Come, Follow Me
Septemba 22–28: “Usoro nke Ọkpara Chineke”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106–108


“Septemba 22–28: ‘Usoro nke Ọkpara Chineke’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106–108,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106–108,” Bịanụ, Soro Mụ—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Jizọs Kraịst na-enyefe ikike nke ọkwa nchụaja

Septemba 22–28: “Usoro nke Ọkpara Chineke”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106–108

Na nlekiri nke mbụ, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107 yiri ka ọ gbasara naanị ịhazi ọkwa ọkwa nchụaja niile ịghọ ndokọ odudu maka Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị. Site mgbe ebipụtara mkpughe nke a, ọnụọgụgụ ndị Nzukọ nsọ nọ na-etofe ike nke ndị ndu ole ma ole o nwere mgbe ahụ. Idepụta oke na ọrụ niile nke Ndịisi Mbụ, Kworum Ndị ozi Iri na abụọ, Ndị Iri Asaa, bishọp niile, na ndịisi kworum niile bụ ihe dị mkpa n’ezie. Mana enwere nnọọ ọtụtụ nye ntuziaka sinachi dị niime nkeji 107 karịa otu odudu Nzukọ nsọ kwesịrị ka ahazie. Ebe, Onyenwe anyị na-akuziri anyị banyere ike na ikike Ya, “Ọkwa nchụaja Dị nsọ, dị ka otu Usoro nke Ọkpara Chineke” (amaokwu 3). Nzube nke ọkwa nchụaja bụ ịgbaghe “ngọzi ime mmụọ niile nke nzukọ nsọ” ka ụmụ Chineke niile nwee ike “nwee eluigwe niile emeghere nye ha” ma nwee obi ụtọ na orikọ na ọnụnọ nke Chineke Nna, na Jizọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ” (amaokwu niile nke 18-19). Na-ikuziri anyị banyere ọkwa nchụaja Ya, Onye Nzọpụta na-akuziri anyị banyere Onwe Ya na otu anyị nwere ike i si bịakwute Ya.

Lee “Iweghachite Usoro Mgbe Gboo,” niime Mkpughe ndị dị N’ụdị, 208–12.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106; 108

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị na-akwado m mgbe Ọ na-akpọ m ije ozi.

Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106 na 108, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ na nkwa niile nye ndị otu abụọ ndị akpọrọ ije ozi niime Nzukọ nsọ Ya. Dị ka ị na-amụ ndụmọdụ Ya, i nwere ike chee banyere ohere ndị nke onwe gị iji jeere Onyenwe anyị ozi—ikekwe ọrụ ije ozi nlekọta, ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ, oke na ọrụ niime ezi na ụlọ gị, ma ọ bụ nkwalite ime mmụọ ime ihe ọma.

Kedụ ihe i chere ozi nke Onyenwe anyị nye gị niime mkpughe ndị a bụ? Kedụ nkebiokwu ndị kachasị abara gị uru? Nke a bụ ole ma ole itule:

Mgbe Okenye Carl B. Cook natara ọrụ Nzukọ nsọ siri ike, ọ natara ike site na nhụmiihe nke otu onye nna nna. Gụọ banyere ya niime ozi ya “Jee ozi” (Liahona, Nov. 2016, 110–12). Tulee ide leta iji gbaa ụmụ ụmụ gị ume—ma ọ bụ onwe gị n’ọdịniihu—ịnabata ohere niile iji jeere Onyenwe anyị ozi. Gụnye niime leta gị eziokwu niile ị mụtara site n’ozi nke Okenye Cook, Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 106 na 108, na nhụmiihe nke onwe gị niile.

Lee kwa Henry B. Eyring, “Soro M Jee ije,” Liahona, Me 2017, 82–85; Isiokwu niile na Ajụjụ niile,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Warren Cowdery” na “‘Emere N’isi’ iji Chọọ Mkpughe,” in Revelations in Context, 219–23, 224–28.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:1–4, 18–20

Ọkwa nchụaja bụ “dị ka Usoro nke Ọkpara Chineke.”

