaba ukwu. Ha na-agụ ọnụọgụgụ bịara na nzukọ ahụ na mmadụ ma ọ bụ site n’ikuku, tinyekwara ndị ọbịa.

Kworum Sọnde na Nzukọ niile nke Otu. Ọbịbịa ka a na-edekọ izu ụka ọbụla site n’aka ndị odeeakwụkwọ na ndị na-enye ndụmọdụ nke kworum na otu. Ndị ndu ntoroọbịa nwekwara ike nye aka n’idekọ ọbịbịa. Ha na-agụ ọnụọgụgụ bịara na nzukọ ahụ na mmadụ ma ọ bụ site n’ikuku, tinyekwara ndị ọbịa. Ndị otù n’eje ozi niime Praịmarị ma ọ bụ dị ka onye ndu ndị ntoroọbịa dị niime ngalaba ukwu ka anakwa agụnye dị ka ndị bịara.

Klak ngalaba ukwu nwere ike dekọọ ọbịbịa n’aha nke otu ọbụla.

33.5.1.2

Repọọtụ niile nke Ajụjụ ọnụ Ije Ozi Nlekọta

Lee 21.3.

33.5.1.3

Repọọtụ Otu ụzọ N’ụzọ Anọ

Ọnụọgụgụ ọbụla dị niime repọọtụ gosipụtara mmadụ n’ezie onye nwere mkpa ndị pụrụ iche (lee Helaman 15:13).

Repọọtụ Otu ụzọ N’ụzọ Anọ nwere niime ya ozi ndị bara uru nwere ike iwetere ndị ndu nghọta niile dị ka ha na-achọ mkpatemmụọ banyere mbọ niile nke ije ozi nlekọta.

Ndị ndu stek na ngalaba ukwu n’arụtụ aka na Repọọtụ Otu ụzọ N’ụzọ Anọ mgbe niile iji nyochagharịa ọganiihu nke ndị mmadụ.

Ngalaba ukwu niile na-emezu ma nyefee otu Repọọtụ Otu ụzọ N’ụzọ Anọ n’aka isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ. Klak na-enyochagharị repọọtụ ya na bishọp ma nyefee ya tupu mgbe ọnwa gbara ụbọchị 15 nke ọnwa ahụ sotere ngwụcha nke otu ụzọ n’ụzọ anọ.

33.5.2

Ndepụta aha niile nke Ịbụ onye otù

Ngwa niile nke idebe ndekọihe nke Nzukọ nsọ na-ewetere ndị ndu ohere na ndepụta aha niile nke ịbụ onye otù. Ndepụta aha ndị a nwere ike nyere ndị ndu aka ịmata:

  • onye otù nke na-anatabeghị emume nsọ niile nke ruuru ha.

  • Onyeikom nta na onyeinyom nta nke tozuru ije ozi mishọn.

  • Ntoroọbịa nke na-enweghị rekọmend tempụl dị ugbua.

  • Ntoroọbịa nke ekwesịrị ịhaziri nzukọ ya na onye otù bishọp.

Ndị ndu kworum na otu kwesịrị inwe ohere na ndepụta aha niile nke ndị ahụ sonyere na kworum ma ọ bụ otu ha.

33.6

Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otù

Ndekọihe niile nke ịbụ onye otù gụnyere aha niile nke onye otù, ozi mkpọtụrụ, nkọwada emume nsọ niile, na ozi ndị ọzọ dị oke mkpa.

Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otù kwesịrị ka edebe ya na ngalaba ukwu ebe onye otù ahụ bi. Ngụpụ niile, nke na-ekwesịghị ịdị mgbe niile, chọrọ ka nkwado nke ndị bishọp na ndịisi stek sonye. Ịrịọ ngụpụ ọbụla, onyeisi stek na-eji LCR iji nyefee arịrịọ ahụ nye Ụlọ ọrụ nke Otu Ndịisi Mbụ.

