“Eprel 28–Me 4: ‘Iwu M iji Chịa Nzukọ nsọ M’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41–41,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41–41,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Eprel 28–Me 4: “Iwu M iji Chịa Nzukọ nsọ M”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41–44
Nzukọ nsọ tolitere ngwa ngwa na 1830 na 1831, kacha nke nkwobata nke ndị òtù ọhụrụ niime Kirtland, Ohio. Uto nke a mara oke mma ma na-agba Ndị nsọ ume, mana ọ wetekwara ụfọdụ aka mgba. Olee otu i si eme ka òtù ndị kwere ekwe na-amụba ọsọ ọsọ dịrị n’otu? Kpọmkwem, kedụ ihe ị na-eme mgbe ha na-ewete ozizi na omume ndị sitere n’okpukpere chi ha nke ikpeazụ? N’ịma atụ, mgbe Josef Smith bịaruru na Kirtland na mbido Febụwarị 1831, ọ hụtara ndị òtù ọhụrụ na-ekesa ihe onwunwe enwekọtara ọnụ, na mgbalị ziri ezi ijere Ndị Kristain Agba Ọhụrụ (lee Ọlụ 4:32–37). Onyenwe anyị mere ụfọdụ mmezi na ido anya dị mkpa na nke a nakwa n’isiokwu ndị ọzọ. O mere nke a nke ukwuu site na mkpughe edekọrọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42 nke Ọ kpọrọ “iwu m iji chịa nzukọ nsọ m” (amaokwu 59). Niime mkpughe nke a, anyị na-amụ eziokwu ndị bụ isi ihe n’ihiwe Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị n’ụbọchi ikpeazụ ndị a Ma anyị na-amụta na anyị nwere ihe karịrị akarị ịmụ: “Ọ bụrụ na ị ga-arịọ,” Onyenwe anyị kwere nkwa, “ị ga-anata mkpughe n’elu mkpughe, ọmụma ihe n’elu ọmụma ihe” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:61).
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:114–19.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ
“Onye nke na-anata iwu m ma dobe ya, onye ahụ kwa bụ onye na-eso ụzọ m.”
Na mbido 1831, ndị nsọ naara amalite ịgbakọta na Ohio. Ha dịịrị njikere ịnata iwu nke Chineke kweworo nkwa ikpughe ebe ahụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:32). Mana nke mbụ, Ọ kuziri otu ndị na-eso ụzọ Ya kwesịrị iji kwadoo ịnata iwu Ya. Kedụ ụkpụrụ ndị ị na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41:1–6 nke gaara enyere Ndị nsọ aka nata iwu nke Chineke? Olee otu ụkpụrụ ndị a ga-esi enyere gị aka nata ntuziaka site n’aka Ya?
Lee kwa “Otu Bishọp nye Nzukọ nsọ,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 77–83.
Onyenwe anyị na-enye m iwu nsọ niile niihi na Ọ hụrụ m naanya.
Ndị Nsọ weere mkpughe a hụrụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:1–72 dị ka otu niime ndị kachasị mkpa Onye Amụma natawororii. Ọ bụ otu niime mkpughe mbụ ebipụtara. Ruo ọtụtụ afọ, Ndị nsọ kpọrọ ya nnọọ “iwu ahụ”. Ebe nkeji niile ahụ agụnyeghị iwu nsọ niile ma ọ bụ iwu niile nke Onyenwe anyị , o zuru ịtụgharị uche ihe kpatara ụkpụrụ ndị a si dị mkpa maka Nzukọ nsọ nke a eweghachitere ọhụrụ. Kedụ ihe mere ha ji dị mkpa nye anyị taa?
Niihi na nkeji 42 dị nnọọ ogologo, i nwere ike tulee ịmụ ya nwa obere nwa obere, dị ka ndị a sotere. Mata ụkpụrụ ndị akuziri niime nke ọbụla, ma tulee otu iwu ndị a si bụrụ ihe ịrịba ama nke ịhụnaanya nke Onyenwe anyị maka ndị Ya.
Gịnị mere Chineke ji enye anyị iwu niile na iwu nsọ niile? Kedụ ụzọ ndị esiworo gọzie gị site na-imara ma soro iwu nsọ niile a?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:30–42
“Cheta ndị ogbenye.”
Dị ka akụkụ nke iwu ekpughere niime nkeji 42, Onyenwe anyị kuziiri Ndị nsọ Ya otu ha nwere ike i si, dị ka ndị na-eso Kraịst mgbe gboo, jiri nwee “ihe niile n’otu” (Ọlụ 2:44; 4 Nefi 1:3), “n’enweghị ogbenye ọbụla n’etiti ha” (Moses 7:18). Kedụ ihe ị na-amụ site na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:30–42 banyere otu Ndị nsọ si bie iwu nke nnyefechasị? (Inyefechasị pụtara iwepụ ihe n’akụkụ maka nzube dị nsọ.)
Na-agbanyeghị anyị anaghị “enwekọta ihe nile ọnụ” taa, niime tempụl Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a na-agba ndụ ibi iwu nke nyefechasị. Olee otu i nwere i si nyefechasịa ihe Chineke nyeworo gị iji gọzie ndị nọ na mkpa? Elemaanya ịgụ otu egwu dị ka “Niihi na Enyewo M Nke Karịrị Akarị” (Abụ, no. 219) nwere ike inye gị nchepụta.
