Come, Follow Me
Ọktoba 6–12: “Aga M Ahazi Ihe Niile maka Ọdịmma Gị”: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111–114


“Ọktoba 6–12: ‘Aga M Ahazi Ihe Niile maka Ọdịmma Gị’: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111–114,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)

“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111–114,” Bịanụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025

Joseph Smith na-akuzi ihe na Tempụl Kirtland

Ọktoba 6-12: “Aga M Ahazi Ihe Niile maka Ọdịmma Gị”

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111–114

Ọ dịwo mgbe i nwetere nhụmiihe nke ime mmụọ nke mere gị enwee obisike na nchekwa na okwukwe gị niime Kraịst—mana emesịa mkpagbu niile nke ndụ anwaa okwukwe gị, ma gị ahụ onwe gị na ịgba mbọ inwetaghachi udo nke i nwere na mbụ? Ihe yiri ya mere Ndị nsọ nọ Kirtland. Ihe na-erughị otu afọ mgbe mwụpụta ihe nke ime mmụọ niile nke metụtara nraranye nke Tempụl Kirtland gasịrị, nsogbu malitere. Nsogbu ego, esemokwu niime Kworum nke Ndị Iri na Abụọ, na mnwale ndị ọzọ mere ụfọdụ Ndị nsọ ịdagharị n’okwukwe ha na-agbanyeghị nhụmiihe isimbụ ha.

Anyị enweghị ike ezere mnwale niile, ya mere kedụ otu anyị ga-esi ewezuga ha site na iyi okwukwe na ama anyị egwu? Ikekwe otu akụkụ azịza ya ka enwere ike ịhụta niime ndụmọdụ nke Onyenwe anyị niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112, enyere mgbe mkpagbu niime Kirtland na-eko achịcha. Onyenwe anyị kwuru, “Mee ka obi unu dị ọcha niihu m” (amaokwu 28), “Enupụkwala isi” (amaokwu 15), “Kechie ihe okike ukwu gị maka ọrụ ahụ” (amaokwu 7), ma “Dịrị umeala” (amaokwu 10). Dị ka anyị na-esoro ndụmọdụ nke a, Onyenwe anyị “ga-edu [anyị] n’aka” oge niile nke mkpagbu ma ruo ọgwụgwọ na udo (lee amaokwu niile nke 10, 13).

akara ngosi ihe ọmụmụ

Nchepụta niile maka Ọmụmụ ihe N’Ebe Obibi na na Nzukọ nsọ

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111

Onyenwe anyị pụrụ “ịhazi ihe niile maka ọdịmma [m].”

Na 1836, Nzukọ nsọ adabawo na nnukwu ụgwọ site na-ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị. Josef Smith na ndị ọzọ nwere nchegbu banyere ụgwọ ndị a ma tulee ụzọ ndị esi akwụ ha (lee isi nkeji nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111).

Dị ka ị na-agụ nkeji 111, tulee otu okwu nke Onyenwe anyị nye Josef nwere ike i si tụnyere gị—na ihe ndị na-echegbu gị. N’ịmaatụ, mgbe ole ka i nweteworo mmetụta ịhụnaanya nke Chineke na-agbanyeghị nzuzu gị niile” (amaokwu 1)? Kedụ otu Onyenwe anyị siworo nyere gị aka chọta akụ niile ị na-atụghị anya ha (amaokwu 10)? Gịnị ka O meworo iji “hazie ihe niile maka ọdịmma gị” (amaokwu 11)? Gịnị ka nkebiokwu a “ngwa ngwa dị ka i nwere ike ịnata ha” na-akuziri gị banyere Nna nke Eluigwe?

Lee kwa Matiu 6: 19-21, 33; “Akụ ndị Ọzọ Karịa Otu,” niime mkpughe niile dị N’ọnọdụ, 229–34.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:3–15, 22

akara ngosi semịnarị
Onyenwe anyị ga-edu m dị ka m ji umeala na-achọ uche Ya.

Thomas B. Marsh, Onyeisi Kworum nke Ndị ozi Iri na Abụọ, were iwe na Josef Smith akpọwo, na-ajụghị ya, ndị otu abụọ nke kworum ya ikwusa ozi ọma na Ingland. O zutere Onye amụma, onye natara mkpughe nke nyeere Thomas aka wezuga iwe ya n’akụkụ. Mkpughe nke a ka edekọrọ niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112.