Ọ dị oke mkpa ime ihe ndịa sotere ngwangwa:

  • Dekọọ ozi emume nsọ.

  • Bugharịa ndekọihe niile nke ndị otù ndị kwabara niime ma ọ bụ pụọ site na ngalaba ukwu.

  • Mepụta ndekọihe niile maka ndị otù ọhụrụ na ụmụ ọhụrụ nke ndị otù nne na nna.

  • Dedata ọnwụ nke onye otù.

  • Dedata ozi alụmdi na nwunye na nke ndị otu ezi na ụlọ.

Bishọp ma ọ bụ onyeisi stek na-ahụ na ndekọihe nke ịbụ onye otù nọ na ngalaba ukwu kwesịrị ekwesị tupu a gbaa onye otù ajụjụ ọnụ iji nata:

  • Ọkpụkpọ okù Nzukọ nsọ.

  • Rekọmend tempụl.

  • Ọkwa nchụaja Melkizedek ma ọ bụ ichi echichi n’ọkwa dị niime ọkwa nchụaja ahụ.

Ọ nakwa ahụ na ndekọihe agụnyeghị ihe ọbụla ndị a sotere:

  • Ihe nkọwa

  • Okwu banyere mgbochi nrachi ma ọ bụ emume nsọ

  • Mgbochi ịbụ onye otù n’okpuru iwu niile

Ọ dịghị ọnọdụ ọbụla enwere ike inye ma ọ bụ gosi onye ọbụla ndekọihe niile nke ịbụ onye otù karịa bishọp ma ọ bụ klak.

Ndị otù nwere ike lee ozi ịbụ onye otù nye onwe ha ma nye ụmụntakịrị ọbụla dabeere na ha bi n’ebe obibi na app Ngwa Onye otu Ha nwekwara ike rịọ maka kọpị ndị ebipụtara nke nchịkọta Emume nsọ niile nke Onwe site n’aka klak. Ọ bụrụ ma achọpụta mmejọ niile, klak na-ahụ na emeziri ha na ndekọihe niile nke ịbụ onye otù.

33.6.1

Aha ndị eji Eme ihe niime Ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ

Aha onye ahụ n’uju nke iwu kwadoro, dị ka akọwara site na iwu obodo ma ọ bụ omenaala, ka ekwesịrị iji eme ihe na ndekọihe niile nke ịbụ onye otù na asambodo emume nsọ niile.

33.6.2

Ndị otù Ndekọihe

Ndị a niile sotere bụ ndị otù ndekọihe ma ha kwesịrị inwe ndekọihe niile nke ịbụ onye otù:

  • Ndị ahụ meworo baptizim ma mee onye otù

  • Ndị ahụ gbara afọ 9 ndị agọziworo kama emebeghị baptizim

  • Ndị ahụ na-enweghị ihe ha nwere ike imeli n’ihi nkwarụ niile nke ọgụgụ isi, na-agbanyeghị afọ ole ha gbara.

  • Ụmụntakịrị a na-agọzighị n’erubeghị afọ 9 mgbe ọnọdụ abụọ ndị a metụtara:

    • Opekampe nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ nne nke ukwu ma ọ bụ nna nke ukwu bụ onye otù Nzukọ nsọ.

    • Ma nne ma nna nyere nkwado ka emepụta ndekọihe. (Ọ bụrụ ma nanị otu nne ma ọ bụ nna ka enyere ikike iwu ilekọta nwa ahụ, nkwado nke nne ma ọ bụ nna ahụ ezuwo.)

Onye gbara afọ 9 ma ọ bụ karịa onye nwere ndekọihe nke ịbụ onye otù mana emebeghị ya baptizim na Emume Nnabata abụghị onye otù ndekọihe. Kosiladị, ngalaba ukwu ahụ nke onye ahụ bi n’ejide ndekọihe nke ịbụ onye otù tutu ruo mgbe onye ahụ ga-agba afọ 18. N’oge ahụ, ọ bụrụ ma onye ahụ họrọ emeghị baptizim, bishọp na-akagbu ndekọihe nke ịbụ onye otù ahụ. Nkwado nke onyeisi stek ka achọrọ.