Onyenwe anyị malitere “mkpughe ọkwa nchụaja” Ya (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107, isi nkeji) site na-ikuziri anyị ezigbo aha nke Ọkwa nchụaja Melkizedek (lee amaokwu niile nke 1-4). Gịnị mere i ji chee na ọ dị mkpa ịmata nke ahụ? Kedụ otu aha nke a si emetụta ụzọ i si na-eche banyere ọkwa nchụaja?

Debe echiche ndị a n’uche dị ka ị na-agụ banyere ọkwa nchụaja, kacha nke niime amaokwu niile nke 18-20. Gịnị ka ọ pụtara “inwe eluigwe niiile emeghere”? Gịnị ka ọ pụtara “inwe obi ụtọ na orikọ na ọnụnọ nke Chineke Nna, na Jizọs”? Kedụ otu ike na ikike ọkwa nchụaja nke Onye Nzọpụta si eme ka ihe niile ndị a dị adị nye gị?

Lee kwa Alma13:2, 16; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:19–27.

Lekwasị anya na Jizọs Kraịst. “E nwere ọtụtụ ihe a ga-akuzi gbasara ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghchitere—ụkpụrụ niile, iwu nsọ niile, amụma niile, na akụkọ niile nke akwụkwọ nsọ. Kama ndị a niile bụ alaka nke otu osisi, nihi na ha niile nwere otu nzube: iji nyere mmadụ aka ịbịakwute Kraịst ma bụrụ ndị e mere ka ha zuo oke nime Ya (lee Jarọm 1:11; Moronaị 10:32). Ya mere na-agbanyeghị ihe ị na-akụzi, cheta na ị na-akụzi n’ezie banyere Jizọs Kraịst na otu ị ga-esi adị ka Ya” (Nkuzi n’Ụzọ nke Ọnye nzọpụta, 6). N’ịmaatụ, dị ka ị na-akuzi—ma na-amụ—banyere ọkwa nchụaja niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107, na-ajụ mgbe na mgbe, “Gịnị ka anyị na-amụ banyere Onye Nzọpụta?”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:22

Ụmụ odibo nke Onyenwe anyị ka “obisike, okwukwe, na ekpere nke Nzukọ nsọ jigidere.”

Kedụ ihe i chere ọ pụtara ijigide ụmụ odibo nke Onyenwe anyị site na obisike gị? site na okwukwe gị? site na ekpere gị?

Lee kwa “Chineke Gọzie Ezi Onye Amụma Anyị,” Abụ, no. 24.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:23–24, 33–35, 38, 91–92

Ndị Amụma na Ndị ozi na-agba ama nke Jizọs Kraịst.

Josef Smith kesara nkeji 107 na 1835 ya na Kworum nke Ndị ozi Iri na abụọ akpọrọ ọhụrụ (lee isi nkeji ahụ). Gịnị ka Onyenwe anyị kuziiri ha banyere ọkpụkpọ oku ha niime amaokwu niile nke 23–24, 33–35, 38? Kedụ otu aka ebe gị nke Jizọs Kraịst siworo nwete mgbam ume site na nkuzi ihe na ije ozi nke Ndị ozi Ya dị ndụ?

Niime amaokwu niilew nke 91-92, Onyenwe anyị na-akuzi ihe banyere Onye ozi Ya kacha ukwuu, Onyeisi Nzukọ nsọ. Kedụ otu o “si dịrị ka Mosis”? (lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Mosis,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

Lee kwa David A. Bednar, “A Họọrọ Ịgba ama nke Aha M,” Liahona, Nov. 2015, 128–31.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:27–31, 85–89

Onyenwe anyị na-emezu ọrụ Ya site na kansụl niile.

Mata ihe Onyenwe anyị kuziri banyere kansụl niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:27–31, 85–89. Gịnị na-eme kansụl ka dịrị irè? Kedụ otu i ga-esi etinye n’ọrụ ụkpụrụ niile ndị a niime ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ gị, ebe obibi gị, ma ọ bụ oke na ọrụ gị ndị ọzọ?

Lee kwa M. Russell Ballard, “Kansụl Ezi na ụlọ niile,” Liahona, Me 2016, 63–65; Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 4.3–4.4, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

ezi na ụlọ na-atụkọta atụmatụ ọnụ

Onyenwe anyị na-akpọku ezi na ụlọ niile ịdụkọrịta ndụmọdụ ọnụ.