Lee kwa Sharon Eubank, “Ana M Ekpe ekpere na Ọ Ga-eji Anyị Eme ihe,” Liahona, Nov. 2021, 53–56; “Iwu Ahụ,” niime Mkpughe niile Nọ N’ọnọdụ, 93–95.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:61, 65–68; 43:1–16
Chineke na-enye mkpughe iji duo Nzukọ nsọ Ya—na iji duo anyị.
Chee na ị na-akparịta ụka gị na onye òtù Nzukọ nsọ dị ọhụrụ onye nwere obi ụtọ ịma na a na-edu Nzukọ nsọ site na mkpughe. Olee otu i nwere ike i si jiri Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 43:1–16 nyere ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka mụọ ihe banyere usoro nke Onyenwe anyị maka idu Nzukọ nsọ Ya site n’aka onye amụma Ya? Olee otu i nwere ike i si jiri Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:61, 65-68 kuzie ihe banyere ịnata mkpughe nke onwe?
Gịnị bụ ụfọdụ “ihe ndị na-enye udo” na obi ụtọ ị nataworo site n’aka Onyenwe anyị site na Mmụọ Ya?
Ịmụ banyere otu ndị ndu nke Nzukọ nsọ siworo nụ olu nke Onyenwe anyị, i nwere ike lee otu niime vidiyo dị niime “Nụrụ Ya” ndekọta dị niime Ọba akwụkwọ Ozi ọma. Tulee ikepụta vidiyo nke onwe gị, na-akọwa otu Onyenwe anyị si agwa gị okwu.
Lee kwa Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2018, 93–96; “Ihe Niile Ka A Na-ahaghị Ime N’usoro”,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 50–53.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị ihe
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41:5
Onye na-eso ụzọ bụ onye na-anata iwu nke Chineke ma na-erube isi na ya.
-
Iji nyere ụmụ gị aka mata ihe ọ pụtara ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, i nwere ike dee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 41:5 n’elu otu ibe akwụkwọ, hapụ oghere ebe mkpụrụokwu onye na-eso ụzọ kwesịrị ịnọ. Ha nweziri ike lenye anya niime amaokwu 5 maka mkpụrụokwu nke furu efu. Dị ka otu amaokwu nke a siri dị, gịnị ka ọ pụtara ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst? Olee otu anyị si na-agbalị ị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst kacha mma?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:2
Obi dị m ụtọ mgbe m rubeere Onyenwe anyị isi.
-
Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ime egwuregwu nke chọrọ ka ha gee ntị nke ọma ma soro ntuziaka niile. I nwere ike jiri ihe egwuregwu nke a ji kwuo okwu banyere ihe ọ pụtara “ịńa ntị ma nụrụ ma rube isi” nye Onyenwe anyị (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:2). Kedụ ntuziaka ndị O nyeworo anyị? Olee otu esiworo gọzie anyị site na-irube isi n’iwu na iwu nsọ Ya niile?
-
I nwere ike mezuo ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a gị na ụmụ gị. Unu nwekwara ike kwee ukwe gbasara irube isi n’iwu niile nke Chineke, ụdị dị ka “A chọrọ m Ibi ndụ Ozi ọma ahụ” (Akwụkwọ Abụ nke Ụmụntakịrị, 148). Tulee ikesara ibe unu otu irube isi n’iwu niile nke Chineke si wetere unu obi ụtọ.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:38
Ana m ejere Jizọs Kraịst ozi mgbe m na-ejere ndị ọzọ ozi.
-
Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:38ọnụ, nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike i si jeere Jizọs ozi site na-ijere ndị ọzọ ozi. Ha nwere ike ịchọta nchepụta ole ma ole site na vidiyo “Pass It On” (ChurchofJesusChrist.org). Ha nwekwara ike ile anya na foto niile nke Onye Nzọpụta na-enyere ndị ọzọ aka, na-agwọ ndị ọrịa, ma ọ bụ na-emere ụmụ ntakịrị obi ọma (lee Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nos. 42, 47).
-
I nwere ike gosi ụmụ gị sliipụ Otu Ụzọ n’ụzọ iri na Onyinye Ndị ọzọ ma kwuo okwu banyere otu e si eji ya enye ihe anyị nwere iji gọzie ndị ọzọ (lee kwa “Ịkwụ Otu Ụzọ n’ụzọ iri na Ụtụ niile N’ikuku”).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 43:1–7
Naanị onye amụma nwere ike ịnata mkpughe maka Nzukọ nsọ dum.
-
Kpọkuo ụmụ gị iche na mmadụ guzoro ọtọ na nzukọ ọgbụgba ama ma na-agwa ngalaba ukwu ahụ na ọ natawo mkpughe maka Nzukọ nsọ dum (na-ịmaatụ, mkpughe na anyị ekwesịghị kwa ịta karọọtụ ma ọ bụ na anyị kwesịrị iji mmiri ara akwọ aka kama iji mmiri nkịtị.) Ọ na-ekwu na anyị kwesịrị ige ntị niihe ọ na-ekwu kama igere onye amụma. Kedụ ihe n’ezighị ezi n’ihe nke ahụ? I nweziri ike mgbe ahụ mụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 43:1–7 ọnụ iji chọta otu Onyenwe anyị si enye nzukọ nsọ Ya iwu nsọ.
-
I nwekwara ike igosi anyị otu foto nke onye amụma dị ndụ ma kpọkuo ụmụ gị ikesa otu ihe ọ kuziri na nso nso a. Ọ bụrụ ma ha chọọ enyemaka, gosi otu vidiyo ma ọ bụ edereede sitere na ozi ọgbakọ zuru ọha na nso nso a. Kedụ ihe o ji bụrụ ngọzi inwe onye amụma dị ndụ taa?