“Ọktoba 13–19: ‘Aja Ya Ga-aka a Dị Nsọ nye M Karịa Mmụba Ya’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115–120,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115–120,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Ọktoba 13-19: “Aja Ya Ga-aka a Dị Nsọ nye M Karịa Mmụba Ya”
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115–120
Enwere ihe kpatara Ndị nsọ jiri nwee nchekube banyere ebe mgbakọta ha kachasị ọhụrụ, Far West, Missouri. Obodo ukwu ahụ naara etolite ọsọ ọsọ, ala ahụ yiri ka ebe ihe juputara n’uju, ma na-akụkụ ya bụ Adam-ondi-Ahman, ebe dị oke mkpa ime mmụọ n’oge gara aga na n’ọdịniihu (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 107:53–56; 116). Rute ugbua, ọ haghị isiri Ndị nsọ ike ịghara iche banyere ihe funaworo ha. E wezuga na-achụpụrụ ha site na Independence, isi ebe Zayọn nọ, Ndị nsọ bịakwara gbafuo site Kirtland, na-ahapụ ọmarịcha tempụl ha naanị ka afọ abụọ gasịrị. Ma oge nke a ọbụghị naanị ndị iro dị na-anọghị na Nzukọ nsọ na-akpata nsogbu—ọtụtụ ndị otù ama ama echigharịwo megide Josef Smith, gụnyere ndị otù anọ sitere na Kworum Ndị ozi Iri na Abụọ.
Kama ilekwasị anya n’ihe funahụrụ ha, ndị kwesịrị ntụkwasị obi nọgidere n’iwu Zayọn, n’oge nke a na Far West. Ha mere atụmatụ maka tempụl ọhụrụ. Ndị ozi anọ dị ọhụrụ ka akpọrọ. Ha ghọtara na ịrụ ọrụ nke Chineke apụtaghị na ị gaghị ada ada; ọ pụtara na i “ga-ebili ọzọ.” Ma agbanyeghị na ị ga-achụ aja, aja ndị ahụ dị nsọ nye Chineke, ọ bụna “dị karịa nsọ … karịa mmụba [gị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117:13).
Lee Ndị Nsọ, 1:296-99.
Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:3–6
Aha Nzukọ nsọ dị mkpa nye Onyenwe anyị.
Onyeisi Russell M. Nelson kwuru na aha Nzukọ nsọ bụ “ihe dị oke mkpa” (“Aha Ziri ezi nke Nzukọ nsọ,” Liahona, Nọv. 2018,87). Chee echiche banyere ihe mere o ji bụrụ eziokwu dị ka ị na-agụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115: 4–6. Kedụ ihe aha Nzukọ nsọ nwere ime ya na ọrụ na ozi ya?
Lee kwa 3 Nifaị 27:1–11.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:5–6
Zayọn na stek ya niile na-enye “nchekwa site n’oké ebili mmiri.”
Dị ka ị na-amụ nhụnuuche dị ike niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:5–6, tulee ọrụ Onyenwe anyị chọrọ gị, dị ka onye otù Nzukọ nsọ Ya, imejupụta. N’ịmaatụ, kedụ ihe i nwere ike ime iji “bilie ma na-enwu pụta” ma ọ bụ “bụrụ ihe atụ nye mba niile”? (amaokwu 5). Kedụ oké ebili mmiri nke ime mmụọ ị na-achọpụta n’akụkụ gị? Kedụ otu i ga-esi achọta “ebe mgbaba” site na mkpokọta? (amaokwu 6).
Lee kwa “Amara nke Nna Anyị Na-egbuke Egbuke,” Abụ, ọnụ ọgụgụ 335.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117
Aja m niile dị nsọ nye Onyenwe anyị.
Ka ewere na ị bụụrụ Newel K. Whitney ma ọ bụ nwunye ya, Elizabeth, ndị naara enwe ndụ ọganiihu niime Kirtland ma emesịa agwa ha pụọ. Kedụ ihe ị na-achọta niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117:1–11 nke gaara enyere gị aka chụọ aja nke a? Kedụ aja ndị ị na-achụ maka Chineke? Kedụ ihe amaokwu ndị a na-akuziri gị banyere onye Chineke bụ na ihe Ọ na-eme?
Aja a rịọrọ Oliver Granger dị iche site na nke ndị Whitney: Onyenwe anyị kenyere ya ọrụ ịnọ na Kirtland ma dozie ego niile nke Nzukọ nsọ. Mgbe ọ nọchitere anya Nzukọ nsọ jiri iguzosi ike n’ezi ihe, n’ikpeazụ o nweteghị ihe a chọrọ. Tulee otu mkpụrụokwu niile nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117:12–15 si tụnyere ihe ndị Ọ rịọworo n’aka gị.
Lee kwa “Far West na Adam-ondi-Ahman,” niime Mkpughe ndị nọ N’ọnọdụ, 239–40.
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 119–20
Otu ụzọ n’ụzọ iri m na-enye aka wuo alaeze nke Chineke.
Ntuziaka niile dị niime nkeji nke 119 na 120 na-edokwu anya ihe otu ụzọ n’ụzọ iri bụ: anyị na-atụ ụtụ “otu ụzọ n’ụzọ iri” nke ọ mụrụ nwa anyị (ma ọ bụ ego a na-enweta) afọ ọbụla (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 119:4). Mana mkpughe ndị a na-emekwu karịa inye nkọwa. Onyenwe anyị gwara Ndị nsọ na otu ụzọ n’ụzọ iri ga “edo ala nke Zayọn nsọ.” Ma ewezuga iwu nke a, ka O kwuru, “ọ gaghị abụ … Zayọn nye unu” (amaokwu 6). I chetụwo echiche mgbe ọ bụla banyere otu ụzọ n’ụzọ iri n’ụzọ dị otu a? Kedụ otu ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri si enye aka mee e dokwuo gị nsọ karịa, kwadoo maka Zayọn karịa?
Kedụ ihe ị na-amụ site na mkpughe ndị a banyere otu ụmụ odibo nke Onyenwe anyị si eji ego otu ụzọ n’ụzọ iri eme ihe? Kedụ ihe dịịrị gị mkpa banyere nkebiokwu ahụ “site n’olu nke onwe m nye ha” niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 120?
Okenye Devid A. Bednar enyewo nkọwa bara uru banyere otu esi eji otu ụzọ n’ụzọ iri eme ihe na ngọzi niile nke na-abịa site na irube isi na iwu nke a niime “Ọnụ mpio niile nke Eluigwe” (Liahona, Nov. 2013, 19-20) Ajụjụ ndị a sotere nwere ike nyee aka dị ka ị na-amụ ozi ya:
-
Onye na-ekpebi otu esi eji otu ụzọ n’ụzọ iri eme ihe mgbe akwụzuru ya nye Nzukọ nsọ?
-
Kedụ ihe eji otu ụzọ n’ụzọ iri eme?
-
Kedụ ngọzi ndị na-abịa dị ka ihe mpụta nke ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri? N’ịmaatụ, olee ụzọ ndị ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri si agba mmekọrịta gị na Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst ume?
-
Kedụ ihe i nwere ike ịmụta site na ọkpụkpọ oku nke Okenye Bednar?
-
Kedụ otu i nwere ike i si nyere ndị ọzọ aka bawanye okwukwe ha niime iwu nke otu ụzọ n’ụzọ iri?
Lee kwa Malakaị 3:8-12; “Otu ụzọ n’ụzọ iri nke Ndị M,” niime Mkpughe ndị dị N’ọnọdụ, 250–55.
Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị
Ozizi na Ọgbụgba ndụ nile 115:4–5
Abụ m onye otù Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.
