“Olu niile nke Mweghachite: Ụlọ Mkpọrọ Libati,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ụlọ Mkpọrọ Libati,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Ụlọ Mkpọrọ Libati
Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Libati, Missouri, Josef Smith natara leta ndị gwara ya banyere ọnọdụ ize ndụ nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a ndị a na-achụpụ site na steeti ahụ site n’aka iwu nke gọvaọnụ ọgụgụ Leta na-emetụ n’ahụ bịara site n’aka nwunye ya Emma. Okwu nwunye ya niile, na akwụkwọ ozi nke Josef na nzaghachi, gosipụtara ma ntaram ahụhụ ha ma okwukwe ha n’oge ihe isi ike nke a n’agụgụala Nzukọ nsọ.
Leta sitere n’aka Emma Smith nye Josef Smith, Maachị 7, 18391
Ezi Di
Ebe m nwetere ohere iziga site n’aka otu enyi, agbalịrị m ide, mana agaghị m anwa anwa ede mmetụta m niile, niihi na ọnọdụ nke ị nọ niime ya, mgbidi niile, ihe mgbochi niile, na bolt niile, osimiri ndị na-atụgharị atụgharị, iyi ndị na-asọ asọ, ugwu nta ndị na-eto eto, ndagwurugwu ndị na-emi emi na ọhịa ahịhịa ahịhịa na-agbasa nke kewara anyị, ma ajọọ ikpe n’ezighị ezi nke bu ụzọ kwaba gị niime ụlọ mkpọrọ ma ka jigidere gị ebe ahụ, ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-atule, na-edebe mmetụta m niile ebe dị anya fere nkọwa.
Asị na ọ bụghị maka aka ịdị ọcha akpachapụrụ anya, na ọnọdụ dị n’etiti nke ebere sinachi, o doro m anya nke ọma na agaraghị m enwe ike ịnagide ọnọdụ niile nke ntaram ahụhụ nke m gabigaworo na ya … ; mana a ka dị m ndụ ma otu ọ dị ka dị njikere ịtakwu ahụhụ ọ bụrụ ma ọ bụ uche nke Eluigwe dị obi ọma na m ga-ata ahụhụ niihi gị.
Anyị niile dị mma oge ugbu a, ewezuga Fredrick onye na-ejichaghị ahụ.
Obere Alexander onye m ku n’aka ugbu a bụ otu niime ọmarịcha ụmụ obere ị hụworo niime ndụ gị. O siri ike nke ukwuu na o jide aka n’oche ọ ga agbagharị ọnụ ụlọ gburugburu. …
Ọ dịghị onye ọbụla kama Chineke maara ntụgharị uche na mmetụta niile nke obi m mgbe m hapụrụ ụlọ anyị na ebe obibi anyị, ma ihe ruru ihe niile nke anyị nwere ewezuga ụmụ ntakịrị anyị, ma zọrọ njem m pụọ site na steeti Missouri, hapụ gị ebe akpọchiri gị niime ụlọ mkpọrọ ahụ na-ama owu. Mana ncheta ya bụ ihe karịrị ọdịdị mmadụ kwesịrị ibu. …
… E nwere m olileanya na ụbọchị ndị katụ mma ka ga-abịara anyị. … A bụ [m] nke gị n’ịhụnaanya mgbe niile.
Emma Smith
Leta sitere n’aka Josef Smith nye Emma Smith, Eprel 4, 18392
Ezi—nwunye—ịhụnaanya.
Abalị tọsde a nọdụrụ m ala naanị dị ka anyanwụ na-agbada, dị ka anyị na-enyo site na grate niile nke ụlọ mkpọrọ nke a na-ama owu, i dere gị, ka m wee gwa gị ọnọdụ m. E kwere m na ọ bụ ugbu a ọnwa ise na ụbọchị isii3 kemgbe m nọ n’okpuru iwe nche abalị na ụtụtụ, ma n’etiti mgbidi niile, grates niile, na ụzọ igwe na-eme mkpọtụ nke ụlọ mkpọrọ nke a na-ama owu, gbara ọchịchịrị, ruru unyi. Jiri mmetụta naanị Chineke maara ka m ji na-ede leta nke a. Ntule niile nke uche n’okpuru ọnọdụ ndị a na-emegide mkpịsị odide, ma ọ bụ ire, ma ọ bụ Ndị mmụọ ozi, ịkọwa, ma ọ bụ tee agba, nye mmadụ ekere eke ahụ onye na-agabigabeghị ihe anyị na-agabiga. … Anyị na-adabere n’ogweaka nke Jehova, ma enweghị onye ọzọ, niihi nnapụta anyị, ma ọ bụrụ na o meghị ya, agaghị eme ya, i nwere mara nke ọma, niihi na enwere oke akpịrị ịkpọ nkụ maka ọbara anyị niime steetị nke a; ọ bụghị niihi na ikpe mara anyị n’ihe ọbụla. … Ezi Emma M, ana m eche maka gị na ụmụaka ahụ esepụghị aka. … A chọrọ m ịhụ obere Frederick, Josef, Julia, Alezanda, Joana, na old mejọ [nkịta ezi na ụlọ]. … Obi ga-atọ m ụtọ ịgba ụkwụ efu site n’ebe a bịakwute gị, ma ghara ikpu okpu, ma gbara ọtọ ọkara ahụ, ịhụ gị ma were ya ka ihe obi ụtọ dị ukwuu, ma ghara ịgụ ya dị ka nnukwu ọrụ. … Ana m anagide mmegbu m niile n’obi ike, otu ahụkwa ka ndị ahụ mụ na ha nọ; ọdịghị onye niime anyị tụgharịwororịị. A chọrọ m [ka] ị ghara ikwe ka [ụmụ anyị] chefuo m. Gwa ha na Nna hụrụ ha naanya jiri ịhụnaanya zuru oke, ma ọ na-eme ihe niile o nwere ike ime iji pụọ n’aka ìgwè ndị obu aghara ịbịakwute ha. … Gwa ha na Nna kwuru na ha ahaghị ịbụ ezigbo ụmụaka, ma sọpụrụ nne ha. …
Nke gị,
Josef Smith Nta.