“Septemba 29– Ọktoba 5: ‘Ọ Bụ Ụlọ Gị, Ebe Ịdị nsọ Gị’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109–110,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109–110,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Septemba 29– Ọktoba 5: “Ọ Bụ Ụlọ Gị, Ebe Ịdị nsọ Gị”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109–110
Ọnụ ụzọ niile nke Tempụl Kirtland abụghị nke kwesịrị ighe oghe tutu ruo elekere asatọ n’ụtụtụ nke Maachị 27, 1836. Mana Ndị nsọ ndị naara atụanya ịga nzukọ nraranye niile malitere ịnọ n’ahịrị n’ahịrị kemgbe elekere asaa. Ebe mmadụ jufere oke ma emesịa nzukọ nke ugboro abụọ dịịrị mkpa iji kpọbata onye niile. Ma ọ bụghị naanị ndị dị ndụ ka ọ naara anụ ọkụ n’obi ịbịa. Ọtụtụ ndị aka ebe hụrụ ndị mmụọ ozi niime tempụl ma ọbụna n’elu ụlọ, mgbe a na-eme nraranye na mgbe emesịrị. N’ezie o yiri ka “otù ndị agha nke eluigwe dị iche iche” abịawo iso Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a “agụ egwu ma [i]ti mkpu” (“Mmụọ nke Chineke,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 2).
Gịnị kpatara nnukwu obi ụtọ ahụ—n’aka akwa mgbochi abụọ? Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị, enwere ụlọ nke Onyenwe anyị ọzọ n’elu ụwa. Onyenwe anyị nọ na-emejuputa nkwa Ya inye Ndị nsọ Ya “ike sitere n’elu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 38:32). Ma nke a, ka Ọ mara ọkwa, bụ naanị “mmalite nke ngọzi ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:10). Oge anyị bi na ya ugbu a—site ọrụ tempụl na emume nsọ niile dị ọkụ ọkụ dị adị nye nde kwuru nde ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ—nwere mmalite ya na Kirtland, mgbe “akwa mgbochi kpuchiri ụwa [naara] amalite ịdọwa” (“Mmụọ nke Chineke”).
Lee kwa Ndị Nsọ, 1:232–41; “Ụlọ maka Chineke Anyị,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 169–72.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109
Onyenwe anyị na-enye m ngọzi bara ụba site na ọgbụgba ndụ niile nke tempụl.
Tempụl Kirtland Ahụ dịịrị iche site na tempụl ndị ọzọ anyị maara taa. Enweghị ebe nchụaja ọbụla ma enweghị ebe a na-eme baptizim, n’ịmaatụ. Mana ngọzi ndị akọwara niime nkeji 109, ekpere nraranye maka Tempụl Kirtland, dị kwa adị taa niime ụlọ nke Onyenwe anyị. Nyochagharịa amaokwu ndị a sotere iji chọpụta ụfọdụ ngọzi ndị a, ma tulee otu ha nwere ike isi nyee aka gbaa mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume.
Amaokwu nke 5, 12-13 (lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:6-8): Niime ụlọ nke Onyenwe anyị, O nwere ike gosipụta Onwe Ya nye m, ma enwere m ike inwe mmetụta ike Ya.
Amaokwu niile 9, 15–19, 26, 78–79:
Ngọzi ndị ọzọ:
Ọ bụrụ na ị gawo n’ụlọ nke Onyenwe anyị, chee banyere otu esi mejuputa nkwa ndị a niime ndụ gị.
Abụ ahụ “Mmụọ nke Chineke” (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 2) ka edere maka nraranye Tempụl Kirtland—ma agụwo ya na nraranye tempụl niile kemgbe ahụ. Tulee ịgụ ma ọ bụ ịge ntị nye ya dị ka akụkụ nke ọmụmụ ihe na ofufe gị. Kedụ ngọzi ndị nke tempụl ị na-achọta akọwara niime abụ nke a?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109
Ekpere bụ nzikọrịta ozi anyị na Nna nke Eluigwe.
Nkeji 109 bụ ekpere nraranye nke enyere Onye amụma Josef Smith site na mkpughe (lee isi nkeji). Kedụ ihe ị na-amụta banyere ekpere site na nkeji nke a? N’ịmaatụ, i nwere ike idetu ihe Onye amụma nyere ekele maka ya na ngọzi ndị ọ na-arịọ maka ya. Kedụ ihe ọzọ o kwuru niime ekpere nke a? Dị ka ị na-amụ ihe, i nwere ike nyochaa nzikọrịta ozi nke gị onwe gị na Nna nke Eluigwe. Kedụ ihe ị na-amụ banyere Ya na Ọkpara Ya site na ekpere nke a?
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịgụ ekpere nraranye niile nke tempụl ndị ọzọ, gụnyere tempụl kachasị dị gị nso, gaa na peeji nke tempụl na temples.ChurchofJesusChrist.org
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:1–10
Onyenwe anyị nwere ike igosipụta Onwe Ya nye m niime ụlọ Ya.
Dị ka ị na-agụ nkọwa niile nke Onye Nzọpụta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:1–10, gụnyere isi nkeji ahụ, tụgharịa uche ihe amaokwu ndị a na-atụpụta banyere Ya.
Kedụ otu Jizọs Kraịst si egosipụta Onwe Ya—ma ọ bụ mee ka gị mara Ya Onwe Ya—niime ụlọ Ya? Kedụ otu O si enyere gị aka mara na Ya nabatara aja gị niile?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:10–16
Onye Nzọpụta na-atuzi aka n’ọrụ Ya site n’ọtụghe ọkwa nchụaja niile.
Na-eteghị anya tupu Moses, Elias, na Elaịja apụta niime tempụl iweghachite ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja, Jizọs Kraịst kwuru sị, “Nke a bụ mmalite nke ngọzi ahụ a ga-awụkwasị n’isi ndị m” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:10). Dị ka ị na-agụ amaokwu nke 11–16, chee banyere ngọzi niile nke Onye Nzọpụta na-awụkwasị n’isi gị site n’ọrụ nke ọtụghe ndị a na-atuzi aka. N’ịmaatụ:
-
Amaokwu nke 11: Moses na ọtụghe niile nke ikpọkọta Izrel (ma ọ bụ ọrụ mgbasa ozi ọma). Kedụ otu Onyenwe anyị siworo gọzie gị na ezi na ụlọ gị site na mbọ nke onye mgbasa ozi ọma nke Nzukọ nsọ Ya?
-
Amaokwu nke 12: Elias na ọtụghe niile nke ozi ọma nke Ebraham, gụnyere Ọgbụgba ndụ nke Ebraham. Kedụ otu Onyenwe anyị nwere ike isi gọzie gị na “ndudugandu ndị na-esote [gị]” niihi ọgbụgba ndụ gị niile? (Lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ Ebighị ebi Ahụ,” Liahona, Oct. 2022, 4–11; Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Elias,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.)
-
Amaokwu nke 13-16: Elaịja na ike nrachi, egosipụtara site n’ọrụ tempụl na ọrụ agụgụala ezi na ụlọ. Gịnị kpatara i ji eche na Nna nke Eluigwe chọrọ ka gị jikọta gị na ndị nna nna gị ha site n’emume nsọ tempụl niile? (Lee Gerrit W. Gong, “Ańụrị na Ebighị ebi,” Liahona, Nov. 2022, 83–86.)
Kedụ njikọ ndị ị na-ahụ n’etiti ọtụghe niile na oke na ọrụ anyị niime ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke (ibi ndụ ozi ọma, ilekọta ndị mmadụ nọ na mkpa, ịkpọku ndị niile ịnata ozi ọma, na ijikọ ezi na ụlọ maka mgbe ebighị ebi)?
Kedụ nhụmiihe ndị i nweteworo n’ọrụ nzọpụta na mbuli elu nke Chineke? Kedụ ihe nhụmiihe ndị a na-akuziri gị banyere Onye Nzọpụta, Nzukọ nsọ Ya, na ọrụ Ya?
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:12–13; 110:1–7
Tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị.
-
Gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere ihe unu hụrụ naanya banyere ebe obibi unu. Mgbe ahụ unu nwere ike lee anya na foto Tempụl Kirtland ma jiri Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:12–13; 110:1–7 iji kwuo okwu banyere otu eji raranye tempụl ahụ ma ghọọ ụlọ nke Onyenwe anyị (lee kwa “Isi nke 39: Aranyewo Tempụl Kirtland,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 154, ma ọ bụ vidiyo dakọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma). Kesaara onye n’ibe ya otu ihe ị hụrụ naanya banyere ụlọ nke Onyenwe anyị.
-
Elemaanya gị na ụmụ gị nwere ike chee na otu enyi na-anwa ịchọta ụlọ unu. Kedụ otu anyị ga-esi enyere enyi anyị aka mata ụlọ nke bụ nke anyị? Kedụ otu anyị ga-esi amata na tempụl bụ ụlọ nke Onyenwe anyị? (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:12–13).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110
Onye Nzọpụta na-agọzi ndị Ya site n’ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja.
-
Unu nwere ike jiri peeji ihe omume nke izu ụka nke a ma ọ bụ “Isi nke 40: Ọhụ niile niime Tempụl Kirtland” (niime Akụkọ ndị dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 155–57, ma ọ bụ vidiyo na-adakọrịta niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma) iji gwa ụmụaka banyere mmadụ si n’eluigwe ndị bịara nleta na tempụl. Unu nwekwara ike jiri foto nọ na ngwụcha ndepụta nke a.
-
Iji mụọ ihe banyere ịdị mkpa nke ihe mere na Tempụl Kirtland ahụ, gị na ụmụ gị nwere ike kwuo okwu banyere ihe ọtụghe niile na-eme. Ikekwe ụmụ gị nwere ike na-otu na-otu jide ọtụghe niile ma mee ka à ga-asị imepe ọnụ ụzọ agbachiri agbachi. Nyere ha aka chọta mkpụrụ okwu ọtụghe niile niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:11–16, ma kwuo okwu banyere ngọzi niile nke ọtụghe ndị a na-agbaghe. I nwere ike kọwaa na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja bụ ikike nke Chineke iji duo Nzukọ nsọ Ya. Kesaa obi ekele gị na Onyenwe anyị nyere anyị ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:15
Onyenwe anyị chọrọ ka m tụgharịa obi m nye ndị nna nna m ha.
-
Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:15 ọnụ, gwa ụmụ gị banyere otu nhụmiihe nke nyeere gị aka tụgharịa obi gị nye ndị nna nna gị ha. Unu nwekwara ike gụkọọ egwu dị ka nke a ọnụ “Agụgụala Ezi na ụlọ—Ana M Eme Ya” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 94).
-
Gịnị nwere ike inye aka “tụgharịa obi” nke ụmụ gị nye ndị nna nna ha ha? I nwere ike ịchọta ụfọdụ nchepụta na-enye obi ụtọ na FamilySearch.org/discovery Unu nwere ike rụkọọ ọrụ ọnụ iji mata ndị nna nna ha ndị chọrọ emume nsọ niile nke tempụl. Gịnị mere Jizọs ji na-achọ anyị ịrụ ọrụ nke a?