-
Iji nyere ụmụ gị aka mụọ aha Nzukọ nsọ ma ghọta ihe mere o ji dị mkpa, tulee ịjụ ma enwere onye ọbụla niime ha nwere ike ikwu aha Nzukọ nsọ n’uju. I nweziri ike gosi ha aha ahụ site Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:4 ma gwa ha iso gị kwugharịa ya. Dị ka ị na-eme, tulee ịrụtụ aka na mkpụrụ okwu ndị dị mkpa na ihe mere ha ji dị mkpa. I nwekwara ike nyochaa “Isi nke 43: Jizọs Kraịst Enye Nzukọ nsọ Ya Aha” (niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 164, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma) ma ọ bụ kwee “Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst” (Akwụkwọ abụ nke Ụmụntakịrị, 77).
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:4–6
Ọmụmaatụ m nwere ike nyere ndị ọzọ aka bịakwute Kraịst ma chọta nchekwa.
-
Ụmụ gị nwere ike mara ndị mmadụ ndị na-adọlị ma nwee mkpa “ebe mgbaba” site na “ebili mmiri nke ndụ” (amaokwu 6). Kedụ otu ha nwere ike i si nyere mmadụ ndị a aka? Tulee ịkpọku ụmụ gị iguzoro mgbe ị na-agụ mkpụrụokwu ahụ bilie niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:5. Ha nwere ike gbatịa mkpịsịaka ha dị ka ụzarị anyanwụ mgbe ị gụrụ gaaniihu na-egbuke. Chetere ụmụ gị na ihè anyị na-abịa site na Jizọs Kraịst, ma nyere ha aka chee maka ụzọ ndị ha ga-esi “aganiihu na-egbuke” dị ka Ọ na-eme.
-
Ụmụ gị nwere ike ise otu foto na-egosi Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 115:6. N’ịmaatụ, ha nwere ike see ebili mmiri ebe ndị mmadụ na-agbaba niime ụlọ Nzukọ nsọ. Gịnị ka ebili mmiri ahụ na-egosipụta? Kedụ otu Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta si ewete enyemaka? Nyere ụmụ gị aka chee maka otu enyi, onye otù ezi na ụlọ, ma ọ bụ onye agbata obi nọ na mkpa. Kedụ otu anyị nwere ike i si kpọkuo ha ịchọta enyem aka niime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117
Aja m niile dị nsọ nye Onyenwe anyị.
-
Kpọkuo ụmụ gị ime ka a ga-asị na ha bụ Newel K. Whitney. Kedụ otu ha ga-esi enwe mmetụta ọ bụrụ ma Onyenwe anyị rịọ ha ịhapụ ọrụ ha na-eme nke ọma ma kwaga ebe ọhụrụ? (O nwere ike inye aka inyochagharị “Isi nke 41: Nsogbu niime Kirtland,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 158–60, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.) Dị ka unu na-agụkọ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 117:1–11, rịọ ụmụ gị ịkwụsị mgbe ha nụrụ ihe ga-enyere ha aka nwee okwukwe irube isi nye Onyenwe anyị. Kedụ aja ndị anyị na-achụ iji rubere Onyenwe anyị isi? Kedụ otu O si agọzi anyị?
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 119–20
Nna nke Eluigwe na-eji otu ụzọ n’ụzọ iri agọzi ụmụ Ya.
-
Ọtụtụ niime ụmụntakịrị ndị ị na-akuziri ihe nwere ike dị oke nta ịkpata ego ma kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri, mana ọ dị mma nye ha ịghọta otu otu ụzọ n’ụzọ iri si enye aka n’ọrụ nke Onyenwe anyị na gburugburu ụwa. Tulee iji foto niile na ihu akwụkwọ ihe omume nọ na ngwụcha ndepụta nke a iji nyere ha aka ghọta ihe otu ụzọ n’ụzọ iri bụ. (Lee kwa “Isi nke 44: Otu ụzọ n’ụzọ iri,” niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 165–66, ma ọ bụ vidiyo kwekọrịtara niime Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma.) Kedụ otu Nna nke Eluigwe si eji otu ụzọ n’ụzọ iri agọzi ụmụ Ya? Kesaa mmetụta gị niile banyere iwu nke otu ụzọ n’ụzọ iri na otu o siworo gọzie gị.