Come, Follow Me
Julaị 28–Ọgọst 3: “Ike nke Iyi Chineke”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84


“Julaị 28- Ọgọst 3: ‘Ike nke Iyi Chineke’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Josef Smit na-anata Ọkwa nchụaja Melkizedek

Uju sitere na Mweghachite nke Ọkwa nchụaja Melkizedek, site n’aka Liz Lemon Swindle

Julaị 28–Ọgọst 3: “Ike nke Iyi Chineke”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84

Kemgbe eweghachitere ọkwa nchụaja na 1829, Ndị nsọ isimbụ ka agọziworo site n’ike dị nsọ nke Onyenwe anyị. E mere ha baptizim, anabata ha, ma kpọkuo ije ozi site n’ikike nke ọkwa nchụaja, dị ka anyị dị taa. Mana inwe ụzọ ruo ike ọkwa nchụaja abụghị otu ụdị ihe ahụ dị ka ịghọta ya kpamkpam, ma Chineke ka nwere ọtụtụ ịhe Ọ chọbụrụ Ndị nsọ Ya ịghọta—kachasị site na mweghachite nke emume nsọ tempụl na-abịa niihu. Mkpughe nke 1832 maka ọkwa nchụaja, ugbu a Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84, mụbara nghọta nke Ndị nsọ banyere ihe ọkwa nchụaja bụ n’ezie. Ma o nwekwara ike ime otu ụdị ihe ahụ maka anyị taa. Emesịa ihe niile, enwere ọtụtụ ihe a ga-amụ banyere ike sinachi nke jidere “ọtụghe nke mmata ihe nke Chineke,” nke na-eme ka “ike nke iyi Chineke” pụta ìhè ma nke ahụ na-akwado anyị ịhụ ihu nke Chineke, ọbụna Nna, ma dịrị ndụ” (amaokwu nke 19–22).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:17–32

akara ngosi semịnarị
Enwere m ohere inwe ụpzọ ruo n’ike ọkwa nchụaja na ngọzị niile nke Chineke.

Mgbe i chere maka mkpụrụ okwu ahụ ọkwa nchụaja, gịnị na-agbata gị n’uche? Kedụ otu ike ọkwa nchụaja nke Chineke si emetụta ndụ gị?

Mgbe ịtụgharịsịrị ajụjụ ndị a niime obi gị, i nwere ike mụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:17–32, na-achọ ihe Chineke chọrọ ka ịmata banyere ike ọkwa nchụaja Ya. Tulee otu i nwere ike i si jiri amaokwu ndị a ji kọwaa ọkwa nchụaja na ebumnuche ya nye mmadụ.

Otu ihe ị ga-achọta bụ na site n’emume nsọ ọkwa nchụaja niile “ike nke ikeyi Chineke na-apụta ihe” (lee amaokwu niile nke 19–21). Ikekwe i nwere ike depụta emume nsọ ọkwa nchụaja ndị i sonyeworo niime (ndepụta niile dị niime Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 18.1, 18.2, nwere ike inye aka). Kedụ otu emume nsọ ndị a—na ọgbụgba ndụ ndị so ya—siworo wete ike nke Chineke niime ndụ gị? Kedụ ihe ndụ gị ga-adị ka ya ma ewepụ ha?

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Nwanyị ọbụla na nwoke ọbụla na-agba ọgbụgba ndụ ya na Chineke ma debe ọgbụgba ndụ ndị ahụ, na onye na-esonye eme emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ntozu oke, nwere ohere inweta ụzọ na-enweghị mgbochi ruo n’ike nke Chineke.” (“Akụ nke Ime mmụọ niile,” Liahona, Nov. 2019, 77). Tulee ịmụ ozi nke Onyeisi Nelson, na-achọ ụzọ ndị i nwere ike i si “dọta ike nke Onye Nzọpụta niime ndụ [gị].”

Lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 25:10, 13, 15; 121:34–37, 41–46; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ọkwa nchụaja,” “Nkuzi niile nke Josef Smith banyere Ọkwa nchụaja, Tempụl niile, na Ụmụnwanyị,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 3.6, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:31–44

Ana enwete ọkwa nchụaja jiri ịńụ iyi na ọgbụgba ndụ.

Ịńụ iyi na ọgbụgba ndụ nke ọkwa nchụaja (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:31–44) nwere ntịnyere pụrụ iche maka ụmụ ndị nwoke nke Nna nke Eluigwe ndị echiri echichi banye n’ọkwa nke ọkwa nchụaja, mana ọtụtụ niime ngọzi ndị ekwere na nkwa niime amaokwu ndị a dị adị nye ụmụ Chineke niile. Gịnị bụ nkwa ndị a, ma gịnị ka Chineke na-arịọ anyị ime iji nata ha?

Okenye Paul B. Pieper kuziri: “Ọ bụ ihe mmasị na na-ịńụ iyi na ọgbụgba ndụ nke ọkwa nchụaja [lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:31–44], Onyenwe anyị na-eji ngwaa ndịa nwete na nata. Ọ naghị eji ngwaa ahụ ichi echichi. Ọ bụ niime tempụl ka ndịikom na ndịinyom—na-ejikọta ọnụ—na-enwete ma na-anata ngọzi niile na ike nke ma Ọkwa nchụaja nke Erọn ma nke Melkizedek” (“Nsiridị niile nke Ndụ anụ ahụ Ekpughere,” Ensign, Jan. 2016, 21).

Dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:31–44, tụgharịa uche ihe o nwere ike ịpụta “inwete” na “ịnata” ọkwa nchụaja. Kedụ otu nke a si dị iche site na-ịbụ onye echiri echichi nótu ọkwa nke ọkwa nchụaja? Kedụ ihe ọzọ Onyenwe anyị na-akpọku gị ịnata niime amaokwu ndị a? Kedụ otu i si na-eme nke ahụ?

Kedụ ihe ị na-ahụta na-akpatemmụọ gị ikwesị ntụkwasị obi karịrị akarị na-ịnata Onye Nzọpụta, Nna Ya, ụmụ odibo Ya, na ike ọkwa nchụaja Ya?

Lee kwa Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 121:36–46.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:43–61

Ibi ndụ site n’okwu nke Chineke na-ewete ihe na eziokwu niime ndụ m.

Kedụ eziokwu ndị ị na-ahụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:43–61 nke na-enyere gị aka ghọta ihe kpatara i ji nwee mkpa ị na-amụ okwu Chineke mgbe niile? Mata ndịiche dị n’etiti ihe na ọchịchịrị niime amaokwu ndị a; kedụ otu “ịdị uchu na-ịńa ntị n’okwu niile nke ndụ ebighị ebi” gị si wete ihe, eziokwu, na “Mmụọ nke Jizọs Kraịst” niime ndụ gị? (amaokwu 4345).

Lee kwa 2 Nifaị 32:3.

Were ụkpụrụ niile nke ozi ọma tụnyere ihe ndị ama ama. I nwere ike chee maka otu nsikwu nke ga-egosipụta eziokwu niile dị niime amaokwu 43-44? N’ịmaatụ, kedụ otu isoro nzọụkwụ niile dị niime usoro isi nri jiri dịrị ka ibi ndụ “site n’okwu niile … nke Chineke”?

onye inyom na-agụ  akwụkwọ nsọ

“Dịrị uchu na-ịńa ntị n’okwu niile nke ndụ ebighị ebi.”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:62–91

Onyenwe anyị ga-anọnyere m mgbe m nọ na-ije ozi Ya.

Dị ka ị na-agụ amaokwu ndị a, i nwere ike mata ụzọ niile Onyenwe anyị siri kwuo na Ya ga-akwado ụmụ odibo Ya. Kedụ otu nkwa ndị a si metụta n’ọrụ Ọ rịọworo gị rụọ? N’ịmaatụ, kedụ otu nkwa niile dị niime amaokwu nnke 88 si mejupụta niime ndụ gị?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:106–110

Onye ọbụla nwere ike tinye aka n’ọrụ nke Chineke.

Kedụ ihe ị na-amụ site na amaokwu ndị a banyere otu Onyenwe anyị si na-emezu ọrụ Ya? Kedụ ndụmọdụ na ngọzi niile ị na-achọta? I nwere ike chee banyere otu i siworo nwee “mwulite elu n’ịdị nwayọọ niile” niihi na i jere ozi gị na onye “siri ike na Mmụọ,” gụnyekọta ndị nọ niime ezi na ụlọ gị.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:4–5

Emume nsọ tempụl niile na-enyere m aka ikwado ibi ndụ ọzọ mụ na Nna nke Eluigwe.

  • Maka inyere ụmụ gị aka tụọ anya ịga tempụl, i nwere ike kewapụta puzzle jiri foto otu tempụl. N’azụ mpempe nke ọbụla, i nwere ike dee ihe anyị na-eme na tempụl, dị ka ime baptizim maka ndị nna nna anyị ha, irachi ezi na ụlọ niile, na ime ọgbụgba ndụ anyị na Chineke. Gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:4–5 gị na ụmụ gị, ma rịọ ha ige ntị maka ihe Onyenwe anyị nyere Ndị nsọ n’iwu wuo. Dị ka gị na ụmụ gị na-etikọta puzzle ahụ ọnụ, kesaara onye ọbụla ihe ndị anyị nwere ike ime iji kwadoo ịbanye na tempụl.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–22

E nwere m ike ịnata ike nke Nna nke Eluigwe site n’emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja.

  • Inyere ụmụ gị aka ghọta ihe emume nsọ bụ, tulee ile anya na foto niile nke emume nsọ ọkwa nchụaja dị iche iche gị na ha, dị ka Akwụkwọ Nka Ozi ọma, nọmba nke 103-8, ma ọ bụ ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a. Rịọ ha ịkọwa ihe na-eme niime foto nke ọbụla. Unu nweziri ike gụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–22. Gịnị mere Nna nke Eluigwe si chọọ anyị ịnata emume nsọ ndị a? Gwa ụmụ gị otu i siworo nwete mmetụta ike nke Chineke niihi emume nsọ niile ị nataworo na ọgbụgba ndụ ndị i meworo. (Lee kwa “Ike Ọkwa nchụaja, Ikike, na Ọtụghe niile” nime appendix A ma ọ bụ appendix B.)

Young Couple Going to the Temple; GAK 609; GAB 120; Primary manual 2-32; Doctrine and Covenants 131:1-3; 132:4-7, 19-20
ụmụntakịrị na-eri oriri nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:77

Abụ m enyi Jizọs dị ka m na-esoro Ya.

  • Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:77 ọnụ, jụọ ụmụ gị banyere ihe ọ pụtara ị bụ enyi. Unu nwere ike kwuo banyere ezigbo ndị enyi i nweworo. Kedụ otu Jizọs si egosi anyị na Ọ chọrọ ka anyị bụrụ ndị enyi Ya? Kedụ otu anyị ga-esi egosi na anyị chọkwara nke ahụ? Egwu dị ka “Ana m Agbalị Ịdị ka Jizọs” (Akwụkwọ egwu Ụmụntakịrị, 78-79) nwere ike nye aka na mkparịta ụka nke a.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:88

Nna nke Eluigwe na-enyere ụmụ odibo Ya aka.

  • Ụmụ gị nwere ike nwee obi ụtọ ịnụrụ banyere otu ndị mgbasa ozi ọma si nyere gị aka, ezi na ụlọ gị, ma ọ bụ ndị nna nna gị ha nata ozi ọma. Mgbe ahụ i nwere ike gụọ banyere nkwa pụrụ iche Onyenwe anyị kwere ndị mgbasa ozi ọma niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:88. Ikekwe ụmụ gị nwere ike chee maka omume niile nke na-agakọ ya na amaokwu nke a. Tulee ịkọ akụkọ banyere otu oge mgbe ị naara ejere Onyenwe anyị ozi ma nwee mmetụta na Ọ nọnyeere gị, dị ka akọwara niime amaokwu 88. I nwekwara ike nyere ụmụ gị aka chee maka ụzọ ndị ha nwere ike iji a bụ ndị mgbasa ozi ọma ugbu a. Gbaa ama na Nna nke Eluigwe na-enyere anyị aka mata ihe anyị ga-ekwu mgbe anyị na ndị ọzọ na-ekwu banyere Jizọs Kraịst.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

tempụl mgbe anyanwụ dara

Rome Italy Tempụl

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị