Come, Follow Me
Ọktoba 20–26: “O Chineke, Olee Ebe Ị Nọ?”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121–123


Ọktoba 20–26: ‘O Chineke, Olee Ebe Ị Nọ?’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121–123,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121–123,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Josef Smith niime Ụlọ Mkpọrọ Libati

Ụlọ Mkpọrọ Libati, site n’aka Welden Andersen

Ọktoba 20-26: “O Chineke, Olee Ebe Ị Nọ?”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121–123

Okpuru ala ụlọ mkpọrọ ahụ nọ na Libati, Missouri, ka a maara dị ka “dọnjọn.” Mgbidi niile gbara agba, ala okwute na-ajụ oyi ma ree ure, nri dị ụkọ ma gbaa ụka, ma mpio abụọ ahụ dị mkpafa eji igwe gbachie dị n’akụkụ silin kwere naanị obere ìhè bata. Ebe a bụ ebe Josef Smith na ole ma ole ndị ọzọ nọrọ ọnwa anọ jụrụ oke oyi n’oge winta nke 1838–39. N’oge nke a, Josef naara anata ozi mgbe niile banyere ntaram ahụhụ nke Ndị nsọ. Udo na nchekwube e nwetere na Far West nọrọ naanị ọnwa ole ma ole, ma ugbu a Ndị nsọ enweghị ebe obibi ọzọkwa, achụbara niime alaịkpa ịchọgharị ebe ọzọ iji malite—oge a ebe Onye amụma ha nọ n’ụlọ mkpọrọ.

Ma otu ọ dị, ọbụna niime ụlọ mkpọrọ nhujuanya ahụ, “mmata ihe sitere n’eluigwe” bịara “na-awụda n’ala” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:33). Ajụjụ nke Josef “O Chineke, olee ebe i nọ?” ka azara na-ido anya na na-ijuputa n’ike: “Atụla egwu … , niihi na Chineke ga-anọnyere gị ruo mgbe ebighị ebi niile” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1; 122:9).

Lee Ndị Nsọ, 1:323–96; “N’etiti Mgbidi niile nke Ụlọ Mkpọrọ Libati,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 256–63.

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1–10, 23–33122

Site na Chineke, mkpagbu nwere ike “bụrụ maka ọ dị mma [m].”

Mgbe anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ naanya na-ata ahụhụ, ọ bụ ihe na-emekarị iche ma Chineke ọ maara maka anyị. Dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1–6, chee banyere oge ndị mgbe i nweworo ọtụtụ ajụjụ ma ọ bụ mmetụta ndị yiri nke Josef Smith. Kedụ ihe ị na-achọta niime azịza nke Onyenwe anyị nke nwere ike inyere gị aka mgbe i nwere ajụjụ ma ọ bụ mmetụta ndị a? N’ịmaatụ, niime amaokwu nke 7-10, 26-33, mata ngọzi niile O kwere nkwa ya. Kedụ ihe i chere ọ pụtara “ịnagide … nke ọma”? Olee otu Onye Nzọpụta si enyere gị aka mee nke a?

Dị ka ị na-agụ nkeji 122, tulee otu Onyenwe anyị si na-achọ gị ịhụ mkpagbu gị niile. I nwere ike tulee nhụmiihe niile nke bịaworo site na mnwale gị niile na otu ha nwere ike i si “bụrụ maka ọ dị mma [gị]” (amaokwu 7)

Lee kwa Quentin L. Cook, “Udo Nke Onwe n’Oge Ndị Ịma Aka,” Liahona, Nov. 2021, 89–92; “Ebee Ka M Ga-atụgharị maka Udo?,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 129.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–46

akara ngosi semịnarị
Ezigbo ike na ike mmetụta dabeere na “ụkpụrụ niile nke ezi omume.”

Ike nke ụwa manyere Ndị nsọ ịpụ site na Missouri ma Josef Smith niime ụlọ mkpọrọ. Mana mgbe Josef nọ ebe ahụ, Onyenwe anyị kuziiri ya ihe banyere ụdị ike dị iche: ike Ya, “ike niile nke eluigwe.” Ịgụ ihe banyere ike ahụ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–46 nwere ike inyere gị aka mụọ otu esi anata ike ahụ—na otu esi eji ya agọzi ndị ọzọ. Ikekwe i nwere ike dekọọ ihe ị mụtara niime tebụụlụ nwere kọlụm enyere aha Ike niile nke Eluigwe na Ike Nke Ụwa. Kedụ otu ụdị ike abụọ ndị a si dị iche? Kedụ ihe nkọwa ndị a banyere ike nke Onyenwe anyị na-akọwara gị gbasara Ya?