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 02

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:18–20

Jizọs Kraịst na-agọzi m site n’ike nke ọkwa nchụaja Ya.

  • Dị ka gị na ụmụ gị na-agụkọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:18–19 ọnụ, kwusie ike nkebiokwu ahụ “ngọzi niile nke ime mmụọ.” Elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike depụta ngọzi ndị na-abịa site na ọkwa nchụaja. I nwere ike mepụta ihe egwuregwu site na ya—lee onye ga-edetu nke kachasị. Ụmụ gị nwekwara ike see ma ọ bụ chọta foto niile iji nọchite ngọzi ndị a niile (lee peeji ihe omume nke izu ụka nke a). I nweziri ike mgbe ahụ kwuo banyere otu emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja (dị ka baptizim ma ọ bụ oriri nsọ) si enyere anyị aka nata ngọzi niile nke Chineke.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:21–26, 33–35, 91–92

Ụmụ odibo nke Onyenwe anyị ahọọrọ na-edu Nzukọ nsọ Ya.

  • Mbipụta nke ọgbakọ ọbụla nke Liahona gụnyere ihu akwụkwọ nke foto nke Ndị Ji Ikikere Zuru ọha. Tulee ile anya na foto ndị a gị na ụmụ gị dị ka i na-agụ banyere oke na ọrụ ha niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:21–26, 33–35, 91–92. Gị na ụmụ gị nwere ike kwuo banyere ihe mere i jiri nwee obi ekele na Onyenwe anyị enyewo ha oke na ọrụ ndị a.

  • Ụmụ gị nwere ike mụtakwuo banyere ụmụ odibo Onyenwe anyị na “Odudu Izugbe Nzukọ nsọ” na ChurchofJesusChrist.org. Ikekwe ụmụ gị nke ọbụla nwere ike mụọ banyere otu niime ndị ndu ndị a ma kuziere ibe unu banyere ya. Kesaara ibe unu otu i si mara na ndị ndu ndị a bụ ezigbo ụmụ odibo nke Jizọs Kraịst.

  • Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike n’otu n’otu jide foto nke Ndịisi Mbụ ma kesaa ụzọ ndị unu ga-esi akwado ha dị ka ụmụ odibo nke Onyenwe anyị.

Otu Ndịisi Mbụ

Otu Ndịisi Mbụ Ahụ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 108:3

E nwere m ike ịkpachapụ anya na-idebe ọgbụgba ndụ m niile.

  • Ibido mkparịta banyere amaokwu nke a, i nwere ike kpọkuo ụmụ gị ime ihe nke na-achọ ezi nlezianya, dị ka ịgbaju iko na-akwafughị ya. Gịnị na-eme mgbe anyị na-elezighị anya? Mgbe ahụ unu nwere ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 108:3 iji chọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka anyị lezieanya mee. Kedụ “adịmara niile” (nkwa niile ma ọ bụ ọgbụgba ndụ niile) anyị na Chineke na-eme? Kedụ otu anyị nwere ike i si lezieanya karịa banyere idebe ha? I nwere ike kesaa akụkụ nke ozi Nwanne nwanyị Becky Craven “Mkpachapụ anya megide Nkịtị” (Liahona, May 2019, 9–11) nke i chere nwere ike ịkpate mmụọ nke ụmụ gị idebe ọgbụgba ndụ ha. Unu nwere ike gụkọta egwu gbasara idebe ọgbụgba ndụ niile, dị ka “Aga M A Dị ike n’ọrụ” (Akwụkwọ Abụ Ụmụntakịrị, 162).

nwantakịrị nwanyị na-awụ mmiri

Ịkpachapụ anya awụ mmiri ka enwere ike ịtụnyere ịkpachapụ anya edebe ọgbụgba ndụ anyị.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta ọnwa nke a nke magazin Friend.

otite agba nke Melkizedek na Abraham

Melkizedek Na-agọzi Abram, site n’aka Walter Rane

peeji ihe omume maka ụmụntakịrị