Debe ọnọdụ nke a n’obi gị dị ka ị na-amụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112. Kedụ ihe ị na-achọta nke gwọworo mmetụta iwe nke Thomas? Niime amaokwu nke 3-15 na 22, i nwere ike chọọ azịza niile maka ajụjụ ndị dị ka ndị a: Gịnị bụ ịdị umeala? Gịnị ka ọ pụtara nye Onyenwe anyị idu gị “n’aka”? Gịnị mere i ji chee na ịdị umeala na-enyere gị aka nata odudu nke Onyenwe anyị? I nwere ike chọta azịza ndị agbakwunyere niime “Usoro nke Ịdị umeala” niime ozi nke Okenye Josef W. Sitati “Usoro niile nke Iso Ụzọ” (Liahona, Nov. 2022, 87–88).

Chee maka onye ị maara dị umeala. Gịnị ka onye a na-eme iji gosi ịdị umeala? Kedụ ihe ị na-amụ site n’aka Onye Nzọpụta banyere ịdị umeala? Eleghị anya i nwere ike chọta foto niile nke oge ndị dị niime ndụ Ya mgbe O gosiri ịdị umeala.

Mgbe ole ka i nweteworo mmetụta odudu site n’aka Onyenwe anyị dị ka ị wedatara onwe gị ala?

Lee kwa Ulisses Soares, “Dị Nwayọọ ma Dị Umueala N’obi,” Liahona, Nov. 2013, 9–11; “Okwukwe na Ọdịda nke Thomas Marsh,” niime Mkpughe ndị Dị n’ụdị, 54–60; Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ịdị umeala,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; “Dịrị Umeala,” Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 130.

Mee ka ndị na-amụ ihe sonye. Chee banyere otu i nwere ike i si nyere ndị i na-akuziri ihe aka isonye nke ọma n’ọmụmụ eziokwu niile dị niime akwụkwọ nsọ. Dị ka ọmụmaatụ, iji nyere ha aka ghọta ihe Onyenwe anyị kwuru niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:10, i nwere ike kechie otu onye anya ma kpachapụ anya duo ya n’aka gburugburu ebe edebechara oche ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ka ihe mgbochi. Kedụ ihe anyị nwere ike ịmụta banyere ịdị umeala site na ngosipụta nke a?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:12–26, 28, 33– 34

Ndị ahụ atọghatara n’ezie na-abịa mata Jizọs Kraịst.

Eziokwu na ụfọdụ Ndị Ozi niime 1837 tụgharịrị megide Onye amụma bụ ihe ncheta dị mma na na-agbanyeghị ọkpụkpọ oku Nzukọ nsọ anyị ma ọ bụ ole anyị maara banyere ozi ọma, anyị garịrị n’otu n’otu ahụ na anyị ga-azụ nke ọma ntọghata anyị nye Jizọs Kraịst. Ikekwe i nwere ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:12–26, 28, 33–34 ma chọọ maka eziokwu ndị nwere ike inyere gị aka merie mnwale nke okwukwe ma ọ bụ bụrụ onye atọghatara n’uju karịa nye Onyenwe anyị. I nwere ike nwee mmetụta mkpatemmụọ ikesa ihe ị chọtara iji nyere onye ọzọ aka gbaa ntọghata ha nye Kraịst ume.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 113

Josef Smith bụ “nwa odibo n’aka nke Kraịst.”

Onye amụma Aịzaya kpọrọ otu niime ndị agbụrụ Jesse dị ka otu “okporo igwe” na otu “mgbọrọgwụ” (Aịzaya 11:1, 10). Niime nkeji 113, Onyenwe anyị kọwara na agbụrụ nke a, onye odibo nke Kraịst, ga-abụ ngwa ọrụ na mkpokọta ndị nke Onyenwe anyị n’ụbọchị ikpeazụ ndị a (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 113:4, 6). Amụma nke a kọwara Onye amụma Josef Smith nke ọma nnọọ. Kedụ otu eziokwu nke a na ndị ọzọ dị niime nkeji 113 siworo gbaa Ndị nsọ ume n’oge ọgba aghara ha hụrụ niime Kirtland? Kedụ ihe ị na-ahụta niime mkpughe nke a nke na-akpate mmụọ gị ịnọgidesi ike ma sonye n’ọrụ nke Onyenwe anyị taa esepụghị aka?