I nwekwara ike tụgharịa uche na mkpụrụ okwu a ike mmetụta niime amaokwu 41. Kedụ ụfọdụ ọnọdụ ndị niime ya ị ga-achọ ịbụ ike mmetụta maka ihe ọma—elemaanya na mmekọrịta ezi na ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, ma ọ bụ n’ọrụ Nzukọ nsọ ekenyere? Kedụ ihe ị na-amụ site na amaokwu niile nke 41–46 banyere otu Chineke si emetụta ụmụ Ya? I nwere ike chịkọta ihe ị mụrụ site na-idezu ahịrị okwu dị ka nke a: “Imetụta maka ihe ọma, Aga m .”

Lee kwa Jeffrey R. Holland, “Ọbụghị dị ka Ụwa si Enye,” Liahona, Me 2021, 35–38; David A. Bednar, “Ike niile nke Eluigwe,” Liahona, Me 2012, 48–51; “Ike niile nke Eluigwe” (vidiyo), Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.

9:13

"The Powers of Heaven"

(D&C 121:34-46) The components and processes involved in providing electricity to a home are compared to the principles the Lord outlined in section 121 for those who would exercise His priesthood in power.

Họrọ otu nkebiokwu ma mụọ ya nke ọma. Ịmụtakwu banyere ngọzi niile dị ịtụnaanya akọwara niime amaokwu ndị a 45-46, i nwere ike họrọ otu nkebiokwu nke pụtaara gị iche ma mụọ ya nke ọma. N’ịmaatụ, gịnị ka mkpụrụokwu a chọọ mma pụtara, ma kedụ otu ezigbo agwa si achọ echiche gị niile mma? Ma ọ bụ ikekwe i nwere ike chọta foto nke igirigi ma mụọ ihe banyere otu igirigi si apụta n’osisi niile. Kedụ otu nke a si yie ụzọ Onyenwe anyị si akuzi ozizi Ya? Kesaa ihe ị chọpụtara gị na ezi na ụlọ ma ọ bụ ndị enyi gị, gụnyekwa ndị enyi gị na nzukọ nsọ.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:8

Jizọs Kraịst agbadawo n’okpuru ihe niile ka O wee nwee ike bulie m elu.

Kedụ ihe i chere ọ pụtara ikwu na Jizọs Kraịst “gbadara n’okpuru … [ihe] niile”? Ebe a bụ ụfọdụ amaokwu ndị agbakwunyere ndị nwere ike inyere gị aka ghọta nkebiokwu nke a: Aịzaya 53:3–4; Ndị Hibru 2:17–18; 1 Nifaị 11:16–33; Alma 7:11–13. Dabere na ihe ị mụrụ, tulee ikwughachi Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:8 n’okwuọnụ nke aka gị. Kedụ otu i ga-esi egosi obi ekele nye Jizọs Kraịst maka ịgbadata n’okpuru ihe niile?

Kedụ otu nghọta nke a sitere n’aka Onyeisi Dallin H. Oaks si emetụta nghọta gị? “Anyị nwekwara ike ikwu na site na-ịgbadata n’okpuru ihe niile, [Jizọs Kraịst] nọziri nke ọma ibuli anyị ma nye anyị ume anyị na-achọ iji nagide mkpagbu anyị” (“Agbara ume site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst,” Liahona, Nov. 2015, 64).

Jizọs Kraịst na-ata ahụhụ niime Getsemane

Nkọwa sitere na Ọbụghị Uche M Kama Nke Gị, site n’aka Walter Rane

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123

“Ka anyị n’obi ụtọ mee ihe niile nke dị n’ike anyị ime.”

Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:7–8, Josef Smith rụtụrụ aka na nkwenye ụgha nke dụbara na ntaram ahụhụ, gụnyere mkpagbu nke Ndị nsọ. Na Maach 1839, o yiri nnọọ ka na-enweghị ọtụtụ ihe Ndị nsọ nwere ike ime banyere nke ahụ. Mana niime leta ya o dere site na Ụlọ Mkpọrọ Libati, Josef gwara ha ihe ha nwere ike ime: “[chịkọta] mmata ihe nke eziokwu niile” ma “guzoro kwem, site na mmasi obi ike kachasị elu, iji hụ nzọpụta nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:1, 17). Dị ka ị na-atule nsogbu ndị dị n’ụwa taa, chee banyere ụzọ ndị eji egbo ndị ahụ “dị n’ike [gị]” (amaokwu nke 12,17). Ma elegharakwala ihe ndị yiri “ụmụ obere ihe” anya (amaokwu 15). Gịnị mere o ji dị mkpa ime ihe ndị a “n’obi ụtọ”? (amaokwu 17)

Ọtụtụ niime nkọwapụta nke Josef rịọrọ maka ha niime leta nke a ka enyefere n’aka gọọmentị ma ebipụta ya dị ka akwụkwọ ozi Nauvoo gbara ụzọ 11, Times and Seasons (lee “Agụgụala, nke Mkpagbu, nke Nzukọ nsọ ahụ nke Jizọs Kraịst, nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a nọ na Missouri, Dizemba 1839–Ọktoba 1840,” [josephsmithpapers.org]).

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 03

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1–9; 122:7–9

Site na Chineke, mkpagbu m niile nwere ike bụrụ maka ịdị mma m.

  • Iji nyere ụmụ gị aka chee ihe ọ gaara adị ka ya nye Josef Smith na ndị enyi ya niime Ụlọ Mkpọrọ Libati, unu nwere ike gụkọta ọnụ “Isi nke 46: Josef Smith niime Ụlọ Mkpọrọ Libati” (niime Akụkọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 172-74) ma ọ bụ “Olu niile nke Mweghachite: Mkpọrọ Libati” ma ọ bụ lee mpaghara nke vidiyo ahụ “Josef Smith: Onye amụma nke Mweghachite” (Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma, malite na 41:30). Emesịa, dị ka unu na-agụkọta ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:1–9, unu nwere ike kwuo banyere otu Onye Nzọpụta si nyere Josef aka nwee mmetụta udo. Kedụ otu anyị si achọta udo niime Onye Nzọpụta, ọbụna n’oge ndị ihe siri ike.

    1:51

    Chapter 46: Joseph Smith in Liberty Jail: November 1838–April 1839

    62:4

    Joseph Smith: The Prophet of the Restoration

    A motion picture about the life and legacy of Joseph Smith, the founding prophet of The Church of Jesus Christ of Latter-day Saints.

  • Inyere ụmụ gị aka mata na mnwale niile nwere ike “ịbụ maka ịdị mma [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:7), gị na ha nwere ike kwuo okwu banyere otu akwara anyị si eto mgbe anyị na-ebu ihe dị arọ. I nwere ike ọbụna kpọkuo ha ibuli ihe dị arọ. Mgbe ahụ i nwere ike kwuo okwu banyere otu ịgabiga oge ndị ihe siri ike nwere ike i si nyere mmụọ anyị aka too—dị ka anyị na-echigharị gakwuru Onyenwe anyị maka enyemaka. Kesaa ụfọdụ ọmụmaatụ ndị sitere na ndụ gị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–46

Ezi omume na-ewete “ike niile nke eluigwe.”

  • Ikekwe ihe ntụnyere ga-enyere ụmụ gị aka ghọta “ike niile nke eluigwe.” N’ịmaatụ, i nwere ike tụnyere ike nke Chineke nye ike eletriki. Kedụ ihe nwere ike igbochi ngwa eletriki site na-ịnata ike? Kedụ ihe na-ebelata ike nke ime mmụọ anyị? Kedụ ihe na-abawanye ya? (Chọọ mkpụrụ okwu niile na nkebiokwu niile dị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 121:34–46; lee kwa Akwụkwọ Ntuziaka Izugbe, 3.5, 3.6, Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.)

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:7–9

Jizọs Kraịst maara ihe M na-agabiga.

  • Mgbe gị na ụmụ gị gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:7–9 ọnụ, i nwere ike kesaa otu ọmụmaatụ mgbe i nwetere mmetụta na Onye Nzọpụta nọnyeere gị n’oge mnwale siri ezigbo ike. Unu nwere ike gụkọọ ọnụ otu egwu dị ka “Jizọs Otu mgbe Bụụrụ Obere Nwata” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 55) ma gbaa ama na Jizọs Kraịst nwere ike inyere anyị aka niihi na Ọ maara otu o si emetụta anyị.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:15–17

Ọbụna ụmụ obere ihe nwere ike imepụta nnukwu ndịiche na-ije ozi nke Chineke.

  • Iji nyere ụmụ gị aka ghọta Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:15–17, i nwere ike kesaara ha otu foto nke nnukwu ụgbọ mmiri na obere ihe eji anyagharị ụgbọ mmiri, ma ọ bụ kesaara ha nkọwa nke Okenye David A. Bednar dị niime “Ụkpụrụ niile nke Ozi ọma M” (Liahona, Me 2021, 125–26). Mgbe ahụ i nwere ike kwuo banyere obere ụzọ ndị anyị nwere ike iji n’obi ụtọ jeere ezi na ụlọ anyị na ndị enyi anyị ozi.

15:0

“The Principles of My Gospel”

Elder Bednar teaches that correct gospel principles help us make wise choices and stay on the covenant path.

ngosipụta ụgbọ mmiri dị n’oke osimiri

Dị ka obere ihe eji anyagharị nnukwu ụgbọ mmiri, ụmụ obere mgbalị anyị nwere ike imepụta nnukwu ndịiche.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Josef Smith na-edekọ otu mkpughe niime Ụlọ Mkpọrọ Libati

Josef Smith niime Ụlọ Mkpọrọ Libati, site n’aka Greg Olsen

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị