“Olu niile nke Mweghachite: Ngosipụta niile nke Ime mmụọ na Tempụl Kirtland,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 2025 (2025)
“Ngosipụta niile nke Ime mmụọ na Tempụl Kirtland,” Bianụ, Soro M—Maka Ebe Obibi na Nzukọ nsọ: 2025
Olu niile nke Mweghachite
Ngosipụta niile nke Ime mmụọ na Tempụl Kirtland
N’okpuru bụ mkpụrụokwu niile nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a ndị nọọrọ niime Tempụl Kirtland n’oge nraranye ya na n’oge nzukọ ndị ọzọ ndị sotere. Ọtụtụ tụnyeere nhụmiihe ha nye ihe Ndị nsọ mgbe gboo hụbigara mgbe “enyere ha ike sitere n’eluigwe” n’ụbọchị Penticost (Luk 24:49; lee kwa Ọlụ 2:1–4; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 109:36–37).
Eliza R. Snow
“Mmemme niile nke nraranye ahụ nwere ike bụrụ nke emegharịrị, mana ọdịghị asụsụ ndụ anụ ahụ ọbụla nwere ike ịkọwa ngosipụta niile si n’eluigwe nke ụbọchị ahụ pụrụ iche. Ndị mmụọ ozi pụtara ihè nye ụfọdụ, ebe uche nke ọnụnọ sinachi ka ndị niile nọ ebe ahụ matara, ma obi ọbụla jupụtara ‘n’ọńụ na-enweghị nkọwa ma juputa n’ebube.’”1
Sylvia Cutler Webb
“Otu niime ncheta isimbụ m bụ nraranye nke Tempụl ahụ. Nna m kukwasara anyị n’elu apata ụkwụ ya ma gwa anyị ihe mere anyị ji aga na ihe ọ pụtara iranye ụlọ nye Chineke. Ma na-agbanyeghị ịdị ezigbo obere n’oge ahụ, echetere m oge ahụ nke ọma. Enwere m ike ileghachi anya azụ n’oge ndị gara aga ma hụta dị ka m si hụ Josef Onye amụma mgbe ahụ, iguzoro welie aka ya abụọ n’eluigwe, ihu ya na-acha ntụ mmiri mmiri, anya mmiri na-agbada na nti ya dị ka ọ na-ekwu okwu n’ụbọchi ahụ pụrụ iche. Ọ dị nnọọ ka onye niile ọ nọ na-anya mmiri. Ụlọ ahụ jupụtara n’igwe mmadụ nke mere ụmụntakịrị kacha nọdụ n’elu apata ụkwụ nke ndị agadị; nwanne m nwanyị nọdụrụ n’elu nke nna, mụ onwe m n’elu apata ụkwụ nke nne m. Ọbụna enwekwara m ike icheta uwe ndị anyị yi. Uche m dịịrị obere nke ukwuu n’oge ahụ iji mata n’uju ịdị mkpa ya niile, mana dị ka oge gafere ọ bịara doo m anya karịa, ma obi m jupụtara n’ekele na enwetere m ohere ịnọ ebe ahụ.”2
Oliver Cowdery
“N’oge mgbede ezutere m ndị ụlọ ọrụ nke nzụkọ nsọ niime ụlọ nke Onyenwe anyị. A wụpụtara Mmụọ ahụ—a hụtara m ebube nke Chineke, dị ka nnukwu urukpuru, gbadatara ma nọrọ n’elu ụlọ ahụ, ma juputakwa ya dị ka ufufe na-asọ asọ dị ike. A hụtakwara m ire ndị kewara ekewa, dị ka ọkụ nọkwasịrị n’elu ọtụtụ, … ebe ha kwuru okwu jiri ire ndị ọzọ ma buo amụma.”3
Benjamin Brown
“Ọtụtụ ọhụ [ka a] hụrụ. Otu hụrụ ohiri isi ma ọ bụ urukpuru nọkwasịrị n’elu ụlọ ahụ, na-egbuke dị ka mgbe anyanwụ na-acha n’elu urukpuru dị ka ọlaedo. Abụọ ndị ọzọ hụrụ mmadụ atọ na-efegharị efegharị niime ọnụ ụlọ jiri ọtụghe ndị na-egbuke egbuke n’aka ha, nakwa ụdọ igwe na-egbuke egbuke n’aka ha.”4
Orson Pratt
“Chineke nọ ebe ahụ, ndị mmụọ ozi ya nọ ebe ahụ, Mmụọ Nsọ nọ n’etiti ndị ahụ … ma ha juputara site n’elu isi ha ruo n’okpuru ụkwụ ha jiri ike na mkpate mmụọ nke Mmụọ Nsọ.”5
Nancy Naomi Alexander Tracy
“[Mgbe] arụsịrị ma raranye Tempụl ahụ … ha bụ ụbọchị abụọ kachasị enye obi ụtọ nke ndụ m. Abụ nke dabara adaba nke edere maka mmemme ahụ bụ ‘Mmụọ nke Chineke Dị ka Ọkụ Na-ere ere.’ Ọ bụ eziokwu n’ezie na Ike mmetụta nke Eluigwe nọkwasịrị n’elu ụlọ ahụ. … O metụtara m dị ka ọ bụ eluigwe nọ n’ụwa.”6