Adịghị akagbu ndekọihe niile maka ndị ahụ a na-emebeghị baptizim n’ihi nkwarụ ọgụgụ isi ọgwụla ma onye ahụ rịọrọ ma ọ bụ onye nlekọta iwu kwadoro, gụnyere nne ma ọ bụ nna.

33.6.3

Ndekọihe niile nke Ndị otù Ngalaba ukwu Ọhụrụ

Klak ngalaba ukwu ma ọ bụ onye enyemaka klak ngalaba ukwu na-akpọtụrụ ndị otù ngalaba ukwu ọhụrụ ngwangwa mgbe ndekọihe ha bịaruru iji nyochaa Nchịkọta Emume nsọ nke Onye ahụ maka ịdaba adaba.

33.6.6

Ndekọihe niile nke Ndị otù Na-eje Ozi ofe Ngalaba ukwu Ebe Ha Bi

33.6.6.2

Ndekọihe niile nke Ndị Mgbasa ozi ọma N’uju Oge

Lee 24.6.2.8.

33.6.13

Ndekọihe niile nke Ụmụntakịrị Nne na nna Gbara Alụkwaghịm

Ndekọihe niile nke ịbụ onye otù na-eji aha iwu kwadoro nke mmadụ, dị ka akọwara site n’aka iwu obodo ma ọ bụ omenaala. Nke a gụnyere ụmụntakịrị nke nne na nna gbara alụkwaghịm.

Ụmụntakịrị nne na nna gbara alụkwaghịm mgbe ụfọdụ na-aga nzukọ niile nke Nzukọ nsọ na ngalaba ukwu abụọ nke nne na nna. Ebe naanị otu ngalaba nwere ike idebe ma melite ndekọihe nke ịbụ onye otù nke nwa ahụ, ndekọihe onye otù si-ngalaba-ọzọ ka enwere ike imepụta na ngalaba ukwu nke ọzọ ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-aga. Nke a na-ekwe ka aha na ozi mkpọtụrụ nke nwa ahụ banye na ndepụta niile nke ngalaba ukwu na aha dị na klaasị.

Ụmụntakịrị nwere ndekọihe onye otù si-ngalaba-ọzọ nwere ike nata ọkpụkpọ okù na ngalaba ahụ.

33.6.15

Wepụga Mgbochi niile nọ na Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otù

Ọ bụrụ ma onye otù pụọ mgbe a ka nwere mgbochi ịbụ onye otù n’okpuru iwu ma ọ bụ nchegbu siri ike ọzọ ka na-eche, bishọp ma ọ bụ klak enyere ikike nwere ike tinye wepụga mgbochi n’elu ndekọihe nke ịbụ onye otù ahụ. Ọ na-eji LCR iji mee nke a.

Anaghị ebupu ndekọihe nwere mgbochi mbuga na ngalaba ọhụrụ tutu ruo mgbe onye ndu ọkwa nchụaja tinyere mgbochi ahụ nyere ikike ka ebupụ ya.

33.6.16

Ndekọihe niile sitere na faịlụ “Amaghị Adreesị”

E nwere ike chọta onye otù mgbe ndekọihe ya nọwororịị na “faịlụ amaghị adreesị” dị na isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ. N’ọnọdụ nke a, klak ngalaba ukwu na-arịọ maka ndekọihe ahụ jiri LCR.

33.6.17

Idekọ ihe na Idezi Ozi Emume nsọ

Lee isi nke 18.

33.6.19

Nnyocha niile nke Ndekọihe niile nke Ịbụ onye otù

Afọ ọbụla klak nke stek ma ọ bụ onye enyemaka klak nke stek na-ahụ na emere nnyocha niile nke ndekọihe nke ịbụ onye otù niime ngalaba ukwu ọbụla jiri LCR. Nnyocha niile kwesịrị ka emezuo ya na Jun 30 nke afọ ọbụla.