Lee kwa Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Jesse,” Ọba akwụkwọ nke Ozi ọma; 2 Nifaị 21:10–12; Josef Smith—Agụgụala 1:40.

ngosipụta nke Aịzaya 11:1

Aịzaya dere maka otu “okporo igwe” na “mgbọrọgwụ niile” na-apụta site na “okporo nke Jesse” (Aịzaya 11:1).

Maka nchepụta ndị ọzọ, lee mbipụta niile nke ọnwa nke a nke Liahona na magazin niile Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa.

akara ngosi nkeji ụmụntakịrị 01

Nchepụta niile maka Ikuziri Ụmụntakịrị

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111:2, 10–11

Ihe ndị nke Chineke nwere ike ị bụ akụ nye m.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike see ihe bịara unu n’obi mgbe unu nụrụ mkpụrụ okwu ahụ akụ. Emesịa unu nwere ike gụkoọ ọnụ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 111:2, 10–11 ma chọọ ndịiche dị n’etiti akụ niile nke ụwa ya na ihe niile Onyenwe anyị jiri kpọrọ ihe. (Lee ihu akwụkwọ ihe omume nke izu ụka nke a.) Kedụ otu anyị ga-esi eji ihe ndị nke Chineke kpọrọ ihe karịa?

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:10

Onyenwe anyị ga-edu m n’aka ma zaa ekpere m niile.

  • Mgbe unu gụkọtasịrị Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:10 ọnụ, gị na ụmụ gị nwere ike gụkọta egwu “Dịrị Umeala” ọnụ (Abụ niile, ọnụ ọgụgụ 130) Unu nwekwara ike mee egwuregwu nke gụnyere idu ibe unu “n’aka” (dị ka ụzọ ihe mgbochi nọ na ya). Kedụ otu Onyenwe anyị si edu anyị “n’aka,” ọbụna agbanyeghị Ọ nọghị na-anụ ahụ anyị na ya? Gịnị mere anyị ji chọọ ka Onyenwe anyị duo anyị? Olee mgbe anyị ji nwee mmetụta na Onyenwe anyị na-edu anyị?

  • Gị ma ọ bụ ụmụ gị nwere ike dee mkpụrụ okwu niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:10 ma kanye ahịrị n’okpụrụ ngọzi niile Onyenwe anyị nyeworo anyị mgbe anyị tụgharịrị n’umeala nye Ya. Gbaa ụmụ gị ume ikesa oge mgbe ha rịọrọ n’umeala maka enyemaka nke Onyenwe anyị ma nata azịza niile nye ekpere ha ma ọ bụ e duo ime ihe dị mma (lee Moronai 7:13, 16).

Jizọs na-agwọ otu nwata

Nkọwa sitere na Bilie ma Jee ije, site n’aka Simon Dewey

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:11

Jizọs chọrọ ka m hụ onye niile naanya.

  • Gị na ụmụ gị nwere ike n’otu n’otu họrọ ịgụ site na “Isi nke 41: Nsogbu na Kirtland” (niime Akụkọ niile nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, 158–60). Onye niime akụkọ ahụ mere ka nsogbu niile dị niime Kirtland dịkwuo njọ? Onye naara achọ ime ka ọ dịkwuoro ha mma? Mgbe ahụ unu nwere ike gụọ Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:11 ma kwuo banyere ihe mere Onyenwe anyị ji chọọ ka anyị hụ onye niile naanya. Kedụ mgbe O gosiri ịhụnaanya maka ndị mmadụ ndị na-adịghịrị Ya obi ọma? (ịmaatụ, lee Luk 23:34). Unu nwere ike gụọ egwu gbasara ịhụ ndị ọzọ naanya, dị ka “Aga M eso Gị Eje Ije” (Akwụkwọ abụ Ụmụntakịrị, 140–140).

2:20

Chapter 41: Trouble in Kirtland: 1837–1838

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:11–14, 24–26

Ndị ahụ nwere ntọghata n’ezie na-abịa mata Jizọs Kraịst.

Maka echiche ndị ọzọ, lee mbipụta nke ọnwa nke a nke magazin Friend.

Thomas B. Marsh dekọrọ mkpughe enyere ya site n’aka Josef Smith.

Dịrị Umeala, site n’aka Julie Rogers

ihu akwụkwọ ihe omume maka ụmụntakịrị