33.7

Ndekọihe nke Agụgụala niile

33.7.1

Agụgụala niile nke Ngalaba ukwu na nke Stek

Onyenwe anyị enyewo iwu na “agụgụala nke ihe niile dị mkpa” gbasara Nzukọ nsọ Ya ka a ga-edetu ma debe (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 69:3; leekwa amaokwu 5; Alma 37:2).

Ngalaba ọbụla dị niime Nzukọ nsọ ga-ede okwu niile dị mkpa gbasara ngalaba ahụ.

Idebe agụgụala bụ ọrụ ime mmụọ nke ga-agba okwukwe nke ndị dere ma gụọ ya ume.

Klak nke stek ma ọ bụ onye enyemaka klak nke stek na-akwado agụgụala nke stek. Otu bishọp na-eso otu ụdị ụzọ yiri ya maka ngalaba ukwu ahụ. Nkuzi niile dị adị na Agụgụala Kwa Afọ nke Stek, Distrikt, na Mishọn ChurchofJesusChrist.org.

33.8

Ịdị Nzuzo nke Ndekọihe niile

Ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ dị nzuzo, ma ha nọ na akwụkwọ ma ha dị na kọmpụta. Ndị a gụnyere:

  • Ndekọihe niile nke ịbụ onye otù.

  • Ndekọihe niile nke ego.

  • Nootu niile sitere na nzukọ niile.

  • Fọm niile na dọkumentị niile (gụnyere ndekọihe niile nke kansụl ịbụ onye otù).

Ndị ndu na-ahụ na ozi ekpokọtara site n’aka ndị otù ka:

  • Ebelatara ruo nihe Nzukọ nsọ na-achọ.

  • Eji mee ihe naanị maka Ebumnoobi ndị Nzukọ nsọ kwadoro.

  • Enyere naanị ndị ahụ enyere ikike iji ya eme ihe.

Ozi nke echekwara na kọmpụta ka a ga-edeberịrị na nchekwa ma chekwaa nke ọma (lee 33.9.1).

33.9

Njikwa Ndekọihe niile

33.9.1

Nchekwa

Ndekọihe niile, repọọtụ niile, na data nke Nzukọ nsọ kwesịrị ka echekwaa ha megide ohere, mgbanwe, mmebi, ma ọ bụ ngosi a na-enyeghị ikike. Ozi nke a kwesịrị ka edebe n’ebe nwere nchekwa.

Ngwaọrụ niile ma ọ bụ nchekwa niile nke Nzukọ nsọ nwe furu efu ma ọ bụ ezuru ezu kwesịrị ka enye repọọtụ ngwa ngwa na incidents.ChurchofJesusChrist.org. Ejizighị ozi Nzukọ nsọ kwesịkwara ka enye repọọtụ maka ya.

33.9.1.1

Aha njirimara niile na Okwuntughe niile

Ndịisi stek, ndị bishọp, na ndị ndu ndị ọzọ ekwesịghị ikesara ndị ndụmọdụ, ndị klak, ndịisi odeeakwụkwọ, na ndị ọzọ aha njirimara niile na okwuntughe niile nke Nzukọ nsọ ha.

33.9.1.3

Ọnọdụ Data Na-abụghị maka Ọha

Ọtụtụ mba enyewo iwu nchekwa data niile nke na-ahazi mmepụta nke data nke onwe. Nke a gụnyere ozi dị niime ndekọihe niile nke ịbụ onye otù na ndekọihe Nzukọ nsọ niile ndị ọzọ na-egosi ndị mmadụ. Ndị ndu nwere ajụjụ niile banyere ntinye iwu nchekwa data niile nye njikwa obodo nke ndekọihe niile nke Nzukọ nsọ nwere ike kpọtụrụ ụlọọrụ data na-abụghị maka ọha nke Nzukọ nsọ na DataPrivacyOfficer@ChurchofJesusChrist.org.

Bipụta